ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 38
ABỤ NKE 25 Ndị Pụrụ Iche nke Chineke
Ị̀ Na-ege Ntị n’Ịdọ Aka ná Ntị?
“A ga-akpọrọ otu onye, hapụ onye nke ọzọ.”—MAT. 24:40.
IHE A GA-AMỤ
Anyị ga-atụle ihe atụ atọ Jizọs mere ma kwuo otú ha si gbasa oge ikpe nke ga-adị ná ngwụcha ụwa ochie a.
1. Gịnị ka Jizọs ga-eme n’oge na-adịghị anya?
ANYỊ bi n’oge a na-enwe ọtụtụ mgbanwe. N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-ekpe onye ọ bụla dị ndụ ikpe. Jizọs kwuru ihe ndị ga-eme tupu oge ahụ ọ ga-ekpe ikpe eruo. O nyere ndị na-eso ụzọ ya “ihe àmà” nke ọnụnọ ya nakwa “nke ọgwụgwụ oge a.” (Mat. 24:3) E dere amụma a na Matiu isi 24 na nke 25 nakwa na Mak isi 13 na Luk isi 21.
2. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a? Gịnị mere ọ ga-eji enyere anyị aka?
2 Jizọs ji ihe atụ atọ o mere dọọ anyị aka ná ntị. Ha bụ ihe atụ gbasara atụrụ na ewu, ụmụ agbọghọ nwere uche na ndị nke dị nzuzu, na ihe atụ gbasara talent. Ihe atụ nke ọ bụla na-enyere anyị aka ịghọta na otú mmadụ si kpaa àgwà ga-ekpebi otú a ga-esi kpee ya ikpe. Ka anyị na-eleba anya n’ihe atụ ndị a, anyị ga-achọpụta ihe ndị anyị ga-amụta na ha nakwa otú anyị ga-esi eme ha. Ihe atụ nke mbụ anyị ga-eleba anya na ya bụ ihe atụ gbasara atụrụ na ewu.
ATỤRỤ NA EWU
3. Olee mgbe Jizọs ga-ekpe ndị mmadụ ikpe?
3 N’ihe atụ Jizọs mere gbasara atụrụ na ewu, o kwuru na a ga-eji ihe ndị mmadụ mere mgbe ha nụrụ ozi ọma nakwa otú ha si kwado ụmụnna ya e tere mmanụ kpee ha ikpe. (Mat. 25:31-46) N’oge “oké mkpagbu,” ọ ga-ekpe ikpe obere oge tupu agha Amagedọn. (Mat. 24:21) Otú ahụ onye ọzụzụ atụrụ si esi n’ebe ewu nọ họpụta atụrụ iche, Jizọs ga-eme ka ndị ji obi ha niile kwado ụmụnna ya e tere mmanụ nọrọ iche n’ebe ndị nke na-akwadoghị ha nọ.
4. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 11:3, 4, olee ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na Jizọs ga-ekpe ndị mmadụ ikpe ziri ezi? (Kọwaakwa foto.)
4 Amụma Baịbụl gosiri na Jizọs, bụ́ Onyeikpe Jehova họpụtara, ga-ekpe ikpe ziri ezi mgbe niile. (Gụọ Aịzaya 11:3, 4.) Ọ na-anụ ihe ndị mmadụ na-ekwu, na-ahụkwa ihe ha na-eme na ihe ha na-eche, ma otú ha si emeso ụmụnna ya e tere mmanụ. (Mat. 12:36, 37; 25:40) Jizọs ga-ama ndị kwadoro ụmụnna ya e tere mmanụ na ọrụ ha na-arụ. a Otu ụzọ dị ezigbo mkpa ndị yiri atụrụ si akwado ụmụnna Kraịst bụ inyere ha aka n’ikwusa ozi ọma. A ga-akpọ ndị si otú a kwado ụmụnna Kraịst “ndị ezi omume.” Ha ga-enwekwa olileanya inweta “ndụ ebighị ebi” n’ụwa. (Mat. 25:46; Mkpu. 7:16, 17) Ihe a bụ ụgwọ ọrụ magburu onwe ya na-echere ndị ji obi ha niile kwado ụmụnna Kraịst. Ọ bụrụ na ha ana-erubere Jehova isi n’oge oké mkpagbu nakwa mgbe ọ gachara, a ga-ede aha ha “n’akwụkwọ nke ndụ.”—Mkpu. 20:15.
5. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe atụ Jizọs mere gbasara atụrụ na ewu, oleekwa ndị ọ ga-abara uru?
5 Na-erubere Chineke isi. Ihe atụ Jizọs mere gbasara atụrụ na ewu kacha gbasa ndị nwere olileanya iketa ụwa. Otú ha si egosi na ha nwere okwukwe abụghị naanị inyere ụmụnna Kraịst aka n’ikwusa ozi ọma, kama ha na-ejikwa obi ha niile erube isi ná ntụziaka si n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, ndị Jizọs họpụtara. (Mat. 24:45) Ma, ndị nwere olileanya ịga eluigwe kwesịkwara ịmụta ihe n’aka ná ntị Jizọs ji ihe atụ a dọọ. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jizọs na-elerukwa ihe ha na-eme, ihe ha na-eche, na ihe ha na-ekwu anya nke ọma. Ha kwesịkwara ịna-erubere Jehova isi. Jizọs medịrị ihe atụ abụọ ọzọ o ji dọọ ndị e tere mmanụ aka ná ntị. E dekwara ihe atụ ndị a na Matiu isi 25. Ka anyị lebazie anya n’ihe atụ Jizọs mere gbasara ụmụ agbọghọ nwere uche na ndị nke dị nzuzu.
ỤMỤ AGBỌGHỌ NDỊ NWERE UCHE NA NDỊ NKE DỊ NZUZU
6. Olee otú ụmụ agbọghọ ise n’ime ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke si gosi na ha nwere uche? (Matiu 25:6-10)
6 N’ihe atụ Jizọs mere gbasara ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke, o kwuru na e nwere ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke gara ka ha zute nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ. (Mat. 25:1-4) Ha niile chọrọ iso ya gaa oriri agbamakwụkwọ. Jizọs kwuru na ise n’ime ha “nwere uche,” ise ndị nke ọzọ adịrị “nzuzu.” Ndị nke nwere uche jikeere ejike ma nọrọ na nche. Ha dị njikere ichere nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ ruo mgbe ọ bụla ọ bịara, ọ bụrụgodị n’ime abalị. N’ihi ya, ha ji mpanaka ha ga-eji ahụ ụzọ n’abalị. Ha jikwa mmanụ ọkụ ọzọ, a dịghị ama ama, nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ egbuo oge ịbịa. N’ihi ya, ha dị njikere ịna-agbanye mmanụ na mpanaka ha ka o nwee ike ịna-enwu. (Gụọ Matiu 25:6-10.) Mgbe nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bịarutere, ya na ụmụ agbọghọ ndị nke ahụ nwere uche so gawa oriri agbamakwụkwọ ahụ. Otú ahụkwa ka ndị e tere mmanụ ndị dị njikere, mụrụ anya, ma nọsie ike n’ofufe Jehova ruo mgbe Kraịst ga-abịa ga-eso Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ, ya bụ, Jizọs, banye n’Alaeze eluigwe. b (Mkpu. 7:1-3) Gịnị mere ụmụ agbọghọ ise ahụ dị nzuzu?
7. Gịnị mere ụmụ agbọghọ ise ahụ dị nzuzu? Maka gịnị?
7 Ụmụ agbọghọ ahụ dị nzuzu adịghị ka ndị nke ahụ nwere uche. Ha adịghị njikere mgbe nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bịarutere. Ọkụ ha chọwara ịnyụ. Ha ejighịkwanụ mmanụ ọzọ. Mgbe ha chọpụtara na nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ abịarutewela, ha gawara ịzụta mmanụ. Ha alọtaghị ruo mgbe nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bịarutere. N’oge ahụ, “ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, ndị dị njikere, sooro ya banye n’oriri agbamakwụkwọ ahụ, e wee mechie ụzọ.” (Mat. 25:10) Mgbe ụmụ agbọghọ ahụ dị nzuzu lọghachiri ma chọọ ịbanye n’oriri agbamakwụkwọ ahụ, nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ gwara ha, sị: “Amaghị m ndị unu bụ.” (Mat. 25:11, 12) Ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke adịghị njikere ichere nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ ruo mgbe ọ bụla ọ ga-abịa. Gịnị ka ihe a na-akụziri ndị e tere mmanụ?
