ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Febụwarị 2016

Ihe dị́ n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite n’Eprel 4 ruo Mee 1, 2016.

Jehova Kpọrọ Ya “Enyi M”

Ị̀ ga-achọ ka gị na Jehova bụrụ enyi? Ihe Ebreham mere ga-enyere gị aka.

Na-eṅomi Ndị Ha na Jehova Bụ Ezigbo Enyi

Olee otú Rut, Hezekaya, na Meri si mee ka ha na Chineke bụrụ ezigbo enyi?

Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Jehova

Ihe Jọnatan mere nwere ike inyere anyị aka ịna-akwado Jehova n’ụzọ dị iche iche. Anyị ga-atụle anọ n’ime ha.

Mụta Ihe n’Aka Ndị Ji Obi Ha Niile Kwado Jehova

Olee otú Devid, Jọnatan, Netan, na Hushaị si gosi na ha ji ịkwado Jehova kpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla ọzọ?

AKỤKỌ NDỤ

Jehova Mere Ka Ozi M Jeere Ya Gaa Nke Ọma

Corwin Robison jeere Chineke ozi afọ iri asaa na atọ. Ọ rụrụ ọrụ ihe karịrị afọ iri isii na Betel dị́ n’Amerịka.

Jiri Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi

Ichebara ihe atọ Baịbụl kwuru echiche nwere ike inyere gị aka ka ị na-enwe ọṅụ.