Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 17

Nabata Aka Jehova Na-enyere Anyị Iji Guzogide Ndị Mmụọ Ọjọọ

Nabata Aka Jehova Na-enyere Anyị Iji Guzogide Ndị Mmụọ Ọjọọ

“Anyị nwere mgba . . . megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.”​—EFE. 6:12.

ABỤ 55 Unu Atụla Ha Egwu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Dị ka Ndị Efesọs 6:​10-13 si kwuo, olee ụzọ kachanụ Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya? Kọwaa.

OTU n’ime ụzọ kachanụ Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya bụ inyere anyị aka ka anyị guzogide ndị iro anyị. Setan na ndị mmụọ ọjọọ bụ ndị iro anyị kachanụ. Jehova dọrọ anyị aka ná ntị banyere ha, nyekwa anyị ihe ndị dị anyị mkpa anyị ga-eji guzogide ha. (Gụọ Ndị Efesọs 6:​10-13.) Ọ bụrụ na anyị ekwe ka Jehova nyere anyị aka ma tụkwasị ya obi anyị niile, anyị ga-eguzogideli Ekwensu. Obi ga-esikwa anyị ike otú ahụ o siri Pọl onyeozi. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?”​—Rom 8:31.

2. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ebe anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst, anyị anaghị eji oge anyị niile na-amụ banyere Setan na ndị mmụọ ọjọọ. Ihe na-abụ mkpa anyị bụ ịmụ banyere Jehova na ife ya. (Ọma 25:5) Ma, anyị kwesịrị ịmata ụzọ Setan si eme ihe. N’ihi gịnị? Ka ọ ghara ịghọgbu anyị. (2 Kọr. 2:11) N’isiokwu a, anyị ga-atụle otu ihe gbara ọkpụrụkpụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ na-eji eduhie ndị mmadụ. Anyị ga-atụlekwa otú anyị nwere ike isi guzogide ha.

OTÚ NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ SI EDUHIE NDỊ MMADỤ

3-4. (a) Gịnị bụ mgbaasị? (b) Ọtụtụ ndị hà kweere na ya?

3 Otu ụzọ gbara ọkpụrụkpụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ na-esi eduhie ndị mmadụ bụ mgbaasị. Ndị na-eme mgbaasị na-ekwu na ha ma ihe ụmụ mmadụ na-enweghị ike ịma ma ọ bụ na-eme ihe ndị mmadụ na-enweghị ike ime. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ n’ime ha na-ekwu na ha nwere ike iji ịgba afa ma ọ bụ ịgụ kpakpando mata ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ndị ọzọ nwere ike ime ka o yie ka hà na-agwa ndị nwụrụ anwụ okwu. Ụfọdụ na-ata amusu ma ọ bụ na-eme majik. Ha nwekwara ike ịgbalị ka ha kụọ mmadụ ọgwụ. *

4 Ọtụtụ ndị hà kweere na mgbaasị? Mgbe a gbara ndị mmadụ si ná mba iri na asatọ na Latịn Amerịka nakwa na Karịbian ajụjụ ọnụ iji chọpụta ma hà kweere na majik, ịta amusu ma ọ bụ ịgba afa, ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ atọ ọ bụla kwuru na ha kweere na ha. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụkwa ọnụ ọgụgụ a kweere na mmadụ na ndị mmụọ nwere ike imekọ ihe. A gbakwara ndị si ná mba iri na asatọ n’Afrịka ajụjụ ọnụ. Ihe karịrị ọkara n’ime ha kwuru na ha kweere na e nwere amusu. N’agbanyeghị ebe anyị bi, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara itinye aka na mgbaasị. A sị ka e kwuwe, Setan na-achọ iduhie “elu ụwa dum mmadụ bi.”​—Mkpu. 12:9.

5. Olee otú Jehova si ele mgbaasị anya?

5 Jehova bụ “Chineke nke eziokwu.” (Ọma 31:5) N’ihi ya, olee otú o si ele mgbaasị anya? Ọ kpọrọ ya asị. Jehova gwara ndị Izrel, sị: “A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla nke na-esure nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’ọkụ, onye ọ bụla nke na-agba afa, onye na-eme anwansi ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu ma ọ bụ dibịa anwansi, ma ọ bụ onye na-akọ ndị ọzọ ọgwụ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase ma ọ bụ onye ọrụ ya bụ ịkọ ọdịnihu ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase. N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova.” (Diut. 18:​10-12) Ndị Kraịst anaghị edebe Iwu ahụ Jehova si n’aka Mozis nye ndị Izrel. Ma, anyị ma na otú o si ele mgbaasị anya agbanwebeghị.​—Mal. 3:6.

