Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ga-enyere Gị Aka ma Ị Na-eme Nchọnchọ

Ihe Ga-enyere Gị Aka ma Ị Na-eme Nchọnchọ

Ihe Ndị E Ji Akụziri Ụmụaka Baịbụl

Ndị nne na nna nwere nnukwu ọrụ, nke bụ́ ịna-akụziri ụmụ ha banyere Jehova. (Efe. 6:4) Nzukọ Jehova ewepụtala ọtụtụ isiokwu, vidio, na abụ ndị ga-enyere ha aka. Olee otú ị ga-esi jiri ha na-azụ ụmụ gị?

  • Chọpụta ihe ndị e nwere. Ihe niile e wepụtaara ndị na-eto eto dị na jw.org, ma vidio ma ihe ndị e dere ede. a Ị chọọ ịhụ ha, gaa n’ebe e dere “Ihe Baịbụl Na-akụzi,” pịa “Ụmụaka” ma ọ bụ “Ihe Ndị Ga-enyere Ndị Na-eto Eto Aka.”

  • Họrọ ihe ga-akacha baara nwa gị uru. I mepee ebe e dere “Ụmụaka,” i nwere ike ịhọrọ vidio, abụ, na isiokwu ndị i chere ga-abara nwa gị uru. Ị chọọ ịhụ ụfọdụ n’ime ha, gaa n’ebe e dere “Ihe Baịbụl Na-akụzi,” pịa “Ụmụaka,” pịzie “Ihe Ezinụlọ Ga-eji Na-amụ Baịbụl.”

  • Wepụtara ụmụ gị oge. Asịla nwa gị ka naanị ya lee vidio ma ọ bụ dee ihe ndị a na-ede ede naanị ka ọ ghara ịnọ nkịtị. Kama ime otú ahụ, gị na ya kwurịta ihe dị na ya, ma nyere ya aka ịgba mbọ ka ọ bụrụ enyi Jehova.

a Na JW Library®, ị ga-ahụkwa vidio niile na isiokwu ndị e dere ede maka ndị na-eto eto.