Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 15

Gịnị Ka Anyị Nwere Ike Ịmụta n’Ọrụ Ebube Ndị Jizọs Rụrụ?

Gịnị Ka Anyị Nwere Ike Ịmụta n’Ọrụ Ebube Ndị Jizọs Rụrụ?

“Ọ gazuru ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị [ọrịa].”​—ỌRỤ 10:38.

ABỤ NKE 13 Ọ Bụ Kraịst Ka Anyị Na-eso

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Kọwaa ihe na-eme mgbe Jizọs rụrụ ọrụ ebube mbụ ya.

 WEREGODỊ ya na ị na-ahụ ihe na-eme mgbe Jizọs malitere ozi ya n’ụwa ná ngwụcha afọ 29 Oge Ndị Kraịst. Jizọs na mama ya bụ́ Meri na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya gara oriri agbamakwụkwọ a kpọrọ ha na Kena. Obodo ahụ dị n’ebe ugwu ma e si Nazaret, bụ́ obodo Jizọs hà, gawa ya. Meri na ndị ezinụlọ ahụ dị ná mma. Ọ ga-abụkwa na o so na-enye aka elekọta ndị ọbịa ha. Ma, n’oriri agbamakwụkwọ ahụ, e nwere otu nsogbu pụtara nke nwere ike imenye ezinụlọ ahụ na ndị ahụ na-agba akwụkwọ ihere. Mmanya ha gwụrụ. b O nwere ike ịbụ na ndị bịara oriri agbamakwụkwọ ahụ karịrị ndị a tụrụ anya ha. Meri gakwuuru nwa ya nwoke ozugbo, gwa ya, sị: “Ha enweghị mmanya.” (Jọn 2:1-3) Gịnị ka Jizọs mere? O mere ihe dị ịtụnanya. Ọ rụrụ ọrụ ebube mee ka mmiri ghọọ “mmanya dị mma.”​—Jọn 2:9, 10.

2-3. (a) Olee ụfọdụ ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ? (b) Olee uru ileba anya n’ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ ga-abara anyị?

2 Jizọs rụkwara ọtụtụ ọrụ ebube ndị ọzọ n’oge ọ na-eje ozi ya n’ụwa. c Ọrụ ebube ya nyeere ọtụtụ puku mmadụ aka. Dị ka ihe atụ, n’abụọ n’ime ọrụ ebube ndị ahụ, o nyere puku ụmụ nwoke ise (5,000) nri, mechaakwa nye puku ụmụ nwoke anọ (4,000) nri. O nwere ike ịbụ na a gụkọta ndị o nyere nri n’ọrụ ebube abụọ a, ha karịrị puku iri abụọ na asaa (27,000) ma a gụnye ma ụmụ nwaanyị ma ụmụaka. (Mat. 14:15-21; 15:32-38) N’oge abụọ ahụ Jizọs rụrụ ọrụ ebube ndị ahụ, ọ gwọkwara ọtụtụ ndị ọrịa. (Mat. 14:14; 15:30, 31) Chegodị otú obi si tọọ ìgwè mmadụ ahụ ụtọ mgbe Jizọs rụrụ ọrụ ebube gwọọ ha ma nye ha nri.

3 Anyị nwere ike isi n’ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ mụta ọtụtụ ihe taa. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ ihe anyị ga-amụta n’ọrụ ebube ndị ahụ ọ rụrụ ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe anyị ga-amụta n’otú Jizọs si dịrị umeala n’obi na otú o si nweere ndị mmadụ ọmịiko mgbe ọ na-arụ ọrụ ebube.

IHE NDỊ ANYỊ GA-AMỤTA GBASARA JEHOVA NA JIZỌS

4. Ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ hà na-akụziri anyị gbasara ihe ndị ga-eme ka okwukwe anyị sie ike banyere ole ndị?

