Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 16

Mata nke Bụ́ Eziokwu Banyere Ọnwụ

Mata nke Bụ́ Eziokwu Banyere Ọnwụ

“Otú a ka anyị si amata okwu si n’aka mmụọ, ma nke bụ́ eziokwu ma nke bụ́ njehie.”​—1 JỌN 4:6.

ABỤ 73 Mee Ka Anyị Ghara Ịtụ Egwu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

Ọ bụrụ na mmadụ anwụnahụ ndị ikwu gị, na-akasi ha obi kama iso ha na-eme omenala ndị na-adịghị Chineke mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1 na nke 2) *

1-2. (a) Olee otú Setan sirila duhie ndị mmadụ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

SETAN, bụ́ “nna ụgha,” na-eduhie ndị mmadụ kemgbe ụwa. (Jọn 8:44) Ụfọdụ n’ime ụgha ọ na-agha bụ banyere ọnwụ na ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ. Ihe mere ndị mmadụ ji kwere ọtụtụ ihe ndị na-abụghị eziokwu ha kweere, na-emekwa ọtụtụ omenala ndị ha na-eme bụ n’ihi egwu ha na-atụ ndị nwụrụ anwụ. Ụdị ihe a emeela ka ọtụtụ ụmụnna anyị “lụsie ọgụ ike maka okwukwe ahụ” mgbe mmadụ nwụrụ n’ezinụlọ ha ma ọ bụ n’obodo ha.​—Jud 3.

2 Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee gị, gịnị ga-enyere gị aka ikwesị ntụkwasị obi n’ihi na ị ma ihe Baịbụl na-akụzi banyere ọnwụ? (Efe. 6:11) Olee otú ị ga-esi kasie nwanna gị obi ma gbaa ya ume ma ọ bụrụ na a na-amanye ya ime omenala ndị na-adịghị Chineke mma? N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú Jehova si enyere anyị aka. Ka anyị burugodị ụzọ tụlee ihe Baịbụl kwuru gbasara ọnwụ.

IHE NDỊ BỤ́ EZIOKWU BANYERE ỌNỌDỤ NDỊ NWỤRỤ ANWỤ

3. Gịnị ka ụgha mbụ kpatara?

3 Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-anwụ anwụ. Ma, ọ bụrụ na Adam na Iv chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi, ha ga-erubere Jehova isi, bụ́ onye nyere ha iwu na-ataghị akpụ. Ọ gwara ha, sị: “Erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụrịrị.” (Jen. 2:​16, 17) Ma, Setan kpatara nsogbu. O ji agwọ gwa Iv, sị: “Unu agaghị anwụ ma ọlị.” Ọ dị mwute na Iv kweere ụgha a ma rie mkpụrụ osisi ahụ. Di ya mechakwara rie ya. (Jen. 3:​4, 6) Ọ bụ otú a ka mmehie na ọnwụ si malite.​—Rom 5:12.

4-5. Olee otú Setan si nọgide na-eduhie ndị mmadụ?

4 Adam na Iv nwụrụ otú ahụ Jehova gwara ha. Ma, Setan akwụsịghị ịna-aghara ndị mmadụ ụgha gbasara ọnwụ. Ka oge na-aga, ọ malitere ịghara ndị mmadụ ụgha ndị ọzọ. Otu n’ime ụgha ndị ahụ bụ na ọ na-abụ mmadụ nwụọ, o nwere ihe na-esi ya n’ahụ́ apụ aga ebe ọzọ dịrị ndụ. Ụzọ dị iche iche o si na-agha ụgha a eduhiela ọtụtụ ndị kemgbe ụwa.​—1 Tim. 4:1.

5 Gịnị mere ọtụtụ ndị ji ekwere ụgha Setan? Setan ma otú ọnwụ na-adị ndị mmadụ n’obi ma jiri ya na-eduhie ha. Ebe ọ bụ na Chineke kere anyị ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi, anyị achọghị ịnwụ anwụ. (Ekli. 3:11) Anyị na-ewere ọnwụ ka onye iro anyị.​—1 Kọr. 15:26.

