Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 15

Ṅomie Jizọs ma Nọgide Na-enwe Udo

Ṅomie Jizọs ma Nọgide Na-enwe Udo

“Udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu . . . nche.”​—FIL. 4:7.

ABỤ 113 Udo Anyị Nwere

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Gịnị mere Jizọs ji na-echegbu onwe ya?

N’ABALỊ ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa, o nwere ihe nọ na-enye ya nsogbu n’obi. N’oge na-adịghị anya, ndị obi fere azụ ga-ata ya ahụhụ ma gbuo ya. Ma, ọ bụghị naanị ọnwụ ọ ga-anwụ nọ na-enye ya nsogbu n’obi. Ọ hụrụ Nna ya n’anya nke ukwuu ma chọọ ime ihe dị ya mma. Jizọs ma na ọ bụrụ na ya ekwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ahụhụ ọ na-aga ịta, na ọ ga-eme ka e wepụ aha Chineke n’ụta. Jizọs hụkwara ndị mmadụ n’anya. Ọ makwa na anyị ga-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi ma o kwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ.

2 N’agbanyeghị ahụhụ Jizọs na-aga ịta, obi ruru ya ala. Ọ gwara ndịozi ya, sị: “M na-enye unu udo m.” (Jọn 14:27) O nwere “udo nke Chineke,” ya bụ, obi ruru ya ala n’ihi na ya na Jehova dị n’ezigbo mma. Udo a mere ka Jizọs ghara ịna-echegbu onwe ya.​—Fil. 4:​6, 7.

3. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 O nweghị onye n’ime anyị ga-ata ụdị ahụhụ Jizọs tara. Ma, a ga-akpagbu ndị niile chọrọ iso Jizọs. (Mat. 16:​24, 25; Jọn 15:20) Mgbe ụfọdụ, anyị nwekwara ike ịna-echegbu onwe anyị ka Jizọs. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-echegbubiga onwe anyị ókè, ya emee ka obi ghara ịna-eru anyị ala? Ka anyị tụlee ihe atọ Jizọs mere mgbe ọ na-eje ozi ya n’ụwa. Anyị ga-atụlekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie ya ma anyị nwee nsogbu.

JIZỌS KPERE EKPERE ỌTỤTỤ UGBORO

Ikpe ekpere ga-eme ka anyị na-enwe udo (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 ruo na nke 7)

4. N’iburu ihe 1 Ndị Tesalonaịka 5:17 kwuru n’uche, olee ihe gosiri na Jizọs kpere ekpere ọtụtụ ugboro n’abalị ikpeazụ ahụ ọ dịrị ndụ n’ụwa?

4 Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:17. Jizọs kpere ekpere ọtụtụ ugboro n’abalị ikpeazụ ọ dịrị ndụ n’ụwa. Mgbe o gosiri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-echeta ọnwụ ya, o kpere ekpere maka achịcha na mmanya ndị ahụ. (1 Kọr. 11:​23-25) Tupu ya apụọ n’ebe ya na ndị na-eso ụzọ ya nọ mee Ememme Ngabiga, ya na ha kpere ekpere. (Jọn 17:​1-26) Mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya rutere Getsemeni n’abalị ahụ, o kpere ekpere ọtụtụ ugboro. (Mat. 26:​36-39, 42, 44) Okwu ikpeazụ Jizọs kwuru tupu ya anwụọ bụkwa ekpere. (Luk 23:46) Jizọs kpere ekpere banyere ihe niile mere n’abalị ikpeazụ ọ dịrị ndụ n’ụwa.

5. Gịnị mere ndịozi Jizọs anọgideghị na-enwe obi ike?

5 Otu ihe mere Jizọs ji die nsogbu ndị bịaara ya bụ na ọ tụkwasịrị Nna ya obi ma kpee ekpere ọtụtụ ugboro ka o nyere ya aka idi nsogbu ya. Ndịozi ya anọgideghị na-ekpe ekpere n’abalị ahụ. O mere ka ha ghara inwe obi ike mgbe ọnwụnwa bịaara ha. (Mat. 26:​40, 41, 43, 45, 56) Nsogbu bịara anyị, anyị ga-ekwesị ntụkwasị obi ma anyị ṅomie Jizọs ma “na-ekpe ekpere mgbe niile.” Gịnị ka anyị nwere ike ikpe n’ekpere?

