ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 38
Ndị Na-eto Eto, Olee Ụdị Ndụ Unu Chọrọ Ibi?
‘Ịghọta ihe ga-echebe gị.’—ILU 2:11.
ABỤ NKE 135 Jehova Ji Obiọma Na-arịọ: “Mara Ihe, Nwa M”
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Olee ihe siiri Jehoash, Ọzaya, na Josaya ike?
OLEE otú obi ga-adị gị ma ị malite ịchị ndị Chineke mgbe ị ka dị obere? Gịnị ka ị ga-eji ikike ahụ i nwere mee? Baịbụl kwuru gbasara ụfọdụ ndị eze Juda ghọrọ eze mgbe ha dị obere. Dị ka ihe atụ, Jehoash ghọrọ eze mgbe ọ dị naanị afọ asaa, Ọzaya aghọọ eze mgbe ọ dị afọ iri na isii, Josaya aghọọkwa eze mgbe ọ dị afọ asatọ. Chegodị otú ihe a si siere ha ike. N’agbanyeghị otú o si siere ha ike, Jehova na ndị ọzọ nyeere ha niile aka ha emee ọtụtụ ihe ọma.
2. Gịnị mere o ji dị mma ka anyị mụọ gbasara Jehoash, Ọzaya, na Josaya?
2 Anyị abụghị ndị eze ma ọ bụ ndị eze nwaanyị. Ma, anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe dị mkpa n’aka mmadụ atọ a a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Ha mere ihe ndị dị mma. Ma e nwekwara ihe ndị na-adịghị mma ha mere. Anyị ga-eji akụkọ ha mata ihe mere anyị ji kwesị ịna-emeta ndị ezigbo mmadụ enyi, ịna-adị umeala n’obi, nakwa ịna-efe Jehova ná ndụ anyị niile.
NA-EMETA NDỊ EZIGBO MMADỤ ENYI
3. Olee otú Jehoyada bụ́ nnukwu onye nchụàjà si nyere Eze Jehoash aka ime ihe dị mma?
3 Na-eme ihe ndị dị mma Jehoash mere. Mgbe Eze Jehoash dị obere, o mere ihe dị mma. Ebe ọ bụ na o nweghịzi nna, o mere ihe Jehoyada gwara ya mee. Jehoyada bụ nnukwu onye nchụàjà na-erubere Jehova isi. Ọ zụrụ Jehoash ma kụziere ya gbasara Jehova ka à ga-asị na ọ bụ nwa ya. Aka ahụ Jehoyada nyeere ya mere ka o kpebie ife Jehova, nyekwara ndị Izrel aka ka ha fee Jehova. Jehoash medịrị ka a rụzie ụlọ nsọ Jehova.—2 Ihe 24:1, 2, 4, 13, 14.
4. Olee uru iji iwu Jehova kpọrọ ihe na-abara anyị? (Ilu 2:1, 10-12)
4 Ọ bụrụ na e nwere onye na-akụziri gị ịhụ Jehova n’anya na ịna-eme ihe ọ chọrọ, onye ahụ na-enye gị onyinye bara ezigbo uru. (Gụọ Ilu 2:1, 10-12.) Ndị nne na nna nwere ike isi ọtụtụ ụzọ zụọ ụmụ ha. Legodị otú nna otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Katya si nyere ya aka ikpebi ihe ndị dị mma. Ka papa nwanna nwaanyị a na-ebuga ya ụlọ akwụkwọ kwa ụbọchị, ya na ya na-ekwurịta ihe mmụta dịịrị ụbọchị. Nwanna nwaanyị ahụ sịrị: “Mkparịta ụka ndị ahụ nyeere m aka ime ihe ndị dị mma ma ọnwụnwa bịara m n’ụbọchị ahụ.” Ọ bụrụ na i chere na ihe nne na nna gị na-agwa gị anaghị ekwe gị megharịa ahụ́, gịnị ga-enyere gị aka irubere ha isi? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Anastasia chetara na nne na nna ya na-ewepụta oge kọwaara ya ihe mere ha ji eme iwu ụfọdụ n’ụlọ ha. Ọ sịrị: “Ihe a ha na-eme na-enyere m aka ịghọta na ihe mere ha ji eme iwu ndị ahụ abụghị ka ha na-atụrụ m ụka, kama na ọ bụ iji chebe m n’ihi na ha hụrụ m n’anya.”
