Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Anyị Ga-ahụ na Paradaịs!”

“Anyị Ga-ahụ na Paradaịs!”

“Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”​—LUK 23:43.

ABỤ: 145, 139

1, 2. Olee echiche dị iche iche ndị mmadụ nwere banyere paradaịs?

ỌTỤTỤ ụmụnna si ná mba dị iche iche bịa mgbakọ e nwere n’obodo Sol dị na Koria. Ka ha si n’ámá egwuregwu ebe a nọ nwee mgbakọ ahụ na-apụ, ụmụnna ndị Koria gbara ha gburugburu. Ka ha na-efere ibe ha aka, anya mmiri nọ na-agba ha, ha ana-agwa ibe ha, sị: “Anyị ga-ahụ na Paradaịs.” Olee paradaịs i chere ha na-ekwu okwu ya?

2 Ndị mmadụ nwere echiche dị iche iche banyere ihe paradaịs pụtara. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ikwere na a ga-enwe paradaịs n’ụwa a bụ ịmụ anya arọ nrọ. Ndị ọzọ na-ekwu na paradaịs bụ ebe ha na-ekpori ndụ ma na-enwe obi ụtọ. Onye na-ahụghị tụrụ rachaa nọ na tebụl nri gbọrọ kasaa na-eri nri nwere ike ịna-eche na ya nọ na paradaịs. Ọtụtụ afọ gara aga, mgbe otu nwaanyị hụrụ ndagwurugwu mara ezigbo mma okooko osisi juru, obi tọrọ ya ụtọ, ya ekwuo, sị: “Ebe a bụ paradaịs.” Ndị mmadụ ka na-akpọ ebe ahụ Paradaịs, ọ bụ eziokwu na nnukwu sno na-ada na ya kwa afọ. Ị nụ banyere Paradaịs, olee ihe i chere ọ pụtara? Ị̀ na-atụ anya ya?

3. Olee mgbe mbụ e kwuru banyere Paradaịs na Baịbụl?

3 Baịbụl kwuru banyere paradaịs e nwere n’oge ochie nakwa nke a ga-enwe n’ọdịnihu. Ebe mbụ anyị gụrụ banyere ya bụ n’akwụkwọ mbụ nke Baịbụl. Na Baịbụl Douay Version nke ndị Katọlik e si n’asụsụ Latịn sụgharịta, Jenesis 2:8, kwuru, sị: “Onyenwe Anyị Chineke kere “paradaịs obi ụtọ” na mbụ: ọ bụ ebe ahụ ka o mere ka [Adam] ọ kpụrụ nọrọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ndị ahụ ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo.) Baịbụl e dere n’asụsụ Hibru kpọrọ ya ogige Iden. Ihe Iden pụtara bụ “Obi Ụtọ.” N’eziokwu, ogige ahụ mara ezigbo mma. Nri bụ atụrụ tawa na ya, ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ bikwa n’udo.—Jen. 1:29-31.

4. Olee ihe mere anyị ga-eji kpọọ ogige Iden paradaịs?

4 Okwu Hibru e si sụgharịa “ogige” ka a sụgharịrị Pa·raʹdei·sos n’asụsụ Grik. Akwụkwọ ọkọwa okwu, nke M’Clintock na Strong dere, kwuru na onye Grik nụ banyere pa·raʹdei·sos, ihe ga-agbata ya n’obi bụ nnukwu ogige mara mma na-enweghị ihe ọ bụla nwere ike imerụ mmadụ ahụ́, nke nwere nnukwu osisi ndị na-amị ụdị mkpụrụ dị iche iche, nweekwa ọtụtụ ezigbo iyi ahịhịa juru n’akụkụ ya, bụ́ ebe ìgwè ele na atụrụ nwere ike ịna-ata nri.—Tụlee Jenesis 2:15, 16.

5, 6. Olee ihe mere Paradaịs ji kwaa Adam na Iv? Olee ihe ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche banyere Paradaịs?

5 Chineke mere ka Adam na Iv biri n’ogige ahụ a kpọrọ paradaịs, ma ha anọgideghị na ya. N’ihi gịnị? Ha nupụụrụ Chineke isi, ya emee ka ha ghara iruzi eru ibi na ya. Otú a ka Paradaịs si kwaa ma ha ma ụmụ ha. (Jen. 3:23, 24) Ọ bụ eziokwu na e nweghịzi onye bi na Paradaịs ahụ, o yiri ka ọ nọgidere ruo Iju Mmiri ahụ e nwere n’oge Noa.

