Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 36

ABỤ NKE 89 Gee Ntị, Rube Isi, Ka A Gọzie Gị

“Na-emenụ Ihe Chineke Kwuru”

“Na-emenụ Ihe Chineke Kwuru”

“Na-emenụ ihe Chineke kwuru. Unu abụla ndị na-anụ naanị ọnụnụ.”​—JEMS 1:22.

IHE A GA-AMỤ

Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịchọsikwu ike ịna-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị na ịna-eche gbasara ihe anyị na-agụ nakwa ịna-eme ya eme ná ndụ anyị.

1-2. Gịnị mere ndị na-efe Chineke ji enwe obi ụtọ? (Jems 1:22-25)

 JEHOVA na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ. Onye dere Abụ Ọma 119:2 sịrị: “Ndị na-eme ihe ọ na-echetara ha na-enwe obi ụtọ, ya bụ, ndị ji obi ha niile na-achọ ya.” Jizọs kwukwara, sị: “Ọ bụ ndị na-anụ okwu Chineke ma na-eme ya na-enwe obi ụtọ.”​—Luk 11:28.

2 Ebe anyị bụ ndị na-efe Jehova, anyị na-enwe obi ụtọ. N’ihi gịnị? E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji enwe obi ụtọ. Ma otu n’ime ha anyị na-ekwesịghị ichefu bụ na anyị na-agụ Okwu Chineke mgbe niile, na-agbalịkwa ime ihe anyị mụtara.​—Gụọ Jems 1:22-25.

3. Olee uru ndị anyị na-erite ma anyị na-eme ihe anyị mụtara n’Okwu Chineke?

3 E nwere ọtụtụ uru ‘ime ihe Chineke kwuru’ na-abara anyị. Nke mbụ bụ na ọ bụ otu ụzọ dị mkpa anyị si eme Jehova obi ụtọ. Ọ na-emekwa anyịnwa obi ụtọ. (Ekli. 12:13) Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị anyị na-amụta n’Okwu Chineke, ezinụlọ anyị ga na-enwekwu obi ụtọ, anyị na ụmụnna anyị ana-adịkwu ná mma. O nwere ike ịbụ na ihe a na-eme ná ndụ gị. Ihe ọzọ bụ na anyị anaghị enwe ọtụtụ nsogbu na-abịara ndị na-anaghị erubere Jehova isi. N’eziokwu, anyị kwetara ihe Eze Devid kwuru. N’abụ ọ bụrụ, mgbe o kwuchara banyere iwu Chineke, ntụziaka ya, na ihe ndị o kpebiri, ọ sịziri: “Onye na-edebe ha na-enweta ụgwọ ọrụ buru ibu.”​—Ọma 19:7-11.

4. Gịnị mere na ọ naghị adị mfe mgbe niile ịgụ Okwu Chineke na ime ihe anyị na-amụta na ya?

4 Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ naghị adịrị anyị mfe mgbe niile ịgụ Okwu Chineke na ime ihe anyị na-amụta na ya. N’agbanyeghị na ihe anyị na-arụ karịrị akarị, anyị kwesịrị iwepụta oge anyị ga-eji na-agụ Baịbụl ma na-amụ ya ka anyị nwee ike ịghọta ihe Jehova chọrọ ka anyị mee. N’ihi ya, ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ nwere ike inyere anyị aka ịna-agụchi Baịbụl anya. Anyị ga-ekwukwa gbasara ihe ga-enyere anyị aka ịna-echebara ihe anyị na-agụ echiche, na-ahụkwa ụzọ ndị anyị nwere ike isi na-eme ha eme ná ndụ anyị.

WEPỤTA OGE Ị GA-EJI NA-AGỤ BAỊBỤL

5. Olee ọrụ ndị na-ewekọrọ oge anyị?

5 Ọtụtụ n’ime ndị Jehova taa na-enwe ọtụtụ ihe ha na-arụ. Anyị na-eji oge buru ibu arụ ọrụ dị iche iche Baịbụl kwuru na ha dị mkpa. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ n’ime anyị na-arụ ọrụ ka anyị nwee ike ịna-egboro onwe anyị na ezinụlọ anyị mkpa. (1 Tim. 5:8) E nwekwara ọtụtụ ndị na-elekọta ndị ikwu ha ahụ́ na-adịghị ma ọ bụ ndị mere agadi. Anyị niile kwesịkwara ịna-elekọta onwe anyị. Ihe a na-ewe oge. E wezụga ọrụ ndị a, anyị nwekwara ọrụ ndị dị ezigbo mkpa anyị na-arụ n’ozi Jehova. Otu n’ime ha bụ ịna-ekwusasi ozi ọma ike. Ebe ọ bụ na i nwere ọrụ ndị a niile, olee otú ị ga-esi na-ewepụta ohere na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-echebara ihe ị gụrụ echiche, na-emekwa ihe ị gụtara?

6. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

6 Ịgụ Baịbụl so ‘n’ihe ndị ka mkpa’ Ndị Kraịst kwesịrị ịna-eme. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji ya kpọrọ ezigbo ihe. (Fil. 1:10) Abụ Ọma nke 1 kwuru banyere onye na-enwe obi ụtọ, sị: “Iwu Jehova na-atọ ya ụtọ, ọ na-agụkwa iwu ya ma na-atụgharị uche na ya ehihie na abalị.” (Ọma 1:1, 2) O doro anya na ihe ihe a pụtara bụ na anyị kwesịrị iwepụta oge na-agụ Baịbụl. Olee oge kacha mma mmadụ ga-eji gụọ Baịbụl? Ihe a bụ ihe onye ọ bụla ga-eji aka ya kpebie. Mana, ihe dị mkpa bụ ka anyị họrọ oge ga-eme ka anyị nwee ike ịna-agụchi ya anya. Otu nwanna aha ya bụ Victor sịrị: “Ọ na-amasị m ịgụ Baịbụl n’ụtụtụ. Ọ bụ eziokwu na anaghị m etetakarị n’oge, ma ọ bụ n’oge a ka m na-anaghị enwecha ihe ga-eme ka uche m pụọ n’ihe m na-agụ. Ebe ọ bụ na isi ka jụrụ m oyi, uche m na-aka adị n’ihe m na-agụ.” O nwekwara ike ịdị gị otú ahụ. Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee oge ga-akachara mụnwa mma ịgụ Baịbụl?’

Olee oge kacha mma mmadụ ga-eji gụọ Baịbụl? Olee oge ị ga-eji na-agụ ya kwa ụbọchị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)


NA-ECHEBARA IHE Ị NA-AGỤ ECHICHE

7-8. Gịnị nwere ike ime ka Baịbụl anyị na-agụ ghara ịbara anyị ezigbo uru? Mee ihe atụ.

7 Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na anyị nwere ike ịna-agụ ọtụtụ ihe n’echebaraghị ha echiche. È nwetụla ihe ị gụrụ, obere oge agaa, e nweghịzi ihe i chetara gbasara ya? E nweghị onye ọ na-emebeghị. Ọ dị mwute na ụdị ihe a nwekwara ike ime anyị ma anyị gụwa Baịbụl. O nwere ike ịbụ na anyị ekpebiela isi ole anyị ga na-agụ na Baịbụl kwa ụbọchị. Ime otú ahụ adịghị njọ. Anyị kwesịrị ikpebi ihe anyị chọrọ ime, gbalịakwa na-eme ya. (1 Kọr. 9:26) Mana, ịgụ Baịbụl abụghị ebe okwu biri. E nwere ihe ọzọ dị mkpa anyị ga-eme ka ịgụ ya baara anyị ezigbo uru.

8 Chegodị gbasara ihe atụ a. Mmiri ozuzo dị ihe a kụrụ akụ ezigbo mkpa. Ma, ọ bụrụ na nnukwu mmiri ezoo n’obere oge, o nwere ike itochi ebe niile. Ụdị ihe ahụ mee, e nweghịzi uru mmiri ọzọ ga-ezo ga-abara ihe a kụrụ akụ. Ọ na-aka mma ma mmiri jiri nwayọọ nwayọọ na-ezo. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ na-aba n’ala, mee ka ihe a kụrụ akụ na-eto. Otú ahụ ka ịgụ Baịbụl dị. Anyị ekwesịghị ịna-agụ Baịbụl ọkụ ọkụ, nke ga-eme ka anyị ghara ichebara ihe anyị na-agụ echiche, ya esiziere anyị ike icheta ya na ime ya eme.​—Jems 1:24.

Mmiri zoo, ọ na-ewetụ oge tupu ala na ihe a kụrụ akụ amịrị ya. Ọ bụ otú ahụ ka anyị kwesịrị iwepụta oge ka anyị nwee ike ichebara ihe anyị gụrụ n’Okwu Chineke echiche ma mee ya emee (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)


9. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị na-agụ Baịbụl ọkụ ọkụ?

