Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:

Olee ihe Baịbụl kwuru nke gosiri na Chineke na-enwere anyị ọmịiko?

Mgbe ndị Izrel nọ n’Ijipt na-agba ohu, Chineke ma ọnụ a na-emekpọ ha, o wutekwara ya. (Ọpụ. 3:7; Aịza. 63:9) E kere anyị n’onyinyo Chineke, anyị ga-enwelikwa ọmịiko. Ọ na-enwere anyị ọmịiko, ma mgbe anyị nwedịrị ike iche na anyị erughị eru ka ọ hụ anyị n’anya.—wp18.3, peeji nke 8 na nke 9.

Olee otú ihe Jizọs kụziri si nyere ndị mmadụ aka ịkwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị?

Ọtụtụ ndị Juu n’oge Jizọs kpọrọ ndị ọzọ asị. Jizọs gwasịrị ha ike na ha kwesịrị ịdị umeala n’obi. Ọ katọkwara mmadụ ịbụ onye mba ya na-ebu isi. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha were ibe ha ka ụmụnne.—w18.06, peeji nke 9 na nke 10.

Olee ihe anyị mụtara n’ihe mere Chineke ji gbochie Mozis ịbanye n’Ala Nkwa Ahụ?

Mozis na Jehova dị n’ezigbo mma. (Diut. 34:10) Mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo afọ iri anọ ndị Izrel nọ n’ala ịkpa, ha mere mkpesa nke ugboro abụọ ya na ha enweghị mmiri ọṅụṅụ. Chineke gwara Mozis ka ọ gwa nkume okwu. Kama Mozis ịgwa nkume okwu, ya akụọ mkpara ya na nkume. Ọ ga-abụ na ihe were Jehova iwe bụ na Mozis emeghị ihe ọ gwara ya ma ọ bụ na o meghị ka e too Jehova n’ihi ọrụ ebube ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 20:6-12) Ihe a kwesịrị ịkụziri anyị na ọ dị mkpa ka anyị rubere Jehova isi ma mee ka e nye ya otuto.—w18.07, peeji nke 13 na nke 14.

Olee otú anyị nwere ike isi mejọọ ihe ngwa ngwa ma ọ bụrụ na anyị elekwasị anya naanị n’otú mmadụ dị?

E nwere ihe atọ ọtụtụ mmadụ na-elekwasị anya emeso mmadụ ihe ma a bịa n’ihe gbasara ile otú mmadụ dị. Ha bụ, agbụrụ ma ọ bụ obodo onye ahụ, otú o nweruru ego, nakwa afọ ndụ ya. Ọ dị mkpa ka anyị gbalịa ịghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu, si otú ahụ na-eṅomi Chineke. (Ọrụ 10:34, 35)—w18.08, peeji nke 8 ruo na nke 12.

Olee ụzọ ụfọdụ Ndị Kraịst katarala ahụ́ nwere ike isi na-enyere ndị ọzọ aka?

Chineke ka hụrụ Onye Kraịst katarala ahụ́ a gbanweere ọrụ n’anya. Onye Kraịst a nwere ike ime ọtụtụ ihe iji nyere ndị ọzọ aka. O nwekwara ike inyere di ma ọ bụ nwunye Onye Kraịst na-anọghị n’ọgbakọ na ndị na-anaghịzi ejekwa ozi aka. O nwekwara ike ịna-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl, ma jekwuoro Jehova ozi.—w18.09, peeji nke 8 ruo na nke 11.

Gịnị na gịnị ka anyị nwere n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe?

Anyị nwere Kaadị JW.ORG na Akwụkwọ Ịkpọ Òkù Ọmụmụ Ihe. Anyị nwekwara traktị asatọ magburu onwe ha, nakwa Ụlọ Nche na Teta! Ihe ndị ọzọ anyị nwere na ya bụ broshọ ole na ole, akwụkwọ abụọ bụ́ isi anyị na ndị mmadụ ji amụ Baịbụl, nakwa vidio anọ bara ezigbo uru. Vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? so na vidio ndị ahụ.—w18.10, peeji nke 16.

Olee otú Onye Kraịst nwere ike isi “zụta eziokwu,” otú ahụ Ilu 23:23 kwuru?

Anyị anaghị akwụ ụgwọ iji zụta eziokwu. Ma, anyị kwesịrị iwepụta oge, gbaakwa ezigbo mbọ ka anyị nwee ike ịmụta ya.—w18.11, peeji nke 4.

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Hosia si meso Goma nwunye ya ihe?

Goma kwara iko ugboro ugboro, ma Hosia gbaghaara ya, ya na ya ebirikwa ka di na nwunye. Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye Onye Kraịst akwaa iko, Onye Kraịst a nwere ike igbaghara ya. Ya na ya maliteghachi inwe mmekọahụ, ọ ga-akagbu ịgba ya alụkwaghịm Akwụkwọ Nsọ kwadoro.—w18.12, peeji nke 13.