5. Olee otú ihe ndị ị na-eme si agbasa ma ndị mụrụ gị ma Jehova? (Ilu 22:6; 23:15, 24, 25)
5 Ọ bụrụ na ị na-eme ihe nne na nna gị ji Baịbụl na-akụziri gị, obi ga-adị ha ụtọ. Nke ka nke bụ na ị ga na-eme Chineke obi ụtọ, gị na ya adịkwuokwa ná mma. (Gụọ Ilu 22:6; 23:15, 24, 25.) Ọ̀ bụ na ihe a abụghị ezigbo ihe mere ị ga-eji na-eme ihe dị mma Jehoash mere mgbe ọ dị obere?
6. Olee ndị Jehoash malitere ige ntị mgbe Jehoyada nwụrụ, oleekwa ihe ọ kpataara ya? (2 Ihe E Mere 24:17, 18)
6 Mụta ihe n’ihe ndị na-adịghị mma Jehoash mere. Mgbe Jehoyada nwụchara, Jehoash metara ndị na-abụghị ndị ezigbo mmadụ enyi. (Gụọ 2 Ihe E Mere 24:17, 18.) Ọ malitere ige ntị na ndụmọdụ ndị isi ndị Juda bụ́ ndị na-ahụghị Jehova n’anya nyere ya. Ọ ga-abụ na i kwetara na ọ gaara akara Jehoash mma ma ọ bụrụ na o zeere ndị ahụ n’ihi na ha na-eme ihe na-adịghị mma. (Ilu 1:10) Kama ime otú ahụ, o gere ndụmọdụ ọjọọ ha nyere ya ntị. Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe Zekaraya nwa nwanne nna Jehoash chọrọ ịgbazi ya, Jehoash nyedịrị iwu, e gbuo ya. (2 Ihe 24:20, 21; Mat. 23:35) Ihe ahụ o mere jọgburu onwe ya, bụrụkwa ịda iberiibe. Jehoash malitere ime nke ọma mgbe ọ dị obere. Ma, o mechara kwụsị ife Jehova, ghọọkwa ogbu mmadụ. N’ikpeazụ, ndị na-ejere ya ozi gburu ya. (2 Ihe 24:22-25) Ihe gaara akara ya mma ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ige Jehova na ndị hụrụ Jehova n’anya ntị. Olee ihe ị mụtara n’akụkọ a?
7. Olee ndị i kwesịrị imeta enyi? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
7 Otu ihe anyị na-amụta n’ihe na-adịghị mma Jehoash mere bụ na ndị anyị kwesịrị imeta enyi bụ ndị ezigbo mmadụ hụrụ Jehova n’anya, nakwa ndị chọrọ ịna-eme ya obi ụtọ. Ọ bụghị naanị ndị ọgbọ anyị ka anyị kwesịrị ịna-emeta enyi. Cheta na Jehoyada tọgburu Jehoash bụ́ enyi ya atọgbu. A bịa n’ihe gbasara ndị ị na-emeta enyi, jụọ onwe gị, sị: ‘Hà na-enyere m aka ka okwukwe m nwere na Jehova sikwuo ike? Hà na-agba m ume ịna-eme ihe Jehova chọrọ? Hà na-ekwu gbasara Jehova na eziokwu ndị ọ na-akụziri anyị? Hà ji iwu Jehova kpọrọ ihe? Hà na-agwa m ihe m chọrọ ịnụ, ka hà na-akata obi gbazie m ma m mewe ihe na-adịghị mma?’ (Ilu 27:5, 6, 17) N’eziokwu, ọ bụrụ na ndị enyi gị ahụghị Jehova n’anya, gị na ha ekwesịghị ịbụ enyi. Ma, ọ bụrụ na ndị enyi gị hụrụ Jehova n’anya, jisie ha ike. Ha ga na-enyere gị aka.—Ilu 13:20.
8. Ọ bụrụ na gị na ndị ọzọ na-esi n’Ịntanet akparịta, gịnị ka i kwesịrị ichebara echiche?
8 Taa, e nwere ọtụtụ ụzọ dị mma anyị na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị nwere ike isi na-akparịta n’Ịntanet. Ma, ọtụtụ ndị na-esi ebe ahụ egosi ndị ọzọ ihe ha nwere. Ha na-etinye foto na vidio ihe ha mere ma ọ bụ ihe ha zụtara. Ọ bụrụ na gị na ndị mmadụ na-esi n’Ịntanet akparịta, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ chọrọ iji ya gosi ụwa niile ihe m nwere? M̀ chọrọ iji ya na-agba ndị mmadụ ume, ka ọ̀ bụ iji ya mee ka ha towe m? Èchewela m echiche na-adịghị mma, ma ọ bụ na-ekwu okwu na-adịghị mma, ma ọ bụ na-eme ihe na-adịghị mma ndị ọzọ na-esi n’Ịntanet akparịta ụka na-eme?’ Nwanna Nathan Knorr, onye sobu n’Òtù Na-achị Isi, nyere ndụmọdụ, sị: “Agbalịla ime ihe dị ndị mmadụ mma. I mee otú ahụ, e nweghị onye ị ga-eme ihe dị ya mma. Mee ihe dị Jehova mma. Ị ga-eme ihe dị ndị niile hụrụ Jehova n’anya mma.”
