ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 37
ABỤ NKE 118 Nyere Anyị Aka Ka Okwukwe Anyị Sie Ike
Akwụkwọ Ozi Ga-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi Ruo Ọgwụgwụ
“Anyị na-enwe obi ike anyị nwere ná mmalite ruo n’ọgwụgwụ.”—HIB. 3:14.
IHE A GA-AMỤ
Ihe anyị ga-amụta n’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru ga-enyere anyị aka ịtachi obi na-efe Jehova ruo n’ọgwụgwụ ụwa ochie a.
1-2. (a) Mgbe Pọl degaara Ndị Kraịst bi na Judia akwụkwọ ozi, olee otú ihe si dịrị ha? (b) Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na akwụkwọ ozi ahụ bịara nnọọ n’oge ya?
MGBE Jizọs nwụchara n’afọ 33, ọtụtụ nsogbu bịaara Ndị Kraịst bi na Jeruselem nakwa na Judia. Obere oge e hiwechara ọgbakọ Ndị Kraịst, a malitere ịkpagbu ha mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. (Ọrụ 8:1) Mgbe ihe dị ka afọ iri abụọ gachara, ezigbo ihe isi ike bịaara ndị na-eso ụzọ Jizọs. O nwere ike ịbụ na ihe kpatara ya bụ ụnwụ nri e nwere n’obodo ahụ n’oge na-adịbeghị anya. (Ọrụ 11:27-30) Ma, n’ihe dị ka afọ 61 Oge Ndị Kraịst, ihe bịara dịtụrụ Ndị Kraịst mma. Ma, mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ga-abịara ha n’ọdịnihu. N’oge ahụ, Pọl si n’ike mmụọ nsọ degara ha akwụkwọ ozi bịara nnọọ n’oge ya.
2 Ihe mere akwụkwọ ozi ahụ Pọl degaara ndị Hibru ji bịa nnọọ n’oge ya bụ na oge udo ahụ Ndị Kraịst nwere agaghị adịte aka. Pọl kwuru ihe ndị ga-enyere ha aka idi mkpagbu ndị ga-abịara ha n’oge na-adịghị anya. Mbibi ahụ Jizọs buru amụma na a ga-ebibi Jeruselem ji ọsọ na-abịa. (Luk 21:20) Ọ bụ eziokwu na Pọl na Ndị Kraịst bi na Judia n’oge ahụ amaghị mgbe mbibi ahụ ga-abịa, ma ha ga-ejili oge ahụ fọrọ afọ kwadebe onwe ha. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịmụta àgwà ndị ga-enyere ha aka, àgwà ndị dị ka okwukwe na ntachi obi.—Hib. 10:25; 12:1, 2.
3. Gịnị mere Ndị Kraịst taa ji kwesị ileba anya nke ọma n’akwụkwọ Ndị Hibru?
3 N’oge na-adịghị anya, mkpagbu karịrị nke ahụ bịaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru ga-abịara anyị. (Mat. 24:21; Mkpu. 16:14, 16) N’ihi ya, ka anyị leba anya na ndụmọdụ ụfọdụ Jehova nyere Ndị Kraịst ndị ahụ ga-abakwara anyị uru n’oge anyị a.
‘JISIE IKE NA-EME NKE ỌMA RUO MGBE I TOZURU ETOZU’
4. Olee nsogbu ndị bịaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
4 E nwere nsogbu ọzọ tara akpụ ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst nwere. E nwere oge ndị Juu bụ ndị Jehova họọrọ. Ruo ọtụtụ afọ, Jeruselem bụ ebe dị ezigbo mkpa. Eze na-anọchi anya Jehova na-anọ na Jeruselem achị. Ndị chọkwara ife Jehova na-aga n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem efe ya. Ndị Juu niile, bụ́ ndị na-erubere Jehova isi, na-eso Iwu Mosis otú ndị isi okpukpe ha si na-akọwara ha ya. Ihe ndị so n’ihe ndị a kụziiri ha bụ ụdị nri ha ga na-eri, otú ha ga-esi na-ele ibi ùgwù anya, na otú ha na ndị na-abụghị ndị Juu ga-esi na-emekọ ihe. Ma kemgbe Jizọs nwụchara, Jehova anaghịzi anabata àjà ndị Juu na-achụ. Ihe ahụ siiri ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst ike n’ihi na ha na-esobu Iwu Mosis. (Hib. 10:1, 4, 10) O sidịịrị Ndị Kraịst tozuru etozu dị ka Pita onyeozi ike ime ụfọdụ n’ime mgbanwe ndị a. (Ọrụ 10:9-14; Gal. 2:11-14) Ihe ọhụrụ ndị ahụ Ndị Kraịst kweere mere ka ndị isi okpukpe ndị Juu na-emegide ha.