9 Ị̀ chọpụtala na e nwere mgbe ụfọdụ ị na-agụ Baịbụl ọkụ ọkụ? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka i kwesịrị ime? Jiri ya nwayọọ. Gbalịa na-echebara ihe ị na-agụ ma ọ bụ ihe ị gụrụ echiche. Ime otú ahụ ekwesịghị isiri anyị ike. Ọ bụrụ na ịtụgharị uche n’ihe ị na-agụ na-ada gị ka ihe siri ezigbo ike, ghọta na naanị ihe a na-agwa gị mee bụ ka i chebara ihe ị na-agụ echiche. I nwere ike ikpebi iwepụtakwu oge ị ga-eji na-amụ ihe ka i nwee ohere ị ga-eji na-echebara ihe ị na-amụ echiche, ma ọ bụkwanụ gị ekpebie ibelata amaokwu ole ị na-agụ, jiri oge fọrọ afọ chebara ihe ị gụrụ echiche. Nwanna Victor anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ebe m na-ekpebi ịgụ na Baịbụl anaghị eto ogologo. O nwere ike ịbụ naanị otu isi. Ebe ọ bụ na m na-agụ ya n’ụtụtụ, m na-enwezi ike ichebara ihe m gụrụ echiche n’ụbọchị ahụ niile.” N’agbanyeghị mgbe ị na-agụ nke gị, ọ dị mkpa ka i jiri nwayọọ na-agụ Baịbụl ka i nwee ike ichebara ihe ị na-agụ echiche.​—Ọma 119:97; gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ajụjụ Ndị Ị Ga-echebara Echiche.”

10. Mee ihe atụ gosiri otú i nwere ike isi chee gbasara otú ị ga-esi eme ihe ị na-amụta. (1 Ndị Tesalonaịka 5:17, 18)

10 N’agbanyeghị mgbe i kpebiri ịna-agụ Baịbụl nakwa nkeji ole i ji agụ ya, gbalịa ka ị na-eme ihe ndị ị na-agụta. Ị gụwa Baịbụl, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú m ga-esi na-eme ihe a m gụtara ugbu a ma ọ bụ n’ọdịnihu?’ Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị na-agụ 1 Ndị Tesalonaịka 5:17, 18. (Gụọ ya.) Ị gụchaa amaokwu abụọ a, i nwere ike ịkwụsịtụ, chee banyere ugboro ole ị na-ekpe ekpere na otú i si ekpe ya. I nwekwara ike iche banyere ihe ndị na-eme gị obi ụtọ. I nwere ike ikpebi na ị ga-ekele Jehova maka ihe atọ o meere gị. Ọ bụrụgodị naanị nkeji ole na ole ka i ji chee gbasara ihe ndị ị mụtara n’ebe ahụ ị gụrụ na Baịbụl, ọ ga-enyere gị aka ịmata otú ị ga-esi eme ihe ebe ahụ kwuru. Chegodị ụdị uru ị ga-erite ma i mewe ihe a kwa ụbọchị n’ebe ndị ọzọ ị gụrụ na Baịbụl. N’eziokwu, ị ga na-efekwu Jehova nke ọma. Mana, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ihe i kwesịrị imekwu nke ọma na ha?

KPEBIE IME IHE NDỊ Ị GA-EMELI

11. Gịnị nwere ike ime ka ike na-agwụ gị mgbe ụfọdụ? Mee ihe atụ.

11 Ị gụwa Baịbụl, ike nwere ike ịgwụ gị ma ị chọpụta na e nwere ọtụtụ ihe i kwesịrị ịna-emekwu nke ọma na ha. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na otu ụbọchị, ị gụtara na Baịbụl na i kwesịghị ịna-ele mmadụ anya n’ihu. (Jems 2:1-8) Ị matara na i kwesịrị ịna-emekwu nke ọma n’otú i si emeso ndị mmadụ, gị ekpebie ịgbanwe. Ọ dị mma otú ahụ. N’echi ya, ị gụrụ ebe gosiri na i kwesịrị ịna-ejide ire gị aka. (Jems 3:1-12) Ị chọpụtara na e nwere mgbe ị na-ekwu ihe na-adịghị mma. N’ihi ya, i kpebiri na ị ga-agbalị na-ekwu ihe ndị dị mma ga na-agba ndị ọzọ ume. N’ụbọchị nke atọ, ị gụtara ebe Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịbụ enyi ụwa. (Jems 4:4-12) Ị chọpụtara na i kwesịrị ịkpacharakwu anya n’ihe ndị i ji atụrụ ndụ. N’ụbọchị nke anọ, i nwere ike iche na ịgbanwe ihe ndị a niile agaghị ekwe gị omume.

12. Gịnị mere na ike ekwesịghị ịgwụ gị ma ọ bụrụ na Baịbụl ị na-agụ egosi na e nwere ihe ụfọdụ i kwesịrị ịgbanwe? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

12 Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ihe i kwesịrị ịgbanwe ma ọ bụ ịna-emekwu nke ọma na ha, ike agwụla gị. O gosiri na i nwere ezigbo obi. Onye dị umeala n’obi, nke na-agwakwa onwe ya eziokwu, na-agụ Baịbụl ka o nwee ike ịhụ ebe ndị o kwesịrị imekwu nke ọma na ha. a Chetakwa na ‘iyiri àgwà ọhụrụ’ abụghị ihe a na-eme otu ugboro kwụsị. (Kọl. 3:10) Gịnị ga-enyere gị aka ịna-emekwu ihe ị na-amụta n’Okwu Chineke?