6-7. (a) Setan ò meela ka mmadụ niile ghara ịma ihe bụ́ eziokwu gbasara ọnwụ? Kọwaa. (b) Olee otú eziokwu Baịbụl sirila mee ka anyị ghara ịna-atụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ?

6 N’agbanyeghị mbọ niile Setan na-agba, ihe bụ́ eziokwu banyere ọnwụ abụghị ihe e zoro ezo. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị taa ma ihe Baịbụl na-akụzi banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ nakwa olileanya e nwere banyere ha, ha na-akụzikwara ha ndị mmadụ. (Ekli. 9:​5, 10; Ọrụ 24:15) Eziokwu ndị anyị ma banyere ndị nwụrụ anwụ na-akasi anyị obi, na-emekwa ka anyị ghara ịna-atụ ụjọ na-enweghị isi banyere ndị nwụrụ anwụ. Ọ na-emekwa ka anyị ghara ịnọ ná mgbagwoju anya banyere ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ. Dị ka ihe atụ, anyị anaghị atụ ndị nwụrụ anwụ egwu ma ọ bụkwanụ na-atụ ụjọ na ihe ọjọọ nwere ike ime ha. Anyị ma na ha adịghị ndụ, nakwa na ha enweghị ike imerụ onye ọ bụla ahụ́. E nwere ike ikwu na ha nọ n’oké ụra. (Jọn 11:​11-14) Anyị makwa na ha amaghị ma oge ọ̀ na-aga. N’ihi ya, n’oge mbilite n’ọnwụ, ndị nwụrụla kemgbe ụwa ga-ewere ya na a kpọlitere ha n’ọnwụ ozugbo ha nwụrụ.

7 Ọ̀ bụ na i kwetaghị na ihe bụ́ eziokwu banyere ndị nwụrụ anwụ doro anya, dịri mfe nghọta ma kwesị ekwesị? Ma, ọ dị iche n’ụgha ndị Setan ji emegharị ndị mmadụ anya taa. Ụgha ndị ahụ na-emekwa ka a na-ekwutọ Onye kere anyị. Iji nwee ike ịghọtakwu nsogbu Setan kpataara ụmụ mmadụ, anyị ga-atụle ajụjụ ndị a: Olee otú ụgha Setan sirila mee ka e kwutọọ Jehova? Olee otú ha sirila mee ka ndị mmadụ na-eche na ọ baghị uru ikwere n’àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ? Olee otú ha sirila mee ka obi na-agbawakwu ndị mmadụ, ha ana-atagbukwa onwe ha n’ahụhụ.

NSOGBU NDỊ ỤGHA SETAN KPATARA

8. Dị ka Jeremaya 19:5 kwuru, olee otú ụgha Setan na-agha gbasara ndị nwụrụ anwụ si eme ka a na-ekwutọ Jehova?

8 Ụgha Setan na-agha banyere ndị nwụrụ anwụ na-eme ka a na-ekwutọ Jehova. Otu n’ime ụgha ndị ahụ bụ na a na-ata ndị nwụrụ anwụ ahụhụ n’ọkụ. Ụdị ozizi a na-eme ka a na-ekwutọ Chineke. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ụgha a na-eme ka ndị mmadụ kweta na obi tara Chineke, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya, mmiri ka Setan. (1 Jọn 4:8) Olee otú ihe a dị gị n’obi? Oleekwa otú i chere ọ dị Jehova n’obi karịchaa? A sị ka e kwuwe, Jehova kpọrọ ụdị mmekpọ ọnụ niile asị.​—Gụọ Jeremaya 19:5.

9. Olee otú ụgha Setan na-agha banyere ndị nwụrụ anwụ si eme ka ndị mmadụ na-ele àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ anya, bụ́ nke e kwuru na Jọn 3:16 na 15:13?