4 Ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ kụziiri anyị ihe ndị anyị ga-amụta gbasara ya na Nna ya ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. Ihe kpatara ya bụ na ọ bụ Jehova nyere Jizọs ike o ji rụọ ọrụ ebube ndị ahụ. Ọrụ Ndịozi 10:38 kwuru, sị: “Chineke ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ ma nye ya ike. Ebe Chineke nọnyeere ya, ọ gazuru ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị niile Ekwensu na-emekpọ ọnụ.” Chetakwa na ihe niile Jizọs kwuru na ihe niile o mere, ma ọrụ ebube ndị ọ rụrụ, gosiri na ọ na-eche echiche ka Nna ya, obi ana-adịkwa ya otú ọ na-adị Nna ya. (Jọn 14:9) Legodị ihe atọ anyị ga-amụta n’ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ.

5. Gịnị mere Jizọs ji rụọ ọrụ ebube? (Matiu 20:30-34)

5 Nke mbụ, Jizọs na Nna ya hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, otú o si gosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu bụ ịrụ ọrụ ebube nyere ndị na-ata ahụhụ aka. N’otu oge, ụmụ nwoke abụọ kpuru ìsì rịọrọ ya ka o nyere ha aka. (Gụọ Matiu 20:30-34.) Ị̀ chọpụtara na “Jizọs meteere ha ebere,” gwọọkwa ha? Okwu Grik a sụgharịrị “meteere ha ebere” ebe a na-egosi na o nweere ha ezigbo ọmịiko. Ụdị ọmịiko a Jizọs nweere ha gosiri na ọ hụrụ ha n’anya. Ọ bụkwa ụdị ọmịiko a mere Jizọs ji nye ndị agụụ na-agụ nri, gwọọkwa onye ekpenta. (Mat. 15:32; Mak 1:41) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova bụ́ Chineke “obi ebere” na Ọkpara ya hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Ahụhụ anyị na-ata na-ewutekwa ha. (Luk 1:78; 1 Pita 5:7) Ọ na-agụsi ha agụụ ike ime ka ahụhụ niile na-emekpa ndị mmadụ ahụ́ kwụsị.

6. Olee ikike Chineke nyere Jizọs?

6 Nke abụọ, Chineke nyere Jizọs ikike ịkwụsị nsogbu niile ụmụ mmadụ nwere. Jizọs si n’ọrụ ebube ndị ọ rụrụ gosi na o nwere ikike imeri nsogbu niile anyị na-agaghị emerili n’onwe anyị. Dị ka ihe atụ, o nwere ikike ịnapụta anyị n’ihe kpatara nsogbu ụmụ mmadụ, ya bụ, mmehie anyị ketara n’aka Adam na nsogbu niile ọ na-akpatara anyị, ma ọrịa ma ọnwụ. (Mat. 9:1-6; Rom 5:12, 18, 19) Ọrụ ebube ndị ọ rụrụ gosiri na ọ ga-agwọli “ụdị ọrịa ọ bụla,” kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. (Mat. 4:23; Jọn 11:43, 44) O nwekwara ikike ịkwụsị oké ifufe nakwa imeri ndị mmụọ ọjọọ. (Mak 4:37-39; Luk 8:2) Ịmata na Jehova nyere Ọkpara ya ụdị ike ahụ na-eme ka obi sie anyị ezigbo ike.

7-8. (a) Olee obi ike ọrụ ebube Jizọs na-eme ka anyị nwee? (b) Olee ọrụ ebube ị na-atụ anya ịhụ n’ụwa ọhụrụ na-abịanụ?

