Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 14

Ị̀ Na-ejezu Ozi Gị?

Ị̀ Na-ejezu Ozi Gị?

“Rụọ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma, jezuo ozi gị.”​—2 TIM. 4:5.

ABỤ 57 Anyị Na-ezi Ụdị Mmadụ Niile Ozi Ọma

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

Ebe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ. Ọ gwara ha ka ha ‘gaa mee ndị mmadụ ndị na-eso ụzọ ya.’ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1)

1. Gịnị ka ndị ohu Chineke niile kwesịrị ịna-eme, n’ihi gịnịkwa? (Lee ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

JIZỌS KRAỊST nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ‘gaa mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.’ (Mat. 28:19) Ndị ohu Chineke niile chọrọ ịmụta otú ha ga-esi “jezuo” ozi a a sị ha jee. (2 Tim. 4:5) Nke bụ́ eziokwu bụ na ozi a ka ihe ọ bụla ọzọ mkpa, kakwa ihe ọ bụla ọzọ baa uru, e kwesịkwara iji ịnụ ọkụ n’obi eje ya karịa ihe ọ bụla ọzọ. Ma, o nwere ike isiri anyị ike iji oge buru ibu na-ekwusa ya otú anyị chọrọ.

2. Olee ihe ndị nwere ike ime ka o siere ụfọdụ n’ime anyị ike ijezu ozi ha?

2 E nwere ihe ndị ọzọ dị mkpa anyị na-eme na-eri anyị oge ma na-eme ka ike na-agwụ anyị. O nwere ike ịbụ na anyị na-eji ọtụtụ awa na-arụ ọrụ kwa ụbọchị ka anyị nwee ike igbo mkpa anyị na nke ndị ezinụlọ anyị. O nwere ike ịbụ na ibu ndị ọzọ dị n’ezinụlọ, ọrịa, ịda mbà n’obi, ma ọ bụ nsogbu ndị ha na nká so aga anaghị ekwe anyị ṅụrụ mmiri tọgbọ iko. Olee otú anyị nwere ike isi jezuo ozi anyị n’agbanyeghị ihe ndị a niile?

3. Olee otú anyị kwesịrị isi aghọta ihe Jizọs kwuru na Matiu 13:23 gbasara ozi ọma anyị na-ezi?

3 Obi ekwesịghị ịna-ajọ anyị njọ ma ọ bụrụ na otú ihe si dịrị anyị mere ka anyị ghara iji oge buru ibu otú anyị chọrọ ejere Jehova ozi. Jizọs ma na oge na ike anyị niile ga-eji na-ekwusa ozi ọma agaghị aha nhata. (Gụọ Matiu 13:23.) Jehova ji ihe niile anyị na-eme n’ozi anyị kpọrọ ihe ma ọ bụrụhaala na anyị ji obi anyị niile na-eme ya. (Hib. 6:​10-12) Ma o nwere ike ịna-adị anyị ka ọnọdụ anyị ga-ekweli anyị ijekwuru Jehova ozi. N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú anyị nwere ike isi mee ka ozi anyị bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị, na-elegide anya otu ebe ma na-eme ka otú anyị si ezi ozi ọma na-akakwu mma. Ka anyị buru ụzọ tụlee ihe ijezu ozi anyị pụtara.

4. Gịnị ka ijezu ozi anyị pụtara?

4 Ijezu ozi anyị pụtara anyị ime ihe niile anyị nwere ike ime n’ikwusa ozi ọma na n’ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ma, ihe ka mkpa n’ozi anyị abụghị otú oge anyị ji jee ya hà. Ihe dị Jehova mkpa bụ ihe anyị bu n’obi na-eje ya. Ihe mere anyị ji eji obi anyị niile ejere Jehova ozi bụ n’ihi na anyị hụrụ ya na ndị mmadụ ibe anyị n’anya. * (Mak 12:​30, 31; Kọl. 3:23) Iji obi anyị niile ejere Jehova ozi pụtara ime ike anyị niile n’ozi Jehova. Ọ bụrụ na anyị aghọta na ikwusa ozi ọma bụ ihe ùgwù, anyị ga-eme ike anyị niile iji kwusaara ọtụtụ mmadụ ozi ọma.

