Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

’Jehova Emesowo Anyị Ihe n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị’

’Jehova Emesowo Anyị Ihe n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị’

O NWERE mgbe mụ na Danièle nwunye m gara Gabọn, bụ́ obodo dị n’Ebe Ọdịdịa Anyanwụ Afrịka. A machibidoro ọrụ anyị iwu n’obodo ahụ n’ihe dị ka malite n’afọ 1971 gawa. Ozugbo anyị rutere Gabọn, awa ole na ole agaa, anyị gara n’otu họtel kwụọ ụgwọ ka anyị hie ebe ahụ. Obere oge, onye na-anabata ndị ọbịa na họtel ahụ gwara m, sị, “Biko, kpọọ ndị uwe ojii.”

Ebe nwunye m bụ nwaanyị anya na-eru ala, ọ takwunyeere m, sị, “Enyela onwe gị nsogbu. Ha nọ anọ.” Mgbe m lere anya n’azụ, m hụrụ ebe ha dọsara ụgbọala ha n’ihu họtel ahụ. O teghị aka, ha akpụrụ mụ na nwunye m gawa. Ma, ekele dịrị Chineke na nwunye m gbaara m àmà, n’ihi na tupu ha akpụrụ anyị gawa, enyere m nwanna ọzọ ụfọdụ akwụkwọ ndị dị mkpa m ji ka o dowe.

Ka ha kpụ anyị na-aga n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, m kelere Chineke na o nyere m onye dị ka Danièle nwunye m. O nwere obi ike, jirikwa ofufe Jehova kpọrọ ihe. Nke a abụghị nke mbụ nwunye m meere m ụdị ihe a. Ma, ka m kọọrọ unu ihe mere anyị ji bịa n’obodo a a machibidoro ọrụ anyị iwu.

JEHOVA MERE EBERE MEPEE M ANYA

A mụrụ m n’afọ 1930, n’otu obodo aha ya bụ Krọịs dị n’ebe ugwu Frans. Ezinụlọ a mụrụ m na ya bu okpukpe Katọlik n’isi. Ha na-aga Mas kwa izu. Papa m bụkwa onye ọnụ na-eru n’okwu na parish anyị. Ma, mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka m ruo afọ iri na anọ, o nwere otu ihe mere ka m mata na ndị chọọchị bụ ndị ihu abụọ.

N’oge a na-alụ agha ụwa nke abụọ, ọ bụ ndị Jamani na-achị Frans. Onye ụkọchukwu anyị kwuwe okwuchukwu, ọ na-agba anyị ume ka anyị kwadoo ọchịchị Nazi, bụ́ ndị na-achị obodo Viki. Ihe ndị ọ na-ekwu na-eme ka ụjọ tụwa anyị. Anyị na-ezoro ezoro ege gbasara ndị na-ebuso Jamani agha na redio BBC. Ihe a ka ọtụtụ ndị Frans ndị ọzọ na-emekwa. Obere oge, ụkọchukwu ahụ gbanwere, kwuzie ka onye ọ bụla bịa ka a tụọ mmamma maka ọganihu ndị na-ebuso Jamani agha nwere n’ọnwa Septemba afọ 1944. Ihe a o mere tụrụ m n’anya. O mere ka m gharazie ịtụkwasị ndị ụkọchukwu obi.

Obere oge agha biri, papa m nwụrụ. Nwanne m nwaanyị nke tọrọ m alụọla di mgbe ahụ. Ha bi na Beljọm. Ọ bụzi mụnwa na-elekọta mama m. Enwetara m ọrụ n’otu ụlọ ọrụ na-emepụta ákwà. Onye were m n’ọrụ na ụmụ ya ndị nwoke bu okpukpe Katọlik n’isi. Ama m na ihe ga-agaziri m n’ụlọ ọrụ ha. Ma, amakwa m na ọnwụnwa ga-esi na ya bịara m.

