Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Ndị Chineke Merela?

Olee Ihe Ndị Chineke Merela?

Ihe ga-enyere gị aka ịmata mmadụ nke ọma bụ ịmata ihe ndị onye ahụ merela nakwa nsogbu ndị o dirila. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmata onye Chineke bụ́ nke ọma, anyị kwesịrị ịmụ gbasara ihe ndị o merela n’oge gara aga. Nke ahụ ga-enyere anyị aka ịmata otú ihe ndị o mere nwere ike isi bara anyị uru ugbu a nakwa n’ọdịnihu.

CHINEKE KERE IHE NIILE MAKA ỌDỊMMA ANYỊ

Ọ bụ Jehova Chineke kere ihe niile. A na-ahụkwa “àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya . . . nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu, n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke.” (Ndị Rom 1:20) “Ọ bụ ya bụ Onye ji ike ya kee ụwa, Onye jikwa amamihe ya mee ka elu ala guzosie ike, Onye jikwa nghọta ya setịa eluigwe.” (Jeremaya 10:12) Ihe ndị Chineke kere eke na-egosị na ọ hụrụ anyị n’anya.

Otú Chineke si kee anyị “n’onyinyo ya” gosiri na o kere anyị n’ụzọ pụrụ iche. (Jenesis 1:27) Ihe ọ pụtara bụ na o kere anyị otú anyị ga-enweli ike ịna-akpatụ ọmarịcha àgwà ndị o nwere. O kere anyị ka anyị nwee ike ịghọta otú o si ele ihe anya na ihe ndị na-amasị ya. Ọ bụrụ na anyị ejisie ike na-eme ihe ndị a, anyị ga na-enwe ezigbo obi ụtọ ná ndụ. Ihe ọzọkwa bụ na anyị nwere ike ịbụ enyi ya.

Ihe ndị Chineke kere n’ụwa na-egosị na ihe gbasara anyị na-emetụ ya n’obi. Pọl onyeozi kwuru na Chineke ‘ahapụghị onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe o mere ihe ọma, na-enye anyị mmiri ozuzo site n’eluigwe, na oge mkpụrụ ji amị, na-enyekwa anyị nri n’ụba, na-emekwa ka anyị nwee obi ụtọ.’ (Ọrụ Ndịozi 14:17) Ọ bụghị naanị ihe ndị dị anyị mkpa iji dị ndụ ndụ ka Chineke nyere anyị. O nyere anyị ọtụtụ ihe ndị ọzọ, n’ụdị ha dị iche iche, ka ndụ nwee ike ịna-atọ anyị ụtọ. Ma, e nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ o bu n’obi imere anyị.

Jehova kere ụwa a ka ụmụ mmadụ biri na ya ruo mgbe ebighi ebi. Baịbụl kwuru, sị: “Ụwa ka o nyere ụmụ mmadụ,” nakwa na ‘o keghị ya n’efu, ọ kpụrụ ya ka e biri n’ime ya.’ (Abụ Ọma 115:16; Aịzaya 45:18) Ole ndị ga-ebi n’ụwa a, afọ ole ka ha ga-ebi na ya? “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.

Ọ bụ ya mere na mgbe Jehova kere nwoke mbụ na nwaanyị mbụ bụ́ Adam na Iv, o tinyere ha na paradaịs ka ha “na-akọ ihe na ya ma na-elekọta ya.” (Jenesis 2:8, 15) O nyere ha ọrụ abụọ na-eme obi ụtọ. Ọ sịrị ha: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu.” (Jenesis 1:28) N’oge ahụ, Adam na Iv nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ma, ọ dị mwute na ha nupụụrụ Chineke isi si otú ahụ tụfuo ọmarịcha ohere ha nwere iso ná “ndị ezi omume ga-enweta ụwa.” Ma, anyị ga-emecha hụ na ihe a ha mere agbanweghị ihe Jehova bu n’obi kee anyị. Ka anyị burugodị ụzọ tụlee ihe ọzọ Chineke merela.

