ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 37
Tụkwasị Jehova Obi Ka Samsịn
“Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, biko, cheta m, . . . nye m ike.”—IKPE 16:28.
ABỤ NKE 30 Nna M, Chineke M na Enyi M
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1-2. Gịnị mere o ji dị mma ka anyị mụọ akụkọ Samsịn?
GỊNỊ na-agbata gị n’obi ma ị nụ aha ahụ bụ́ Samsịn? O nwere ike ịbụ na ị na-echeta nwoke siri ezigbo ike. Ọ bụ eziokwu. Mana, e nwere mgbe Samsịn kpebiri ihe na-adịghị mma, ya akpatara ya nnukwu nsogbu. Ma, Jehova lekwasịrị anya n’ihe ọma niile Samsịn mere. Ọ bụkwa ihe o mere ka e dee na Baịbụl ka o nwee ike baara anyị uru.
2 Jehova ji Samsịn mee ọtụtụ ihe dị ịtụnanya iji nyere ndị ya bụ́ ndị Izrel aka. Mgbe ọtụtụ narị afọ gara Samsịn nwụchara, Jehova ji mmụọ nsọ mee ka Pọl onyeozi dee aha Samsịn mgbe ọ na-ede ndị nwere ezigbo okwukwe. (Hib. 11:32-34) Ihe Samsịn mere nwere ike ịgba anyị ume. Ọ tụkwasịrị Jehova obi, ma mgbe ihe siiri ya ike. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu gbasara ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Samsịn nakwa otú ihe o mere nwere ike isi gbaa anyị ume.
SAMSỊN TỤKWASỊRỊ JEHOVA OBI
3. Olee ọrụ Chineke nyere Samsịn?
3 Mgbe a mụrụ Samsịn, ndị Filistia na-achị ndị Izrel, na-emegbukwa ha. (Ikpe 13:1) Ndị Izrel tara ezigbo ahụhụ n’ihi otú ndị Filistia si emekpọ ha ọnụ. Jehova họọrọ Samsịn ka ‘ọ malite ịzọpụta ndị Izrel n’aka ndị Filistia.’ (Ikpe 13:5) Ma, ọrụ a siri ezigbo ike. Samsịn kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi iji rụọ ọrụ a o nyere ya.
4. Olee otú Jehova si napụta Samsịn n’aka ndị Filistia? (Ndị Ikpe 15:14-16)
4 Ka anyị legodị ihe gosiri otú Samsịn si tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere ya aka ma kwado ya. N’otu oge, ndị agha ndị Filistia bịara ijide Samsịn na Lihaị. O nwere ike ịbụ na Lihaị dị na Juda. Ndị Juda tụrụ ezigbo egwu. N’ihi ya, ha kpebiri ịkpọrọ Samsịn kpọnye ndị iro ya. Ndị obodo Samsịn ji ụdọ ọhụrụ abụọ kee Samsịn ma kpọpụta ya, kpọnye ya ndị Filistia. (Ikpe 15:9-13) Ma, ‘mmụọ Jehova mere ka ọ dị ike,’ mee ka ụdọ ahụ e ji kee ya dọbisịa. ‘Ọ hụziri ọkpụkpụ agba oké jakị nke na-akpọbeghị nkụ,’ were ya kụgbuo otu puku (1,000) ụmụ nwoke ndị Filistia.—Gụọ Ndị Ikpe 15:14-16.
5. Olee otú Samsịn si gosi na ọ tụkwasịrị Jehova obi?
5 Gịnị mere Samsịn ji were ọkpụkpụ agba jakị? Ihe ahụ abụtụdịghị ihe e ji alụ agha. Ma, o doro anya na Samsịn ma na ọ bụghị ngwá agha o ji lụso ndị Filistia agha ga-enyere ya aka imeri, kama ọ bụ ma Jehova nyere ya aka. N’eziokwu, nwoke a na-erubere Jehova isi ji ihe ruru ya aka mee uche Jehova. O doro anya na ihe mere Samsịn ji merie ndị Filistia bụ na ọ tụkwasịrị Jehova obi.
6. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Samsịn ma anyị na-arụ ọrụ ndị e nyere anyị n’ọgbakọ?
6 Jehova nwekwara ike inye anyị ike anyị ga-eji mee ihe ọ bụla ọ gwara anyị ka anyị mee, ọ bụrụgodị na o yie ihe na-agaghị ekwe omume. Otú Jehova nwere ike isi eme ya nwere ike ịtụ anyị n’anya. Obi sie gị ike na Jehova ga-enyere gị aka ime uche ya otú ahụ o nyeere Samsịn, ma ọ bụrụhaala na ị tụkwasị ya obi na ọ ga-enyere gị aka.—Ilu 16:3.
7. Olee ihe atụ gosiri na anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka ọ na-eduzi anyị?
7 Ọtụtụ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị, ndị na-eso arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova, egosila na ha tụkwasịrị Jehova obi. N’oge gara aga, ọ bụ ụmụnna anyị na-ese ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na ụlọ ndị ọzọ a na-arụ ná nzukọ Jehova, rụọkwa ha. Ma, ka oge na-aga, nzukọ Jehova gbanwere ihe n’ihi na ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ. Ụmụnna ndị na-eduzi nzukọ Jehova kpere ekpere ka Jehova duzie ha. Ha gbalịkwara isi n’ụzọ ọhụrụ eme ya. Dị ka ihe atụ, ha malitere ịzụ ụlọ ndị a rụrụ arụ na ịrụzigharị ha. Otu nwanna aha ya bụ Robert esorola rụọ ọtụtụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova n’ebe niile n’ụwa n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Ọ sịrị: “Na mbụ, ọ dịrịghị ụfọdụ ụmụnna mfe ịnabata ụzọ ọhụrụ a.” Ọ sịkwara: “Ọ dị ezigbo iche n’ihe anyị na-eme kemgbe ọtụtụ afọ. Ma, ụmụnna dị njikere ịnabata mgbanwe ndị ahụ. O dokwara anya na Jehova gọziri mgbanwe ndị ahụ.” Ihe a bụ otu ihe atụ gosiri otú Jehova si eduzi ndị ya ime uche ya. Anyị niile kwesịrị ịna-eme anyị nọtụ, anyị ajụọ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-achọ ka Jehova duzie m, dịkwa njikere ịgbanwe ihe ụfọdụ ka m nwee ike na-efe ya otú kacha mma?’
SAMSỊN JI IHE JEHOVA NYERE YA MEE IHE BARA URU
8. N’otu oge ezigbo mmiri malitere ịgụ Samsịn, gịnị ka o mere?
8 O nwere ike ịbụ na ị gụọla ihe ndị ọzọ dị ịtụnanya Samsịn mere. O gburu ọdụm, mechaakwa gbuo ndị Filistia iri atọ n’Ashkelọn n’enweghị onye nyeere ya aka. (Ikpe 14:5, 6, 19) Samsịn ma na ọ gaghị emeli ụdị ihe ahụ ma ọ bụrụ na Jehova enyereghị ya aka. Ihe gosiri na ihe a bụ eziokwu bụ ihe o mere n’otu oge ezigbo mmiri nọ na-agụ ya mgbe o gbuchara otu puku ndị Filistia. Gịnị ka o mere? Kama ịtụkwasị onwe ya obi, chọwa otú ọ ga-esi nweta mmiri ọ ga-aṅụ, ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka.—Ikpe 15:18.
