Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
Ọtụtụ ndị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. Ma, ì chetụla ihe Alaeze Chineke bụ na ihe ọ ga-eme?
LEGODỊ IHE BAỊBỤL KWURU GBASARA YA:
Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
Ọ bụ ọchịchị dị n’eluigwe, nke Jizọs Kraịst bụ Eze ya.—Aịzaya 9:6, 7; Matiu 5:3; Luk 1:31-33.
Olee ihe Alaeze Chineke ga-eme?
Ọ ga-akwụsị ihe ọjọọ niile ma mee ka ụmụ mmadụ nwee ezigbo udo n’ụwa. —Daniel 2:44; Matiu 6:10.
Olee ihe ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke pụtara?
Ọ pụtara ịkwado Alaeze Chineke nakwa inwe obi ike na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụwa dịrị otú Chineke chọrọ.—Matiu 6:33; 13:44.