6. Olee otú okwukwe ga-esi enyere anyị aka ịnọgide na-enwe udo?

6 Anyị nwere ike ikpe ekpere ka Jehova “nyekwuo anyị okwukwe.” (Luk 17:5; Jọn 14:1) Okwukwe dị anyị mkpa n’ihi na Setan ga-anwa ndị niile na-eso Jizọs. (Luk 22:31) Olee otú okwukwe ga-esi enyere anyị aka ịnọgide na-enwe udo mgbe anyị na-enwe nsogbu? Anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime iji merie nsogbu anyị, okwukwe anyị nwere na Jehova ga-enyere anyị aka ga-eme ka anyị kwụsị ịna-echegbu onwe anyị n’ihi na anyị ma na ọ ga-edozi nsogbu ahụ n’oge kwesịrị ekwesị. Ebe ọ bụ na obi siri anyị ike na ọ ma ihe ọ ga-eme karịa otú anyị ma, obi na-eru anyị ala.​—1 Pita 5:​6, 7.

7. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Nwanna Robert kwuru?

7 Ekpere na-enyere anyị aka ime ka obi na-eru anyị ala n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara anyị. Ka anyị tụlee banyere otu okenye kwesịrị ntụkwasị obi aha ya bụ Robert, bụ́ onye dị ihe dị ka afọ iri asatọ na abụọ ugbu a. O kwuru, sị: “Ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 4:​6, 7 enyerela m aka idi ọtụtụ nsogbu ndị bịaara m. E nwere mgbe ihe siiri m ezigbo ike. E nwekwara mgbe m na-abụghị okenye.” Gịnị nyeere Nwanna Robert aka ịnọgide na-enwe obi iru ala? O kwuru, sị: “M na-ekpe ekpere mgbe ọ bụla m bidoro ichegbu onwe m. M makwa na ka m na-ekpesi ekpere ike, ka obi na-erukwu m ala.”

JIZỌS JI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI KWUSAA OZI ỌMA

Ikwusa ozi ọma ga-eme ka anyị na-enwe udo (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 ruo na nke 10)

8. Dị ka e kwuru na Jọn 8:​29, olee ihe ọzọ mere obi ji ruo Jizọs ala?

8 Gụọ Jọn 8:29. Obi ruru Jizọs ala ma mgbe a na-akpagbu ya, n’ihi na ọ ma na obi ga-adị Nna ya ụtọ ma ọ nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. Ọ nọgidere na-erubere Nna ya isi ma mgbe o siiri ya ike ime otú ahụ. Ọ hụrụ Nna ya n’anya ma mee ka ofufe Jehova bụrụ ihe kacha ya mkpa ná ndụ. Tupu ya abịa n’ụwa, ọ bụ “onye ọkà ọrụ” Chineke. (Ilu 8:30) Mgbe ọ nọkwa n’ụwa, o ji ịnụ ọkụ n’obi gwa ndị mmadụ gbasara Nna ya. (Mat. 6:9; Jọn 5:17) Ọrụ ahụ mere Jizọs ezigbo obi ụtọ.​—Jọn 4:​34-36.

9. Olee otú ijechi ozi ọma anya nwere ike isi mee ka obi na-eru anyị ala?

9 Anyị na-eṅomi Jizọs ma anyị na-erubere Jehova isi ma nwee ‘ọtụtụ ihe anyị na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị.’ (1 Kọr. 15:58) Ọ bụrụ na anyị ‘ana-ekwusasi’ ozi ọma ike, ọ ga-eme ka anyị lee nsogbu anyị anya otú kwesịrị ekwesị. (Ọrụ 18:5) Dị ka ihe atụ, ndị anyị na-ezi ozi ọma na-enwekarị nsogbu ka nke anyị njọ. Ma, ha mụta ịhụ Jehova n’anya ma na-eme ihe o kwuru, ndụ ha na-akakwu mma, ha ana-enwekwukwa obi ụtọ. Mgbe ọ bụla anyị hụrụ ka ụdị ihe a mere, obi na-esikwu anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka. Ihe a na-eme ka obi na-eru anyị ala. Otu nwanna nwaanyị, bụ́ onye na-eche kemgbe ụwa na ya abaghị uru ma daa mbà n’obi chọpụtara na ihe a bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Ijechi ozi ọma anya na-eme ka obi na-erukwu m ala, na-emekwa ka obi na-atọ m ụtọ. M chere na ihe kpatara ya bụ na m nọrọ n’ozi ọma, ọ na-adị m ka m nọ Jehova ezigbo nso.”

10. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Nwanna Nwaanyị Brenda kwuru?