8-9. Gịnị ka ndị e tere mmanụ nwere ike ịmụta n’ihe atụ Jizọs mere gbasara ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
8 Dịrị njikere, nọrọkwa na nche. Ihe Jizọs na-ebu amụma ya abụghị na ndị e tere mmanụ ga-eke ụzọ abụọ, na otu ga-abụ ndị dị njikere ichere ruo mgbe ọgwụgwụ ụwa ochie a ga-abịa, e nweekwa ndị nke na-agaghị eme otú ahụ. Kama, ihe ọ na-akọwa bụ ihe ga-eme ndị e tere mmanụ ma ọ bụrụ na ha adịghị njikere iji obi ha niile na-efe Chineke ruo ọgwụgwụ. Ọ bụrụ na ha adịghị njikere, ha agaghị enweta ụgwọ ọrụ ha. (Jọn 14:3, 4) Ihe a dị ezigbo mkpa. Ma olileanya anyị ọ̀ bụ ịga eluigwe ma ọ̀ bụ inweta ụwa, anyị niile kwesịrị iji ihe anyị mụtara n’ihe atụ ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke kpọrọ ihe. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịnọ na nche ma dịrị njikere ịtachi obi ruo ọgwụgwụ.—Mat. 24:13.
9 Mgbe Jizọs kọchara akụkọ ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke iji gosi na ọ dị mkpa ka anyị dịrị njikere ma nọrọ na nche, o mere ihe atụ gbasara talent. Ihe atụ a gosiri na anyị kwesịrị ịna-arụsi ọrụ ike.
TALENT
10. Olee otú ndị ohu abụọ si gosi na ha ji ọrụ nna ha ukwu nyere ha kpọrọ ihe? (Matiu 25:19-23)
10 N’ihe atụ Jizọs mere gbasara talent, o kwuru banyere ndị ohu abụọ ji ọrụ nna ha ukwu nyere ha kpọrọ ihe na otu ohu na-emeghị otú ahụ. (Mat. 25:14-18) Otú ndị ohu abụọ a si gosi na ha ji ọrụ ha kpọrọ ihe bụ na ha rụsiri ọrụ ike ka ha nwetakwuoro nna ha ukwu uru. Tupu nna ha ukwu agawa obodo ọzọ, o nyere ha talent. Talent a bụ ego buru ezigbo ibu. Ndị ohu abụọ a rụsiri ọrụ ike ma jiri ego ahụ mee ihe bara uru. Gịnị mechara mee? Mgbe nna ha ukwu lọtara, ha enwetala ego ahụ nna ha ukwu nyere ha okpukpu abụọ. Nna ha ukwu jara ha mma. Ha sokwaara ‘ya ṅụrịa ọṅụ.’ (Gụọ Matiu 25:19-23.) Ohu nke atọ kwanụ? Gịnị ka o ji ego nna ya ukwu nyere ya mee?
11. Gịnị mere ohu ahụ dị “umengwụ”? Maka gịnị?
11 E nyere ohu nke atọ otu talent. Mana, ọ dị “umengwụ.” Nna ya ukwu tụrụ anya ka o jiri talent ya mee ihe bara uru. Kama ime otú ahụ, o liri ya n’ala. Mgbe nna ya ukwu lọtara, o nyeghachiri ya naanị otu talent ahụ o nyere ya. Àgwà ohu a adịghị mma. Kama ịrịọ nna ya ukwu mgbaghara maka na o nwetaraghị ya uru, ọ kpọrọ nna ya ukwu “onye aka ike.” Nna ya ukwu ajaghị ya mma. Ihe ọzọ mere bụ na a naara ya talent ahụ o nwere ma chụpụ ya n’ụlọ nna ya ukwu.—Mat. 25:24, 26-30.
12. Ole ndị ka ndị ohu abụọ ahụ ji ọrụ e nyere ha kpọrọ ihe nọchiri anya ha taa?
12 Ndị ohu abụọ ahụ ji ọrụ e nyere ha kpọrọ ihe nọchiri anya Ndị Kraịst e tere mmanụ ji obi ha niile na-efe Chineke. Nna ha ukwu bụ́ Jizọs Kraịst ga-akpọ ha ka ha ‘soro ya ṅụrịa ọṅụ.’ Ha ga-enweta ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe, nke bụ́ mbilite n’ọnwụ mbụ. (Mat. 25:21, 23; Mkpu. 20:5b) Mana, e ji ihe ajọ ohu ahụ mere adọ ndị e tere mmanụ aka ná ntị. Olee otú ọ bụ?