9 Ụgha Setan na-agha banyere ọnwụ na-eme ka ndị mmadụ na-eche na ọ baghị uru ikwere n’àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. (Mat. 20:28) Ụgha ọzọ Setan na-agha bụ na ụmụ mmadụ nwere mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ. Ọ bụrụ na ihe a bụ eziokwu, mmadụ niile ga-adị ndụ ebighị ebi. Jizọs agaraghịnụ eji ndụ ya chụọ àjà ka anyị nweta ndụ ebighị ebi. Ma, cheta na àjà Jizọs chụrụ bụ ịhụnanya kachanụ e gositụrụla ụmụ mmadụ. (Gụọ Jọn 3:16; 15:13.) Chegodị otú obi ga-adị Jehova na Jizọs banyere ozizi ndị merela ka ihe a magburu onwe ya ha meere anyị yie ihe na-abaghị uru.

10. Olee otú ụgha Setan sirila mee ka obi na-agbawakwu ndị mmadụ, ha ana-atagbukwa onwe ha n’ahụhụ?

10 Ụgha Setan na-eme ka obi na-agbawakwu ndị mmadụ, ha ana-atagbukwa onwe ha n’ahụhụ. E nwere ike ịgwa nne na nna na-eru uju nwa ha na ọ bụ Chineke kpọọrọ ya, ikekwe ka ọ bụrụ mmụọ ozi n’eluigwe. Ụdị ụgha a ọ̀ na-eme ka ha kwụsị iru uju ka ọ bụ ka ha rukwuo uju? Ndị mmadụ ejirila nkụzi ọkụ ala mmụọ, bụ́ nkụzi ụgha, na-eme ka ọnụ a na-emekpọ ndị mmadụ yie ihe kwesịrị ekwesị, ma ọkụ a na-akpọ ndị gbara ihe Chọọchị Katọlik na-akụzi ụkwụ. Otu akwụkwọ nke kwuru gbasara ụlọikpe na-akpọ ndị mmadụ ọkụ n’ihi ịgba ihe Chọọchị Katọlik kwuru ụkwụ, kwuru na ụfọdụ ndị ahụ na-akpọ ndị mmadụ ọkụ nwere ike ịna-eche na ihe ha na-eme bụ ime ka ndị ahụ ha na-akpọ ọkụ “hụperetụ otú ọkụ ala mmụọ ga-adị,” ka ha nwee ike ichegharị tupu ha anwụọ, ka ha ghara ịga ọkụ ala mmụọ. N’ọtụtụ ebe taa, ndị mmadụ na-eche na ha ji ụgwọ ife ndị nna nna ha nwụrụ anwụ, ịkwanyere ha ùgwù, na ịchọ ka ha gọzie ha. Ndị ọzọ chọrọ ime ka obi jụrụ ndị nna nna ha nwụrụ anwụ ka ha ghara imekpa ha ahụ́. Ọ dị mwute na ihe ndị a ndị mmadụ kweere n’ihi ụgha Setan na-agha anaghị akasi ha obi. Kama, ọ na-eme ka ha na-echegbu onwe ha ma ọ bụdị na-atụ ụjọ na-enweghị isi na ọdụ.

OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI NA-AGBACHITERE EZIOKWU BAỊBỤL

11. Olee otú ndị ikwu anyị ma ọ bụ ndị enyi anyị nwere ike isi amanye anyị ime ihe Okwu Chineke na-akwadoghị?

11 Ịhụ Chineke n’anya na iji Okwu ya kpọrọ ihe na-enyere anyị aka irubere Chineke isi, ma mgbe ndị ikwu anyị ma ọ bụ ndị enyi anyị na-achọ ịmanye anyị ka anyị soro ha mee omenala Baịbụl na-akwadoghị banyere ndị nwụrụ anwụ. Ha nwere ike ịchọ imenye anyị ihere ma ọ bụrụ na anyị esoghị ha, ikekwe, na-ekwu na anyị ahụghị onye ahụ nwụrụ anwụ n’anya ma ọ bụ na anyị anaghị akwanyere ya ùgwù. Ha nwekwara ike ikwu na àgwà anyị nwere ike ime ka onye ahụ nwụrụ anwụ merụọ ndị dị ndụ ahụ́. Olee otú anyị nwere ike isi gbachitere eziokwu Baịbụl? Ka anyị tụlee otú i nwere ike isi mee ihe ndị na-esonụ Baịbụl kwuru.