5-6. Mee ihe atụ gosiri otú onye ọnọdụ ya na-anaghị ekwe jee ozi otú ọ chọrọ nwere ike isi jiri ozi ọma mere ihe kacha mkpa ná ndụ ya.

5 Chegodị gbasara otu nwa okorobịa ise foto na-atọ ụtọ. Obi na-atọ ya ụtọ ise foto mgbe ọ bụla ohere ya dapụtara. O mechara bido ise ndị mmadụ foto n’ebe a na-eme ememme ná gwụcha izu. Ma ego ọ na-enweta na ya anaghị ezuru ya. N’ihi ya, ọ malitere irere mmadụ ahịa, si na Mọnde ruo Fraịdee. Ọ bụ eziokwu na ọ na-eji oge buru ibu erere mmadụ ahịa, ma obi ya ka dịkwa n’ise foto. Ọ na-atụ anya mgbe ọ ga-amụtakwu otú e si ese foto ma jiri ya mere aka ọrụ. Ma, ọ na-eji ohere ọ bụla dapụtaranụ ese foto, ọ bụrụgodị obere oge.

6 O nwekwara ike ịdị gị otú ọ dị nwa okorobịa a. O nwere ike ị naghị eji oge buru ibu ezi ozi ọma n’ihi otú ihe si dịrị gị. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na izi ozi ọma na-atọ gị ụtọ. Ị na-agbalị ka otú i si ezi ozi ọma na-erukwu ndị mmadụ n’obi. Ma, n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe na-ewekọrọ oge gị, i nwere ike ịna-eche otú ị ga-esi jiri ikwusa ozi ọma mere ihe kacha mkpa ná ndụ gị.

OTÚ Ị GA-ESI EME KA OZI JEHOVA BỤRỤ IHE KACHA GỊ MKPA NÁ NDỤ

7-8. Olee otú anyị ga-esi jiri ozi anyị kpọrọ ihe ka Jizọs?

7 Jizọs gosiri otú anyị nwere ike isi jiri ozi Jehova mere ihe kacha anyị mkpa ná ndụ. Ihe kacha ya mkpa ná ndụ bụ ịkọrọ ndị mmadụ gbasara Alaeze Chineke. (Jọn 4:​34, 35) O ji ụkwụ gaa ọtụtụ narị kilomita kwusaara ọtụtụ ndị ozi ọma. O ji ohere ọ bụla dapụtaranụ zie ndị mmadụ ozi ọma ma n’ụlọ ha ma n’ebe ọhaneze na-anọkarị. Ihe kacha Jizọs mkpa bụ ozi ya.

8 Anyị nwere ike iṅomi Jizọs ma anyị jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, n’ebe ọ bụla nakwa n’oge ọ bụla o kwere omume. Anyị na-ahapụkwa ihe ụfọdụ na-amasị anyị ka anyị nwee ike iwepụta oge zie ndị mmadụ ozi ọma. (Mak 6:​31-34; 1 Pita 2:21) Ụfọdụ ụmụnna anyị bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị ọsụ ụzọ oge niile ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ inyeaka. E nwekwara ndị nke mụrụ asụsụ ọzọ ma ọ bụkwanụ kwaga ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma. Ma, ndị ihe ha na-arụ kacha buo ibu bụ ndị nkwusa na-enweghị ike ije ụdị ozi ndị a, ma ha ji ike ha niile na-ekwusa ozi ọma. N’agbanyeghị ihe anyị nwere ike ime, Jehova anaghị atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. Ọ chọrọ ka ozi anyị niile na-ejere ya na-atọ anyị ụtọ, ebe ọ bụ na ozi ọma anyị na-ezi bụ “ozi ọma dị ebube nke Chineke bụ́ onye obi ụtọ.”​—1 Tim. 1:11; Diut. 30:11.

9. (a) Olee otú Pọl si were ozi ya ka ihe kacha ya mkpa ná ndụ n’agbanyeghị na o nwere ọrụ ọ na-arụ iji kpaa afọ ya? (b) Gịnị ka Ọrụ Ndịozi 28:​16, 30, 31 kwuru nke gosiri otú Pọl si were ozi ya?