7 Nke atọ, obi kwesịrị isi anyị ezigbo ike na ihe ọma niile Chineke kwere nkwa imere anyị n’Alaeze ya ga-emezu. Ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa na-akụziri anyị ihe ọ ga-eme n’ụwa niile n’ihi na ọ bụ Eze nke Alaeze Chineke n’eluigwe. Chegodị uru anyị ga-erite mgbe Jizọs ga na-achị ụwa n’oge na-adịghị anya. Ahụ́ ga-agbasi anyị ezigbo ike maka na ọ ga-ewepụ ọrịa niile na nkwarụ niile na-enye ụmụ mmadụ nsogbu. (Aịza. 33:24; 35:5, 6; Mkpu. 21:3, 4) Anyị agaghịzi na-anọ agụụ. Ọdachi ndị na-emere onwe ha agaghịkwa na-akpatara anyị nsogbu. (Aịza. 25:6; Mak 4:41) Obi ga-atọgbu anyị atọgbu ịnabata ndị anyị nwụrụ anwụ a ga-esi “n’ili ncheta” kpọlite. (Jọn 5:28, 29) Olee ọrụ ebube ị kacha atụ anya ya n’ụwa ọhụrụ na-abịanụ?

8 Mgbe Jizọs na-arụ ọrụ ebube ndị ahụ ọ rụrụ, ọ dị umeala n’obi, nweekwara ndị mmadụ ọmịiko. Àgwà ndị a bụ àgwà anyị kwesịrị ịmụta. Ka anyị leba anya n’ihe atụ abụọ. Nke mbụ bụ ihe mere n’agbamakwụkwọ e mere na Kena.

IHE ANYỊ NA-AMỤTA GBASARA ỊDỊ UMEALA N’OBI

9. Gịnị ka Jizọs mere n’oriri agbamakwụkwọ? (Jọn 2:6-10)

9 Gụọ Jọn 2:6-10. Mgbe mmanya gwụrụ n’oriri agbamakwụkwọ ahụ, iwu ò ji Jizọs ime ihe ọ bụla gbasara ya? Mbanụ. E nweghị amụma ọ bụla e buru na Mezaya ga-arụ ọrụ ebube mee ka e nwee mmanya. Ma, chegodị otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na mmanya gwụrụ n’agbamakwụkwọ gị. Ọ ga-abụ na Jizọs nweere ezinụlọ ahụ ọmịiko, nke ka nke, nwoke na nwaanyị ahụ na-agba akwụkwọ. Ọ chọkwara ka ihere ghara ime ha. N’ihi ya, dị ka e kwuru ná mmalite, ọ rụrụ ọrụ ebube mee ka mmiri ghọọ mmanya. Mmiri ahụ dị ihe dị ka narị lita atọ na iri itoolu (390) ma ọ bụ otu narị galọn na atọ (103). Mmanya ahụ bụkwanụ ụdị nke kacha mma. O nwere ike ịbụ na ihe mere o ji mee ka e nwee mmanya buru ibu otú ahụ bụ ka e nwee nke ga-afọ ma e mechaa agbamakwụkwọ ahụ ma ọ bụkwanụ ka di na nwunye ahụ nwee ike ire ụfọdụ n’ime ha nweta ego ha ga-eji nyere onwe ha aka. Ọ ga-abụrịrị na obi tọrọ ha ụtọ maka ihe ahụ Jizọs mere.

Ị ga na-eme ka Jizọs ma ọ bụrụ na ị naghị eji ihe ndị i mere etu ọnụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11) e

10. Olee ụfọdụ ihe ndị dị mkpa a kọrọ na Jọn isi nke 2? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

10 Chegodị ihe ụfọdụ dị mkpa a kọrọ na Jọn isi nke 2. Ị̀ chọpụtara na Jizọs ejighị aka ya gbajuo nnukwu ite ndị ahụ mmiri? Kama ime ka mmadụ niile hụ ya, ọ gwara ndị na-eje ozi ka ha gbajuo mmiri n’ite ndị ahụ. (Amaokwu nke 6 na nke 7) Mgbe Jizọs mechara ka mmiri ahụ ghọọ mmanya, o jighị aka ya kuru mmanya ahụ gakwuru onye haziri oriri agbamakwụkwọ ahụ, kama ọ gwara ndị na-eje ozi ka ha mee ya. (Amaokwu nke 8) Jizọs eburughị otu iko mmanya, welie ya elu n’ihu ndị niile bịara oriri agbamakwụkwọ ahụ, tuzie ọnụ, sị: ‘Ṅụọnụ mmanya a kacha mma m mepụtaara unu ugbu a.’