ANYỊ KWESỊRỊ ỊDỊ UMEALA N’OBI
9. Gịnị ka Jehova nyeere Ọzaya aka ime? (2 Ihe E Mere 26:1-5)
9 Na-eme ihe ọma Ọzaya mere. Mgbe Eze Ọzaya na-eto eto, ọ dị umeala n’obi. Ọ mụtara “ịtụ egwu Chineke.” Ọ dịrị ndụ afọ iri isii na asatọ. Jehova gọziri ya n’ọtụtụ n’ime afọ ndị ahụ. (Gụọ 2 Ihe E Mere 26:1-5.) Ọzaya meriri ọtụtụ ndị iro ha, meekwa ka e chebe Jeruselem. (2 Ihe 26:6-15) O doro anya na obi dị Ọzaya ụtọ maka ihe niile Chineke nyeere ya aka ime.—Ekli. 3:12, 13.
10 Gịnị mere Ọzaya?
10 Mụta ihe n’ihe na-adịghị mma Ọzaya mere. Ọ bụ Eze Ọzaya na-agwa ndị ọzọ ihe ha ga-eme. O nwere ike ịbụ na ihe ahụ mere ka o chee na o nwere ike ime ihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Otu ụbọchị, mpako mere ka Ọzaya banye n’ụlọ nsọ Jehova ka ọ mụnye insens ọkụ. E nyeghị ndị eze ikike ime ihe ahụ. (2 Ihe 26:16-18) Nnukwu onye nchụàjà bụ́ Azaraya gbalịrị ịgbazi Ọzaya, ma ezigbo iwe were ya. Ọ dị mwute na Ọzaya erubereghị Jehova isi, Jehova ataakwa ya ahụhụ maka ya mee ka ọ rịawa ekpenta. (2 Ihe 26:19-21) Ndụ ya gaara aka mma ma a sị na ọ kwụsịghị ịdị umeala n’obi.
11 Olee ihe nwere ike igosi ma ànyị dị umeala n’obi? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
11 Mgbe Ọzaya siri ike, o chefuru na ọ bụ Jehova mere ka o sie ike, meekwa ka ihe na-agaziri ya. Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Anyị kwesịrị ịna-echeta mgbe niile na ọ bụ Jehova mere ka anyị nwee ihe ọma niile anyị nwere nakwa ọrụ anyị na-arụrụ ya n’ọgbakọ ya. Kama iji ihe anyị na-arụ na-anya isi, anyị kwesịrị inye Jehova otuto maka ihe ọ bụla anyị mere. b (1 Kọr. 4:7) Anyị kwesịrị ịna-echeta mgbe niile na anyị ezughị okè nakwa na e kwesịrị ịna-agbazi anyị. Otu nwanna dị ihe dị ka afọ iri isii dere, sị: “M mụtala ịghara ịna-ewe iwe ma ọ bụ ịda mbà ma ndị mmadụ chọpụta ihe m na-emetaghị. Mgbe ọ bụla a gbaziri m maka ihe na-adịghị mma m mere, m na-agbalị imewekwa nke ọma, na-enyekwa Jehova ihe niile m nwere ike inye ya.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na anyị ana-atụ egwu Jehova, dịrị umeala n’obi, anyị ga na-enwe obi ụtọ ná ndụ.—Ilu 22:4.
AKWỤSỊLA ỊCHỌ JEHOVA
12 Olee otú Josaya si chọọ Jehova mgbe ọ na-eto eto? (2 Ihe E Mere 34:1-3)
12 Mụta ihe n’ihe ọma Josaya mere. Josaya dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchọ Jehova. Ọ chọrọ ịmata gbasara Jehova, chọọkwa ime uche ya. Ma, ọ dịrịghị ya mfe n’oge ahụ ọ na-eto eto. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị na-ekpere arụsị. N’ihi ya, Josaya kwesịrị inwe obi ike iji kwụsị ha ife arụsị. O mekwaranụ otú ahụ. Tupu Josaya eruo afọ iri abụọ, ọ malitere iwepụsị arụsị niile dị n’obodo ha.—Gụọ 2 Ihe E Mere 34:1-3.