9 Pọl onyeozi ji ozi ya mere ihe kacha ya mkpa ná ndụ, anyị kwesịkwara iṅomi ya. Mgbe ọ nọ na Kọrịnt n’oge ọ na-eje ozi ala ọzọ ya nke abụọ, ego o nwere e bughịzi ibu. N’ihi ya, ọ rụrụ ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu ruo oge ụfọdụ. Ma Pọl ewereghị ịkpa ákwà ụlọikwuu ka ọrụ kacha ya mkpa. O ji ọrụ a na-akpa afọ ya ka o nwee ike izi ndị Kọrịnt ozi ọma ‘n’anaghị ha ihe ọ bụla.’ (2 Kọr. 11:7) Ọ bụ eziokwu na Pọl nwere ọrụ ọ na-arụ o ji na-akpa afọ ya, ọ nọgidere jiri ozi ọma kpọrọ ihe. O zidịrị ndị mmadụ ozi ọma n’Ụbọchị Izu Ike. Mgbe ihe bịara dịkwuoro ya mma, ọ bịara jiri oge bukwuru ibu na-ezi ozi ọma. Ọ “malitere ikwusasi okwu Chineke ike, na-agbara ndị Juu àmà iji gosi na Jizọs bụ Kraịst.” (Ọrụ 18:​3-5; 2 Kọr. 11:9) Mgbe a tụrụ ya mkpọrọ n’ụlọ ya na Rom ruo afọ abụọ, o ziri ndị bịara ileta ya ozi ọma, deekwa akwụkwọ ozi. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 28:​16, 30, 31.) Pọl kpebisiri ike na ya agaghị ekwe ka ihe ọ bụla dị ya mkpa karịa ozi ya. O kwuru, sị: “Ebe anyị nwere ozi a . . . , anyị adịghị ada mbà.” (2 Kọr. 4:1) Dịkwa ka Pọl, anyị ka nwere ike ime ka ozi Alaeze ahụ bụrụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ n’agbanyeghị na anyị nwere ọrụ ndị anyị na-arụ iji kpaa afọ anyị.

E nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi ejezu ozi anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11)

10-11. Olee otú anyị nwere ike isi jezuo ozi anyị ma ọ bụrụ na anyị na-arịa ọrịa?

10 Ọ bụrụ na anyị anaghị ejikwa oge buru ibu eje ozi ụlọ n’ụlọ n’ihi na anyị emeela agadi ma ọ bụkwanụ na ọrịa anyị na-eme ka ike ghara ịdị anyị, e nwekwara ụzọ ndị ọzọ anyị ka nwere ike isi zie ozi ọma. Ndị Kraịst oge mbụ ziri ndị mmadụ ozi ọma ebe ọ bụla ha nọ. Ha ji ohere ọ bụla ha nwere zie ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ọ bụla ha hụrụ ha, ma n’ụlọ n’ụlọ, ma n’ihu ọha, nakwa mgbe ha na-anọghị n’ozi. (Ọrụ 17:17; 20:20) Ọ bụrụ na anyị enweghị ike ịga ije ruo ogologo oge, anyị nwere ike ịnọrọ ọdụ n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị na-ezi ndị na-agafe agafe ozi ọma. Anyị nwekwara ike izi ozi ọma mgbe anyị na-anọghị n’ozi, dee akwụkwọ ozi ma ọ bụkwanụ jiri telefon zie ndị mmadụ ozi ọma. Obi na-atọ ọtụtụ ndị nkwusa ọnọdụ ha na-anaghị ekwecha gaa ozi ụlọ n’ụlọ ụtọ ma ha si n’ụzọ ndị a kwusaa ozi ọma.

11 I nwere ike ijezu ozi gị n’agbanyeghị ọrịa ị na-arịa. Ka anyị tụleekwa ọzọ gbasara Pọl. O kwuru, sị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.” (Fil. 4:13) Ụdị ike a dị ya mkpa mgbe ọ dara ọrịa n’otu n’ime ozi ala ọzọ o jere. Ọ gwara ndị Galeshia, sị: “M ziri unu ozi ọma n’oge mbụ n’ihi ọrịa nke na-arịa m n’anụ ahụ́.” (Gal. 4:13) Ọrịa ị na-arịa nwekwara ike ime ka i zie ndị ọzọ ozi ọma, dị ka ndị dọkịta, ndị nọọsụ, na ndị ọzọ na-elekọta gị. Ọtụtụ n’ime ha na-anọ n’ọrụ ha mgbe a gara izi ha ozi ọma n’ụlọ ha.

