Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 39

ABỤ NKE 125 “Ndị Na-eme Ebere Na-enwe Obi Ụtọ”

Inye Ihe Ga-eme Ka Ị Na-enwekwu Obi Ụtọ

Inye Ihe Ga-eme Ka Ị Na-enwekwu Obi Ụtọ

“A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”​—ỌRỤ 20:35.

IHE A GA-AMỤ

Anyị ga-amụta otú anyị ga-esi na-enwe obi ụtọ ma ọ bụ na-enwekwu obi ụtọ ma anyị na-enye ndị mmadụ ihe.

1-2. Olee uru ọ na-abara anyị na Jehova kere anyị ka inye ihe na-eme anyị obi ụtọ karịa ịnara ihe?

 MGBE Jehova kere ndị mmadụ, o kere ha ka inye ihe na-eme ha obi ụtọ karịa ịnara ihe. (Ọrụ 20:35) Ihe a ọ̀ pụtara na obi anaghị adị anyị ụtọ ma e nye anyị ihe? Mba. Anyị ma na obi na-atọ anyị ụtọ ma e nye anyị onyinye. Ma, obi na-aka atọ anyị ụtọ ma anyị nye mmadụ ihe. Ọ dịkwa mma na Jehova si otú ahụ kee anyị. Maka gịnị?

2 Otú a Jehova si kee anyị na-eme ka anyị nwee ike ịna-emekwu onwe anyị obi ụtọ. Anyị nwere ike imekwu onwe anyị obi ụtọ ma anyị na-achọpụta ụzọ ndị anyị ga-esi na-enye ndị mmadụ ihe. Ọ magburu onwe ya na Jehova si otú a kee anyị.​—Ọma 139:14.

3. Gịnị mere Baịbụl ji kpọọ Jehova “Chineke, onye obi ụtọ”?

3 Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na inye ihe na-eme anyị obi ụtọ. N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya na Baịbụl kpọrọ Jehova “Chineke, onye obi ụtọ.” (1 Tim. 1:11) Ọ bụ ya malitere inye ihe. Ọ bụkwa ya kacha enye ihe. Pọl onyeozi kwuru na ọ bụ Chineke “nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-eje ije, na-adịkwa ndụ.” (Ọrụ 17:28) N’eziokwu, “onyinye ọ bụla dị mma, nke zukwara okè,” na-esi n’aka Jehova.​—Jems 1:17.

4. Gịnị ga-eme ka anyị na-enwekwu obi ụtọ?

4 O nwere ike ịbụ na anyị niile chọrọ inwetakwu obi ụtọ a na-enwe ma anyị nye mmadụ ihe. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-emesapụ aka ka Jehova. (Efe. 5:1) N’isiokwu a, anyị ga-amụta otú Jehova si enye ndị mmadụ ihe, mụtakwa ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na o yie ka ndị mmadụ anaghị ekele anyị maka ihe ọma anyị meere ha. Ihe a ga-enyere anyị aka ịna-enye ndị mmadụ ihe ma na-enwekwu obi ụtọ.

NA-EMESAPỤ AKA KA JEHOVA

5. Olee ihe ụfọdụ Jehova na-enye anyị?

5 Olee ụzọ ụfọdụ Jehova si emesapụ aka? Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha. Jehova na-enye anyị ihe ndị na-akpa anyị. O nwere ike ọ bụghị mgbe niile ka anyị ga-enwe ihe ndị dara oké ọnụ, ma Jehova na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa. Dị ka ihe atụ, ọ na-enye anyị nri, uwe, na ebe anyị na-ebi. (Ọma 4:8; Mat. 6:31-33; 1 Tim. 6:6-8) Ihe mere Jehova ji enye anyị ihe ndị na-akpa anyị ọ̀ bụ naanị n’ihi na ọ bụ ọrụ ya? Mbanụ. Gịnị mere Jehova ji emere anyị ya?

6. Gịnị ka anyị mụtara na Matiu 6:25, 26?

6 Ihe mere Jehova ji enye anyị ihe na-akpa anyị bụ na ọ hụrụ anyị n’anya. Ka anyị legodị ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:25, 26. (Gụọ ya.) Jizọs ji ihe ndị e kere eke mee ihe atụ. Mgbe ọ na-ekwu banyere ụmụ nnụnụ, ọ sịrị: “Ha anaghị akụ mkpụrụ. Ha anaghị aghọrọ mkpụrụ, ha anaghịkwa ekpokọta mkpụrụ n’ụlọ a na-akwasa ihe.” Ma ihe ọzọ o kwuru bụ: “Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri.” Jizọs jụziri, sị: “Ọ̀ bụ na unu abaghị uru karịa ha?” Gịnị ka o ji ya na-akụzi? Ihe ọ na-ekwu bụ na Jehova ji ndị na-efe ya kpọrọ ezigbo ihe karịa ụmụ anụmanụ. Ebe ọ bụ na Jehova na-egboro ụmụ anụmanụ mkpa ha, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga na-egboro anyị mkpa anyị. Jehova na-egboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya otú ahụ nna hụrụ ezinụlọ ya n’anya na-eme.​—Ọma 145:16; Mat. 6:32.

7. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi na-emesapụ aka ka Jehova? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

7 Anyịnwa nwekwara ike inye ndị mmadụ ihe dị ha mkpa n’ihi na anyị hụrụ ha n’anya otú ahụ Jehova na-eme. Dị ka ihe atụ, è nwere nwanna ị ma uwe ma ọ bụ nri dị mkpa? Jehova nwere ike iji gị gbooro ya mkpa ya. O doro ewu na ọkụkọ anya na ndị Jehova na-emesapụrụ ụmụnna ha aka ma e nwee ọdachi. Dị ka ihe atụ, n’oge ọrịa koronavaịrọs, ụmụnna nyere ibe ha nri, uwe, na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa. Ọtụtụ ndị nyekwara ego iji kwado ọrụ anyị na-arụ n’ụwa niile. Ihe a mere ka e nwee ego e ji gbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka n’ụwa niile. Ha mere ihe e kwuru ná Ndị Hibru 13:16. Ebe ahụ sịrị: “Unu echefukwala ịna-eme ihe ọma na ịna-enye ndị ọzọ ihe n’ihi na ụdị àjà ndị a na-adị Chineke ezigbo mma.”

Anyị niile nwere ike ịna-emesapụ aka ka Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)


8. Olee ụzọ ndị anyị si erite uru n’ike Jehova? (Ndị Filipaị 2:13)

8 Jehova na-enye ike. Obi na-adị Jehova ụtọ inye ndị ohu ya ji obi ha niile na-efe ya ike ya na-enweghị atụ. (Gụọ Ndị Filipaị 2:13.) È nwetụla mgbe i kpere ekpere ka Jehova nye gị ike ị ga-eji merie ọnwụnwa ma ọ bụ ike ị ga-eji die ọnwụnwa tara akpụ? O nwekwara ike ịbụ na i kpeela ekpere ka Jehova nye gị ike ị ga-eji mee ihe ndị i kwesịrị ime n’ụbọchị. Mgbe Jehova zara ekpere gị nye gị ike, ọ ga-abụ na ọ dị gị otú ọ dị Pọl onyeozi. O dere, sị: “N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.”​—Fil. 4:13.

9. Olee otú anyị nwere ike isi na-eji ike anyị enyere ndị ọzọ aka ka Jehova? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

9 Anyị enweghị ike na-enweghị atụ ka Jehova. Anyị agaghịkwa enyeli ndị ọzọ ike otú ahụ Jehova na-eme. Mana, anyị ga-ejili ike anyị nyere ndị ọzọ aka ka ya. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịgara nwanna mere agadi ma ọ bụ nke na-arịa ọrịa ozi ma ọ bụ rụọrọ ya ọrụ ụlọ. Ọ bụrụkwa na ọ ga-ekwe anyị omume, anyị nwere ike iwepụta onwe anyị soro na-edowe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha, na-arụzikwa ihe ndị mebiri na ya. Ọ bụrụ na anyị ejiri ike anyị na-eme otú ahụ, ọ na-abara ndị anyị na ha so efe Jehova uru.

Anyị nwere ike iji ike anyị meere ndị ọzọ ihe ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)


10. Olee otú anyị nwere ike isi jiri ike okwu ọnụ na-akpa nyere ndị ọzọ aka?

10 Echefukwala na okwu ọnụ na-akpa ike. Ì nwere ike icheta onye i nwere ike ịja mma, ya agbaa ya ume? Ị̀ ma onye i nwere ike ịkasi obi? Ọ bụrụ na e nwere, ọ ga-adị mma ka i mee ka onye ahụ mara na ị hụrụ ya n’anya. I nwere ike ịga leta ya, kpọọ ya n’ekwentị ma ọ bụ zigara ya ihe i dere na kaadị, ozi iimel, ma ọ bụ ozi i dere n’ekwentị. Echegbula onwe gị maka ihe ị ga-ekwu. Mkpụrụ okwu ole na ole si gị n’obi ị gwara nwanna gị nwere ike ịbụ ihe ahụ́ ya chọrọ n’oge ahụ ka o nwee ike ịnọsi ike n’ofufe Jehova ma ọ bụkwanụ ka o nyere ya aka idi nsogbu bịaara ya.​—Ilu 12:25; Efe. 4:29.