5. Olee ụzọ ndị abụọ megidere Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru?
5 E nwere ụzọ ndị abụọ na-emegide Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru. Otu n’ime ha bụ ndị isi okpukpe ndị Juu, ndị weere ha ka ndị si n’okpukpe ndị Juu pụọ. Ihe ọzọ bụ na ụfọdụ ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst nọ na-esi ọnwụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs ka kwesịrị ịna-edebe Iwu Mosis. O nwere ike ịbụ ka a ghara ịna-akpagbu ha. (Gal. 6:12) Olee ihe ga-enyere Ndị Kraịst aka irubere Jehova isi?
6. Gịnị ka Pọl gwara Ndị Kraịst ibe ya ka ha mee? (Ndị Hibru 5:14–6:1)
6 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru, ọ gwara ha ka ha na-amụ Okwu Chineke, na-atụgharịkwa uche na ya. (Gụọ Ndị Hibru 5:14–6:1.) Pọl ji ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru kọwaa ihe mere otú Ndị Kraịst si efe Jehova ji ka otú ndị Juu si fee ya ezigbo mma. a Pọl ma na ọ bụrụ na Ndị Kraịst ndị ahụ amụtakwuo Baịbụl, ghọta ya nke ọma, ọ ga-enyere ha aka ịmata nke bụ́ ozizi ụgha ma jụ ya, ka a ghara iduhie ha.
7. Olee nsogbu na-abịara anyị taa?
7 Taa, e nwere ndị na-akọsa ihe ndị dị iche n’ihe Jehova kwuru otú ahụ e nwere n’oge Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe Ndịàmà Jehova na-eme adịghị mma n’ihi na ha na-erubere ihe Jehova kwuru banyere mmekọahụ isi. Ka ụbọchị na-aga, otú ndị mmadụ si eche echiche na-adịkwu ezigbo iche n’otú Jehova si eche echiche. (Ilu 17:15) N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị chọpụta echiche dị iche na nke Jehova ma jụ ya. Anyị ekwesịghị ikwe ka ndị mmegide mee ka anyị kwụsị inwe obi ike ma ọ bụ kwụsị ife Jehova.—Hib. 13:9.
8. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-eme nke ọma ruo mgbe anyị tozuru etozu?
8 Anyị kwesịrị ịna-echeta ihe Pọl gwara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru. Ọ gwara ha ka ha jisie ike na-eme nke ọma ruo mgbe ha tozuru etozu. Ihe ọ pụtara bụ na anyị kwesịrị ịna-amụ Baịbụl nke ọma ka anyị nwee ike ịmatakwu Jehova na otú o si eche echiche. Anyị kwesịrị ịna-eme otú a ma mgbe anyị nyefechara Jehova onwe anyị ma mee baptizim. N’agbanyeghị afọ ole anyị nọrọla n’ọgbakọ, anyị niile kwesịrị ịna-agụchi Baịbụl anya, na-amụchikwa ya anya. (Ọma 1:2) Ịmụchi Baịbụl anya ga-enyere anyị aka ịmụta àgwà dị ezigbo mkpa Pọl kwuru okwu ya n’akwụkwọ ozi ahụ o degaara ndị Hibru, ya bụ, okwukwe.—Hib. 11:1, 6.