6 Ụfọdụ nwere ike ịna-eche, sị: ‘È nwere mgbe ndị mmadụ ga-ekpori ndụ ọzọ na Paradaịs n’ụwa a?’ Olee ihe ndị na-egosi na ndị mmadụ ga-ebi ọzọ na Paradaịs? Ọ bụrụ na ị na-atụ anya na gị na ndị ị hụrụ n’anya ga-ebi na Paradaịs, è nwere ihe ndị mere i ji nwee olileanya a? Ì nwere ike ịkọwara mmadụ ihe mere obi ji sie gị ike na a ga-enwe Paradaịs?

IHE NDỊ GOSIRI NA A GA-ENWE PARADAỊS

7, 8. (a) Olee nkwa Chineke kwere Ebreham? (b) Olee ihe nkwa ahụ Chineke kwere Ebreham nwere ike ime ka ọ na-eche banyere ya?

7 Ebe kacha mma mmadụ nwere ike isi nweta azịza nke ajụjụ ndị a na-ajụ banyere Paradaịs bụ n’akwụkwọ Onye kere Paradaịs mbụ ahụ mere ka e dee. Tụlee ihe Chineke gwara enyi ya Ebreham. Ọ gwara ya na ya ga-eme ka mkpụrụ ya baa ụba “ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri.” Jehova kweziri ya nkwa a dị mkpa, sị: “Ọ bụkwa site ná mkpụrụ gị ka mba niile nke ụwa ga-agọzi onwe ha n’ihi na i gewo ntị n’olu m.” (Jen. 22:17, 18) Ka oge na-aga, Chineke kwekwara nwa Ebreham na nwa nwa ya nkwa a.—Gụọ Jenesis 26:4; 28:14.

8 E nweghị ebe ọ bụla Baịbụl kwuru na Ebreham chere n’echiche na ndị mmadụ ga-emecha gaa biri na paradaịs n’eluigwe. N’ihi ya, mgbe Chineke kwuru na ya ga-agọzi “mba niile nke ụwa,” ọ ga-abụ na Ebreham chere na ọ bụ n’ụwa a ka Chineke ga-agọzi ha. Ọ bụ Chineke kwere nkwa a, n’ihi ya, ihe ọ pụtara bụ na ihe ga-adịrị “mba niile nke ụwa” ná mma. Ọ̀ bụ naanị ihe a ka Baịbụl kwuru gosiri na a ga-enwe paradaịs n’ụwa a?

9, 10. Olee nkwa Chineke mechara kwe, bụ́ ndị mere ka anyị na-atụ anya na a ga-enwe paradaịs n’ụwa?

9 Chineke nyere Devid nwa Ebreham mmụọ nsọ ya ekwuo na e nwere mgbe “ndị na-eme ihe ọjọọ” na-agaghị adịkwa. (Ọma 37:1, 2, 10) Kama, “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” Devid kwukwara, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọma 37:11, 29; 2 Sam. 23:2) Olee uru i chere nkwa a baara ndị chọrọ ime uche Chineke? O mere ka ha na-atụ anya na otu ụbọchị, naanị ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa a, nakwa na ọ ga-aghọ paradaịs ọzọ ka ogige Iden.

10 Ka oge na-aga, ọtụtụ ndị Izrel, bụ́ ndị na-ekwu na ha na-efe Jehova, hapụrụ ya, hapụkwa ofufe ya. N’ihi ya, Chineke kwere ka ndị Babịlọn merie ha, mebie obodo ha, ma dọrọ ọtụtụ n’ime ha n’agha. (2 Ihe 36:15-21; Jere. 4:22-27) Ma, ndị amụma Chineke kwuru na ndị Izrel ga-alaghachi n’obodo ha mgbe ha nọchara afọ iri asaa na Babịlọn. Amụma ndị a niile mezukwara. Ha bakwaara anyị uru taa. Ka anyị na-atụle ụfọdụ n’ime ha, chọpụta otú ha si mee ka anyị na-atụ anya na a ga-enwe paradaịs n’ụwa.

11. Olee otú Aịzaya 11:6-9 si mezuo na nke mbụ ya? Olee ajụjụ anyị ka nwere ike ịna-ajụ?

11 Gụọ Aịzaya 11:6-9. Chineke si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo na mgbe ndị Izrel laghachiri n’obodo ha, na udo ga-adị. E nweghị onye ga na-atụ ụjọ mmadụ ma ọ bụ anụmanụ imerụ ya ahụ́. O nweghịkwa ihe ga-eme ma onye ukwu ma onye nta. Ihe a ọ̀ naghị echetara gị ụdị udo e nweburu n’ogige Iden? (Aịza. 51:3) Aịzaya kwukwara na n’ụwa niile, ọ bụghị naanị ná mba Izrel, na “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.” Olee mgbe ihe a ga-eme?

