Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu
Ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga, Jehova Chineke gwara ndị na-efe ya ihe ha ga-eme ka ihe dịrị ha ná mma. Ọ gwara ha, sị: “Agwala m unu ihe abụọ unu ga-ahọrọ otu n’ime ha. Ha bụ ndụ na ọnwụ, ka a gọzie unu ma ọ bụ ka a bụọ unu ọnụ. Unu ga-ahọrọ ndụ ka unu wee dịrị ndụ, unu na ụmụ unu.”—Diuterọnọmi 30:19.
Ha chọọ ka ihe dịrị ha ná mma, ha ga na-eme ihe Chineke chọrọ ka ha mee. Ọ bụkwa ihe anyịnwa kwesịrị ime. Baịbụl gwara anyị ihe anyị ga-eme ka ihe dịrị anyị ná mma n’ọdịnihu. Ọ sịrị: “Otú unu ga-esi eme ya bụ na unu ga-ahụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya, na-ege ntị n’olu ya.”—Diuterọnọmi 30:20.
OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI AHỤ JEHOVA N’ANYA MA NA-EGE NTỊ N’OLU YA?
NA-AMỤ BAỊBỤL: Ka i nwee ike ịhụ Jehova n’anya, ị ga-ebu ụzọ mụọ Baịbụl ka ị mata onye ọ bụ. Ka ị na-amụ Baịbụl, ị ga-achọpụta na ọ hụrụ gị n’anya nakwa na ọ chọrọ ka ihe dịrị gị ná mma. Ọ chọrọ ka ị na-ekpegara ya ekpere ‘n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na ị gbaa mbọ bịaruo Chineke nso, ‘ọ ga-abịarukwa gị nso.’—Jems 4:8.
NA-EME IHE NDỊ Ị MỤTARA NA BAỊBỤL: Ige Chineke ntị pụtara ịna-eme ihe ndị ị mụtara na Baịbụl. Ị na-eme otú ahụ, ‘ihe ga na-agaziri gị, ị ga na-akpakwa àgwà ka onye ma ihe.’—Joshụa 1:8.