Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee otú o si bụrụ na ‘e bugara Pọl onyeozi n’eluigwe nke atọ,’ nakwa “na paradaịs”?—2 Kọr. 12:2-4.

Na 2 Ndị Kọrịnt 12:2, 3, Pọl kwuru banyere otu nwoke ‘e bugara n’eluigwe nke atọ.’ Ònye bụ onye ahụ? Mgbe Pọl na-edegara ọgbakọ dị na Kọrịnt akwụkwọ ozi, o kwusiri okwu ike na Chineke mere ya onyeozi. (2 Kọr. 11:5, 23) O kwuziri banyere “ọhụụ ndị dị ebube na mkpughe nke Onyenwe anyị.” N’amaokwu ndị ahụ, Pọl ekwughị banyere ụmụnna ndị ọzọ. N’ihi ya, mgbe ọ na-ekwu banyere nwoke e gosiri ọhụụ, nyekwa ya mkpughe, ọ bụ onwe ya ka ọ na-ekwu banyere ya.—2 Kọr. 12:1, 5.

N’ihi ya, Pọl bụ onye ahụ e ‘bugara n’eluigwe nke atọ,’ ọ bụkwa ya ka e ‘bugara na paradaịs.’ (2 Kọr. 12:2-4) Pọl kwuru banyere “mkpughe,” bụ́ nke gosiri na a gwara ya ihe ga-eme n’ọdịnihu.

Gịnị ka “eluigwe nke atọ” ahụ Pọl hụrụ pụtara?

Na Baịbụl, “eluigwe” nwere ike ịpụta eluigwe nkịtị. (Jen. 11:4; 27:28; Mat. 6:26) Ma, e nwekwara ihe ndị ọzọ “eluigwe” nwere ike ịpụta. Mgbe ụfọdụ, ọ na-apụta ọchịchị ụmụ mmadụ. (Dan. 4:20-22) O nwekwara ike ịpụta ọchịchị Chineke, ya bụ, ọchịchị Chineke ga-esi n’aka Alaeze ya na-achị.—Mkpu. 21:1.

Pọl hụrụ “eluigwe nke atọ.” Olee ihe eluigwe a ọ hụrụ pụtara? Mgbe ụfọdụ, Baịbụl na-ekwu otu ihe ugboro atọ iji mee ka o doo anya, na iji mesie ihe ahụ ike. (Aịza. 6:3; Ezik. 21:27; Mkpu. 4:8) Ọ ga-abụ na mgbe Pọl kwuru banyere “eluigwe nke atọ,” ọ na-ekwu gbasara ọchịchị kacha elu, ya bụ, Alaeze Mesaya nke Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-achị. (Gụọ Insight on the Scriptures, Nke 1, peeji nke 1059, na nke 1062.) Ọ bụ Alaeze Mesaya a ka Pita bu n’obi kwuo na anyị na-echere “eluigwe ọhụrụ” dị ka Chineke kwere ná nkwa.—2 Pita 3:13.

Gịnịkwanụ banyere “paradaịs” ahụ Pọl kwuru gbasara ya?

Okwu ahụ bụ́ “paradaịs” nwekwara ike ịpụta ọtụtụ ihe: (1) Ebe ọ bụ na paradaịs bụ ebe mbụ ụmụ mmadụ biri, o nwere ike ịpụta Paradaịs ga-adị n’ụwa n’ọdịnihu. (2) O nwekwara ike ịpụta ezigbo udo Chineke ga-eme ka ndị ya nwee n’ụwa ọhụrụ. (3) Ihe ọzọ o nwere ike ịpụta bụ ọnọdụ magburu onwe ya e nwere na “paradaịs Chineke” n’eluigwe, bụ́ nke e kwuru banyere ya na Mkpughe 2:7.—Gụọ Ụlọ Nche Julaị 15, 2015, peeji nke 8, paragraf nke 8.

O nwere ike ịbụ na ihe atọ ahụ e kwuru paradaịs nwere ike ịpụta ka Pọl na-ekwu gbasara ya ná 2 Ndị Kọrịnt 12:4 mgbe ọ na-ekwu ihe ọ hụrụ.

Ịchịkọta ihe anyị kwuru:

“Eluigwe nke atọ” ahụ e kwuru gbasara ya na 2 Ndị Kọrịnt 12:2 nwere ike ịbụ Alaeze Mesaya nke Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-achị, ya bụ, “eluigwe ọhụrụ.”—2 Pita 3:13.

Ọ bụ “eluigwe nke atọ” n’ihi na Alaeze ahụ bụ ọchịchị kacha elu.

“Paradaịs” ahụ e ‘bugara’ Pọl na ya n’ọhụụ ahụ ọ hụrụ nwere ike ịbụ (1) Paradaịs nke ga-adị n’ụwa n’ọdịnihu, (2) paradaịs ime mmụọ a ga-enwe mgbe ahụ, ọ ga-akarị paradaịs ime mmụọ e nwere taa, nakwa (3) “paradaịs nke Chineke” nke dị n’eluigwe. Ọ bụ n’ụwa ọhụrụ ka a ga-enwe ha atọ n’otu mgbe ahụ.

N’ihi ya, paradaịs ahụ ga-abụ ụwa ọhụrụ na eluigwe ọhụrụ. Ọ ga-abụ ndokwa ọhụrụ, nke gụnyere ma Alaeze eluigwe ma ụmụ mmadụ ndị bi na paradaịs n’ụwa na-efe Jehova.