12. (a) Olee otú Chineke si gọzie ndị a dọọrọ n’agha si Babịlọn laghachi? (b) Olee ihe gosiri na Aịzaya 35:5-10 ga-emezu ọzọ n’ọdịnihu?

12 Gụọ Aịzaya 35:5-10. Ihe ọzọ Aịzaya kwuru bụ na ndị mmadụ ma ọ bụ ụmụ anụmanụ agaghị emerụ ndị Izrel si na Babịlọn laghachi n’ala ha ahụ́. Ala ha ga-amị ezigbo mkpụrụ, n’ihi na ọ ga na-enweta mmiri zuru ezu, otú ahụ ọ dị n’ogige Iden. (Jen. 2:10-14; Jere. 31:12) Ọ̀ bụ naanị mgbe ahụ ka amụma a mezuru? E nweghị ihe gosiri na a gwọrọ ndị Izrel laghachirinụ ọrịa ha. Dị ka ihe atụ, e meghị ka ndị ìsì hụwa uzọ. N’ihi ya, Chineke ji amụma a na-egosi na ya ga-agwọ ndị mmadụ ọrịa ha n’ọdịnihu.

13, 14. Olee otú e si mezuo Aịzaya 65:21-23 mgbe ndị Izrel si na Babịlọn laghachi? Olee ihe e kwuru n’amụma ahụ nke ka ga-emezu? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

13 Gụọ Aịzaya 65:21-23. Mgbe ndị Izrel laghachiri n’obodo ha, ha ahụghị ezigbo ụlọ, ha ahụghịkwa ubi ndị a kọrọ ihe nakwa ubi vaịn. Ma ebe ọ bụ na Chineke gọziri ha, ihe gbanwere ka oge na-aga. Ma chegodị ụdị obi ụtọ ha nwere mgbe ha rụrụ ụlọ ma biri na ha, nakwa mgbe ha na-eri nri ndị na-atọ ụtọ ha kọrọ

14 Buru n’obi otu ihe dị mkpa e kwuru n’amụma a. È nwere mgbe anyị ga-anọ ogologo ndụ otú ahụ “osisi si anọ ogologo ndụ”? Ụfọdụ osisi na-anọ ọtụtụ puku afọ. Ka ndị mmadụ nwee ike ịdị ogologo ndụ otú ahụ, ahụ́ ga-agbasi ha ezigbo ike. Ọ bụrụ na ha ga-ebi n’ebe mara mma udo dị na ya otú ahụ Aịzaya kwuru, ọ ga-abụ paradaịs a na-atụ anya ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka amụma ahụ ga-emezu.

Olee otú a ga-esi emezu nkwa ahụ Jizọs kwere gbasara Paradaịs? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16)

15. Olee ụfọdụ ngọzi ndị e kwuru banyere ha n’akwụkwọ Aịzaya?

15 Chegodị otú nkwa ndị ahụ anyị ka tụlere si gosi na a ga-enwe paradaịs n’ọdịnihu. Chineke ga-agọzi ndị mmadụ n’ụwa niile. E nweghị onye ụmụ anụmanụ ma ọ bụ ndị mmadụ na-eme ka anụ ọhịa ga-emerụ ahụ́. Ndị ìsì ga-ahụ ụzọ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe, ndị ngwọrọ ga-agakwa ije. Ndị mmadụ ga-ewu ụlọ nke ha, na-akọkwa ezigbo nri ndị ha ga na-eri. Ha ga-adị ogologo ndụ karịa osisi. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị nwere ihe ndị Baịbụl kwuru gosiri na ihe ndị a ga-eme n’ọdịnihu. Ma ụfọdụ ndị anyị na-ezi ozi ọma nwere ike ịna-ekwu na amụma ndị ahụ apụtachaghị na a ga-enwe paradaịs n’ụwa n’ọdịnihu. Gịnị ka i nwere ike ịgwa ha? Olee ezigbo ihe mere i ji na-atụ anya na a ga-enwe paradaịs n’ụwa a? Jizọs, bụ́ nwoke kacha ukwuu nke bitụrụla n’ụwa a, gwara anyị ihe mere anyị ji na-atụ anya ya.

