Jiri Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi
CHEGODỊ echiche. Olee ụbọchị ị kacha nwee obi ụtọ? Ọ̀ bụ ụbọchị ị gbara akwụkwọ, ka ọ̀ bụ ụbọchị a mụrụ nwa mbụ gị? Ì chere na ọ bụ ụbọchị e mere gị baptizim? O nwere ike ịbụ ya bụ ụbọchị ị na-agaghị echefu echefu na ụbọchị ị kacha nwee obi ụtọ. Obi tọrọ ụmụnna gị niile ụtọ ụbọchị ahụ ịhụ otú i si gosi na i ji obi gị dum, mkpụrụ obi gị dum, uche gị dum nakwa ike gị dum hụ Chineke n’anya.—Mak 12:30.
Ọ ga-abụ na kemgbe ahụ e mechara gị baptizim, i ji ezigbo ọṅụ na-ejere Jehova ozi. Ma, ụfọdụ ndị nkwusa anaghịzi enwe ọṅụ otú ha na-enwebu. N’ihi gịnị? Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-enwe ọṅụ n’ozi anyị na-ejere Jehova?
IHE MERE ỤFỌDỤ NDỊ ANAGHỊZI ENWE ỌṄỤ
Ozi ọma Alaeze Chineke na-eme ka anyị na-enwe ezigbo ọṅụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova kwere nkwa na Alaeze ya ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya ma weta ụwa ọhụrụ ya. Zefanaya 1:14 gwara anyị, sị: “Oké ụbọchị Jehova dị nso. Ọ dị nso, o jikwa oké ọsọ na-abịa.” Ma ọ bụrụ na ọ dị anyị ka ànyị ga-echere ogologo oge karịa otú anyị tụrụ anya ya, e nwere ike anyị agaghịzi na-enwe ọṅụ otú anyị na-enwebu. O nwere ike ime ka anyị selata aka n’ozi anyị na-ejere Chineke.—Ilu 13:12.
Ọ bụrụ na anyị na ụmụnna anyị na-anọrị, ọ ga-eme ka anyị jiri ọṅụ na-ejere Jehova ozi. O nwere ike ịbụ àgwà ọma ndị na-efe Jehova na-akpa mere ka anyị bata n’ọgbakọ, meekwa ka anyị jiri ọṅụ malite ijere Chineke ozi. (1 Pita 2:12) Ma, olee ihe nwere ike ime ma á dọọ nwanna aka ná ntị n’ọgbakọ n’ihi na ọ dara iwu Chineke? O nwere ike ime ka ụfọdụ ụmụnna dawa mbà, ha agaghịzi enwe ọṅụ otú ha na-enwebu.
Ịchụ ego ọnwụ ọnwụ nwekwara ike ime ka anyị ghara ịna-enwe ọṅụ otú anyị na-enwebu. Olee otú o nwere ike isi mee? Ụwa Setan na-agbalị ime ka anyị kweta na anyị kwesịrị ịzụ ihe na-adịghị anyị mkpa. N’ihi ya, ka anyị na-echeta na Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” (Matiu 6:24) Anyị agaghị ejili ọṅụ na-ejere Jehova ozi, na-agbalịsikwa ike ka anyị nweta ihe niile anyị nwere ike inweta n’ụwa a.
NA-ENWE ỌṄỤ N’OZI JEHOVA
Ijere Jehova ozi anaghị abụrụ ndị hụrụ Jehova n’anya ibu arọ. (1 Jọn 5:3) Cheta na Jizọs sịrị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, mkpụrụ obi unu ga-enweta ume. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:28-30) Ịbụ ezigbo Ndị Kraịst na-eme ka ahụ́ ruo anyị ala, na-emekwa ka anyị nwee ọṅụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ezigbo ihe mere anyị ji kwesị ịna-enwe ọṅụ n’ozi Jehova. Ka anyị leba anya n’atọ n’ime ha.—Habakọk 3:18.
Anyị na-efe Onye nyere anyị ndụ, bụ́ Chineke obi ụtọ. (Ọrụ Ndịozi 17:28; 1 Timoti 1:11) Anyị ghọtara na ọ bụ Onye kere anyị nyere anyị ndụ. N’ihi ya, ka anyị jiri ọṅụ na-ejere ya ozi n’agbanyeghị afọ ole gaferela kemgbe e mere anyị baptizim.
E nwere otu nwanna aha ya bụ Héctor. Ọ bụ onye nlekọta sekit ruo afọ iri anọ. Ruokwa ugbu a ọ karala nká, ijere Jehova ozi ka na-eme ya obi ụtọ. (Abụ Ọma 92:12-14) Ọrịa nwunye ya emeela ka ọ ghara ịna-eme ihe niile ọ chọrọ ime n’ozi Chineke, ma ọ ka na-enwe ọṅụ. Ọ sịrị: “Ọ bụ eziokwu na ọ na-ewute m ịhụ ka ọrịa nwunye m ji nwayọọ nwayọọ na-aka njọ, ya ana-esikwara m ike ilekọta ya, ekwebeghị m ka o mee ka m ghara ịna-enwe obi ụtọ n’ozi Chineke. M kwesịrị ịhụ Jehova n’anya ma jiri obi m niile na-ejere ya ozi n’ihi na m ma na ọ bụ ya nyere m ndụ, e nwekwara ihe o bu n’obi kee mmadụ. M na-agba mbọ ịna-ekwusasi ozi ọma ike, na-agbalịsikwa ike ịna-echekarị ihe Alaeze Chineke ga-emere anyị ka m ghara ịkwụsị ịna-enwe ọṅụ.”