6. (a) Olee otú Setan si eji mgbaasị etinye ndị mmadụ ná nsogbu? (b) Dị ka e kwuru n’Ekliziastis 9:​5, olee ihe bụ́ eziokwu banyere ndị nwụrụ anwụ?

6 Jehova dọrọ anyị aka ná ntị gbasara ime mgbaasị n’ihi na ọ ma na Setan na-eji ya etinye ndị mmadụ ná nsogbu. Setan na-eji mgbaasị eme ka ndị mmadụ kwere n’ụgha ọ na-agha. Otu n’ime ụgha ya bụ na mmadụ nwụọ, na ọ na-aga dịrị ndụ ebe ọzọ. (Gụọ Ekliziastis 9:5.) Setan na-ejikwa mgbaasị eme ka ụjọ na-atụ ndị mmadụ, jirikwa ya na-eme ka ha ghara ife Jehova. Ihe o bu n’obi eme ya bụ ka ndị na-eme mgbaasị tụkwasị ndị mmụọ ọjọọ obi kama ịtụkwasị Jehova obi.

OTÚ ANYỊ SI EGUZOGIDE NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ

7. Gịnị ka Jehova na-agwa anyị?

7 Dị ka anyị kwurula, Jehova na-agwa anyị ihe ndị anyị kwesịrị ịma ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ghara iduhie anyị. Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ anyị ga-eme iji guzogide Setan na ndị mmụọ ọjọọ.

8. (a) Olee ihe ga-akacha enyere anyị aka iguzogide ndị mmụọ ọjọọ? (b) Olee otú Abụ Ọma 146:4 si gbaa ụgha Setan na-agha banyere ndị nwụrụ anwụ n’anwụ?

8 Na-agụ Okwu Chineke ma na-echebara ihe ndị ị gụrụ echiche. Ọ bụ ya ga-akacha enyere anyị aka ịgbara ụgha ndị mmụọ ọjọọ na-agha ọsọ. Okwu Chineke dị ka mma agha dị nkọ nke anyị nwere ike iji bibie ụgha Setan. (Efe. 6:17) Dị ka ihe atụ, Okwu Chineke na-eme ka anyị mata na ndị nwụrụ anwụ na ndị dị ndụ enweghị ike imekọ ihe. (Gụọ Abụ Ọma 146:4.) O mekwara ka anyị mata na ọ bụ naanị Jehova bụ onye nwere ike ikwu kpọmkwem ihe ga-eme n’ọdịnihu. (Aịza. 45:21; 46:10) Ọ bụrụ na anyị ana-agụ Okwu Chineke ma na-echebara ihe ndị anyị gụrụ echiche, anyị ga-enwe ike ịjụ ụgha ndị mmụọ ọjọọ chọrọ ka anyị kwere ma kpọọ ha asị.

9. Olee ihe ndị nwere ihe jikọrọ ha na mgbaasị anyị na-ezere?

9 Etinyela aka n’ihe ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na mgbaasị. Ebe anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst, anyị anaghị eme mgbaasị. Dị ka ihe atụ, anyị anaghị aga na nke dibịa afa ma ọ bụ gbalịa ka anyị na ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu n’ụzọ ọ bụla. Dị ka anyị tụlere n’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị anaghị eme omenala ndị mmadụ na-eme ma mmadụ nwụọ n’ihi na ha kweere na ndị nwụrụ anwụ ka dị ndụ ebe ọzọ. Anyị anaghịkwa agụ kpakpando iji mata ọdịnihu ma ọ bụ gakwuru ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu. (Aịza. 8:19) Anyị ma na ihe ndị ahụ niile jọgburu onwe ha, marakwa na ha nwere ike ime ka anyị na Setan na ndị mmụọ ọjọọ na-emekọrịta ihe.