‘KA ANYỊ NWEE OKWUKWE KA E WEE CHEBE NDỤ ANYỊ’
9. Gịnị mere Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru ji kwesị inwe okwukwe siri ike?
9 Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru kwesịrị inwe okwukwe siri ike ka ha nwee ike ịlanahụ mkpagbu a ga-enwe na Judia. (Hib. 10:37-39) Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị na mgbe ọ bụla ha hụrụ ka ndị agha Rom gbara Jeruselem gburugburu, ka ha si na ya gbapụ, gbaga n’ugwu. Ndị Kraịst niile kwesịrị ige ntị na ndụmọdụ a ma hà bi na Jeruselem ma hà bi na Judia dị ya nso. (Luk 21:20-24) N’oge ochie, mgbe ọ bụla ndị agha bịara ịlụso obodo agha, ndị na-ebighị n’ime obodo na-agbaba n’ime obodo dị ka Jeruselem ka e chebe ha n’ihi mgbidi gbara ya gburugburu. Ịgbapụ gawa n’ugwu ga-adị ka ime iberiibe. N’ihi ya, Ndị Kraịst kwesịrị inwe okwukwe siri ike iji mee otú ahụ.
10. Olee ihe okwukwe siri ike ga-eme ka Ndị Kraịst mee? (Ndị Hibru 13:17)
10 Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru kwesịkwara ịtụkwasị ndị Jizọs ji na-eduzi ọgbakọ ya obi. Ọ ga-abụ na ndị na-eduzi ọgbakọ Chineke n’oge ahụ gwara ndị niile nọ n’ọgbakọ mgbe ha ga-agbapụ na otú ha ga-esi agbapụ. (Gụọ Ndị Hibru 13:17.) Okwu Grik a sụgharịrị ‘na-erube isi’ ná Ndị Hibru 13:17 na-egosi mmadụ irubere onye ọzọ isi n’ihi na ọ tụkwasịrị ya obi, ọ bụghị naanị na e nyere onye ahụ ikike ịgwa ya ihe ọ ga-eme. N’ihi ya, Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru kwesịrị ịtụkwasị ndị okenye obi ma na-erubere ha isi tupu mkpagbu ahụ amalite. Ọ bụrụ na ọ na-adịrị Ndị Kraịst mfe irubere ndị na-eduzi ọgbakọ isi mgbe ihe dị mma, ọ ga-adịkwuru ha mfe ime ya n’oge ihe siri ike.
11. Gịnị mere inwe okwukwe siri ike ji dị Ndị Kraịst taa mkpa?
11 Taa, okwukwe dị anyị ezigbo mkpa otú ahụ ọ dị Ndị Kraịst ndị ahụ Pọl degaara akwụkwọ ozi. Anyị bi n’oge ọtụtụ ndị na-ekwetaghị na ọgwụgwụ ụwa a adịla nso. Ha na-akwadị anyị emo maka na anyịnwa kwetara. (2 Pita 3:3, 4) Ihe ọzọ bụ na n’agbanyeghị na e nwere ihe ndị Baịbụl kwuru gbasara ihe ndị ga-eme n’oge oké mkpagbu, e nwere ọtụtụ ihe anyị na-amaghị. Anyị kwesịrị inwe okwukwe siri ike na ọgwụgwụ ụwa ochie a ga-abịa n’oge Jehova kpebiri na ọ ga-abịa nakwa na Jehova ga-elekọta anyị n’oge ahụ.—Hab. 2:3.
12. Gịnị ga-enyere anyị aka ịlanahụ oké mkpagbu?
12 Anyị kwesịkwara ime ka okwukwe anyị sie ezigbo ike na Jehova na-eji “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” eduzi anyị taa. (Mat. 24:45) Oké mkpagbu malite, e nwere ike inye anyị ntụziaka ndị ga-azọ anyị ndụ otú ahụ o nwere ike ịbụ na e nyere Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru mgbe ndị agha Rom gbara Jeruselem gburugburu. Ọ dị ezigbo mkpa ugbu a ka anyị tụkwasị ndị Jehova ji eduzi nzukọ ya obi. Ọ bụrụ na anyị atụkwasịghị ha obi ugbu a ma na-erubere ha isi, ọ ga-esiri anyị ezigbo ike irubere ha isi n’oge oké mkpagbu.