9. Gịnị ka Jehova mere mgbe Samsịn kpere ekpere rịọ ya ka o nyere ya aka? (Ndị Ikpe 15:19)
9 Jehova zara ekpere Samsịn, rụọ ọrụ ebube mee ka o nweta mmiri. Mgbe Samsịn ṅụchara mmiri ahụ, “ike ya lọghachiri, ya enweta onwe ya.” (Gụọ Ndị Ikpe 15:19.) Ọ ga-abụ na iyi ọhụrụ a ka dị mgbe ọtụtụ afọ gachara, ya bụ, mgbe Samuel onye amụma si n’ike mmụọ nsọ dee akwụkwọ Ndị Ikpe. Ọ ga-abụ na ndị Izrel hụ iyi a, ha na-echeta na Jehova ga-enyere ndị ji obi ha niile na-efe ya aka mgbe ihe siiri ha ike ma ọ bụrụ na ha atụkwasị ya obi.
10 Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka Jehova nyere anyị aka? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
10 Anyịnwa kwesịkwara ịtụkwasị Jehova obi ka o nyere anyị aka n’agbanyeghị nkà ndị anyị nwere ma ọ bụkwanụ ihe ndị anyị rụrụ n’ozi ya. Anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma kweta na naanị ihe ga-enyere anyị aka ịrụ ihe Jehova chọrọ ka anyị rụọ bụ ma anyị tụkwasị ya obi. Otú ahụ Samsịn si nweta ike mgbe ọ ṅụchara mmiri Jehova nyere ya, anyịnwa ga-enwetakwa ike anyị ga-eji na-efe Jehova ma ọ bụrụ na anyị ejiri ihe niile Jehova na-ewepụtara anyị na-eme ka okwukwe anyị sie ike.—Mat. 11:28.
11 Olee otú anyị nwere ike isi tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere anyị aka? Mee ihe atụ.
11 Chegodị banyere otu nwanna aha ya bụ Aleksey bụ́ onye Rọshịa. A na-akpagbu ya mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. Gịnị nyeere ya aka ịna-erubere Jehova isi n’oge a ihe siiri ya ezigbo ike? Ya na nwunye ya na-amụchi Baịbụl anya, na-emekwa ihe ndị ọzọ gbasara ofufe Chineke. Ọ sịrị: “M na-agbalị na-amụ ihe n’onwe m, na-agụkwa Baịbụl kwa ụbọchị. N’ụtụtụ ọ bụla, mụ na nwunye m na-agụkọ ihe mmụta dịịrị ụbọchị ọnụ, na-ekpekọkwa ekpere ọnụ.” Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi kama ịtụkwasị onwe anyị obi. Olee otú anyị ga-esi mee ya? Ọ bụ ịna-eme ihe ndị ga-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike, ihe ndị dị ka ịna-amụchi ihe anya na ịna-eme ihe ndị ọzọ gbasara ofufe Jehova. Jehova ga-agọzikwa mbọ niile anyị na-agba ife ya. O mere ka Samsịn dị ike, ọ ga-emelikwa ka anyịnwa dị ike.
SAMSỊN AKWỤSỊGHỊ IME UCHE JEHOVA
12 Olee ihe mere adịm ná mma Samsịn na Delaịla ji dị iche na nke ya na ụmụ nwaanyị Filistia?
12 Samsịn ezughị okè otú anyịnwa na-ezughị. N’ihi ya, o mere ihe na-adịghị mma mgbe ụfọdụ. Otú n’ime ha kpataara ya ezigbo nsogbu. Mgbe Samsịn bụrụla onye ikpe ruo oge ụfọdụ, “ọ hụrụ otu nwaanyị bi na Ndagwurugwu Sorek n’anya. Aha nwaanyị ahụ bụ Delaịla.” (Ikpe 16:4) Tupu mgbe ahụ, Samsịn ekwela otu nwaanyị Filistia nkwa na ọ ga-alụ ya. Ma nke ahụ “si n’aka Jehova, n’ihi na ọ na-achọ ohere ọ ga-eji mee ndị Filistia ihe.” Mgbe e mechara, Samsịn biri n’ụlọ otu onye akwụna na Gaza bụ́ otu obodo ndị Filistia. N’oge ahụ, Chineke nyere Samsịn ike, ya eburu ibo ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, nke mere ka obodo ahụ gharazie isi ike. (Ikpe 14:1-4; 16:1-3) Ma, o yiri ka Delaịla ọ̀ bụ onye Izrel. N’ihi ya, adịm ná mma ya na Samsịn abụghị iji nweta ohere luso ndị Filistia ọgụ.
