Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Onye Ezi Omume Ga-aṅụrị Ọṅụ n’Ime Jehova”

“Onye Ezi Omume Ga-aṅụrị Ọṅụ n’Ime Jehova”

DIANA akarịala afọ iri asatọ. Di ya rịara ọrịa na-eme ka ụbụrụ ghara ịkpakọ mmadụ ọnụ. Nke a mere ka a kpọga ya n’ebe a na-elekọta ndị agadi ruo afọ ụfọdụ tupu ya anwụọ. Ọ nọkwa na-edi ọnwụ ụmụ ya nwoke abụọ, na-edikwa kansa ara ọ na-arịa. Ma, ụmụnna hụ Diana n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ n’ozi ọma, ha na-achọpụta na ọ na-enwekarị ọṅụ.

John bụ onye nlekọta sekit ihe karịrị afọ iri anọ na atọ. Ozi a tọgburu ya atọgbu nke na ọ naghị echetụdị n’echiche ime ihe ọzọ. Ma, ọ kwụsịrị ọrụ sekit ka o nwee ike ilekọta onye ikwu ya na-arịa ọrịa. Ugbu a, o so otu ọgbakọ na-eje ozi. Ụmụnna ndị maara John hụ ya ná mgbakọ sekit ma ọ bụ ná mgbakọ ukwu, ọ na-adị ha ka ọ gbanwebeghị. Ọ ka na-enwe ezigbo ọṅụ.

Olee ihe mere Diana na John ji na-enwe ọṅụ? Olee otú onye obi na-ajọ njọ na onye na-arịa ọrịa nwere ike isi na-enwe ọṅụ? Oleekwanụ otú mmadụ nwere ike isi na-enwe ọṅụ ma ọ bụrụ na ọ naghịzi arụ ọrụ na-enye ya obi ụtọ? Baịbụl zara anyị ajụjụ ndị a. Ọ sịrị: “Onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova.” (Ọma 64:10) Anyị nwere ike ịghọtakwu ihe a Baịbụl kwuru ma anyị mata ihe ga-eme ka anyị na-enwe ọṅụ na ihe ga-eme ka anyị ghara ịna-enwe ọṅụ.

ỌṄỤ NA-ANAGHỊ ADITE AKA

E nwere ụfọdụ ihe ndị na-eme ka anyị na-enwe ọṅụ. Chegodị gbasara nwoke na nwaanyị hụrụ ibe ha n’anya ma na-achọ ịlụ. Ma ọ bụ chegodị gbasara onye ghọrọ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụkwanụ onye e nyere ọrụ ọhụrụ n’ozi Jehova. Ihe ndị a niile na-enye ọṅụ n’ihi na ha bụ onyinye si n’aka Jehova. Ọ bụ Jehova malitere alụmdi na nwunye, meekwa ka a na-amụ ụmụ, nyekwa ọrụ ndị a na-arụ ná nzukọ ya.—Jen. 2:18, 22; Ọma 127:3; 1 Tim. 3:1.

Ma ihe ụfọdụ ndị na-eme ka anyị na-enwe ọṅụ nwere ike ha agaghị adịte aka. Ọ dị mwute na di ma ọ bụ nwunye nwere ike kwụsị ife Jehova ma ọ bụ nwụọ. (Ezik. 24:18; Hos. 3:1) Ụfọdụ ụmụaka na-enupụrụ Chineke na ndị mụrụ ha isi, e nwedịrị ike chụọ ha n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, ụmụ Samuel efeghị Jehova otú ọ chọrọ, ihe Devid mere kpataara ya ọtụtụ nsogbu n’ezinụlọ ya. (1 Sam. 8:1-3; 2 Sam. 12:11) Ụdị ihe a mee, ọ naghị enye anyị ọṅụ, kama, ọ na-ewute anyị ma na-agbawa anyị obi.

Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ọrụ ndị anyị na-arụ n’ọgbakọ Jehova. Anyị nwere ike kwụsị ọrụ anyị na-arụ ná nzukọ Jehova n’ihi ọrịa, igboro ezinụlọ anyị mkpa ha, ma ọ bụ mgbanwe e nwere ná nzukọ Jehova. Ọtụtụ ndị ụdị ihe ndị a merela ekwuola na ọ na-ewute ha na ha anaghịzi eje ozi ahụ na-eme ka ha na-enwe obi ụtọ.