Jehova nyere ihe mgbapụta, nke mere ka anyị nwee ike ịna-enwe ọṅụ. N’eziokwu, “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Chineke nwere ike ịgbaghara mmehie anyị, anyị enwetakwa ndụ ebighị ebi, ma ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ Chineke nyere maka na ọ hụrụ anyị n’anya. N’eziokwu, nke a kwesịrị ime ka anyị na-ekele ya. Obi ụtọ anyị na-enwe n’ihi ihe mgbapụta ahụ ga-eme ka anyị jiri ọṅụ na-ejere Jehova ozi.
Otu nwanna bibụ na Meksiko aha ya bụ Jesús sịrị: “M na-agbaburu ọrụ m ohu. Mgbe ụfọdụ, m na-arụ ọrụ ọtụtụ awa kwa ụbọchị karịa otú m kwesịrị, n’agbanyeghị na ọ bụghị iwu na m ga-eme otú ahụ. Naanị ihe mere m ji na-eme ya bụ ka m nwetakwuo ego. M mechara mụta banyere Jehova nakwa otú o si jiri Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya chụọ àjà maka ụmụ mmadụ. M chọsiri ike ịna-ejere ya ozi. N’ihi ya, m nyefere Jehova onwe m. Mgbe m rụchaara ụlọ ọrụ anyị ọrụ afọ iri abụọ na asatọ, m kpebiri ịgba arụkwaghịm ma malite ije ozi oge niile.” Ọ bụ otú a ka Jesús si malite iji ọṅụ na-ejere Chineke ozi.
Anyị na-enwe obi ụtọ maka na anyị na-eme omume ọma. Ì chetara ụdị ndụ ị na-ebi tupu gị amata Jehova? Pọl onyeozi chetaara Ndị Kraịst nọ́ na Rom na ha ‘bụbu ndị ohu mmehie,’ ma ha Ndị Rom 6:17-22) Anyịnwa na-emekwa ihe Jehova kwuru. Ọ bụ ya mere na obi anaghị agbawa anyị n’ihi ibi ndụ rụrụ arụ ma ọ bụ ime ihe ike. O so n’ihe mere anyị ji enwe ọṅụ.
ghọrọ “ndị ohu nke ezi omume.” Ebe ọ bụ na ha na-eme omume ọma, ha nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (E nwere nwanna aha ya bụ Jaime. O kwebughị na Chineke. O kweere na e keghị mmadụ eke, ọ na-akụkwa ọkpọ. Ọ malitere ịga ọmụmụ ihe. Otú ụmụnna si hụ ibe ha n’anya metụrụ ya n’obi. Jaime rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka ikwere na ya, ka o nwee ike ịgbanwe ụdị ndụ ọ na-ebi. Ọ sịrị: “Nwayọọ nwayọọ, achọpụtara m na Chineke dị adị nakwa na ọ bụ Nna hụrụ anyị n’anya, na-emekwa ebere. Idebe iwu Jehova emeela ka m ghara ịba ná nsogbu. A sị na mụ agbanweghị, o nwere ike ịbụ na e gbuola m otú e gburula ụfọdụ ndị bụbu enyi m mụ na ha na-akụ ọkpọ. Ọ bụ afọ ndị m ji jeere Jehova ozi ka m kacha nwee obi ụtọ.”
ADALA MBÀ
Olee otú obi kwesịrị ịdị anyị ka anyị na-eche ka e bibie ụwa ochie a? Cheta na anyị na-eme uche Chineke nakwa na anyị na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, “ka anyị ghara ịda mbà n’ime ihe dị mma, n’ihi na mgbe oge ruru, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.” (Ndị Galeshia 6:8, 9) Ebe Jehova na-enye anyị ike, ka anyị na-atachi obi, na-agbalịsikwa ike inwe àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịlanahụ ‘oké mkpagbu’ na-abịanụ ma jiri ọṅụ na-ejere Jehova ozi.—Mkpughe 7:9, 13, 14; Jems 1:2-4.
Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-akwụ anyị ụgwọ maka na anyị na-atachi obi n’ihi na ọ ma ọrụ anyị na-arụ nakwa otú anyị si egosi na anyị hụrụ ya n’anya, jirikwa aha ya kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na anyị ejiri ọṅụ na-ejere ya ozi, anyị ga-adị ka ọbụ abụ bụ́ Devid, onye sịrị: “Emewo m ka Jehova nọrọ n’ihu m mgbe niile. N’ihi na ọ nọ m n’aka nri, a gaghị eme ka m maa jijiji. Ya mere, obi m na-aṅụrị ọṅụ, ihe niile dị ebube n’ime m na-enwe aṅụrị. Anụ ahụ́ m ga-ezukwa ike.”—Abụ Ọma 16:8, 9.