13-14. Gịnị ka ndị e tere mmanụ na-amụta n’ihe atụ Jizọs mere gbasara talent? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
13 Na-arụsi ọrụ ike. N’ihe atụ Jizọs mere gbasara talent nakwa gbasara ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke, ihe ọ na-ekwu abụghị na ndị e tere mmanụ ga-adị umengwụ. Kama, ọ nọ na-akọwa ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ha akwụsị ịnụ ọkụ n’obi. Ọ ga-eme ka ha kwụsị ife Chineke bụ́ onye ‘kpọrọ ha ma họrọ ha,’ a gaghịkwa ekwe ka ha banye n’Alaeze eluigwe.—2 Pita 1:10.
14 Jizọs mere ka o doo anya n’ihe atụ o mere gbasara ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke nakwa nke talent na Ndị Kraịst niile e tere mmanụ kwesịrị ịdị njikere ma nọrọ na nche, na-arụsikwa ọrụ ike. Mana, è nwere ihe ọzọ Jizọs kwuru iji dọọ ndị e tere mmanụ aka ná ntị? Ee, e nwere. Anyị ga-ahụ ihe ahụ Jizọs ji dọọ ha aka ná ntị na Matiu 24:40, 41.
OLEE NDỊ “A GA-AKPỌRỌ”?
15-16. Olee otú Matiu 24:40, 41 si gosi na ndị e tere mmanụ kwesịrị ịna-eche nche?
15 Tupu Jizọs emee ihe atụ atọ a, ọ kọwara ikpe ikpeazụ a ga-ekpe ndị e tere mmanụ nke ga-eme ka a mata ndị a họọrọ. O kwuru gbasara ụmụ nwoke abụọ nọ n’ubi na-arụ ọrụ nakwa ụmụ nwaanyị abụọ na-egwe nri. Na nke ọ bụla n’ime ha, o yiri ka mmadụ abụọ ahụ hà na-eme otu ihe. Ma, Jizọs kwuru na “a ga-akpọrọ otu onye, hapụ onye nke ọzọ.” (Gụọ Matiu 24:40, 41.) Ọ gbaziri ndị na-eso ụzọ ya ume, sị: “N’ihi ya, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.” (Mat. 24:42) Jizọs kwukwara ihe yiri ya mgbe o mechara ihe atụ gbasara ụmụ agbọghọ ndị ahụ na-amaghị nwoke. (Mat. 25:13) Ọ̀ bụ otu ihe ka Jizọs na-ekwu okwu ya n’ihe ndị a o kwuru? Ọ ga-abụ. Ọ bụ naanị ezigbo ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi ka “a ga-akpọrọ,” Jizọs anabata ha n’Alaeze eluigwe.—Jọn 14:3.
16 Na-eche nche. Onye ọ bụla e tere mmanụ na-anaghị eche nche agaghị eso ná ndị a ga-achịkọta ka ha soro “ndị ọ họọrọ.” (Mat. 24:31) Ihe a gbasakwara ndị niile na-efe Chineke n’agbanyeghị ma olileanya ha ọ̀ bụ ịga eluigwe ma ọ̀ bụ ibi n’ụwa. Ha kwesịrị iwere ihe Jizọs kwuru ka ihe o ji na-adọ ha aka ná ntị ka ha nọrọ na nche ma na-erubere Chineke isi.
17. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ichegbuwe onwe anyị gbasara mgbe Jehova kpebiri iji mmụọ nsọ ya tee mmadụ mmanụ?