13 Gịnị ka Delaịla mere Samsịn?
13 Delaịla natara ndị Filistia nnukwu ego iji resị ha Samsịn. Ọ ga-abụ na Samsịn hụrụ Delaịla n’anya nke ukwuu nke mere na ọ chọpụtaghị ihe Delaịla chọrọ ime ya. Delaịla nyere Samsịn nsogbu ọtụtụ ugboro ka ọ gwa ya ebe ike ya si. N’ikpeazụ, ọ gwara ya. Ọ dị mwute na Samsịn kwere ka nwaanyị ahụ tinye ya ná nsogbu nke mere ka ọ gharazie ịdị ike, meekwa ka ya na Jehova gharazie ịdị ná mma ruo oge ụfọdụ.—Ikpe 16:16-20.
14 Gịnị mere Samsịn n’ihi na ọ tụkwasịrị Delaịla obi?
14 Ọtụtụ ihe ọjọọ mere Samsịn n’ihi na ọ tụkwasịrị Delaịla obi kama ịtụkwasị Jehova obi. Ndị Filistia jidere Samsịn, ghụpụ ya anya. Ha tụrụ ya mkpọrọ na Gaza bụ́ ebe ahụ o gburu ọtụtụ n’ime ha n’oge gara aga. Ha mekwara ka ọ bụrụ ohu na-egwere ha ọka. Ndị Filistia mechakwara kpụpụta ya ebe ha gbakọrọ ka ha menye ya ihere ebe ha na-eme ememme. Ha chụụrụ arụsị ha bụ́ Degọn nnukwu àjà ka à ga-asị na ọ bụ ya mere ka ha jide Samsịn. Ha kpọpụtara Samsịn n’ụlọ mkpọrọ ka ọ bịa ebe ahụ ka ha “jiri ya metụ ihe ọchị.”—Ikpe 16:21-25.
15 Olee otú Samsịn si gosi na o bidokwala ịtụkwasị Jehova obi? (Ndị Ikpe 16:28-30) (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)
15 Samsịn mere ihe dị oké njọ, ma ọ kwụsịghị ife Jehova. Ọ chọtara ohere ọ ga-eji rụọ ọrụ Jehova chọrọ ka ọ rụọ, ya bụ, ibibi ndị Filistia. (Gụọ Ndị Ikpe 16:28-30.) Samsịn rịọrọ Jehova, sị: “Ka m bọọ ọbọ n’isi ndị Filistia.” Ezi Chineke zara ekpere ya, ma rụọ ọrụ ebube mee ka ọ dịkwa ike ọzọ. Ihe ahụ mere ka Samsịn gbuo ọtụtụ ndị Filistia n’oge ahụ karịa otú o gbutụrụla.
16 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Samsịn mejọrọ?
16 Ọ bụ eziokwu na e nwere ihe ụfọdụ na-adịghị mma mere Samsịn n’ihi ihe o mejọrọ, ọ kwụsịghị ịgbalị ime uche Jehova. Ọ bụrụgodị na anyị emejọọ ihe, a dọọ anyị aka ná ntị ma ọ bụ kwụsị anyị ọrụ ụfọdụ anyị na-arụ, anyị ekwesịghị ịkwụsị ife Jehova. Cheta na Jehova dị njikere ịgbaghara anyị. (Ọma 103:8-10) N’agbanyeghị ihe anyị mejọrọ, anyị ka nwere ike ịbara Jehova uru otú ahụ Samsịn mere.