Otú ị ga-esi eṅomi Ndị Kraịst oge mbụ bụ ibibi ihe ọ bụla i nwere nke nwere ihe jikọrọ ya na ime anwansi nakwa izere ihe ọ bụla e ji atụrụ ndụ nwere ihe jikọrọ ya na mgbaasị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 ruo na nke 12)

10-11. (a) Gịnị ka ụfọdụ ndị mere n’oge ndịozi mgbe ha mụtara eziokwu? (b) Dị ka 1 Ndị Kọrịnt 10:21 kwuru, olee ihe mere anyị ji kwesị ime ihe Ndị Kraịst oge ochie mere, oleekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie ha?

10 Bibie ihe ọ bụla i nwere nke nwere ihe jikọrọ ha na anwansi. N’oge ndịozi, ụfọdụ ndị bi n’Efesọs mere mgbaasị. Mgbe ha mụtara eziokwu, ha mere ihe ozugbo. Baịbụl kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị na-eme anwansi chịkọtara akwụkwọ ha ma kpọọ ha ọkụ n’ihu mmadụ niile.” (Ọrụ 19:19) Ha mere ihe niile ha nwere ike ime iji guzogide ndị mmụọ ọjọọ. Ha ji nnukwu ego zụọ akwụkwọ ndị ahụ ha ji eme anwansi. Ma kama ire ha ma ọ bụ nye ha ndị ọzọ, ha kpọrọ ha ọkụ. Ihe bụ́ mkpa ha bụ ime ihe dị Jehova mma, ọ bụghị ego ole akwụkwọ ndị ahụ furu ha.

11 Olee otú anyị nwere ike isi eṅomi Ndị Kraịst ndị ahụ? Ọ ga-adị mma ma anyị bibie ihe ọ bụla anyị nwere, nke nwere ihe jikọrọ ya na ime anwansi. Ụfọdụ n’ime ha bụ ọtụmọkpọ, ọgwụ, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ndị mmadụ na-eyi n’ahụ́ ma ọ bụkwanụ ndị ha ji na-achọ ichebe onwe ha n’aka ndị mmụọ ọjọọ.​—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:21.

12. Gịnị bụ ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị gbasara ihe ndị anyị ji atụrụ ndụ?

12 Chebara ihe ndị i ji atụrụ ndụ echiche. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-agụ akwụkwọ, magazin ma ọ bụ isiokwu ndị gbara n’Ịntanet, ndị kwuru gbasara ime anwansi? Oleekwanụ banyere egwú ndị m na-ege, fim na ihe omume tiivi m na-ele, ma ọ bụ egwuregwu vidio m na-egwu? È nwere ihe ọ bụla m ji atụrụ ndụ nwere ihe jikọrọ ya na mgbaasị? À na-egosi ihe ndị dị ka ịta amusu, ebe onye nwụrụ anwụ pụtara dịrị ndụ ma ọ bụ ịga na dibịa na ya? Ọ̀ na-eme ka majik, ịkọ ọgwụ ma ọ bụ ịga na nke dibịa afa yie egwuregwu nkịtị na-enweghị ihe o mere?’ Ma, ọ bụghị egwuregwu niile a na-egosi ihe ndị na-emeghị eme nwere ihe jikọrọ ha na mgbaasị. Mgbe ị na-echebara ihe ndị i ji atụrụ ndụ echiche, gbalịa hụ na ihe ndị ị ga-ahọrọ ga-enyere gị aka ịgbara ihe ọ bụla Jehova kpọrọ asị ọsọ. Anyị chọrọ ime ihe niile anyị nwere ike ime iji “nwee akọ na uche dị ọcha” n’ebe Chineke nọ.​—Ọrụ 24:16. *

13. Olee ihe anyị na-ekwesịghị ịna-eme?

13 Zere ịna-akọ akụkọ gbasara ndị mmụọ ọjọọ. Anyị kwesịrị iṅomi Jizọs n’izere ịna-akọ akukọ gbasara ndị mmụọ ọjọọ. (1 Pita 2:21) Jizọs biri n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa. Ọ makwa ọtụtụ ihe gbasara Setan na ndị mmụọ ọjọọ. Ma ọ kọrọghị ndị mmadụ gbasara ihe ndị mmụọ ọjọọ ndị a mere. Jizọs chọrọ ịkụziri ndị mmadụ banyere Jehova, ọ bụghị Setan. Anyị na-eṅomi Jizọs ma anyị ghara ịna-akọsa akụkọ banyere ndị mmụọ ọjọọ. Kama nke ahụ, ka anyị jiri ihe anyị na-ekwu gosi na ‘okwu ọma [ya bụ, eziokwu] akpaliwo obi anyị.’​—Ọma 45:1.