OTÚ Ị GA-ESI EME KA ANYA GỊ NA-ELEGIDE OTU EBE

12. Gịnị ka ‘ilegide anya otu ebe’ pụtara?

12 Jizọs kwuru, sị: “Oriọna nke ahụ́ bụ anya. Ya mere, ọ bụrụ na anya gị na-elegide otu ebe, ahụ́ gị dum ga-ejupụta n’ìhè.” (Mat. 6:22) Olee ihe ihe a o kwuru pụtara? Ọ pụtara na anyị agaghị ebi ndụ okomoko. Kama, anyị ga-eme ka anya anyị dịrị n’otu ihe ma ghara ikwe ka ihe ọ bụla mee ka uche anyị pụọ na ya. Jizọs n’onwe ya legidere anya n’ozi ya, ọ kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ka ha lekwasị anya n’ihe gbasara ofufe Jehova na Alaeze ya. Anyị na-eṅomi Jizọs ma anyị were ozi ọma ka ihe kacha mkpa ná ndụ anyị ma ‘buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.’​—Mat. 6:33.

13. Olee ihe ga-enyere anyị aka ilegide anya n’ozi anyị?

13 Otu ụzọ anyị nwere ike isi elekwasị anya n’ozi anyị bụ iselata aka n’ihe ndị anyị na-eme ka anyị nwekwuo oge anyị ga-eji na-enyere ndị mmadụ aka ka ha mata Jehova ma hụ ya n’anya. * Dị ka ihe atụ, ànyị nwere ike iselata aka n’oge anyị ji arụ ọrụ anyị ji akpa afọ anyị ka anyị nwee ike iwepụtakwu oge jee ozi etiti izu? Ànyị nwere ike iselata aka ná ntụrụndụ ndị na-eri oge anyị?

14. Gịnị ka otu di na nwunye mere ka ha nwee ike inwekwu oge ha ji eje ozi ọma ma jiri ya kpọrọ ihe?

14 Ọ bụ ihe a ka otu okenye aha ya bụ Elias na nwunye ya mere. O kwuru, sị: “Anyị enweghị ike ịsụ ụzọ n’oge ahụ, ma e nwere ihe ndị anyị ga-eme ka anyị nwee ike iji oge bukwuru ibu na-ezi ozi ọma. N’ihi ya, anyị mere obere ihe ụfọdụ ka anyị nwee ike iwepụtakwu oge na-ezi ozi ọma. Dị ka ihe atụ, anyị selatara aka n’otú anyị si emefu ego nakwa n’oge anyị ji atụrụ ndụ. Anyị gwakwara ndị anyị na-arụrụ ọrụ ka ha gbubilatara anyị oge anyị ji arụ ọrụ. Anyị bịaziri nwee oge anyị ji ezi ozi ọma ná mgbede, na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl, na-agakwa ozi ọma etiti izu ugboro abụọ n’ọnwa. Ọ na-atọgbu anyị atọgbu.”

IHE Ị GA-EME KA OTÚ I SI EZI OZI ỌMA NA OTÚ I SI AKỤZI IHE KA MMA

Ime ihe ndị anyị na-amụta n’ọmụmụ ihe etiti izu ga-eme ka anyị na-emekwu nke ọma n’ozi anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16) *

15-16. Dị ka 1 Timoti 4:​13, 15 kwuru, olee otú anyị nwere ike isi mee ka otú anyị si ezi ozi ọma na-akakwu mma? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị M Ga-eme Ka M Nwee Ike Ijezu Ozi M.”)