11. Olee otú Jehova si enye anyị amamihe ya?

11 Jehova na-enye amamihe. Jems onye na-eso ụzọ Jizọs dere, sị: “Ọ bụrụkwa na e nwere onye n’ime unu chọrọ amamihe, ya na-arịọ Chineke n’ihi na Chineke na-emesapụrụ mmadụ niile aka. Ọ gaghị asị na onye ahụ mejọrọ ihe.” (Jems 1:5; na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Ihe a o kwuru gosiri na Jehova anaghị ejichi amamihe ya. Ọ na-enye ya ndị ọzọ n’ụba. Jems kwukwara na Jehova nyewe anyị amamihe, ọ na-eme ya ‘n’ewesaghị anyị iwe’ ma ọ bụ ‘sị na anyị mejọrọ ihe.’ Ọ naghị eme ka obi jọọ anyị njọ ma anyị kweta na anyị chọrọ ka o nyere anyị aka ma ọ bụ ka o duzie anyị. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ ya gwara anyị ka anyị rịọ ya ka o nye anyị amamihe.​—Ilu 2:1-6.

12. Olee ohere ndị anyị nwere iji ihe anyị ma nyere ndị ọzọ aka?

12 Anyịnwa kwanụ? Ànyị ga-ejili amamihe anyị nyere ndị ọzọ aka otú ahụ Jehova na-eme? (Ọma 32:8) Ndị ohu Jehova nwere ọtụtụ ohere ịkụziri ndị ọzọ ihe ha mụtara. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ mgbe, anyị na-azụ ndị nkwusa ọhụrụ ma anyị nọrọ n’ozi ọma. Ndị okenye na-ewetu obi nyere ndị ohu na-eje ozi na ụmụ nwoke mere baptizim aka ka ha mụta ịrụ ọrụ ndị e nyere ha n’ọgbakọ. Ndị bụ́ aka ochie n’ịrụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova nakwa n’ịrụzi ihe mebiri na ha na-enyekwara ndị na-amachaghị ya aka ka ha soro na-arụ ụdị ọrụ ndị ahụ.

13. Mgbe anyị na-azụ ndị ọzọ, olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jehova?

13 Gbalịa ka ị na-eme ka Jehova mgbe ị na-azụ ndị ọzọ. Cheta na Jehova na-eji obi ụtọ enye ndị mmadụ amamihe. Anyịnwa na-emekwa otú ahụ. Anyị na-akụziri ndị ọzọ ihe anyị ma. Anyị anaghị ejichi ihe ụfọdụ anyị ma n’ihi ụjọ na ha ga-anọchi anyị ma ha mụta ya ka anyị. Anyị anaghịkwa ekwu, sị, ‘E nweghị onye zụrụ m. Ya jiri aka ya zụwa onwe ya.’ Ndị Jehova anaghị ekwu otú ahụ. Kama, obi na-adị anyị ụtọ ịkụziri ndị anyị na-azụ ihe anyị ma, ‘na-enyekwa ha onwe anyị.’ (1 Tesa. 2:8) Olileanya anyị bụ na hanwa “ga-erukwa eru nke ọma ịkụziri ya ndị ọzọ.” (2 Tim. 2:1, 2) Ọ bụrụ na anyị niile ana-akụziri ibe anyị ihe anyị ma, anyị niile ga-amakwu ihe ma na-enwekwu obi ụtọ.

O YIE KA NDỊ MMADỤ EJIGHỊ IHE ANYỊ NYERE HA KPỌRỌ IHE

14. Gịnị ka ọtụtụ ndị na-eme ma anyị mesapụrụ ha aka?

14 Anyị mesapụrụ ndị mmadụ aka, karịchaa ụmụnna anyị, ọtụtụ mgbe, ha na-ekele anyị. Ha nwere ike ide ihe n’akwụkwọ, jiri ya kelee anyị, ma ọ bụkwanụ mee ihe ọzọ iji gosi na ihe anyị meere ha dị ha mma. (Kọl. 3:15) Ọ bụrụ na ndị anyị nyere ihe ekelee anyị, obi na-adịkwu anyị ụtọ.

15. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị ekeleghị anyị maka ihe anyị meere ha?

