Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
Baịbụl ò nwere ike inyere gị aka ka gị na Chineke bụrụ enyi?
ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU . . .
na ha agaghị abụli enyi Chineke n’ihi na ha bụ ndị mmehie. Ndị ọzọ na-ekwu na ihe banyere anyị anaghị emetụ Chineke n’obi. Gịnị ka i chere?
IHE BAỊBỤL KWURU
Chineke “na ndị na-eme ihe n’eziokwu na-enwe mmekọrịta chiri anya.” (Ilu 3:32) Ọ bụrụ na anyị ana-erubere Chineke isi, anyị na ya ga-abụ enyi.
OLEE IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL?
Chineke chọrọ ka anyị na ya bụrụ enyi.—Jems 4:8.
Chineke bụ enyi anyị. Ọ dị njikere ịgbaghara anyị ma nyere anyị aka.—Abụ Ọma 86:5.
Ndị enyi Chineke na-eme ihe dị Chineke mma, ha na-akpọkwa ihe Chineke kpọrọ asị, asị.—Ndị Rom 12:9.