10 Ka anyị tụleekwa banyere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Brenda. Ya na nwa ya nwaanyị na-arịa otu ọrịa ọjọọ. O mere ka Brenda na-anọ n’ígwè ndị ngwọrọ. Ọ na-emekwa ka ike na-agwụ ya. Ọ na-aga ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ mgbe o nwere ike, ma ọ na-ejikarị akwụkwọ ozi ezi ozi ọma. O kwuru, sị: “Mgbe m chọpụtara na ọrịa m enweghị ọgwụgwọ n’ụwa ochie a, m bịara wepụtakwuo oge na-ekwusa ozi ọma. N’eziokwu, ikwusa ozi ọma na-eme ka m ghara ịna-echegbu onwe m. O mere ka m lekwasị anya n’inyere ndị m na-ezi ozi ọma aka n’ókèala ọgbakọ anyị. Ọ na-emekwa ka m na-echeta olileanya m nwere maka ọdịnihu.”

JIZỌS KWERE KA NDỊ ENYI YA NYERE YA AKA

Anyị na ezigbo ndị enyi ịna-akpa ga-eme ka anyị na-enwe udo (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 ruo na nke 15)

11-13. (a) Olee otú ndịozi na ndị ọzọ si gosi na ha bụ ezigbo ndị enyi Jizọs? (b) Olee uru aka ndị enyi Jizọs nyeere ya baara ya?

11 N’oge niile Jizọs kwusara ozi ọma, ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi ghọọrọ ya ezigbo ndị enyi. Ha bụ ụdị enyi Baịbụl kwuru gbasara ya, sị: “E nwere enyi nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.” (Ilu 18:24) Jizọs ji ndị enyi ya a kpọrọ ihe. N’oge niile o jere ozi ya, e nweghị nwanne ya nwere okwukwe na ya. (Jọn 7:​3-5) E nwedịrị mgbe ndị ikwu ya chere na isi emebiela ya. (Mak 3:21) Ma, Jizọs gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ, sị: “Ọ bụ unu rapaara m n’ahụ́ n’ọnwụnwa m dị iche iche.”​—Luk 22:28.

12 Ndịozi Jizọs mejọrọ ihe mgbe ụfọdụ. Ma, o lekwasịghị anya n’ihe ndị ha mejọrọ, kama, ọ chọpụtara na ha nwere okwukwe na ya. (Mat. 26:40; Mak 10:​13, 14; Jọn 6:​66-69) Mgbe ha na ya nọ n’abalị ikpeazụ tupu ya anwụọ, ọ gwara ha, sị: “Ana m akpọ unu ndị enyi m, n’ihi na ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m ka m mere ka unu mara.” (Jọn 15:15) O doro anya na ndị enyi Jizọs gbara ya ezigbo ume. Aka ha nyeere ya mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma mere ka obi tọọ ya ezigbo ụtọ.​—Luk 10:​17, 21.

13 E wezụga ndịozi Jizọs, o nwekwara ndị enyi ndị ọzọ, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, nyeere ya aka mgbe ọ na-ezi ozi ọma nakwa n’ụzọ ndị ọzọ. Ụfọdụ kpọrọ ya ka ọ bịa rie nri n’ụlọ ha. (Luk 10:​38-42; Jọn 12:​1, 2) Ụfọdụ so ya mee njem, jirikwa ihe ndị ha nwere lekọta ya. (Luk 8:3) Jizọs nwere ezigbo ndị enyi n’ihi na ọ bụ ezigbo enyi ha. O meere ha ihe ọma, ọ tụghịkwa anya ka ha mee ihe ha na-agaghị emeli. N’agbanyeghị na Jizọs zuru okè, obi dị ya ụtọ maka aka ndị enyi ya na-ezughị okè nyeere ya. O doro anya na ha nyeere ya aka mee ka obi nọgide na-eru ya ala.

14-15. Olee otú anyị nwere ike isi mete ezigbo ndị enyi, oleekwa otú ha nwere ike isi nyere anyị aka?

14 Ezigbo ndị enyi anyị nwere ike ime ka anyị nọgide na-erubere Jehova isi. Ihe ga-emekwanụ ka anyị nweta ezigbo ndị enyi bụ anyịnwa ịbụ ezigbo enyi. (Mat. 7:12) Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị ka anyị na-eji ike anyị na oge anyị na-enyere ndị ọzọ aka, karịchaa, ndị “nọ ná mkpa.” (Efe. 4:28) Ì nwere ike iche banyere onye nọ n’ọgbakọ unu i nwere ike inyere aka? Ì nwere ike ịga zụtara nwanna na-anaghị apụ apụ ihe? Ì nwekwara ike inye ezinụlọ ihe na-esiri ike nri? Ọ bụrụ na ị ma otú e si achọta ihe na jw.org® ma ọ bụkwanụ na JW Library®, ì nwere ike inyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ unu aka ka ha jiri ha na-achọta ihe? Ọ bụrụ na anyị ejiri oge anyị na-enyere ndị ọzọ aka, o nwere ike ime ka anyị na-enwekwu obi ụtọ.​—Ọrụ 20:35.