15 Ụzọ ọzọ anyị si ejezukwu ozi anyị bụ ime ka otú anyị si ezi ozi ọma na-aka mma. A na-enye ndị na-arụ ọrụ ụfọdụ ọzụzụ si n’oge ruo n’oge ka ha nwee ike ịmụtakwu ọrụ ahụ ma na-arụ ya nke ọma. Otú a ka ọ dịkwa ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Anyị kwesịrị ịna-amụtakwu otú anyị ga-esi ezi ozi ọma.​—Ilu 1:5; gụọ 1 Timoti 4:​13, 15.

16 Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-emekwu nke ọma n’ozi anyị? Ọ bụ itinye uche anyị n’ihe ndị a na-akụziri anyị n’Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ a na-enwe kwa izu. A na-enye anyị ọzụzụ magburu onwe ya n’ọmụmụ ihe a iji nyere anyị aka ịna-eme nke ọma n’otú anyị si ekwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe onyeisi oche na-enye ụmụnna ụfọdụ mere ihe omume n’ọmụmụ ihe ndụmọdụ, anyị nwere ike ịmụta ihe ndị ga-enyere anyị aka imezikwu otú anyị si ezi ozi ọma. Mgbe ọzọ anyị gara ozi ọma, anyị nwere ike iji ihe ndị ahụ anyị mụtara zie mmadụ ozi ọma. Anyị nwekwara ike ịgwa onye nlekọta ìgwè ozi ubi anyị ka o nyere anyị aka, ma ọ bụkwanụ anyị na ya ma ọ bụ onye nkwusa ma nke a na-akọ, ọsụ ụzọ ma ọ bụkwanụ onye nlekọta sekit arụọ n’ozi ọma. Ka anyị na-amụtakwu otú e si eji ihe ndị dị n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe ezi ozi ọma, izi ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl ga na-atọkwu anyị ụtọ.

17. Olee uru ijezu ozi gị ga-abara gị?

17 Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù na Jehova kwere ka anyị na ya “na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:9) Ọ bụrụ na ị “chọpụta ihe ndị ka mkpa” ma lekwasị anya n’ozi gị, ị ga-eji “ọṅụ jeere Jehova ozi.” (Fil. 1:10; Ọma 100:2) Ebe ị bụ onyeozi Chineke, obi kwesịrị isi gị ike na ọ ga-enye gị ike ị ga-eji ejezu ozi gị n’agbanyeghị nsogbu nwere ike ịbịara gị. (2 Kọr. 4:​1, 7; 6:4) Ma ọnọdụ gị ò kwere gị jiri oge buru ibu na-eje ozi ọma ma ọ bụ na o kweghị gị, ị “ga-enwe aṅụrị” ma ọ bụrụ na i jiri obi gị niile na-eje ozi gị. (Gal. 6:4) Ọ bụrụ na i jezuo ozi gị, o gosiri na ị hụrụ Jehova na ndị mmadụ ibe gị n’anya. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, “ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.”​—1 Tim. 4:16.

ABỤ 58 Anyị Na-achọ Ndị Udo

^ par. 5 Jisọs nyere anyị ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú anyị nwere ike isi jezuo ozi anyị, ọ bụrụgodị na e nwere ihe ndị ga-eme ka o siere anyị ike. Anyị ga-atụlekwa ihe anyị ga-eme ka otú anyị si ezi ozi ọma na-akakwu mma, obi ana-atọkwa anyị ụtọ.

^ par. 4 NKỌWAKWU: Ihe ndị so n’ozi anyị na-ejere Jehova bụ ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl, ịrụ ma ọ bụ ịrụzigharị ụlọ ndị e ji eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova, na ịgbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka.​—2 Kọr. 5:​18, 19; 8:4.

^ par. 13 Gụọ ihe asaa e kwuru n’igbe isiokwu ya bụ “Otú Ị Ga-esi Selata Aka n’Ihe Ndị Na-eri Gị Oge.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Julaị 2016, peeji nke 10.

^ par. 62 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-egosi otú e si eme nletaghachi n’ọmụmụ ihe etiti izu. Mgbe o mechara, onyeisi oche ana-enye ya ndụmọdụ, ya ana-ede ihe na broshọ Ịgụ Ihe na Izi Ihe ya. Ná ngwụcha izu ahụ, o ji ihe ndị ahụ ọ mụtara n’ọmụmụ ihe gaa ozi ọma.