17 Anyị amatala Jehova nke ọma. N’ihi ya, anyị tụkwasịrị ya obi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. Ihe bụ́ mkpa anyị abụghị ma Jehova ò teela ụfọdụ ndị mmanụ n’afọ ndị na-adịbeghị anya. c Anyị na-echeta ihe Jizọs kwuru banyere ndị bịara ọrụ n’awa nke iri na otu n’ihe atụ o mere gbasara ubi vaịn. (Mat. 20:1-16) A kwụrụ ndị a kpọrọ ka ha rụwa ọrụ mgbe chi jiwerela n’ụbọchị ahụ ihe a kwụrụ ndị malitere n’ụtụtụ. N’ihi ya, n’agbanyeghị oge e tere mmadụ mmanụ, onye ahụ ga-eketakwa Alaeze eluigwe ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ife Jehova.
GEE NTỊ N’ỊDỌ AKA NÁ NTỊ
18-19. Gịnị ka anyị mụtarala n’ihe atụ ndị a?
18 Olee ihe ndị anyị kwurula? Ihe atụ Jizọs mere gbasara atụrụ na ewu gosiri na ọ dị mkpa ka ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa na-erubere Jehova isi ma ugbu a ma n’oge oké mkpagbu na-abịanụ. N’oge ahụ, Jizọs ga-ekwu na ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ime ha ruru eru inweta “ndụ ebighị ebi.”—Mat. 25:46.
19 Anyị tụlekwara ihe atụ abụọ e ji dọọ ndị e tere mmanụ aka ná ntị. N’ihe atụ Jizọs mere gbasara ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke ndị nwere uche na ndị dị nzuzu, ise n’ime ha nwere uche. Ha jikeere ejikere ma nọrọ na nche. Ha dị njikere ichere nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ ruo mgbe ọ bụla o ji bịa. Mana, ndị nke dị nzuzu adịghị njikere. N’ihi ya, nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ ekweghị ka ha bata n’oriri agbamakwụkwọ ahụ. Anyịnwa kwesịkwara ịdị njikere ichere ruo mgbe Jizọs ga-ebibi ụwa ochie a n’agbanyeghị afọ ole anyị ga-echere. Ihe ọzọ bụ na n’ihe atụ Jizọs mere gbasara talent, o kwuru gbasara ndị ohu abụọ rụsiri ọrụ ike. Ha gbaara nna ha ukwu mbọ, ihe ha amasịkwa ya. Mana, ọ nabataghị ohu nke dị umengwụ. Gịnị ka anyị na-amụta? Anyị kwesịrị ịna-arụsi ọrụ Jehova ike ruo ọgwụgwụ. N’ikpeazụ, anyị kwukwara otú ndị e tere mmanụ ga-esi nọrọ na nche ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka Jizọs ‘kpọrọ’ ha ka ha nweta ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe. Ndị e tere mmanụ na-atụsi anya ike mgbe “a ga-akpọkọta” ha n’ebe Jizọs nọ n’eluigwe. A lụchaa agha Amagedọn, ha ga-abụ ndị nwunye Jizọs n’agbamakwụkwọ Nwa Atụrụ ahụ.—2 Tesa. 2:1; Mkpu. 19:9.
20. Gịnị ka Jehova ga-emere ndị gere ntị n’aka ná ntị ọ na-adọ?
20 Ọ bụ eziokwu na oge ikpe ji ọsọ na-abịa, ụjọ ekwesịghị ịtụ anyị. Ọ bụrụ na anyị ekwesị ntụkwasị obi, Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya ga-enye anyị “ike karịrị ike mmadụ” ka anyị ‘nwee ike iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.’ (2 Kọr. 4:7; Luk 21:36) Ma olileanya anyị ọ̀ bụ ịga eluigwe ma ọ̀ bụ inweta ụwa, ihe anyị ga-amasị Nna anyị ma ọ bụrụ na anyị egee ntị n’aka ná ntị Jizọs ji ihe atụ ndị ahụ dọọ anyị. N’amara Jehova, ‘a ga-ede aha anyị n’akwụkwọ’ nke ndụ.—Dan. 12:1; Mkpu. 3:5.
ABỤ NKE 26 Unu Meere M Ya
a Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ihe Anyị Ma Gbasara Otú Jehova Ga-esi Kpee Ndị Mmadụ Ikpe n’Ọdịnihu?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Mee 2024.
b Ị chọọ ịmatakwu gbasara ya, gụọ isiokwu bụ́ “Ị̀ Ga ‘Na-eche Nche’?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Mach 2015.
d NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị e tere mmanụ na-amụrụ otu nwa agbọghọ ọ hụrụ n’ozi ọma ihe.