15 Ma n’eziokwu, e nwere ike inwe ndị na-agaghị ekele anyị maka ihe anyị meere ha. Anyị nwere ike iji oge anyị, ike anyị, ma ọ bụ akụ̀ anyị nyere mmadụ aka, ma e mechaa, anyị echewe ma ihe ahụ anyị mere ọ̀ dịkwa onye ahụ mma. Ụdị ihe ahụ mee, gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịkwụsị inwe obi ụtọ ma ọ bụ wewe iwe? Cheta ihe e kwuru n’amaokwu Baịbụl isiokwu a si, nke bụ́ Ọrụ Ndịozi 20:35. Ihe na-eme ka anyị nwee obi ụtọ ma anyị nye mmadụ ihe abụghị ihe onye ahụ mere. Anyị nwere ike ikpebi ịna-enwe obi ụtọ ma anyị nye mmadụ ihe ọ bụrụgodị na o keleghị anyị maka ya. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ka anyị lee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi eme ya.

16. Gịnị kwesịrị ịkacha anyị mkpa ma anyị nyewe mmadụ ihe?

16 Ka ihe kacha gị mkpa bụrụ ime ka Jehova. Jehova na-enye ndị mmadụ ihe ma hà kelere ya ma ọ̀ bụ na ha ekeleghị ya. (Mat. 5:43-48) Jehova kwekwara anyị nkwa na ọ bụrụ na anyị ana-enye ihe otú ahụ ọ na-enye “n’atụwaghị anya inweta ihe ọ bụla,” ‘ụgwọ ọrụ anyị ga-adị ukwuu.’ (Luk 6:35) Ekele nwere ike iso ‘n’ihe ọ bụla’ e kwuru okwu ya. Ma è kelere anyị ma ọ̀ bụ na e keleghị anyị, Jehova ga-akwụ anyị ụgwọ ihe ọma anyị meere ndị mmadụ nakwa n’ihi na anyị “na-eji obi ụtọ enye ihe.”​—Ilu 19:17; 2 Kọr. 9:7.

17. Olee ihe kacha mkpa mere anyị ga-eji na-enye ndị mmadụ ihe? (Luk 14:12-14)

17 Ihe ọzọ anyị nwere ike ime iji na-eme ka Jehova ma anyị nyewe mmadụ ihe bụ ime ihe Jizọs kwuru na Luk 14:12-14. (Gụọ ya.) Ọ dịghị njọ ma anyị lee ndị nwere ike ile anyị ọbịa ọbịa, ma ọ bụ si n’ụzọ ndị ọzọ mesapụrụ ndị nwere ike imere anyị ụdị ihe ahụ aka. Ma, gịnị ka anyị ga-eme ma anyị chọpụta na mgbe ụfọdụ, anyị na-emere ndị mmadụ ihe n’ihi na anyị ma na hanwa ga-emekwara anyị? Anyị kwesịrị ịgbalị mee ihe Jizọs kwuru. Anyị nwere ike imere onye anyị ma na o nweghị otú ọ ga-esi akwụghachi anyị ihe ọma. Anyị mee otú ahụ, obi ga-adị anyị ụtọ n’ihi na anyị na-eme ka Jehova. Ime otú ahụ ga-enyekwara anyị aka inwe obi ụtọ mgbe ndị anyị meere ihe ọma na-ekeleghị anyị.

18. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ime? Maka gịnị?

18 Echela na ndị i meere ihe ọma achọghị ikele gị. (1 Kọr. 13:7) Ọ bụrụ na ndị mmadụ ekeleghị anyị maka ihe ọma anyị meere ha, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ọ̀ bụ na obi adịghị ha mma maka ihe anyị meere ha, ka ọ̀ bụ na ha chefuru ikele anyị maka ya?’ E nwere ike inwe ihe ndị ọzọ mere ha ji ghara ikele anyị otú anyị tụrụ anya ya. O nwere ike ịbụ na ihe ọma anyị meere mmadụ tọgburu ya atọgbu, mana ya esiere ya ike ikwupụta ya ekwupụta. O nwekwara ike ịbụ na ihere na-eme ya na mmadụ nyeere ya aka, karịchaa ma ọ bụrụ na yanwa na-enyere ndị ọzọ aka n’oge gara aga. Nke ọ bụla ọ bụ, otú anyị si hụ ụmụnna anyị n’anya kwesịrị ime ka anyị na-ediri ha ihe ma na-enwe obi ụtọ maka na anyị nyere ha ihe.​—Efe. 4:2.