15 Ndị enyi anyị metere ga-enyere anyị aka ma anyị nwee nsogbu, nyekwa aka mee ka obi nọgide na-eru anyị ala. Ndị enyi anyị na-enyere anyị aka ma ha na-emeda obi gee anyị ntị mgbe anyị na-agwa ha otú obi dị anyị, otú ahụ Elaịhu si gee Job ntị mgbe ọ na-ekwu gbasara ọnwụnwa ndị bịaara ya. (Job 32:4) Anyị ekwesịghị ịtụ anya ka ndị enyi anyị na-emere anyị mkpebi, ma ọ ga-abara anyị uru ma anyị gee ntị na ndụmọdụ ha ji Baịbụl nye anyị. (Ilu 15:22) Eze Devid nabatara aka ndị enyị ya nyeere ya n’ihi na ọ dị umeala n’obi. Anyị kwesịkwara ime ka Devid ma ghara ikwe ka mpako mee ka anyị ghara ịnabata aka ndị enyi anyị na-enyere anyị ma anyị nọrọ ná mkpa. (2 Sam. 17:​27-29) N’eziokwu, ezigbo ndị enyi dị otú a bụ onyinye si n’aka Jehova.​—Jems 1:17.

OTÚ ANYỊ GA-ESI NỌGIDE NA-ENWE UDO

16. Dị ka Ndị Filipaị 4:​6, 7 si kwuo, olee ihe ga-eme ka anyị nwee udo? Kọwaa.

16 Gụọ Ndị Filipaị 4:​6, 7Gịnị mere Jehova ji gwa anyị na ọ bụ “site n’aka Kraịst Jizọs” ka anyị ga-esi enweta udo ya? Ọ bụ n’ihi na naanị ihe ga-eme ka obi nọgide na-eru anyị ala bụ ma anyị ghọta ma nwee okwukwe n’ọrụ Jizọs na-arụ n’imezu nzube Chineke. Dị ka ihe atụ, Jehova na-agbaghara anyị mmehie anyị niile n’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. (1 Jọn 2:12) Ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere ya, ọ ga-eme ka obi na-eru anyị ala. Ebe Jizọs bụ Eze nke Alaeze Chineke, ọ ga-ewepụ nsogbu niile Setan na ụwa ọjọọ ya kpataara anyị. (Aịza. 65:17; 1 Jọn 3:8; Mkpu. 21:​3, 4) Ihe a na-eme ka anyị nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. N’agbanyeghị na ọrụ Jizọs nyere anyị siri ike, ọ nọnyeere anyị, na-akwadokwa anyị n’oge ikpeazụ nke ụwa ochie a. (Mat. 28:​19, 20) Ọ na-eme ka obi sie anyị ezigbo ike. Obi iru ala, olileanya na obi ike dị anyị ezigbo mkpa ka anyị nwee ike inwe udo.

17. (a) Gịnị ka Onye Kraịst ga-eme ka ọ nọgide na-enwe obi iru ala? (b) Dị ka e kwuru na Jọn 16:​33, olee ihe anyị nwere ike ime?

17 Ma, olee otú ị ga-esi nọgide na-enwe obi iru ala mgbe ọnwụnwa siri ike bịaara gị? Otú ị ga-esi eme ya bụ iṅomi Jizọs. Nke mbụ, kpee ekpere ma nọgidesie ike n’ekpere. Nke abụọ, na-erubere Jehova isi ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ma mgbe o siiri gị ike ime otú ahụ. Nke atọ, gakwuru ndị enyi gị ka ha nyere gị aka idi ọnwụnwa gị. I mee otú ahụ, udo nke Chineke ga-eche uche gị na obi gị nche. Mgbe ahụ, ị ga-emeri ọnwụnwa ọ bụla bịaara gị otú ahụ Jizọs mere.​—Gụọ Jọn 16:33.

ABỤ 41 Biko, Nụrụ Ekpere M

^ par. 5 Anyị niile nwere nsogbu ndị nwere ike ime ka anyị ghara inwe udo ma ọ bụ ka obi ghara iru anyị ala. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe atọ Jizọs mere anyịnwa kwesịkwara ime ka anyị nọgide na-enwe udo, ma mgbe anyị na-ata ezigbo ahụhụ.