13 Olee otú ndụ gị ga-esi gbanwee ma i nyefee Jehova onwe gị?
13 Ọ bụrụgodị na ị ka na-eto eto, i nwere ike ikpebi ime ka Josaya. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-achọ Jehova, na-amụtakwa àgwà ndị magburu onwe ha o nwere. I mee otú ahụ, ị ga-achọ inyefe Jehova onwe gị. Olee otú ọ ga-esi gbasa ihe ị na-eme ná ndụ? Otu nwanna aha ya bụ Luke mere baptizim mgbe ọ dị afọ iri na anọ. Ọ sịrị: “Malite ugbu a, ihe ga-akacha m mkpa ná ndụ bụ ife Jehova nakwa ime ya obi ụtọ.” (Mak 12:30) Jehova ga-agọzi gị ma ọ bụrụ na ị chọọ ime otú ahụ.
14 Mee ihe atụ otú ụfọdụ ndị na-eto eto si eme ka Eze Josaya?
14 Olee ihe ndị nwere ike isiri ohu Jehova na-eto eto ike? Otu nwanna aha ya bụ Johan mere baptizim mgbe ọ dị afọ iri na abụọ. O kwuru otú ndị klas ha si gbalịa ime ka ọ ṅụwa sịga ọgbara ọhụrụ. Ihe nyeere Johan aka imeri ọnwụnwa ahụ bụ na ọ na-echetara onwe ya na ime ihe ahụ nwere ike ịkpatara ya ọrịa, meekwa ka ya na Jehova gharazie ịdị ná mma. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Rachel mere baptizim mgbe ọ dị afọ iri na anọ. O kwuru ihe nyeere ya aka imeri nsogbu ndị o nwere n’ụlọ akwụkwọ. Ọ sịrị: “M na-agbalị ịchọta ihe ga na-echetara m gbasara Baịbụl na Jehova. Dị ka ihe atụ, a kụziwere anyị gbasara ihe ndị mere n’oge ochie, o nwere ike ichetara m akụkọ Baịbụl ma ọ bụ amụma e dere na Baịbụl. Ụka mụ na mmadụ na-akparịta nwekwara ike ichetara m amaokwu Baịbụl m nwere ike ịgụrụ ya.” Nsogbu ndị nke gịnwa nwere ike ịdị iche ná ndị nke Eze Josaya. Mana, i nwere ike ịkpa àgwà ka onye ma ihe, rubekwara Jehova isi, ka ya. Imeri nsogbu ndị na-abịara gị mgbe ị na-eto eto ga-eme ka i nwee ike imeri nsogbu ndị nwere ike ịbịara gị n’ọdịnihu.
15 Gịnị nyeere Josaya aka iji obi ya niile fee Jehova? (2 Ihe E Mere 34:14, 18-21)
15 Mgbe Eze Josaya gbara afọ iri abụọ na isii, ọ malitere ịrụzi ụlọ nsọ. Ka a na-arụ ọrụ ahụ, a hụrụ “akwụkwọ e dere Iwu Jehova si n’aka Mosis nye.” Mgbe Josaya nụrụ ihe e kwuru na ya, ọ malitere ozugbo ịgbanwe ihe iji mee ihe e dere na ya. (Gụọ 2 Ihe E Mere 34:14, 18-21.) Ị̀ ga-achọ ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị? Ọ bụrụ na ị malitela ịgụ ya, ọ̀ na-atọ gị ụtọ? Ị̀ na-ede amaokwu Baịbụl ndị i chere ga-abara gị uru? Nwanna Luke anyị kwuburu okwu ya nwere akwụkwọ ọ na-ede ihe ndị masịrị ya ọ gụtara na Baịbụl. Ime ụdị ihe ahụ ga-enyere gị aka icheta amaokwu Baịbụl ma ọ bụ ihe ndị masịrị gị mgbe ị na-agụ Baịbụl. Ka ị na-amụtakwu Baịbụl ma jiri ya kpọrọkwuo ihe, ọ ga-eme ka ị chọkwuo ife Jehova. Okwu Chineke ga-enyekwara gị aka ime ihe dị mma otú ahụ o nyeere Eze Josaya aka.