Anyị ekwesịghị ịtụ ndị mmụọ ọjọọ ụjọ. Jehova, Jizọs na ndị mmụọ ozi ka ha ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15) *

14-15. (a) Gịnị mere anyị ekwesịghị ịtụ ndị mmụọ ọjọọ ụjọ? (b) Olee ihe na-egosi na Jehova na-echebe ndị na-efe ya taa?

14 Atụla ndị mmụọ ọjọọ ụjọ. N’ụwa anyị a, ihe ọjọọ nwere ike ime anyị. Mmadụ nwere ike inwe ihe mberede, ma ọ bụ rịawa ọrịa, ma ọ bụkwanụ nwụọ mgbe ọ na-atụghị anya ya. Ma, ànyị kwesịrị iche na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ na-akpata ihe niile a? Baịbụl kwuru na “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya” nwere ike ịbịakwasị onye ọ bụla. (Ekli. 9:11) Jehova egosila na ya ka ndị mmụọ ọjọọ ike. Dị ka ihe atụ, Chineke ekweghị ka Setan gbuo Job. (Job 2:6) N’oge Mozis, Jehova gosiri na ya ka ndị dibịa anwansi ndị Ijipt ike. (Ọpụ. 8:18; 9:11) Jehova mechakwara nye Jizọs ike n’eluigwe, ya achụda Setan na ndị mmụọ ọjọọ n’ụwa. N’oge na-adịghị anya, a ga-atụba ha n’abis, bụ́ ebe ha na-agaghị enwe ike imesi ndị mmadụ ike.​—Mkpu. 12:9; 20:​2, 3.

15 Anyị na-ahụ ọtụtụ ihe ndị gosiri na Jehova na-echebe ndị na-efe ya taa. Chegodị banyere ihe a: Anyị na-ekwusa ma na-akụziri ndị mmadụ eziokwu n’ebe niile n’ụwa. (Mat. 28:​19, 20) Anyị na-esi otú ahụ agba ọrụ ọjọọ niile Ekwensu na-arụ n’anwụ. O doro anya na ọ bụrụ na Setan nwere ike ịkwụsị ihe niile gbasara ozi ọma anyị na-ekwusa, ọ gaara eme otú ahụ, ma ọ gaghị emeli ya. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ ndị mmụọ ọjọọ ụjọ. Anyị ma na “anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.” (2 Ihe 16:9) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ana-erubere Jehova isi, ndị mmụọ ọjọọ enweghị ike ịkpatara anyị nsogbu ọ bụla ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.

NGỌZI NDỊ NABATARA AKA JEHOVA NA-ENYERE ANYỊ GA-ENWETA

16-17. Nye ihe atụ gosiri ụdị obi ike mmadụ kwesịrị inwe iji guzogide ndị mmụọ ọjọọ.

16 Anyị ga-enwerịrị obi ike ma ọ bụrụ na anyị ga-eguzogideli ndị mmụọ ọjọọ. Obi ike dị anyị mkpa karịchaa ma ndị enyi na ndị ikwu anyị na-emegide anyị n’ihi na ha chere na ihe ọjọọ ga-eme anyị ma ọ bụrụ na anyị esoghị ha na-eme ihe ha na-eme. Ma Jehova na-agọzi ndị gosiri na ha nwere ụdị obi ike a. Ka anyị tụlee ihe otu nwanna nwaanyị onye Gana, aha ya bụ Erica mere. Ọ dị afọ iri abụọ na otu mgbe ọ malitere ịmụ Baịbụl. Papa ya bụ onye dibịa afa. Ndị ezinụlọ ha tụrụ anya na ọ ga na-eso na-eri anụ ndị papa ya ji chụọrọ ndị nna nna ha nwụrụ anwụ àjà. Mgbe Erica jụrụ iso ha, ha sịrị na ọ na-akparị chi ha. Ha kweere na ndị nna nna ha ahụ ga-akụ ha ara ma ọ bụ kpatara ha ọrịa ndị ọzọ.