CHINEKE NYERE ANYỊ OKWU YA

A na-akpọ Baịbụl Okwu Chineke. Gịnị mere Chineke ji nye anyị Baịbụl? Ihe kacha mkpa mere o ji nye anyị ya bụ ka anyị mụtakwuo gbasara ya. (Ilu 2:1-5) N’eziokwu, Baịbụl anaghị aza ajụjụ niile anyị nwere gbasara Chineke. O nweghịkwanụ akwụkwọ nwere ike ịza ha niile. (Ekliziastis 3:11) Ma, ihe niile dị na Baịbụl na-enyere anyị aka ịmata Chineke. Anyị na-esi na ya amata onye ọ bụ, otú o si emeso ụmụ mmadụ ihe, ihe mmadụ ga-eme ka ya na Chineke dịrị ná mma na ihe ọ ga-abụ mmadụ mee ya na ya agaghị adị ná mma. (Abụ Ọma 15:1-5) Anyị na-esikwa na ya amata otú anyị ga-esi na-efe ya, otú anyị kwesịrị isi na-akpa àgwà, na otú anyị ga-esi na-ele ihe onwunwe anya. Ihe kacha enyere anyị aka ịmata ụdị onye Chineke bụ bụ ihe ndị Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst mere na ihe ndị o kwuru e dere na Baịbụl.—Jọn 14:9.

Ihe ọzọ mere Jehova ji nye anyị Baịbụl bụ ka anyị nwee ike ịmata ihe ndị anyị ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ná ndụ. Na Baịbụl, Jehova gwara anyị otú ezinụlọ anyị ga-esi na-enwe obi ụtọ, otú ihe anyị nwere ga-esi na-eju anyị afọ, nakwa otú anyị ga-esi ghara ịna-echegbu onwe anyị. Dị ka anyị ka ga-ahụ n’akwụkwọ a, Baịbụl zara ajụjụ ndị kacha mkpa ná ndụ. Ajụjụ ndị dị ka: Gịnị mere ahụhụ ji ju n’ụwa a? Olee otú ọdịnihu ga-adị? Ọ kọwakwara ihe Chineke merela iji hụ na ihe o bu n’obi kee ụwa ga-emezu.

E nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ gosiri na Baịbụl bụ akwụkwọ pụrụ iche, nakwa na ọ bụ naanị Chineke ga-enyeli anyị ụdị akwụkwọ a. Ọ bụ ihe dị ka ụmụ nwoke iri anọ dere Baịbụl, o wekwara ha ihe dị ka otu puku afọ na narị isii iji dee ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ha niile dere kwekọrọ, n’ihi na ọ bụ Jehova nwe ihe e dere na ya. (2 Timoti 3:16) Baịbụl adịghị ka akwụkwọ ndị ọzọ e dere n’oge ochie. Ihe ndị e dere na ya ka dịkwa otú ha dị n’agbanyeghị na ọ dịla anya e dere ha. Ọtụtụ puku akwụkwọ mpịakọta ndị e ji dee Baịbụl n’oge ochie a ka nwere taa gosiri na nke a bụ eziokwu. Ihe ọzọkwa bụ na Baịbụl ka dịkwa taa n’agbanyeghị mbọ niile ndị mmadụ gbarala ka a ghara ịsụgharị ya, ikesa ya ma ọ bụ ịgụ ya. Ọ bụ ya bụ akwụkwọ a kacha asụgharị ma na-ekesa n’ụwa taa. Otú a Baịbụl si ka dịrị taa gosiri na “okwu Chineke anyị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịzaya 40:8.

JEHOVA MERE KA OBI SIE ANYỊ IKE NA Ọ GA-EMEZU NZUBE YA

Ihe ọzọ bụ na Chineke mere ihe pụrụ iche mere ka obi sie anyị ike na ọ ga-emezu nzube ya. Dị ka anyị kwuru na mbụ, Chineke kere ụmụ mmadụ ka ha biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe Adam kpachaara anya mehie Chineke, ọ tụfuru ohere ya na ụmụ ọ ga-amụta nwere ịdị ndụ ebighị ebi. Baịbụl kwuru, sị: “N’ihi ya, dị nnọọ ka mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Isi ahụ Adam nupụụrụ Chineke mere ka o yie ka ihe Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ agaghị emezu. Olee ihe Jehova mere maka ya?