12. Olee nkwenkwe na omenala banyere ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị o doro anya na Akwụkwọ Nsọ akwadoghị?

12 Kpebisie ike ‘ikewapụ onwe gị’ na nkwenkwe na omenala ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. (2 Kọr. 6:17) Ná mba Karịbian, ọtụtụ ndị kweere na mmadụ nwụọ, ihe ha na-asị na ọ bụ mmụọ onye ahụ nwere ike ịnọ gburugburu na-ata ndị mere ya ihe ọjọọ mgbe ọ dị ndụ ahụhụ. Otu akwụkwọ kwuru na mmụọ onye ahụ nwedịrị ike “ịkpa mkpamkpa n’obodo.” N’obodo ụfọdụ n’Afrịka, ha na-eji ihe kpuchie enyo ndị dị n’ụlọ onye nwụrụ anwụ ma che foto ya ihu n’ahụ́ ụlọ. Maka gịnị? Ụfọdụ na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ ekwesịghị ịhụ onwe ha. Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, o doro anya na anyị anaghị ekwere akụkọ ọ bụla na-abụghị eziokwu ma ọ bụ na-eme omenala ndị na-akwado ụgha Setan.​—1 Kọr. 10:​21, 22.

Ime ezigbo nchọnchọ na Baịbụl nakwa n’akwụkwọ anyị na iso ndị ikwu gị na-abụghị Ndịàmà Jehova kwurịta okwu nke ọma ga-enyere gị aka izere nsogbu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 14) *

13. Dị ka e kwuru na Jems 1:​5, olee ihe i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na omenala ụfọdụ edoghị gị anya?

13 Ọ bụrụ na omenala ụfọdụ ma ọ bụ ihe ndị mmadụ na-eme edoghị gị anya, kọọrọ ya Jehova n’ekpere, rịọ ya ka o nye gị amamihe ya. (Gụọ Jems 1:5.) Meekwa nchọnchọ n’akwụkwọ anyị. I nwere ike ịkọrọ ya ndị okenye ọgbakọ. Ha agaghị agwa gị ihe ị ga-eme, kama, ha ga-enyere gị aka ịmata ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru, dị ka ndị nke anyị tụlerela n’isiokwu a. I mee ihe ndị a, ị ‘na-azụ ikike nghọta’ gị. Ikike nghọta a ga-enyekwara gị aka “ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.”​—Hib. 5:14.

14. Olee ụzọ ndị anyị ga-esi zere ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ?

14 ‘Na-emenụ ihe niile iji nye Chineke otuto. Unu abụla ihe ịsụ ngọngọ.’ (1 Kọr. 10:​31, 32) Mgbe anyị na-ekpebi ma ànyị ga-eso eme omenala ụfọdụ, anyị kwesịrị ichebara otú mkpebi anyị nwere ike isi emetụta akọnuche ndị ọzọ echiche, karịchaa, ụmụnna anyị. Ma, anyị achọghị ime ihe ga-eme ka onye ọ bụla sụọ ngọngọ. (Mak 9:42) Anyị achọghịkwa ịkpasu ndị na-abụghị ụmụnna anyị iwe n’ihi ihe na-enweghị isi. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe ha nọ ga-eme ka anyị meda obi gwa ha okwu. Nke a ga-emekwa ka a na-eto Jehova. O doro anya na anyị achọghị ka anyị na ndị mmadụ na-ese okwu ma ọ bụ katọọ omenala ha. Anyị kwesịrị icheta na ịhụnanya na-akpa ezigbo ike. Ọ bụrụ na anyị emeda obi gosi ndị na-emegide anyị na anyị hụrụ ha n’anya, o nwedịrị ike ime ka obi ha jụrụ.