13. Gịnị mere ndụmọdụ ahụ dị ná Ndị Hibru 13:5 ji dị mkpa?
13 Mgbe Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru nọ na-eche ka a gwa ha ka ha gbapụ, ha kwesịkwara iwere ozi Jehova ka ihe kacha mkpa ma ghara ‘ịhụ ego n’anya.’ (Gụọ Ndị Hibru 13:5.) Ụnwụ nri na ịda ogbenye akpaala ụfọdụ n’ime ha aka ọjọọ. (Hib. 10:32-34) Ụfọdụ nwere ike ilewe ego anya ka ihe ga-echebe ha n’agbanyeghị na e nweela mgbe ha diri ihe isi ike n’ihi ozi ọma. Ma, e nweghị ụdị ego mmadụ nwere ga-echebe ya mgbe ahụ a ga-abịa ibibi Jeruselem. (Jems 5:3) Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwee onye weere akụnụba ka ihe kacha mkpa, o nwere ike ịka siere ya ike ịhapụ ụlọ ya na ihe ndị ọzọ o nwere gbapụ.
14. Olee otú inwe okwukwe siri ike ga-esi mee ka anyị mee ezigbo mkpebi ugbu a gbasara akụnụba?
14 Ọ bụrụ na okwukwe anyị esie ike na n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ebibi ụwa ochie a, anyị agaghị na-eche na inwetakwu akụnụba bụ ihe kacha mkpa. N’oge oké mkpagbu, ego agaghịzi aba uru. Baịbụl sịrị na ndị mmadụ “ga-atụfu ọlaọcha ha n’okporo ámá” n’ihi na ha amatala na “ma ọlaọcha ha ma ọlaedo ha agaghị azọpụtali ha n’ụbọchị oké iwe Jehova.” (Ezik. 7:19) Kama iwere ịkpatakwu ego ka ihe kacha mkpa, anyị kwesịrị ikpebi ime ihe ndị ga-enyere anyị aka ịna-elekọta onwe anyị na ezinụlọ anyị, na-efekwa Jehova. Ọ pụtara na anyị agaghị aga koro ụgwọ na-enweghị isi na ọdụ ma ọ bụ kwe ka ilekọta ihe ndị anyị nwere na-ewekọrọ oge anyị. Anyị kwesịkwara ịkpachara anya ka anyị ghara iwere ihe ndị anyị nwere ka ihe kacha mkpa ná ndụ anyị. (Mat. 6:19, 24) Ka ụwa ochie a na-agba egwú ụla ya, e nwere ike inwe ihe ndị ga-eme ka a mata ma ànyị tụkwasịrị Jehova obi ka ọ̀ bụkwanụ ihe ndị anyị nwere.
“UNU KWESỊRỊ ỊTACHI OBI”
15. Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru na-atachi obi?
15 Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru kwesịrị ịna-atachi obi n’ozi ha na-ejere Jehova n’ihi na nsogbu ga-abịara ha n’oge na-adịghị anya. (Hib. 10:36) Ọ bụ eziokwu na e nweela mgbe a kpagburu ụfọdụ n’ime ha mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, ma ọtụtụ n’ime ha batara n’ọgbakọ mgbe a na-anaghị akpagbu Ndị Kraịst. Pọl kwuru na n’agbanyeghị na ha atachiela obi ná nsogbu ndị bịaara ha, ha atarubeghị ahụhụ ka Jizọs, ya bụ, ruo ọnwụ. (Hib. 12:4) Mgbe ọtụtụ ndị malitere ịghọ Ndị Kraịst, ezigbo iwe wewere ọtụtụ ndị Juu, ha ana-emesikwa Ndị Kraịst ike. Afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, ìgwè mmadụ iwe ji lụsoro Pọl ọgụ mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma na Jeruselem. Ihe karịrị ndị Juu iri anọ ṅụrụ iyi, sị: “Anyị agaghị eri ihe ma ọ bụ ṅụọ ihe ọ bụla ruo mgbe anyị gburu Pọl.” (Ọrụ 22:22; 23:12-14) N’agbanyeghị ụdị mmegide a na ịkpọ asị a, Ndị Kraịst ndị ahụ kwesịkwara ịna-ezukọta na-efe Jehova, na-ekwusa ozi ọma, na-emekwa ka okwukwe ha na-esikwu ike.