A na-ahụ àgwà Jehova n’ihe niile ọ na-eme. Ebe ọ bụ na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, o mere ka ha buru ihe ha metara. Ma, o mere ka ụmụ ha ga-amụta nwee olileanya. Jehova ji amamihe ya kpebie ihe ọ ga-eme gbasara ihe ahụ merenụ, ọ bụ ya mere o ji kwuo ozugbo ihe ọ ga-eme iji mezie ya. (Jenesis 3:15) Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ́ Ọkpara Chineke ka Chineke ga-eji gbapụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ. Olee ihe ọ ga-eme iji gbapụta ụmụ mmadụ?

Ihe Chineke mere iji gbapụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie Adam bụ na o zitere Jizọs n’ụwa ka ọ kụziere ụmụ mmadụ ihe ha ga-eme ka ha nweta ndụ, nakwa ka ‘o nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ a (Matiu 20:28; Jọn 14:6) Ihe mere Jizọs ji ruo eruo ịgbapụta ụmụ mmadụ bụ n’ihi na o zuru okè otú ahụ Adam zuru na mbụ. Ma, Jizọs adịghị ka Adam n’ihi na ọ nọgidere na-erubere Chineke isi, ọbụna ruo ọnwụ. Ebe ọ bụ na o nweghị ihe Jizọs metara ọ ga-eji anwụ, Jehova kpọlitere ya n’ọnwụ, ya alaghachi eluigwe. Jizọs mere ihe Adam na-emelighị, ya bụ, ime ka ụmụ mmadụ niile na-erubere Chineke isi biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. “N’ihi na ebe ọ bụ na e mere ka ọtụtụ mmadụ ghọọ ndị mmehie site ná nnupụisi nke otu onye ahụ, otú ahụkwa ka a ga-eme ka ọtụtụ mmadụ ghọọ ndị ezi omume site ná nrubeisi nke otu onye ahụ.” (Ndị Rom 5:19) Jehova ga-emezu ihe o bu n’obi, ya bụ, ime ka ụmụ mmadụ biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi n’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ.

Ihe Chineke mere gbasara nnupụisi Adam mere ka anyị ghọtakwuo ụdị onye ọ bụ. Anyị aghọtala na o nweghị ihe ga-eme ka Jehova ghara ime ihe ahụ o bu n’obi. Ihe o kwuru ‘ga-emezu.’ (Aịzaya 55:11) Anyị na-aghọtakwa na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. “Ọ bụ site n’ihe a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ebe anyị nọ, n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site n’aka ya. Ịhụnanya ahụ si otú a dịrị, ọ bụghị na ọ bụ anyị hụrụ Chineke n’anya, kama na ọ bụ ya hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ àjà ime udo maka mmehie anyị.”—1 Jọn 4:9, 10.

Chineke ‘azọghị ọbụna Ọkpara nke ya kama o nyefere ya maka anyị niile.’ N’ihi ya, obi siri anyị ike na Chineke ‘ga-eji obiọma nye anyị ihe niile ọzọ.’ (Ndị Rom 8:32) Olee ihe Chineke kwere anyị ná nkwa? Ị ga-achọpụta ya ma ị gụọ isiokwu ndị na-esonu.

OLEE IHE NDỊ CHINEKE MERELA? Jehova kere ụmụ mmadụ ka ha dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa. O nyere anyị Baịbụl ka anyị nwee ike ịmụta banyere ya. Jehova ji Jizọs Kraịst gbapụta anyị, si otú ahụ mee ka nzube ya mezuo

a Ị chọọ ịmatakwu gbasara ihe mgbapụta ahụ, gụọ isi nke 27 n’akwụkwọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ọ dịkwa na www.pr418.com.