N’afọ 1953, Simone nwanne m nwaanyị bịara ileta anyị. Ọ bụzi Onyeàmà Jehova. O ji Baịbụl ya gbaa ozizi ụgha ndị Katọlik na-akụzi n’anwụ, dị ka, ozizi Atọ n’Ime Otu na mkpụrụ obi anwụghị anwụ. Na mbụ, m gwara ya na Baịbụl ahụ o ji abụghị Baịbụl ndị Katọlik. Ma, m mechara kweta na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. O wetaara m ụfọdụ Ụlọ Nche ndị ochie, mụ anọrọ n’ime ụlọ m gụchapụ ha n’ime abalị. M matara ozugbo na achọtala m eziokwu. Ma, ụjọ nọ na-atụ m na m bido fewe Jehova, a ga-achụ m n’ọrụ.

M ji ọnwa ole na ole mụọ Baịbụl na Ụlọ Nche ndị ahụ n’onwe m. M mechara kpebie na m ga-aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Otú ndị nọ ebe ahụ si hụ ibe ha n’anya metụrụ m n’ahụ́. Mgbe mụ na otu nwanna nọterela aka n’ọgbakọ mụrụ ihe ọnwa isii, m mere baptizim na Septemba afọ 1954. O teghị aka, mama m na nwanne m nwaanyị nke m tọrọ emee baptizim, ghọọ Ndịàmà Jehova. Ihe a mere m ezigbo obi ụtọ.

ANYỊ TỤKWASỊRỊ JEHOVA OBI MGBE ANYỊ NA-EJE OZI OGE NIILE

N’afọ 1958, mama m nwụrụ mgbe ọ fọrọ izu ole na ole ka m gaa mgbakọ mba niile na Niu Yọk. Mgbe m lọtara, o nweghịzi onye m na-elekọta. N’ihi ya, m kwụsịrị ọrụ m na-arụ ma malite ọrụ ọsụ ụzọ. Ka ihe a na-eme, o nwere otu nwanna nwaanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi mụ na ya kpebiri na anyị ga-alụ. Aha ya bụ Danièle Delie. Anyị mechara lụọ n’ọnwa Mee afọ 1959.

Danièle malitere ọrụ ọsụ ụzọ n’otu ime obodo a na-akpọ Britani. Ebe ahụ dị anya n’ụlọ ha. Obi ike dị ya mkpa iji kwusaa ozi ọma n’ebe ahụ okpukpe Katọlik gbanyere mgbọrọgwụ, nakwa iji gbara ígwè gaa n’ime ime obodo kwusaa ozi ọma. Ma mụnwa ma yanwa jicha ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma n’ihi na anyị amaghị mgbe ọgwụgwụ ga-abịa. (Mat. 25:13) Otú o si na-ewepụta onwe ya maka ozi Jehova nyeere anyị aka idi ọtụtụ ihe n’ozi oge niile.

M ghọrọ onye nlekọta sekit abalị ole na ole mụ na nwunye m gbachara akwụkwọ. Anyị hazigharịrị ihe iji nwee ike ịna-ebi ndụ dị mfe. Ọgbakọ mbụ anyị gara leta nwere ndị nkwusa iri na anọ. O nweghịdị onye n’ime ha nwere ụlọ anyị nwere ike ịnọ na ya. N’ihi ya, anyị hiri n’elu ikpo okwu dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị otú o kwesịrị ịdị, mana, ma ó nweghị ihe ọzọ, o mere ka ọkpụkpụ azụ anyị gbatịa.

Anyị ji obere ụgbọala anyị a gaa leta ọtụtụ ọgbakọ

N’agbanyeghị otú ọrụ si zuo anyị ahụ́, ọrụ anyị matara nwunye m ahụ́. Ọ bụrụ na anyị enwee nnọkọ ndị okenye na mberede, ọ na-enwe ndidi chere m n’obere ụgbọala anyị ka anyị gbasaa. Anyị rụrụ ọrụ nlekọta naanị afọ abụọ. O nyekwaara anyị aka ịmụta na ọ dị mkpa di na nwunye ịna-ekwurịta okwu, ịna-agwa ibe ha eziokwu na ịna-emekọ ihe ọnụ.—Ekli. 4:9.