16. Olee otú akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru ga-esi nyere anyị aka ịna-ele mkpagbu anya otú kwesịrị ekwesị? (Ndị Hibru 12:7)
16 Gịnị ga-enyere Ndị Kraịst aka idi mkpagbu ndị na-abịara ha? Pọl ma na ha kwesịrị ịhụ uru ntachi obi ga-abara ha. Ọ bụ ya mere o ji kọwaara ha na Chineke nwere ike ikwe ka nsogbu bịara Onye Kraịst ka o jiri ya zụọ ya. (Gụọ Ndị Hibru 12:7.) Ụdị ọzụzụ ahụ nwere ike inyere onye ahụ aka ịmụta ịna-akpa àgwà Ndị Kraịst ma ọ bụ ịna-akpakwu ya nke ọma. Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru lekwasị anya n’uru ụdị ọnwụnwa ndị ahụ na-abara ha, ọ ga-adịrị ha mfe ịtachi obi.—Hib. 12:11.
17. Gịnị ka Pọl ma gbasara idi mkpagbu?
17 Pọl gwara Ndị Kraịst ndị ahụ bi na Judia ka ha nwee obi ike nakwa ka ike ghara ịgwụ ha ma ọnwụnwa bịara ha. Pọl ga-enyeli ha ezigbo ndụmọdụ banyere otú e si atachi obi. Ebe ọ bụ na o sobu na-akpagbu Ndị Kraịst, ọ hụla otú e si mesie ha ike. Ọ makwa otú e si edi mkpagbu. A sị ka e kwuwe, ọtụtụ mkpagbu abịarala ya kemgbe ọ ghọrọ Onye Kraịst. (2 Kọr. 11:23-25) N’ihi ya, Pọl ma nke ọma otú e si atachi obi. O chetaara Ndị Kraịst ndị ahụ na ha diwe ọnwụnwa, ha kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi, ọ bụghị onwe ha. Pọl ji obi ike sị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu.”—Hib. 13:6.
18. Gịnị ka a ga-eme anyị niile n’ọdịnihu, oleekwa otú anyị ga-esi kwadebe maka ya?
18 Ụfọdụ ụmụnna anyị na-edi mkpagbu ugbu a. Anyị nwere ike ịkwado ha ma anyị na-etinye ha n’ekpere. Mgbe ụfọdụ, anyị nwekwara ike inye ha ihe ndị dị ha mkpa. (Hib. 10:33) Ma Baịbụl mere ka o doo anya na ‘a ga-akpagbu ndị niile na-ebi ndụ otú na-egosi na ha na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ.’ (2 Tim. 3:12) N’ihi ya, anyị niile kwesịrị ịkwadebe maka ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ka anyị na-atụkwasị Jehova obi anyị niile, obi esiekwa anyị ike na ọ ga-enyere anyị aka idi ọnwụnwa ọ bụla nwere ike ịbịara anyị. Mgbe oge ya ruru, ọ ga-eme ka ndị niile na-efe ya nwere onwe ha.—2 Tesa. 1:7, 8.
19. Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ga-enyere anyị aka ịkwadebe maka oké mkpagbu? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
19 O doro anya na akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru nyeere ha aka ịkwadebe maka mkpagbu ga-abịara ha. Pọl gwara ụmụnna ya ka ha na-amụsi Baịbụl ike ma na-aghọtakwu ya. Ime otú ahụ ga-enyere ha aka ịmata ozizi ga-eme ka okwukwe ha gharazie isi ike ma jụ ya. Ọ gwara ha ka ha na-eme ka okwukwe ha na-esikwu ike ka ha nwee ike ịna-eme ihe Jizọs na ndị o ji eduzi ọgbakọ ya gwara ha mee ozugbo. O nyekwaara Ndị Kraịst aka ka ha nwee ike ịna-atachi obi. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-ele nsogbu ndị na-abịara ha anya ka ohere Nna ha hụrụ ha n’anya ji azụ ha. Anyị gbalịa na-eme ihe ndị a si na Baịbụl, anyị ga-enwe ike idi nsogbu bịaara anyị, na-erubekwara Jehova isi ruo n’ọgwụgwụ.—Hib. 3:14.
ABỤ NKE 126 Mụrụ Anya, Ka Okwukwe Gị Sie Ike, Dị Ike
a Naanị n’akwụkwọ Ndị Hibru isi mbụ, ọ dịkarịa ala, Pọl kwuru ihe asaa si n’Akwụkwọ Nsọ Hibru gosiri na otú Ndị Kraịst si efe Jehova ka otú ndị Juu si fee ya mma.—Hib. 1:5-13.