Anyị ahụla na ihe ndị ahụ na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ anaghị adịte aka mgbe niile. N’ihi ya, è nwere ụdị ọṅụ ọzọ na-adịgide adịgide, a sịgodị na ihe esiere anyị ezigbo ike? E nwere, n’ihi na Samuel, Devid na ndị ọzọ nọgidere na-enwe ọṅụ mgbe ọnwụnwa bịaara ha.

ỌṄỤ NKE NA-ADỊTE AKA

Jizọs ma ihe inwe ọṅụ pụtara. Tupu ya abịa n’ụwa, Baịbụl gwara anyị na ọ ‘na-aṅụrị ọṅụ n’ihu [Jehova] mgbe niile.’ (Ilu 8:30) Ma mgbe ọ bịara n’ụwa, e nwere mgbe ihe na-adịchaghịrị ya mfe. N’agbanyeghị ya, Jizọs ji ọṅụ na-eme uche Nna ya. (Jọn 4:34) Gịnịkwanụ gbasara awa ndị ikpeazụ ahụ ọ tara ahụhụ tupu ya anwụọ? Baịbụl kwuru, sị: “N’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya, o diri osisi ịta ahụhụ.” (Hib. 12:2) N’ihi ya, anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’ihe abụọ Jizọs kwuru gbasara inwe ezigbo ọṅụ.

E nwere mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs dị iri asaa laghachikwutere ya mgbe ha zichara ozi ọma ọ gwara ha gaa zie. Ha ṅụrịrị ọṅụ n’ihi ọrụ ebube ndị ha rụrụ, ha chụpụdịrị ndị mmụọ ọjọọ. Jizọs gwaziri ha, sị: “Unu aṅụrịla ọṅụ n’ihi nke a, na a na-eme ka mmụọ dị iche iche nọrọ n’okpuru unu, kama ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi na e dewo aha unu n’eluigwe.” (Luk 10:1-9, 17, 20) N’eziokwu, ihe kacha mkpa abụghị inwe ihe ùgwù ụfọdụ, kama ọ bụ mmadụ na Jehova ịdị ná mma. Ọ gaghị echefu ndị na-eso ụzọ Jizọs ji obi ha niile jeere ya ozi. Nke a na-eme ka anyị na-enwekwu ọṅụ.

E nwekwara mgbe Jizọs nọ na-agwa ìgwè mmadụ okwu. Ihe ọ nọ na-agwa ha tọrọ otu nwaanyị bụ́ onye Juu ụtọ, ya ekwuo na obi ga-atọ nne Jizọs ezigbo ụtọ. Ma Jizọs gbaziri ya, ma kwuo, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya.” (Luk 11:27, 28) Iji ụmụ anyị eme ọnụ nwere ike ime ka anyị na-enwe ọṅụ. Ma ihe kacha enye anyị ọṅụ bụ anyị na Jehova ịdị n’ezigbo mma n’ihi na anyị na-erubere ya isi.

Anyị na-enwe ezigbo ọṅụ ma anyị mara na anyị na Jehova dị ná mma. Ọ bụ eziokwu na ọnwụnwa anaghị enye ọṅụ, ma ọ gaghị eme ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme ihe dị Chineke mma n’oge ọnwụnwa, ọ ga-eme ka anyị na-enwekwu ọṅụ. (Rom 5:3-5) Jehova na-enyekwa ndị tụkwasịrị ya obi mmụọ nsọ ya. Ọṅụ sokwanụ ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22) Nke a na-eme ka anyị ghọta ihe mere Abụ Ọma 64:10 ji kwuo, sị: “Onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova.”

Olee ihe nyeere John aka ịnọgide na-enwe ezigbo ọṅụ?