Ị GA-ANỌ NA PARADAỊS

16, 17. Olee mgbe Jizọs kwuru gbasara Paradaịs?

16 Ọ bụ eziokwu na e nweghị ihe Jizọs mere, a mara ya ikpe ọnwụ ma kwụwa ya n’elu osisi ka ọ nwụọ. A kwụwakwara ndị Juu abụọ bụ́ ndị omekome, otu n’aka nri ya, otu n’aka ekpe ya. Tupu ha anwụọ, otu kwetara na Jizọs bụ eze ma gwa ya, sị: “Jizọs, cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” (Luk 23:39-42) Ihe Jizọs zara ya na Luk 23:43 metụtara ọdịnihu gị. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta taa sụgharịrị ya otú a, sị: “N’eziokwu, ana m asị gị, taa mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” Buru n’obi okwu a bụ́ “taa.” Ma, Gịnị ka “taa” Jizọs kwuru pụtara? E nwere ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-ekwu na ọ pụtara.

17 N’ọtụtụ asụsụ ndị e nwere taa, a na-eji kọma eme ka ahịrị okwu doo anya nke ọma. Ma na Baịbụl ndị mbụ e nwere taa, bụ́ ndị e dere n’asụsụ Grik, e nwere ebe ndị e nwere akara edemede, nweekwa ebe ndị a na-enweghị ha. N’ihi ya, anyị nwere ike ịjụ, sị: “Ihe Jizọs na-ekwu, ọ̀ bụ, “Ana m asị gị, taa mụ na gị ga-anọ na Paradaịs”? Ka ihe ọ na-ekwu, ọ̀ bụ, “Ana m asị gị taa, mụ na gị ga-anọ na Paradaịs”? Ndị nsụgharị nwere ike ide kọma tupu ha edee “taa,” ma ọ bụ dee “taa” tupu ha edee kọma, dabere n’ihe ha chere Jizọs na-ekwu. Na Baịbụl ndị e nwere taa, ị ga-ahụ ụzọ abụọ a ndị nsụgharị si sụgharịa okwu Jizọs.

18, 19. Olee ihe nyeere anyị aka ịghọta ihe okwu Jizọs pụtara?

18 Cheta na Jizọs bu ụzọ gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nwa nke mmadụ ga-anọ n’ime ala ụbọchị atọ, ehihie na abalị.” O kwukwara si: “A ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmadụ, ha ga-egbu ya, a ga-akpọlitekwa ya n’ụbọchị nke atọ.” (Mat. 12:40; 16:21; 17:22, 23; Mak 10:34) Pita onyeozi kwuru na ihe a mere eme. (Ọrụ 10:39, 40) N’ihi ya, Jizọs agaghị na Paradaịs n’ụbọchị ahụ ya na onye omekome ahụ nwụrụ. Jizọs nọ “n’ili [ma ọ bụ “Hedis”]” ruo ụbọchị ụfọdụ, Chineke akpọlitezie ya n’ọnwụ.—Ọrụ 2:31, 32. *

19 Anyị ahụla na ihe Jizọs ji malite nkwa ahụ o kwere onye omekome ahụ bụ: “N’eziokwu, ana m asị gị taa.” Otú ahụ ka ndị mmadụ si ekwukarị okwu ma n’oge Mozis. O nwekwara mgbe Mozis kwuru, sị: “Okwu ndị a m na-enye gị n’iwu taa ga-adị n’obi gị.”—Diut. 6:6; 7:11; 8:1, 19; 30:15.

20. Olee ihe kwadoro otú anyị si ghọta ihe ahụ Jizọs kwuru?

20 Otu onye na-asụgharị Baịbụl, nke si n’ebe Jizọs biri kwuru, sị: “Okwu e mesiri ike n’amaokwu a bụ ‘taa,’ n’ihi ya, otú e kwesịrị isi gụọ ya bụ, ‘N’eziokwu ana m asị gị taa, mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.’ Ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka Jizọs kwere nkwa ahụ, mana ọ ga-emezu ya n’ọdịnihu. Otú ahụ ka ndị mmadụ na-esi ekwu okwu n’ebe ahụ, nke pụtara na ọ bụ n’ụbọchị ahụ onye ahụ kwuru okwu ahụ ka o kwere nkwa ahụ, o nweghịkwa ihe ga-eme ka ọ ghara imezu ya.” Ọ bụ ya mere Baịbụl a sụgharịrị n’asụsụ Siriak ji si otú a sụgharịa amaokwu ahụ: “Amen, Ana m asị gị taa na mụ na gị ga-anọ n’Ogige Iden.” Nkwa a kwesịrị ịgba anyị niile ume.

