Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-eto Eto, Unu Nwere Ike Ibi Ndụ Na-enye Obi Ụtọ

Ndị Na-eto Eto, Unu Nwere Ike Ibi Ndụ Na-enye Obi Ụtọ

“Ị ga-eme ka m mara ụzọ ndụ.”—ỌMA 16:11.

ABỤ: 133, 89

1, 2. Olee otú ihe a kọrọ gbasara Tony si gosi na mmadụ ga-agbanweli ndụ ya?

E NWERE otu nwa akwụkwọ aha ya bụ Tony. Nna ya anwụọla. Ọ chọrọ ịkwụsị ịga akwụkwọ n’ihi na ọ naghị amasị ya. Ná ngwụcha izu ọ bụla, ọ na-aga n’ebe a na-ele fim ma ọ bụ gaa ka ya na ndị enyi ya nọrọ. Ọ naghị aṅụ ọgwụ ọjọọ, ọ naghịkwa eme ihe ike. Ma, e nweghị ihe ọ chọrọ iji ndụ ya eme. Ọ maghịkwa ma Chineke ọ̀ dị. Otu ụbọchị, Tony na otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova kwurịtara okwu, ya agwa ha obi ya, jụọkwa ha ajụjụ ụfọdụ. Ha nyere ya broshọ Bekee abụọ aha ha bụ The Origin of Life—Five Questions Worth Asking na Was Life Created?

2 Mgbe di na nwunye ahụ lọghachiri, ha chọpụtara na Tony agbanweela echiche ya. Ọ gụọla broshọ ndị ahụ ọtụtụ ugboro nke mere ka ha fụkọtachaa. Tony sịrị ha, “A ga-enwerịrị onye bụ́ Chineke.” O kwetara ka a mụwara ya Baịbụl. Nwayọọ nwayọọ, otú o si ele ndụ anya gbanwere. Tupu ya a mụwa ihe, ọ na-agba ọnyụpa n’ụlọ akwụkwọ. Ma ugbu a, o sozi ná ndị ụbụrụ kacha aghọ nkọ n’ụlọ akwụkwọ ha. Ihe na-emenụ tụrụ Onyeisi ụlọ akwụkwọ ha n’anya, ya agwa Tony na ya chọpụtara na ọ na-akpazi ezigbo àgwà, na-emekwa nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Ọ jụrụ Tony, sị, “Ihe kpatara ya ọ̀ bụ maka na gị na Ndịàmà Jehova na-esozi?” Tony asị ya, ee, jirizie ohere ahụ zie ya ozi ọma. Tony megidere nke ọma ruo mgbe ọ gụchara. Taa, ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile, bụrụkwa ohu na-eje ozi n’ọgbakọ ha. Obi dịkwa ya ụtọ ugbu a na o nweziri Nna na-ahụ n’anya bụ́ Jehova.—Ọma 68:5.

IHE GA-AGAZIRI GỊ MA I RUBERE JEHOVA ISI

3. Olee ihe Jehova chọrọ ka ndị na-eto eto jiri ndụ ha mee?

3 Ihe mere ná ndụ Tony na-echetara anyị na Jehova nwere mmasị buru ibu n’ebe unu bụ́ ndị na-eto eto nọ. Ọ chọrọ ka ndụ tọọ unu ụtọ, chọọkwa ka ihe gaziere unu. Ọ bụ ya mere o ji na-agba unu ume, sị: “Cheta . . . Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa.” (Ekli. 12:1) Taa, ime ihe a adịghị mfe. Ma, ọ pụtaghị na ọ gaghị ekwe omume. N’enyemaka Chineke, ị ga-emeli ya, ma ugbu a ị ka na-eto eto ma ná ndụ gị niile. Iji mee ka ihe a dokwuo anya, ka anyị tụlee ihe anyi nwere ike ịmụta n’agha ụmụ Izrel lụrụ iji nweta Ala Nkwa ahụ nakwa n’ihe mere n’etiti Devid na Golayat.