11. Gịnị ka anyị na-amụta n’ọrụ ebube ahụ Jizọs rụrụ?

11 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ọrụ ebube a Jizọs rụrụ mee ka mmiri ghọọ mmanya? Ọ bụ ịdị umeala n’obi. Jizọs ejighị ọrụ ebube ahụ tuo ọnụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị mgbe ọ bụla o ji ihe ọ rụrụ tuo ọnụ. Kama ime otú ahụ, o weturu onwe ya ala nye Nna ya otuto na ekele niile. O mekwara otú ahụ ugboro ugboro. (Jọn 5:19, 30; 8:28) Ọ bụrụ na anyị emee ka Jizọs ma dịrị umeala n’obi, anyị agaghị eji ihe ndị anyị rụrụ na-etu ọnụ. N’agbanyeghị ihe ọ bụla anyị rụrụ n’ozi Jehova, ka anyị ghara iji ya na-etu ọnụ. Kama ka anyị jiri Chineke anyị dị ịtụnanya anyị na-ejere ozi na-etu ọnụ. (Jere. 9:23, 24) Ka anyị na-enye ya otuto kwesịrị ya. A sị ka e kwuwe, ò nwere ihe ọ bụla anyị ga-arụli ma ọ bụrụ na Jehova enyereghị anyị aka?​—1 Kọr. 1:26-31.

12. Olee otú ọzọ anyị nwere ike isi na-adị umeala n’obi ka Jizọs? Nye ihe atụ.

12 Ka anyị hụ otú ọzọ anyị nwere ike isi dị umeala n’obi ka Jizọs. Chegodị banyere ihe atụ a. Ka e were ya na otu okenye wepụtara oge buru ibu nyere otu nwa okorobịa bụ́ ohu na-eje ozi aka ịkwadebe okwu ihu ọha mbụ ya. N’ihi ya, ohu na-eje ozi ahụ kwuru okwu ihu ọha gbara ndị mmadụ ume, ya atọọ ọgbakọ niile ụtọ. Mgbe a gbasara ọmụmụ ihe, otu onye bịakwutere okenye ahụ, sị ya, ‘Okwu a nwanna a kwuru tọrọ nnọọ ụtọ.’ Okenye ahụ ò kwesịrị ịsị: ‘Ọ bụ eziokwu. Mana, ọ bụ mụnwa wepụtara ezigbo oge nyere ya aka’? Ka ọ̀ ga-asị: ‘Ee, ọ tọrọ ụtọ. Eji m ya eme ọnụ’? Ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi, anyị agaghị anara otuto maka ihe ọma anyị meere ndị ọzọ. Obi ga-adị anyị ụtọ maka na anyị ma na Jehova na-ahụ ihe anyị na-eme, nakwa na o ji ya kpọrọ ihe. (I nwere ike ịtụle Matiu 6:2-4; Hib. 13:16) O doro anya na anyị na-eme ka obi Jehova ṅụrịa ma ọ bụrụ na anyị amụta ịdị umeala n’obi ka Jizọs.​—1 Pita 5:6.