E NYERE ANYỊ ỌRỤ ỌHỤRỤ

Mgbe o ruru n’afọ 1962, a kpọrọ anyị ka anyị gaa klas nke 37 nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied na Bruklin dị na Niu Yọk. Anyị ga-anọ ọnwa iri n’ụlọ akwụkwọ ahụ. N’ime otu narị mmadụ bịara ụlọ akwụkwọ ahụ, e nwere ndị di na nwunye iri na atọ. Obi dị anyị ụtọ na anyị abụọ gakọrọ ụlọ akwụkwọ ahụ ọnụ. M na-enwe obi ụtọ ma m cheta ụmụnna ndị nwere okwukwe siri ike anyị na ha mekọrọ ihe ebe ahụ, dị ka, Nwanna Frederick Franz, Ulysses Glass, na Alexander H. Macmillan.

Obi dị anyị ụtọ na anyị abụọ gakọrọ Ụlọ Akwụkwọ Gilied

N’ụlọ akwụkwọ ahụ, a gwara anyị ka anyị gbalịa mụta ịna-eleru anya ala. N’ehihie Satọdee ụfọdụ, anyị mụchaa ihe na klas, a na-akpọrọ anyị kpapụ ka anyị gaa legharịa anya na Niu Yọk Siti. Anyị ma na o ruo na Mọnde na-esonụ, a ga-agwa anyị dee ihe anyị hụrụ n’ebe ndị ahụ anyị gara. Ọtụtụ mgbe, ike na-agwụcha anyị ma anyị lọta. Nwanna si na Bethel na-edugharị anyị na-ajụ anyị ajụjụ ụfọdụ ga-enyere anyị aka icheta ihe ndị a ga-ajụ anyị gbasara mkpapụ ahụ. E nwere otu Satọdee anyị ji ụkwụ gagharịa na Niu Yọk Siti ehihie niile. Anyị gara n’otu ebe a na-anọ ele ihe dị na mbara ígwé, ebe anyị nọ mata gbasara nkume ndị a na-akpọ meteor na meteorite. Anyị gakwara n’otu ebe a na-egosi ihe mgbe ochie n’Amerịka. Anyị nọ ebe ahụ mata ihe dị iche n’aghụ na agụiyi. Mgbe anyị lọghachiri na Betel, nwanna na-edugharị anyị jụrụ anyị, sị, “Olee ihe dị iche na nkume meteor na nkume meteorite?” Ike gwụchara Danièle nwunye m, ya azaa, sị, “Ezé meteorite ka ezé meteor ogologo.”

Anyị nwere obi ụtọ mgbe anyị gara leta ụmụnna anyị nọ n’Afrika

Ọ tụrụ anyị n’anya mgbe a gwara anyị ka anyị gaa jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Frans. Anyị jere ozi ebe ahụ ruo afọ 53. N’afọ 1976, a họpụtara m ịbụ Onye Na-ahaziri Kọmitii Alaka Ọrụ. A gwakwara m ka m na-aga eleta mba ndị a machiri ọrụ anyị n’Afrịka na n’Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu. Ọ bụ ya mere m ji gaa Gabọn, ebe ihe m kọrọ ná mmalite nọ mee. N’eziokwu, o nweghị mgbe ọ dị m ka m̀ ga-arụli ọrụ ndị a niile. Ma, nwunye m kwadoro m, mụ enwee ike ịrụ ha niile.

Ebe m na-atapịa okwu Nwanna Theodore Jaracz ná mgbakọ “Ikpe Ziri Ezi nke Chineke” e nwere n’afọ 1988

MỤ NA NWUNYE M DIRI NSOGBU TARA AKPỤ

Ozi anyị jere na Betel tọrọ anyị ezigbo ụtọ malite n’ụbọchị mbụ anyị bidoro ya. Nwunye m gbalịrị mụta asụsụ Bekee n’ime ọnwa ise tupu anyị agaa Gilied. O mechara ghọọ onye nsụgharị aka siri ike so na-asụgharị ọtụtụ akwụkwọ anyị. Ozi Betel anyị tọrọ anyị ụtọ, ma ihe ndị anyị mere n’ọgbakọ mere ka anyị nwekwuo obi ụtọ. Obi na-adị m ụtọ ma m cheta mgbe mụ na nwunye m na-aga mụchaara ndị mmadụ Baịbụl, jiri ụgbọ okporo ígwè na-alọta n’ime abalị. Ike na-agwụcha anyị, ma obi na-abụ anyị sọ aṅụrị. Ọ dị mwute na ọrịa bịara mee ka nwunye m gharazie inwe ike ime ihe ndị ọ chọrọ ime.