4, 5. Olee ihe dị mkpa anyị ga-amụta n’ihe mere n’agha ụmụ Izrel lụrụ iji nweta ala Kenan nakwa n’ihe mere n’etiti Devid na Golayat? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

4 Mgbe ndị Izrel ruwere Ala Nkwa ahụ nso, Chineke ọ̀ gwara ha ka ha gaa mụkwuo otú e si alụ agha iji nwee ike imeri ndị iro ha? Mba. (Diut. 28:1, 2) Kama, ihe ọ gwara ha bụ ka ha rubere ya isi ma tụkwasị ya obi. (Jọsh. 1:7-9) N’anya mmadụ, ihe a bụ ndụmọdụ na-enweghị isi na ọdụ. Ma, ọ bara ezigbo uru, n’ihi na o mere ka Jehova nyere ha aka imeri ndị Kenan ọtụtụ ugboro. (Jọsh. 24:11-13) Ọ bụ okwukwe na-eme ka e rubere Chineke isi. Ihe na-agaziri onye nwere okwukwe na Chineke mgbe niile, ma n’oge gara aga, ma taa.

5 Golayat bụ dike gbara ajọ dimkpa. Ọ fọrọ obere ka o ruo mịta atọ n’ogologo. Ọ na-ejikwa ngwá agha ndị jọgburu onwe ha alụ ọgụ. (1 Sam. 17:4-7) Ma, Devid ji ihe abụọ na-abịa ịlụso ya ọgụ: èbè na okwukwe o nwere n’ebe Chineke ya bụ́ Jehova nọ. N’anya ndị na-enweghị okwukwe, o yiri ka Devid ọ̀ dị iberiibe. Ma n’eziokwu, ọ bụ Golayat bụ onye dị iberiibe.—1 Sam. 17:48-51.

6. Olee ihe ndị anyị ga-elebakwu anya na ha n’isiokwu a?

6 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị lebara anya n’ihe anọ na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ, ihe agaziekwara ya ná ndụ. Ha bụ, ọtụtụ ihe Chineke nyere anyị e ji akụziri anyị ihe, ezigbo ndị enyi o nyere anyị, ihe ndị anyị ga-achọ ime n’ofufe Chineke na iji nnwere onwe anyị kpọrọ ihe. Ka anyị lebakwuo anya n’ihe ndị a, ma lee otú ihe ndị e kwuru n’Abụ Ọma nke 16 ga-esi nyere anyị aka.

JIRI OFUFE CHINEKE KPỌRỌ IHE

7. (a) Olee ihe e ji ama onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe? (b) Gịnị bụ “òkè” Devid, oleekwa uru ọ baara ya?

7 Onye ji ife Chineke kpọrọ ihe na-enwe okwukwe na Chineke, na-elekwa ihe anya otú Chineke si ele ya. Ọ na-achọkarị ka Chineke na-eduzi ya n’ihe ọ bụla ọ na-eme, na-ekpebisikwa ike irubere ya isi. (1 Kọr. 2:12, 13) Devid bụ otu onye mere otú ahụ. Ọ bụrụ abụ, sị: “Jehova bụ òkè e kenyere m nakwa iko e nyere m.” (Ọma 16:5) Ihe so ‘n’òkè’ ahụ bụ adịm ná mma ya na Chineke ya, bụ́ onye ọ gbabara n’ime ya. (Ọma 16:1) Olee uru ọ baara ya? Devid sịrị: “Ihe niile dị ebube n’ime m na-enwe aṅụrị.” O nweghị ihe na-eme ya obi ụtọ ka adịm ná mma ya na Chineke.—Gụọ Abụ Ọma 16:9, 11.

8. Olee ihe ndị so na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ná ndụ?

8 Ndị hụrụ ntụrụndụ na ịchụ akụnụba n’anya anaghị enwe ụdị ọṅụ ahụ Devid nwere. (1 Tim. 6:9, 10) Otu nwanna onye Kanada kwuru, sị: “Ihe na-eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ ná ndụ abụghị ihe ndị o nwere, kama, ihe ndị o nyere Onye ahụ na-enye ezi onyinye ọ bụla, ya bụ, Jehova bụ Chineke.” (Jems 1:17) N’eziokwu, ihe ga-eme ka ị na-enwe ezigbo obi ụtọ bụ inwe okwukwe n’ebe Jehova nọ na ife ya ofufe. Olee otú ị ga-esi mee ka okwukwe gị sikwuo ike? Gị na Jehova ga na-anọrị, ya bụ, ị ga na-agụ Okwu ya, na-ele ihe ndị o kere eke, na-eche gbasara àgwà ya dị iche iche, dị ka, ịhụnanya o nwere n’ebe ị nọ.—Rom 1:20; 5:8.

