ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Eprel 2019

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite Jun 3 ruo 30, 2019.

Ị̀ Na-ejezu Ozi Gị?

Olee otú anyị ga-esi eme ka otú anyị si ezi ozi ọma kakwuo mma ma na-atọ anyị ụtọ?

Ṅomie Jizọs ma Nọgide Na-enwe Udo

Ihe atọ Jizọs mere nwere ike inyere anyị aka ịnọgide na-enwe udo ma mgbe anyị na-edi ọnwụnwa ndị tara akpụ.

Mata nke Bụ́ Eziokwu Banyere Ọnwụ

Olee otú anyị ga-esi zere ime omenala ndị mmadụ na-eme ma mmadụ nwụọ, bụ́ ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị?

Nabata Aka Jehova Na-enyere Anyị Iji Guzogide Ndị Mmụọ Ọjọọ

Olee ihe ndị anyị ga-eme ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ghara iduhie anyị?

AKỤKỌ NDỤ

Anyị Chọtara “Nkume Pel Dị Nnọọ Oké Ọnụ Ahịa”

Gụọ akụkọ ndụ Nwanna Winston Payne na Pamela nwunye ya si Ọstrelia ka ị hụ otú Jehova si gọzie ha n’ozi ha na-ejere ya.

Ị̀ Maara?

Olee otú mmadụ si eji ụgbọ mmiri eme njem n’oge ochie?