15-16. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị gwa ndị ọzọ ihe ndị i kweere? Nye ihe atụ. (b) Olee otú ihe Pọl kwuru ná Ndị Rom 1:16 si gbasa anyị?

15 Mee ka ndị obodo unu mata na ị bụ Onyeàmà Jehova. (Aịza. 43:10) Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’ezinụlọ unu, ndị ikwu gị na ndị agbata obi gị nwere ike ịna-ewesa gị iwe na i soghị ha mee omenala ha. Ma, ọ bụrụ na i bula ụzọ gwa ha ihe ndị i kweere, o nwere ike ime ka ha ghara ịna-enyecha gị nsogbu. Otu nwanna bi na Mozambik aha ya bụ Francisco kwuru, sị: “Mgbe mụ na Carolina nwunye m mụtara eziokwu, anyị gwara ndị ezinụlọ anyị na anyị agaghịzi efe ndị nwụrụ anwụ ofufe. Ma, ọnwụnwa bịaara anyị mgbe nwanne nwunye m nwụrụ. Ndị obodo anyị na-asa ozu ahụ́ mgbe a na-eme omenala ha. Ha mechaa, otu onye ezinụlọ ya kacha ya nso ga-ehi ụra abalị atọ n’ebe ahụ a wụfuru mmiri e ji saa ya ahụ́. Ha kwuru na ihe mere ha ji eme omenala ndị a bụ ka obi dị mmụọ nke onye nwụrụ anwụ mma. Ndị ezinụlọ nwunye m sịrị na ọ bụ ya ga-ehi ụra abalị atọ n’ebe ahụ a wụfuru mmiri e ji saa ozu nwanne ya ahụ́.”

16 Gịnị ka Nwanna Francisco na nwunye ya mere? Francisco kwuru, sị: “N’ihi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma chọọ ime ihe dị ya mma, anyị jụrụ ime omenala ahụ. Ezigbo iwe were ndị ezinụlọ nwunye m. Ha kwuru na anyị akwanyereghị onye ahụ nwụrụ anwụ ùgwù, kwuokwa na ha agaghịzi abịa na nke anyị ma ọ bụ nyere anyị aka. Ebe ọ bụ na anyị agwala ha ihe ndị anyị kweere tupu ihe a emee, anyị na ha ekwughị banyere ya mgbe ahụ iwe ji ha. Ụfọdụ n’ime ha gbachiteere anyị ma kwuo na anyị gwara ha ihe ndị anyị kweere tupu ihe a emee. Ka oge na-aga, obi bịara jụrụ ndị ezinụlọ nwunye m, anyị na ha ekpezie. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụfọdụ abịadịla n’ụlọ anyị ka anyị nye ha akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl.” Ka ihere ghara ime anyị ịnọgide na-erubere Chineke isi ebe ọ bụ na anyị ma ihe Baịbụl na-akụzi banyere ọnwụ.​—Gụọ Ndị Rom 1:16.

NA-AKASI NDỊ NA-ERU UJU OBI, NA-ENYEKWARA HA AKA

Ezigbo ndị enyi na-akasị ndị mmadụ nwụnahụrụ obi ma na-akwado ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17 ruo na nke 19) *

17. Gịnị ga-enyere anyị aka ịbụ ezigbo enyi mgbe nwanna anyị na-eru uju?

17 Ọ bụrụ na mmadụ anwụnahụ nwanna anyị, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị bụrụ ‘ezi enyi, bụrụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.’ (Ilu 17:17) Olee otú anyị ga-esi abụ “ezi enyi,” nke ka nke, ma ọ bụrụ na a na-amanye nwanna ahụ ime ihe Baịbụl na-akwadoghị. Ka anyị tụlee ihe abụọ Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ịkasi ya obi.