9. Olee otú i nwere ike isi kwe ka Okwu Chineke kpụgharịa gị otú ahụ o mere Devid?

9 Mgbe ụfọdụ, otú Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya bụ ịdọ anyị aka ná ntị otú ahụ nna si adọ nwa ya aka ná ntị. Devid nabatara ụdị ịdọ aka ná ntị ahụ. Ọ sịrị: “M ga-agọzi Jehova, bụ́ onye nyeworo m ndụmọdụ. N’ezie, akụrụ m agbaziwo m n’abalị.” (Ọma 16:7) Devid tụgharịrị uche n’echiche Chineke, ma kwe ka ọ na-eduzi ya ma na-akpụgharị ya. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga na-ahụkwu Chineke n’anya ma na-achọkwu irubere ya isi. Ị ga-abụkwa Onye Kraịst tozuru okè. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Christin kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m mere nchọnchọ ma tụgharịa uche n’ihe m gụrụ na Baịbụl, ọ na-adị m ka ọ bụ mụnwa ka Jehova bu n’obi mee ka e dee ihe ahụ.”

10. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 26:3, olee uru iji ofufe Chineke kpọrọ ihe ga-abara gị?

10 O doro anya na i jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe, ị ga na-ele ụwa a na ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu anya otú Chineke si ele ya. Gịnị mere Chineke ji mee ka i nwee ike ịmata ihe ndị ahụ ga-eme n’ọdịnihu? Ọ chọrọ ka i bute ihe ndị ka mkpa ná ndụ ụzọ, mee mkpebi ndị dị mma, ma jiri obi ike na-ele anya ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. (Gụọ Aịzaya 26:3.) Otu nwanna bi n’Amerịka aha ya bụ Joshua kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị anọrọ Jehova nso, anyị ga na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.” Ihe a o kwuru bụ eziokwu. Anyị mee otú ahụ, anyị ga na-enwe ezigbo obi ụtọ.

META EZIGBO NDỊ ENYI

11. Olee otú Devid si họta ndị enyi ya?

11 Gụọ Abụ Ọma 16:3. Devid ma ihe ga-eme ka mmadụ nweta ezigbo ndị enyi. O “nwere mmasị” n’ebe ndị hụrụ Jehova n’anya nọ. Ebe a kpọrọ ha “ndị nsọ,” ha bụ ndị na-eme omume dị ọcha, na-akwụwakwa aka ha ọtọ. Ọbụ abụ ọzọ kwukwara ihe yiri ihe ahụ Devid kwuru gbasara ụdị ndị ọ na-emeta enyi. Ọ sịrị: “Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị, bụrụkwa enyi ndị na-edebe iwu gị.” (Ọma 119:63) Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, i nwere ike inweta ọtụtụ ezigbo ndị enyi n’etiti ndị na-atụ egwu Jehova ma na-edebe iwu ya. Ha nwere ike ịbụ ndị nọ n’afọ ndụ dị iche iche.

12. Olee ihe mere Devid na Jọnatan ji bụrụ nnu na mmanụ?

12 Ndị Devid metara enyi abụghị naanị ndị ya na ha bụ ọgbọ. Ì nwere ike icheta otu onye dị “ebube” Devid metara enyi? Aha ya bụ Jọnatan. N’eziokwu, ọbụbụenyi ha so ná ndị kacha mma e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Ị̀ ma na Jọnatan ji ihe dị ka iri afọ atọ tọ Devid? Gịnị mere ha abụọ ji bụrụ nnu na mmanụ? Ọ bụ n’ihi na ha abụọ nwere okwukwe na Chineke, na-asọpụrụ ibe ha, ma hụkwa obi ike onye nke ọ bụla n’ime ha ji lụso ndị iro Chineke agha.—1 Sam. 13:3; 14:13; 17:48-50; 18:1.

13. Olee otú ị ga-esi metakwuo ndị ọzọ enyi? Nye ihe atụ.

13 Dị ka Devid na Jọnatan mere, anyị na-enwe obi ụtọ ma anyị meta ndị hụrụ Jehova n’anya ma na-atụkwasị ya obi enyi. Otu nwanna nwaanyị ferela Chineke ọtụtụ afọ aha ya bụ Kiera kwuru, sị: “Mụ na ọtụtụ ụmụnna anyị ndị si ebe dị iche iche n’ụwa abụrụla enyi. Ọtụtụ n’ime ha nwere omenala dị iche na nke m, na-asụkwa asụsụ dị iche.” Ọ bụrụ na i meta ndị si ebe dị iche iche enyi otú a, ị ga-aghọta ike Okwu Chineke na mmụọ nsọ ya na-akpa n’ime ka anyị dịrị n’otu.