N’afọ 1993 ka a chọpụtara na ọ bụ ọrịa kansa na-enye nwunye m nsogbu. Ọrịa ahụ dị ya n’ara. Otú a chọrọ isi gwọọ ya ga-afụ ya ezigbo ụfụ n’ihi na a ga-awa ya ahụ́, gbanyekwa ya ọgwụ ndị na-akpa ezigbo ike n’ahụ́. Mgbe afọ iri na ise gara, ọrịa kansa bịakwara nwunye m ọzọ. Nke ugbu a kadị njọ. Ma, n’ihi otú o si hụ ọrụ nsụgharị ọ na-arụ n’anya, o jisiri ike maliteghachi ọrụ mgbe ahụ́ ya kwetụrụ ya.

N’agbanyeghị ọrịa ọjọọ a nwunye m na-arịa, o nwetụdịghị mgbe anyị chetụrụ echiche ịhapụ Betel. Ma n’eziokwu, ịnọ na Betel na-arịa ọrịa adịghị mfe, karịchaa ma ọ bụrụ na ndị ọzọ aghọtachaghị otú ọrịa ahụ jọruru ná njọ. (Ilu 14:13) N’agbanyeghị na nwunye m akarịala afọ iri asaa, ọ ka mara ezigbo mma, e nwedịghị onye ga-ekweta na ọ na-arịa ọrịa. O kweghị ka nsogbu ya na-eme ya obi ọjọọ. Kama, ọ na-agbalị na-ege ndị ọzọ nọkwa ná nsogbu ntị. (Ilu 17:17) Nwunye m anaghị ewere onwe ya ka onye ndụmọdụ, ma, o jirila ihe ndị ọ ma banyere ọrịa kansa nyere ọtụtụ ụmụnna nwaanyị ibe ya aka ịkwụsị ịtụ ọrịa kansa ụjọ.

O nwekwara nsogbu ndị ọzọ bịaara mụ na nwunye m. Mgbe nwunye m na-enweghịzi ike ịrụ ọrụ kwa ụbọchị, ọ gbalịrị si n’ọtụtụ ụzọ na-akwado m. O mere ọtụtụ ihe ka ndụ dịrị anyị mfe. Ihe ndị ahụ mere ka ọ dịrị m mfe ịnọgide na-eje ozi ka Onye Na-ahaziri Kọmitii Alaka Ọrụ ruo afọ iri atọ na asaa. Dị ka ihe atụ, ọ na-agbalịsi ike kwadebe ihe niile ka anyị nwee ike ịnọ n’ụlọ anyị rie nri ehihie ma zurutụ ike kwa ụbọchị.—Ilu 18:22.

IHE NDỊ ANYỊ NA HA NA-ALỤ KWA ỤBỌCHỊ

Nwunye m akwụsịghị inwe olileanya na ihe ga-aka mma. Ma, ọrịa kansa bịakwara ya ọzọ. Ike gwụrụ anyị n’ihi na nke a bụ nke ugboro atọ ọ na-arịa ya. Ọtụtụ ugboro e ji ọgwụ na ngwá ọrụ dị iche iche na-agwọ ya ọrịa ahụ mere ka ike na-agwụ ya nke na mgbe ụfọdụ, ọ na-esiri ya ike ịga ije. Obi gbawara m mgbe m hụrụ na nwunye m bụbu onye nsụgharị aka siri ike na-achọzi okwu achọ.

Ọ bụ eziokwu na anyị amaghịzi ihe anyị ga-eme eme, ma anyị akwụsịghị ikpe ekpere. Obi siri anyị ike na Jehova agaghị ekwe ka nsogbu anyị na-agaghị edili bịara anyị. (1 Kọr. 10:13) Anyị nọgidere na-ekele Jehova maka otú o si jiri Okwu ya, ụmụnna anyị ndị na-ahụ maka ahụ́ ike na Betel, na ụmụnna anyị ndị ọzọ na-enyere anyị aka.