13. Olee otú i nwere ike isi eme ihe ị na-amụta? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

13 Kama ịgbalịwa ka i mee ihe niile ị gụtara na Baịbụl otu mgbe, i nwere ike ịgbalị mewe otu ma ọ bụ abụọ n’ime ha. (Ilu 11:2) Lee ihe i nwere ike ime. Depụta ihe ndị i kwesịrị imewe nke ọma na ha. Họrọ otu ma ọ bụ abụọ ị ga-ebu ụzọ mee, hapụkwa ndị nke ọzọ ị ga-eme ka oge na-aga. Olee ebe ị ga-ebido?

Kama ịgbalịwa ka i mee ihe niile ị gụrụ na Baịbụl otu mgbe, ọ ga-adị mma ka i jiri nwayọọ na-eme ha. I nwere ike iji otu ma ọ bụ abụọ n’ime ha bido (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 14)


14. Olee nke i nwere ike ikpebi iji malite?

14 I nwere ike ikpebi ịmalite na nke ga-akara gị mfe, ma ọ bụ gị ekpebie ịmalite na nke ị kacha kwesị imekwu nke ọma na ya. I kpebihaala nke ị ga-eji bido, mee nchọnchọ gbasara ya. I nwere ike iji Ọ́bá Akwụkwọ Anyị nke Dị n’Ịntanet ma ọ bụ Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ mee ya. Kpee ekpere banyere ihe ahụ i kpebiri ime. Rịọ Jehova ka o mee ‘ka i nwee mmasị ime ya, nyekwa gị ike i ji eme ya.’ (Fil. 2:13) Gbalịzie ime ihe ị mụtara. I mee ihe nke mbụ i kpebiri ime, o nwere ike ime ka ọ na-agụkwu gị agụụ ime ọzọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ị chọpụta na ị gbanweliri otu àgwà na-adịghị mma ị na-akpa ma ọ bụ mekwuo nke ọma n’otu n’ime àgwà Ndị Kraịst kwesịrị ịna-akpa, o nwere ike ịdịrị gị mfe ịna-emekwu nke ọma n’ihe ndị ọzọ.

KWE KA OKWU CHINEKE ‘NA-AKPA IKE N’IME GỊ’

15. Olee otú ndị Jehova si dịrị iche n’ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl? (1 Ndị Tesalonaịka 2:13)

15 Ụfọdụ ndị na-ekwu na ha agụọla Baịbụl ọtụtụ ugboro. Ma, hà kwetara ihe Baịbụl na-akụzi? Hà na-eme ya eme ma ọ bụ kwe ka ọ gbanwee ndụ ha? Ọ dị mwute na ọtụtụ mgbe, azịza ya na-abụ mba. Ma ndị Jehova adịghị otú ahụ. Anyị kwetara na Baịbụl bụ “okwu Chineke. N’eziokwu, ọ bụ okwu Chineke” otú ahụ Ndị Kraịst n’oge ndịozi kwetara. Anyị na-agbalịkwa ịna-eme ya eme ná ndụ anyị.​—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:13.

16. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịbụ ndị na-eme ihe Chineke kwuru?

16 Ịgụ Okwu Chineke na ime ihe o kwuru anaghị adị mfe mgbe niile. O nwere ike isiri anyị ike inweta ohere anyị ga-eji na-agụ ya ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na anyị na-agụ ya ọkụ ọkụ n’echebaraghị ihe anyị gụrụ echiche. Ike nwekwara ike ịna-agwụ anyị n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị mewe nke ọma na ha. N’agbanyeghị nke na-esiri gị ike, ike agwụla gị. Jehova ga-enyere gị aka gị emerie ya. Ka anyị kpebisie ike ikwe ka o nyere anyị aka ka anyị nwee ike ịbụ ndị na-eme ihe o kwuru, ọ bụghị ndị na-echefu ihe ha nụrụ. O doro anya na ka anyị na-agụkwu Okwu Chineke, na-emekwa ihe ndị anyị na-amụta, obi ga na-adịkwu anyị ụtọ.​—Jems 1:25.

ABỤ NKE 94 Anyị Na-ekele Chineke Maka Okwu Ya

a Gaa na jw.org lee vidio isiokwu ya bụ Ihe Ndị Na-eto Eto Ibe Gị Kwuru​—Ịgụ Baịbụl.