NWEE IHE NDỊ Ị GA-ACHỌ IME N’OFUFE CHINEKE

14. (a) Gịnị ga-enyere gị aka ikpebi ihe ndị dị mma ị ga-eme ná ndụ? (b) Olee ihe ụfọdụ ndị na-eto eto kwuru gbasara ya?

14 Gụọ Abụ Ọma 16:8. Devid lekwasịrị anya n’ife Chineke. Obi ga-adịkwa gị ụtọ ma ọ bụrụ na ị nọgide na-ebute ofufe Jehova ụzọ, ma burukwa ya n’obi na-eme mkpebi ndị ị na-eme. Otu nwanna aha ya bụ Steven kwuru, sị: “Ịgba mbọ ka m mee ihe m kpebiri, ime ya, nakwa iche banyere ọganihu ndị m nwerela na-eme ka m nwee ezigbo obi ụtọ.” Otu nwanna na-eto eto bụ́ onye Jamani na-eje ozi ná mba ọzọ kwuru, sị: “M mee agadi, achọghị m ka mgbe ọ bụla m ga-eche banyere ihe m ji ndụ m mee, ya abụrụ na m ji ya mee ihe nke onwe m naanị.” Anyị makwa na ọ bụ otú ahụ ka ị chọrọ ka ọ dịrị gị. Ọ bụrụ otú ahụ, jiri nkà ndị i nwere jeere Jehova na ndị ọzọ ozi. (Gal. 6:10) Nwee ihe ndị ị ga-achọ ime n’ofufe Chineke, rịọkwa ya ka o nyere gị aka ime ha. Obi na-adị ya ụtọ ịnụ ụdị ekpere ndị ahụ.—1 Jọn 3:22; 5:14, 15.

15. Olee ihe ndị i nwere ike ikpebiri onwe gị ime n’ozi Jehova? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ụfọdụ M Nwere Ike Ikpebi Ime.”)

15 Olee ihe ndị i nwere ike ikpebi ime n’ozi Jehova? O nwere ike ịbụ iji okwu nke aka gị na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ nakwa ije ozi na Betel. I nwekwara ike ịmụ asụsụ ọzọ iji nwee ike ije ozi n’ebe a na-asụ asụsụ ọzọ. Otu onye na-eje ozi oge niile aha ya bụ Barak kwuru, sị: “O nweghị ihe na-eme m obi ụtọ ka iteta n’ụra kwa ụbọchị cheta na m ji ike m niile na-ejere Jehova ozi.”

JIRI NNWERE ONWE CHINEKE NYERE GỊ MEE IHE BARA URU

16. Olee otú obi dị Devid maka iwu ezi omume Chineke, oleekwa ihe kpatara ya?

16 Gụọ Abụ Ọma 16:2, 4. Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, iwu ezi omume ndị Chineke nyere anyị na-eme ka anyị hụ ihe dị mma n’anya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. (Emọs 5:15) Ihe Devid na-ekwu n’amaokwu a bụ na ọ bụ Jehova bụ isi iyi nke ịdị mma. Ịdị mma bụ àgwà magburu onwe ya. Devid gbalịsiri ike iṅomi àgwà Chineke a. Ọ gbalịsikwara ike ịkpọ ihe ọ bụla jọrọ njọ n’anya Chineke asị. Ife arụsị jọrọ njọ n’anya Chineke. Ọ na-eme ka mmadụ fewe ihe ọ ka mma ofufe, werekwa nsọpụrụ ruuru Chineke nyewe ihe ọzọ.—Aịza. 2:8, 9; Mkpu. 4:11.

17, 18. (a) Olee ihe Devid kwuru gbasara nsogbu na-esi n’ife chi ụgha apụta? (b) Olee ihe mere ndị mmadụ ji enwe “ọtụtụ ihe mgbu” taa?