Ọtụtụ mgbe, anyị na-arịọ Jehova ka o duzie anyị mgbe anyị na-ahọrọ otú a ga-esi gwọọ nwunye m. O nwere otu mgbe ọ na-enweghị ọgwụ ọ bụla a na-eme ya maka ahụ́ ya. Otu dọkịta lekọtarala nwunye m afọ iri abụọ na atọ chọpụtara na mgbe ọ bụla e nyere ya ọgwụ, ọ naghịzi ama onwe ya. Ọ gwara anyị na ya amaghịzi otú ọzọ ka mma a ga-esi agwọ ya. Ihe a mere ka anyị chee na olileanya adịghịzi, ụjọ ana-atụkwa anyị na nke ka njọ nwere ike ime. Ma, dọkịta ọzọ na-agwọ ọrịa kansa kwetara na ya ga-enye aka. Jehova si otú ahụ mee ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị.

Anyị gbara mbọ ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị maka echi. Jizọs sịrị na “ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya.” (Mat. 6:34) Ihe ọzọ nyekwaara anyị aka ịkwụsị nchegbu bụ inwe olileanya na echi ga-aka mma nakwa ịna-achịfu ihe ụfọdụ n’ọchị. Dị ka ihe atụ, mgbe nwunye m nọrọ ọnwa abụọ n’agaghị ụlọ ọgwụ, o ji ọchị ọchị kwuo, sị, “Ọ dịzi ka ahụ́ ọ ka sie m ike ugbu a.” (Ilu 17:22) N’agbanyeghị ahụhụ ọrịa ahụ na-ata ya, ọ na-amasị ya iwepụta oge jiri olu dara ụda na-amụ abụ Alaeze.

Otú nwunye m si tinyere ụwa ya obiọma nyekwaara mụnwa aka idi nsogbu ndị nke m. N’eziokwu, n’ime afọ iri ise na asaa mụ na ya biri, o meere m ọtụtụ ihe dị m mkpa. O kweghịdị akụziri m otú e si eghe àkwá. Mgbe ahụ́ ya na-ekweghịzi ya mee ihe ọ bụla, m bịara mụwa otú e si asa efere, otú e si asụ ákwà na otú e si esi nri ndị dị mfe. Akụwaala m ụfọdụ iko ebe m na-agbalị ịmụta ime ihe ndị a. Ma, obi dị m ụtọ na m na-eme ike m iji mee nwunye m obi ụtọ. *

EKELERE M JEHOVA MAKA OBIỌMA YA

Nsogbu ndị nká na ọrịa na-akpata akụzierela m ọtụtụ ihe ga-abara m uru ná ndụ. Nke mbụ, anyị ekwesịghị ikwe ka ọtụtụ ihe anyị na-eme mee ka anyị ghara iji di anyị ma ọ bụ nwunye anyị kpọrọ ihe. Anyị kwesịrị iji afọ ndị ahụ ahụ́ ka kwụ anyị chịm lekọta di anyị ma ọ bụ nwunye anyị nke ọma. (Ekli. 9:9) Nke abụọ bụ na anyị ekwesịghị ịna-echegbukarị onwe anyị maka ihe ndị na-enweghị ihe ha bụ. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị leghara ngọzi ndị anyị na-enweta kwa ụbọchị anya.—Ilu 15:15.

Mgbe ọ bụla m chere echiche banyere ozi oge niile anyị jere, m na-aghọta na Jehova goziri anyị karịa otú anyị tụrụ anya ya. M nwere ike ikwu ihe a ọbụ abụ ahụ kwuru, ya bụ: ‘Jehova emesowo m ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị.’—Ọma 116:7.

^ para. 32 Nwanna nwaanyị Danièle Bockaert nwụrụ ka a na-akwadebe isiokwu a. Ọ dị afọ iri asaa na asatọ nwụọ.