17-18. Gịnị mere akụkọ Nwanna Michael ji gbaa gị ume? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
17 Legodị akụkọ otu nwanna na-eto eto aha ya bụ Michael. Ọ nọ na-agba ezigbo mbọ n’ozi Jehova. Ọ bụ ohu na-eje ozi na ọsụ ụzọ oge niile. Ma ọ dị mwute na o nwere ihe o mejọrọ nke mere ka a napụ ya ọrụ ndị ahụ ọ na-arụ n’ọgbakọ. Ọ sịrị: “Tupu ihe ahụ emee, m na-eme nnọọ nke ọma n’ofufe Jehova. Ma, na mberede, ọ bịaziri dị m ka o nweghị ihe ọ bụla m ga-emeli n’ozi Jehova. O nwebeghị mgbe m chere na Jehova ga-ahapụ m. Ma ọ na-abụ m nọtụ, mụ ana-eche ma mụ na ya ànyị ka ga-adị ná mma otú anyị dịbụ nakwa ma m̀ ka ga-enwe ike ịrụrụ ya ihe ndị ahụ m na-arụburu ya n’ọgbakọ.”
18 Ọ dị ezigbo mma na Michael akwụsịghị ife Jehova. Ọ sịrị: “M gbasiri mbọ ike ka mụ na Jehova dịwakwa ná mma. Otú m si mee ya bụ ịna-ekpechi ekpere anya, ịna-amụ ihe, na ịna-atụgharị uche n’ihe m na-amụ.” Michael mechakwara mewe nke ọma n’ọgbakọ. Ugbu a, ọ bụ okenye na ọsụ ụzọ oge niile. Ọ sịrị: “Ụmụnna nọ n’ọgbakọ, karịchaa ndị okenye, gbara m ume, kwadokwa m. O mere ka m mata na Jehova ka hụrụ m n’anya. Ejewekwala m ozi n’ọgbakọ ma nwee akọnuche dị ọcha. Ihe a mere m akụzierela m na Jehova ga-agbaghara onye ọ bụla ji obi ya niile chegharịa.” Ka obi sie anyị ike na Jehova ga-eji anyị na-arụ ọrụ, gọziekwa anyị, ọ bụrụgodị na anyị mejọrọ ihe n’oge gara aga, ma ọ bụrụhaala na anyị na-agbasi mbọ ike ịgbanwe, na-atụkwasịkwa ya obi.—Ọma 86:5; Ilu 28:13.
19 Olee otú akụkọ Samsịn si mee ka ị dị ike?
19 N’isiokwu a, anyị ekwuola ihe ole na ole magburu onwe ha mere ná ndụ Samsịn. O zughị okè, ma ọ kwụsịghị ịgba mbọ ife Jehova ma mgbe ọ gwachara Delaịla ihe ọ na-ekwesịghị ịgwa ya. Jehova akwụsịghịkwa iji ya arụ ọrụ. Chineke mechakwara jiri Samsịn rụọ nnukwu ihe. Jehova ka na-ele ya anya ka onye nwere ezigbo okwukwe. O mere ka e tinye aha ya ná ndị nwere okwukwe n’akwụkwọ Ndị Hibru isi 11. Ọ na-eme anyị ezigbo obi ụtọ ịmata na anyị na-efe Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya, onye ọ na-agụsikwa agụụ ike ime ka anyị dị ike, karịchaa, n’oge anyị na-adịghị ike. N’ihi ya, ka anyị rịọ Jehova ihe ahụ Samsịn rịọrọ ya. Ọ sịrị: “Cheta m, biko, Chineke, nye m ike.”—Ikpe 16:28.
ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị
a Ọtụtụ ndị ma gbasara Samsịn a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl, ma ndị na-amaghịdị Baịbụl nke ọma. E jirila akụkọ ya mee fim dị iche iche, gụọkwa egwú dị iche iche. Ma, akụkọ Samsịn abụghị naanị akụkọ na-atọ ụtọ. E nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka nwoke a nwere nnukwu okwukwe.