17 N’oge Baịbụl, mmekọahụ rụrụ arụ so n’ihe a na-eme n’ofufe ụgha. (Hos. 4:13, 14) Ndị mmadụ na-enwe mmasị n’ụdị ofufe a n’ihi na omume rụrụ na-atọ ha ụtọ. Ma, ihe ndị a anaghị eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ. Kama inwe obi ụtọ, Devid kwuru na “ndị ọ na-abụ ha hụ chi ọzọ ha esowe ya na-enwe ọtụtụ ihe mgbu.” Ndị a na-efe chi ọzọ jidị ụmụ ha chụọrọ chị ha àjà. (Aịza. 57:5) Jehova kpọrọ ụdị obi ọjọọ a asị. (Jere. 7:31) A sị na ị dị ndụ n’oge ahụ, ị gaara ekele Chineke ma ọ bụrụ na ndị mụrụ gị bụ ndị na-efe Jehova.

18 Taakwa, ọtụtụ okpukpe ụgha na-akwado ịkwa iko nakwa nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị ibe ya. Ma, ihe na-esi ná mmadụ ime otú masịrị ya apụta agbanwebeghị kemgbe oge Baịbụl. (1 Kọr. 6:18, 19) O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ndị na-eme otú ahụ “na-enwe ọtụtụ ihe mgbu.” N’ihi ya, ndị na-eto eto, geenụ Nna unu nke eluigwe ntị. Maranụ na irubere ya isi ga-abara unu uru. Marakwanụ na nsogbu ime ihe ọjọọ ga-akpatara unu karịrị ụtọ nwa oge ọ ga-atọ unu. (Gal. 6:8) Joshua anyị kwuru okwu ya ná mmalite sịrị, “Anyị nwere ike iji nnwere onwe anyị mee ihe ọ bụla masịrị anyị. Ma, anyị jiri ya mee ihe na-abaghị uru, anyị ga-akwara ya mmakwaara.”

19, 20. Olee ngọzi ndị na-eto eto nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ ma na-erubere ya isi ga-enweta?

19 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:31, 32) Anyị na-ekele Jehova na anyị enwerela onwe anyị n’okpukpe ụgha, amaghị ihe Baịbụl kwuru, na nkwenkwe ụgha. N’ọdịnihu, anyị ga-enweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Rom 8:21) I nwere ike irite uru ná nnwere onwe ahụ ugbu a ma ọ bụrụ na ị ‘nọgide n’okwu’ Kraịst ma ọ bụ n’ihe ndị ọ kụziri. I mee otú ahụ, ị “ga-amarakwa eziokwu ahụ,” ọ bụghị naanị na ị ga na-amụ gbasara ya, kama, ị ga na-emekwa ya eme.

20 Ndị na-eto eto, jirinụ nnwere onwe Chineke nyere unu kpọrọ ihe. Unu jiri ya na-ebi ndụ otú kwesịrị ekwesị, ọ ga-eme ka ihe gaziere unu n’ọdịnihu. Otu nwanna na-eto eto kwuru, sị: “Ịmalite mgbe anyị na-eto eto na-eji nnwere onwe anyị na-eme ihe kwesịrị ekwesị ga-enyere anyị aka n’ọdịnihu mgbe anyị ga-eme mkpebi ndị tara akpụ, dị ka mgbe anyị ga-ahọrọ ụdị ọrụ anyị ga-arụ, mgbe anyị ga-ekpebi ma ànyị ga-alụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ nọrọ n’alụghị ruo oge ụfọdụ.”

21. Olee ihe ga-eme ka ị nọgide n’ụzọ ahụ na-eduga ná “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”?

21 N’ụwa ochie a, ihe ndị mmadụ na-ewere ka ikpori ndụ anaghị adịte aka. Anyị amaghịkwa ihe echi ga-abụ. (Jems 4:13, 14) Ihe kacha mma anyị ga-eme ugbu a bụ ịnọsi ike n’ụzọ ahụ na-eduga ná “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” ya bụ, ndụ ebighị ebi. (1 Tim. 6:19) Nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke anaghị amanye anyị ife ya. Ọ bụ anyị ga-ekpebi ihe anyị ga-eme. Mee Jehova “òkè” gị. Jiri ‘ihe ọma’ niile o meere gị kpọrọ ihe. (Ọma 103:5) Nweekwa okwukwe na ọ ga-eme ka ‘ị ṅụrịjuo ọṅụ afọ . . . ruo mgbe ebighị ebi.’—Ọma 16:11.