19-20. Gịnị mere anyị kwesịrị iji nweere ndị ọzọ ndidi ma anyị meere ha ihe? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

19 Na-enwe ndidi. N’ihe gbasara imesapụ aka, Solomọn bụ́ eze ma ihe dere, sị: “Tụpụ achịcha gị n’elu mmiri, n’ihi na ị ga-ahụ ya ọzọ ma ọtụtụ ụbọchị gachaa.” (Ekli. 11:1) Ihe a Solomọn kwuru gosiri na ụfọdụ ndị nwere ike ikele anyị maka ihe ọma anyị meere ha “ma ọtụtụ ụbọchị gachaa,” ya bụ, mgbe ogologo oge gara. Ka anyị lee otu ihe atụ gosiri na ihe a bụ eziokwu.

20 Ọtụtụ afọ gara aga, nwunye otu onye nlekọta sekit ji obi ya niile degara otu nwanna nwaanyị mere baptizim ọhụrụ akwụkwọ ozi, jiri ya gbaa ya ume ka ọ nọsie ike n’ofufe Jehova. Mgbe ihe dị ka afọ asatọ gachara, nwanna nwaanyị ahụ zaghachiri akwụkwọ ozi ahụ. Ọ sịrị nwunye onye nlekọta sekit ahụ: “Obi m gwara m na m kwesịrị idetara gị akwụkwọ ozi ugbu a ka m gwa gị otú i sirila nyere m aka kemgbe ọtụtụ afọ ndị a n’amaghị na i nyeere m aka.” O dekwara, sị: “[Ihe i dere] gbara m ezigbo ume. Mana, ihe kacha ruo m n’obi bụ amaokwu Baịbụl i dere. Anaghị m echefu ya echefu.” a Mgbe o kwuchara banyere ụfọdụ nsogbu o nwere, ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, m chọrọ ịhapụ ihe niile ma kwụsị ife Jehova. Mana, amaokwu Baịbụl ahụ i dere na-abata m n’obi, ya enyere m aka ifere Jehova na-aga.” O dekwara, sị: “E nwebeghị ihe ọ bụla metụrụ m n’obi kemgbe afọ asatọ ahụ ka akwụkwọ ozi ahụ i detaara m.” Chegodị otú obi si tọọ nwunye onye nlekọta sekit ahụ ezigbo ụtọ inweta akwụkwọ ozi ahụ mgbe ‘ọtụtụ ụbọchị gachara.’ Ndị mmadụ nwekwara ike ikele anyị maka ihe ọma anyị meere ha mgbe ogologo oge gachara.

Ndị mmadụ nwere ike ikele anyị maka ihe ọma anyị meere ha mgbe ọtụtụ afọ gachara (A ga-akọwa ya na paragraf nke 20) b


21. Gịnị mere i ji kpebisie ike ịna-emesapụ aka ka Jehova?

21 Dị ka anyị kwuburu, otú Jehova si kee anyị pụrụ iche. Ọ bụ eziokwu na ịnara ihe na-atọ anyị ụtọ, ma obi na-aka atọ anyị ụtọ ma anyị nye ndị ọzọ ihe. Obi na-adị anyị mma ma anyị meere ụmụnna anyị ihe. Obi na-atọkwa anyị ụtọ ma ha kelee anyị maka ya. Ma hà kelere anyị ma ọ̀ bụ na ha ekeleghị anyị, obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na anyị mere ihe anyị kwesịrị ime. Echefula na “Jehova nwere ike inye gị ihe karịrị” ihe ọ bụla i nyere ndị ọzọ. (2 Ihe 25:9) Anyị agaghị enyeli ndị ọzọ ihe Jehova na-agaghị enyeghachili anyị. E nweghịkwanụ ihe ga-eme anyị obi ụtọ karịa na Jehova ji aka ya kwụọ anyị ụgwọ. N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ịna-emesapụrụ ndị ọzọ aka ka Nna anyị nke eluigwe.

ABỤ NKE 17 “Achọrọ M”

a Amaokwu Baịbụl e deere nwanna nwaanyị ahụ bụ 2 Jọn 8, ebe sịrị: “Lezienụ anya ka unu ghara imebi ihe ndị anyị gbara mbọ rụọ, kama ka unu nweta ụgwọ ọrụ zuru ezu.”

b NKỌWA FOTO: E ji foto a na-egosi ebe nwunye onye nlekọta sekit ji obi ya niile degara nwanna nwaanyị ọzọ akwụkwọ ozi ga-agba ya ume. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, ọ natara akwụkwọ ozi nwanna nwaanyị ahụ ji kelee ya maka ihe ahụ o mere.