16 Gịnị mere Josaya ji mee ihe dị oké njọ? Gịnị ka anyị ga-amụta na ya?
16 Mụta ihe n’ihe na-adịghị mma Josaya mere. Mgbe Josaya dị ihe dị ka afọ iri atọ na itoolu, o mejọrọ ihe tara isi ya. Ọ tụkwasịrị onwe ya obi kama ịrịọ Jehova ka o duzie ya. (2 Ihe 35:20-25) E nwere ihe anyị ga-amụta na ya. N’agbanyeghị afọ ole anyị dị ma ọ bụ afọ ole anyị mụrụla Baịbụl, anyị ekwesịghị ịkwụsị ịchọ Jehova. Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga na-ekpe ekpere mgbe niile na-arịọ Jehova ka o duzie anyị, na-amụ Baịbụl, na-egekwa ntị na ndụmọdụ Ndị Kraịst ma nke a na-akọ na-enye anyị. Ime ihe ndị a nwere ike ime ka anyị ghara ime ihe dị oké njọ, meekwa ka anyị na-enwe obi ụtọ.—Jems 1:25.
NDỊ NA-ETO ETO, UNU NWERE IKE ỊNA-ENWE OBI ỤTỌ NÁ NDỤ
17 Olee ihe ndị dị mkpa anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ ndị eze Juda atọ ahụ?
17 E nwere ọtụtụ ihe unu nwere ike ime mgbe unu na-eto eto. Akụkọ Jehoash, Ọzaya, na Josaya na-egosi na ndị na-eto eto nwere ike ikpebi ime ihe dị mma, jirikwa ndụ ha mee ihe ndị na-amasị Jehova. Ọ bụ eziokwu na mgbe ndị eze ndị a na-eto eto, ha mejọrọ ihe mechara kpatara ha nsogbu, ma ọ bụrụ na i mee ihe ọma ndị ha mere ma zere ihe na-adịghị mma ha mere, i nwekwara ike inwe obi ụtọ ná ndụ.
18 Olee ihe ndị a kọrọ na Baịbụl gosiri na i nwere ike ịna-enwe obi ụtọ ná ndụ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
18 Na Baịbụl, a kọrọ gbasara ndị na-eto eto ndị ọzọ bịaruru Jehova nso, ha na ya adịrị ná mma, ihe agaziekwara ha ná ndụ. Devid bụ otu n’ime ha. Mgbe ọ ka na-eto eto, ọ họọrọ ife Jehova. Mgbe o mechakwara bụrụ eze, o rubeere Jehova isi. Ọ bụ eziokwu na o nwere mgbe ụfọdụ o mejọrọ ihe, ma Jehova kpọrọ ya ezigbo mmadụ. (1 Eze 3:6; 9:4, 5; 14:8) Ọ bụrụ na ị mụọ gbasara Devid, ihe o mere ga-agba gị ume iji obi gị niile na-efe Jehova. I nwekwara ike ịmụ gbasara Mak ma ọ bụ Timoti. Ị ga-ahụ na ha bidoro ife Jehova mgbe ha na-eto eto, ya emee ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ha mere Jehova obi ụtọ, ihe agaziekwara ha.
19 Olee otú ndụ gị nwere ike ịdị n’ọdịnihu?
19 Otú i si ebi ndụ gị ugbu a nwere ike ime ka ihe dịrị gị mma n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Jehova obi ugbu a kama ịtụkwasị onwe gị obi, ọ ga-enyere gị aka ikpebi ihe ndị dị mma. (Ilu 20:24) I nwere ike ịna-enwe obi ụtọ ná ndụ, ndụ gị abaakwara gị uru. Cheta na Jehova ji ihe ị na-emere ya kpọrọ ihe. O nweghị ihe dị mma ị ga-eji ndụ gị eme karịa ife Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya.
ABỤ NKE 144 Lekwasị Anya n’Ụgwọ Ọrụ
a Ndị na-eto eto, Jehova ma na mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri unu ike ime ihe dị mma nakwa ihe ga-eme ka unu na ya dịrị ná mma. Olee otú unu nwere ike isi kpebie ihe ndị ga-eme Nna unu nke eluigwe obi ụtọ? Anyị ga-eleba anya n’akụkọ ụmụ nwoke atọ ghọrọ eze Juda mgbe ha dị obere. Ka anyị hụ ihe unu ga-amụta n’ihe ndị ha mere.
b Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Kpachara Anya Ka Ị Ghara Ịna-eme Ka Ị̀ Dị Umeala n’Obi, ma Ya Abụrụ na Ị Na-etu Ọnụ,” nke gbara na jw.org n’isiokwu bụ́ “Mmadụ Ịna-agba Mbọ Ka A Mara Ya Amara n’Ịntanet Ọ̀ Bara Uru?”