Nke a na-emekwa ka anyị ghọta ihe mere Diana na John anyị kwuburu okwu ha ji nọgide na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị otú ọnọdụ ha si taa akpụ. Diana kwuru, sị: “Agbabala m n’ime Jehova otú ahụ nwa si agbakwuru nna ya.” Olee otú o si mata na ya na Chineke dị ná mma? O kwukwara, sị: “Echere m na Jehova agọziela m ma mee ka m nọgide na-eji ọṅụ ekwusa ozi ọma mgbe niile.” Olee ihe nyeere John aka ịnọgide na-eji ọṅụ ekwusa ozi ọma mgbe ọ kwụsịrị ọrụ sekit? O kwuru, sị: “Kemgbe afọ 1998 a gwara m ka m kụziwe ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, amụọla m ihe n’onwe m karịa mgbe ọ bụla ọzọ.” O kwukwara banyere onwe ya na nwunye ya, sị: “Otú anyị si dị njikere kemgbe ọtụtụ afọ ịrụ ọrụ ọ bụla e nyere anyị ná nzukọ Jehova nyeere anyị aka ime mgbanwe. Anyị anaghị akwa mmakwaara.”

Ọtụtụ ndị aghọtala na ihe Abụ Ọma 64:10 kwuru bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, e nwere otu di na nwunye jerela ozi ihe karịrị afọ iri atọ na Betel dị n’Amerịka. E mechara gwa ha ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ha kwetara ma kwuo, sị: “Anyị na-ebe ákwá ma ihe anyị ji kpọrọ ihe funahụ anyị,” ma ha kwukwara, sị: “Ị gaghị ebegide ákwá ruo mgbe ebighị ebi.” Ozugbo ha rutere ebe ahụ, ha malitere iso ọgbakọ jewe ozi. Di na nwunye a kwukwara, sị: “E nwere ihe ụfọdụ anyị rịọrọ Jehova ka o meere anyị. Mgbe anyị hụrụ otú Jehova si za anyị ekpere, ọ gbara anyị ume ma mee ka anyị na-enwe ọṅụ. Ọ dịghị anya anyị bịara, ụmụnna ndị ọzọ anyị na ha nọ n’ọgbakọ malitere ịsụ ụzọ. Jehova gọzikwara anyị ma mee ka anyị nweta mmadụ abụọ na-eme ọfụma anyị na-amụrụ Baịbụl.”

‘ỊṄỤRỊ ỌṄỤ RUO MGBE EBIGHỊ EBI’

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-enwe ọṅụ. E nwere oge anyị na-anọ ná mwute. Ma Jehova ji okwu ya dị n’Abụ Ọma 64:10 mesie anyị obi ike. Ọ bụrụgodị na anyị adaa mbà n’obi, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ bụrụ na anyị anọgide na-efe Jehova otú ọ chọrọ n’agbanyeghị ihe anyị na ya na-alụ, anyị “ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova.” Ihe ọzọkwa bụ na anyị na-atụ anya mgbe Jehova ga-eweta “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” otú ahụ o kwere anyị ná nkwa. Mgbe ahụ, mmadụ ga-ezu okè. Ndị niile na-efe Chineke ‘ga-enwe obi ụtọ, na-aṅụrịkwa ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi’ n’ihi ihe ọ na-eke na ihe ọ na-emere ha.—Aịza. 65:17, 18.

Chegodị echiche ihe nke ahụ ga-abụ: Anyị ga-enwe ahụ́ ike, nweekwa ezigbo ume anyị ga-eji na-arụ ọrụ kwa ụbọchị. N’agbanyeghị ihe ọ bụla gbawara anyị obi n’oge gara aga, ha agaghị agbawa anyị obi ọzọ. Jehova na-emesi anyị obi ike na anyị ‘agaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.’ Anyị ga-anabata ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. Obi ga-adị anyị otú ahụ ọ dị nne na nna nwa agbọghọ ahụ dị afọ iri na abụọ Jizọs kpọlitere n’ọnwụ. Baịbụl kwuru otú obi dị ha, sị: “Ha nwere oké obi ụtọ.” (Mak 5:42) N’ikpeazụ, onye ọ bụla bi n’ụwa ga-abụ “onye ezi omume” ma ‘na-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova’ ruo mgbe ebighị ebi.