21. Olee ihe onye omekome ahụ na-esoghị na ya, n’ihi gịnịkwa?

21 Onye omekome ahụ amaghị na Jizọs na ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi agbaala ndụ na ya na ha ga-anọ n’Alaeze eluigwe. (Luk 22:29) Ihe ọzọ bụ na onye omekome ahụ emebedịghị baptizim. (Jọn 3:3-6, 12) Ihe ndị a mere ka anyị ghọta na ihe Jizọs kwere onye omekome ahụ nkwa ya bụ paradaịs a ga-enwe n’ụwa a. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Pọl onyeozi kwuru banyere otu nwoke ọ hụrụ n’ọhụụ, bụ́ onye “e bupụrụ, buga ya na paradaịs.” (2 Kọr. 12:1-4) A họọrọ Pọl na ndịozi ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi iso Jizọs chịa n’Alaeze eluigwe, ma onye omekome ahụ esoghị ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ “paradaịs” a ga-enwe n’ọdịnihu ka Pọl na-ekwu gbasara ya. * Paradaịs ahụ ọ̀ ga-abụ n’ụwa a? Ị̀ ga-anọ na ya?

IHE I NWERE IKE ỊTỤ ANYA YA

22, 23. Olee ihe ị na-atụ anya ya?

22 Cheta na Devid kwuru banyere mgbe “ndị ezi omume ga-enweta ụwa.” (Ọma 37:29; 2 Pita 3:13) Devid na-ekwu gbasara mgbe ndị mmadụ bi n’ụwa ga na-eme ihe Chineke kwuru. Baịbụl kwuru n’Aịzaya 65:22, sị: “Dị ka osisi si anọ ogologo ndụ, otú ahụ ka ndị m ga-anọ ogologo ndụ.” Nke a na-egosi na ndị mmadụ ga-adị ndụ ọtụtụ puku afọ. Ị̀ na-atụ anya ụdị ihe a? Ee, n’ihi na Mkpughe 21:1-4 kwuru na Chineke ga-agọzi ụmụ mmadụ. Otu n’ime ngọzi ndị ahụ ga-abụ na “ọnwụ agaghị adị ọzọ.” Ndị Chineke ga-emezuru nkwa a bụ ndị ga-efe ya n’ụwa ọhụrụ ya.

23 Ihe Baịbụl na-akụzi banyere Paradaịs doro anya. Adam na Iv tụfuru ohere magburu onwe ya ha nwere ịdị ndụ na Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. Ma ụwa ga-emechakwa bụrụ paradaịs. Chineke ka ga-agọzi ụmụ mmadụ bi n’ụwa a otú ahụ o kwere nkwa ya. O nyere Devid mmụọ nsọ ya ekwuo na ndị dị umeala n’obi na ndị ezi omume ga-enweta ụwa birikwa n’ime ya ruo mgbe ebighị ebi. Amụma ndị e buru n’Aịzaya na-eme ka anyị na-atụ anya mgbe anyị ga-ekpori ndụ na paradaịs mara ezigbo mma n’ụwa a. Olee mgbe ọ ga-abụ? Ọ ga-abụ mgbe a ga-emezu nkwa ahụ Jizọs kwere onye Juu ahụ bụ́ onye omekome. Ị ga-enweli ike ibi na Paradaịs ahụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka ihe ahụ ụmụnna ndị Koria gwara ụmụnna ndị si mba ọzọ bịa mgbakọ e nwere na Koria ga-emezu, ya bụ, “Anyị ga-ahụ na Paradaịs.”

^ para. 18 Prọfesọ C. Marvin Pate kwuru na ụfọdụ ndị ọkà mmụta kweere na mgbe Jizọs sịrị “taa,” ihe ọ na-ekwu bụ na ọ ga-anwụ ma gaa na Paradaịs n’ụbọchị ahụ, ma ọ bụ n’ime iri awa abụọ na anọ ọ nwụrụ. Prọfesọ a kwukwara na nsogbu nkọwa a nwere bụ na ọ dabaghị n’ihe ndị e kwuru n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na Jizọs nọrọ n’ili mgbe ọ nwụrụ, nakwa na o mechara gaa n’eluigwe.—Mat. 12:40; Ọrụ 2:31; Rom 10:7.

^ para. 21 Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” dị n’Ụlọ Nche a.