18. Gịnị mere Jizọs ji bee ákwá, gịnịkwa ka anyị nwere ike ịmụta na ya?

18 ‘Soro ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.’ (Rom 12:15) O nwere ike isiri anyị ike ịma ihe anyị ga-agwa ndị na-eru uju. Ọ bụrụgodị na anyị amaghị ihe anyị ga-agwa ha, ha hụ na anyị na-ebe ákwá, ha ga-amata na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. Mgbe enyi Jizọs aha ya bụ Lazarọs nwụrụ, Meri, Mata na ndị ọzọ bere ákwá n’ihi ọnwụ nwanne ha na enyi ha ha hụrụ n’anya. Mgbe Jizọs bịara ebe ahụ mgbe abalị anọ gachara, ‘anya mmiri gbakwara ya’ n’agbanyeghị na ọ ma na ya ga-akpọlite Lazarọs n’ọnwụ n’oge na-adịghị anya. (Jọn 11:​17, 33-35) Ákwá a Jizọs bere gosiri otú obi dị Jehova gbasara ọnwụ Lazarọs. O gosikwara na Jizọs hụrụ ezinụlọ ahụ n’anya. O doro anya na nke a kasiri Meri na Mata obi. Ọ bụrụkwa na ụmụnna anyị achọpụta na anyị hụrụ ha n’anya, nakwa na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi, ha na-amata na anyị kwụ ha n’azụ ma na-akwado ha.

19. Mgbe anyị na-akasi nwanna na-eru uju obi, olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi mee ihe Ekliziastis 3:7 kwuru?

19 “Oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Ekli. 3:7) Ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi kasie nwanna na-eru uju obi bụ ige ya ntị nke ọma. Hapụ ya ka o kwuo otú ọ dị ya n’obi. Ewekwala iwe ma o kwuo “okwu nzuzu.” (Job 6:​2, 3) Nsogbu ndị ikwu ya na-abụghị Ndịàmà Jehova na-enye ya nwere ike ime ka ọ na-echegbukwu onwe ya. N’ihi ya, soro ya kpee ekpere. Rịọ “Onye na-anụ ekpere” ka o nye ya ike, nakwa ka o mee ka anya doo ya. (Ọma 65:2) Ọ bụrụ na o kwe mee, gị na ya gụọ Baịbụl, ma ọ bụ isiokwu dị n’akwụkwọ anyị, nke dabara n’ọnọdụ ya, dị ka akụkọ ndụ nke nwere ike ịgba ya ume.

20. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

20 Obi dị anyị ụtọ na anyị ma ihe bụ́ eziokwu banyere ndị nwụrụ anwụ nakwa olileanya magburu onwe ya ndị nọ n’ili ncheta nwere. (Jọn 5:​28, 29) N’ihi ya, ka anyị na-akata obi esi n’okwu ọnụ anyị nakwa n’omume anyị na-akwado eziokwu Baịbụl, na-akọkwara ya ndị ọzọ n’oge ọ bụla kwesịrị ekwesị. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle gbasara mgbaasị, bụ́ ụzọ ọzọ Setan si eme ka ndị mmadụ ghara ịmata eziokwu. Anyị ga-achọpụtakwa ihe mere anyị ji kwesị izere omenala na ntụrụndụ ndị nwere ihe jikọrọ ha na mgbaasị.

ABỤ 24 Bịanụ n’Ugwu Jehova

^ par. 5 Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-aghara ndị mmadụ ụgha banyere ndị nwụrụ anwụ, si otú ahụ na-eduhie ha. Ụgha ndị ahụ emeela ka ndị mmadụ na-eme omenala ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Isiokwu a ga-enyere gị aka ịna-erubere Jehova isi ma ndị mmadụ chọọ ịmanye gị ka i mee ụdị omenala ndị ahụ.

^ par. 55 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwaanyị na-eru uju ọnwụ onye ezinụlọ ya, ndị ezinụlọ ya bụ́ Ndịàmà Jehova ana-akasi ya obi.

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna mechara nchọnchọ banyere omenala ndị obodo ha na-eme mgbe ha na-eli ozu ma meda obi na-akọwara ndị ikwu ya ihe ndị o kweere.

^ par. 59 NKỌWA FOTO: Ebe ndị okenye na-akasi otu nwanna mmadụ nwụnahụrụ obi.