17 Ndị ezinụlọ Erica gbalịrị ịmanye ya iso ha mee ihe ha na-eme, ma ọ jụwapụrụ isi, n’agbanyeghị na ọ ga-eme ka ha chụpụ ya n’ụlọ. Mgbe ha chụpụrụ ya, ụmụnna ụfọdụ kpọọrọ ya. Jehova si otú a gọzie Erica. Ụmụnna ndị a bịara ghọọrọ ya ụmụnne. (Mak 10:​29, 30) Ọ bụ eziokwu na ndị ezinụlọ Erica jụrụ ya ma kpọọ ihe ya ọkụ, ọ nọgidere na-erubere Jehova isi, mechaa mee baptizim. Ugbu a, ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile. Ọ naghị atụ ndị mmụọ ọjọọ ụjọ. Erica kwuru gbasara ezinụlọ ya, sị: “M na-arịọ Jehova kwa ụbọchị ka o mee ka ndị ezinụlọ anyị mụta banyere ya ma fewe ya, n’ihi na ọ ga-eme ka ha na-enwe obi ụtọ ma nwere onwe ha.”

18. Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị na-atụkwasị Jehova obi?

18 Ọ bụghị anyị niile ka ụdị ọnwụnwa a nwere ike ịbịara. Ma anyị niile kwesịrị iguzogide ndị mmụọ ọjọọ ma tụkwasị Jehova obi. Anyị mee ya, Jehova ga-agọzi anyị, Setan agaghịkwa eji ụgha ya duhie anyị. Ụjọ ndị mmụọ ọjọọ agaghịkwa eme ka anyị kwụsị ife Jehova. Ma nke kachanụ bụ na anyị na Jehova ga-adịkwu ná mma. Jems onye na-eso ụzọ Jizọs kwuru, sị: “Doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ. Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”​—Jems 4:​7, 8.

ABỤ 150 Chọọ Chineke Ka O Chebe Gị

^ par. 5 Jehova dọrọ anyị aka ná ntị banyere ndị mmụọ ọjọọ na nsogbu ndị ha nwere ike ịkpatara anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Olee otú ndị mmụọ ọjọọ si eduhie ndị mmadụ? Olee ihe anyị nwere ike ime iji guzogide ha? N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú Jehova si enyere anyị aka ka ndị mmụọ ọjọọ ghara iduhie anyị.

^ par. 3 NKỌWAKWU: Mgbaasị bụ nkwenkwe na ihe ọ bụla nwere ihe jikọrọ ha na ndị mmụọ ọjọọ. Ihe so na ya bụ ikwe na mmadụ nwụọ, mmụọ ya na-apụ gaa biri ebe ọzọ, nakwa na ndị dị ndụ nwere ike iso onye ahụ na-ekwurịta okwu, karịchaa si n’aka ndị na-eme mgbaasị. Ihe ndị ọzọ so na ya bụ ịta amusu na ịgba afa. N’isiokwu a, anyị kwuo banyere majik, ihe anyị na-ekwu bụ ihe niile gbasara ime anwansi. Ihe ụfọdụ e ji mara ya bụ ịga na nke dibịa gwa ya ka o mesie mmadụ ike, ịkọ mmadụ ọgwụ ma ọ bụ imerụ ọgwụ a kọrọ mmadụ. Ọ bụghị ụdị ihe ụfọdụ ndị na-eji aghụghọ eme iji mee egwuregwu ma ọ bụ mee ndị mmadụ obi ụtọ.

^ par. 12 E nyeghị ndị okenye ikike ịgwa ụmụnna ihe ndị ha ga-eji na-atụrụ ndụ. Kama, nwanna ọ bụla ga-eji akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ kpebie ihe ndị ọ ga-agụ, ihe ndị ọ ga-ele ma ọ bụ ihe ndị ọ ga-eji egwu egwuregwu. Onyeisi ezinụlọ ọ bụla ma ihe ga-agbalị hụ na ezinụlọ ya na-eji ihe Baịbụl kwuru ekpebi ihe ndị ha ga-eji atụrụ ndụ.​—Gaa na jw.org® n’asụsụ Igbo na www.pr418.com/ig, gụọ isiokwu bụ́ “Ndịàmà Jehova Hà Na-agwa Ndị Òtù Ha Aha Fim, Akwụkwọ, na Egwú Ndị Ha Ga-ezere?” Gaa n’ebe e dere GBASARA ANYỊ pịa ebe e dere AJỤJỤ NDỊ A NA-AJỤKARỊ GBASARA NDỊÀMÀ JEHOVA.

^ par. 54 NKỌWA FOTO: Ebe Jizọs, bụ́ Eze anyị dị ike, na-eduzi ìgwè ndị mmụọ ozi n’eluigwe.