IHE ANYỊ NA-AMỤTA GBASARA INWE ỌMỊIKO

13. Gịnị ka Jizọs hụrụ mgbe ọ na-erute nso n’obodo Nen? Gịnịkwa ka o mere gbasara ya? (Luk 7:11-15)

13 Gụọ Luk 7:11-15. Weregodị ya na ị na-ahụ ka ihe a na-eme. O mere mgbe Jizọs gamirila ozi ya n’ụwa. Ọ gara Nen bụ́ obodo dị na Galili. Obodo a dị nso na Shunem. Ọ bụ na Shunem ka Ịlaịsha onye amụma kpọlitere nwa otu nwaanyị ihe dị ka narị afọ itoolu (900) tupu mgbe ahụ. (2 Eze 4:32-37) Mgbe Jizọs rutere nso n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, ọ hụrụ ndị bu ozu na-apụ n’obodo ahụ. Ihe ahụ na-agbawa obi n’ihi na ọ bụ otu mkpụrụ nwa nwaanyị di ya nwụrụ mụtara. Ma, ọ bụghị naanị nwaanyị ahụ so na-aga. Ìgwè mmadụ si n’obodo ahụ sokwa ya. Jizọs kwụsịrị ha ma meere nwaanyị ahụ na-eru uju ihe dị ịtụnanya. Ọ kpọlitere nwa ya n’ọnwụ. Ọ bụ onye a bụ onye nke mbụ n’ime mmadụ atọ Jizọs kpọlitere n’ọnwụ e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn.

Ị ga na-eme ka Jizọs ma ọ bụrụ na ị na-enwere ndị mmadụ nwụnahụrụ ọmịiko (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 ruo na nke 16)

14. Olee ihe ụfọdụ dị mkpa Baịbụl kọrọ na Luk isi nke 7? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

14 Chegodị gbasara ihe ụfọdụ dị mkpa Baịbụl kọrọ na Luk isi nke 7. Ị̀ chọpụtara na Jizọs “hụrụ” nwaanyị ahụ na-eru uju ma ‘metere ya ebere’? (Amaokwu nke 13) N’ihi ya, ọ bụ ihe Jizọs hụrụ mere ka o nweere nwaanyị ahụ ọmịiko. O nwere ike ịbụ na ọ hụrụ ka nwaanyị ahụ beere ákwá na-aga n’ihu ndị bu ozu nwa ya nwoke. Ihe Jizọs mere abụghị naanị inwere nwaanyị ahụ ọmịiko, kama o mere ihe gosiri na o nweere ya ọmịiko. Ọ gwara nwaanyị ahụ okwu. Ọ ga-abụrịrị na o weturu obi gwa ya, sị: “Ebezila.” O nyeziiri ya aka. Ọ kpọlitere nwa ya nwụrụ anwụ ma ‘kpọnyezie ya nne ya.’​—Amaokwu nke 14 na nke 15.

15. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ọrụ ebube Jizọs rụrụ?

15 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ọrụ ebube ahụ Jizọs rụrụ kpọlite nwa nwaanyị ahụ di ya nwụrụ? Anyị na-amụta na anyị kwesịrị ịna-enwere ndị mmadụ nwụnahụrụ ọmịiko. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị agaghị akpọliteli ndị nwụrụ anwụ otú ahụ Jizọs mere. Ma dị ka Jizọs, anyị ga-enweliri ndị mmadụ nwụnahụrụ ọmịiko ma ọ bụrụ na anya ana-eru anyị ala. Otú anyị ga-esi gosi na anyị na-enwere ha ọmịiko bụ ikwu na ime ihe anyị nwere ike iji nyere ha aka ma kasie ha obi. d (Ilu 17:17; 2 Kọr. 1:3, 4; 1 Pita 3:8) Ịgwa ha obere okwu ma ọ bụ imere ha obere ihe nwedịrị ike ịbara ha ezigbo uru.

16. Dị ka e gosiri na foto ahụ, gịnị ka ị mụtara n’akụkọ otu nwanna nwaanyị nwa ya nwụrụ n’oge na-adịbeghị anya?

16 Chegodị banyere otu ihe mere eme. Afọ ole na ole gara aga, otu nwanna nwaanyị hụrụ ka nwanna nwaanyị ọzọ bụ́ nne nwaanyị nọ ya nso na-ebe ákwá ka a na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe. Abụ ahụ kwuru gbasara olileanya mbilite n’ọnwụ. Nwa nwanna nwaanyị ahụ nwụrụ n’oge na-adịbeghị anya. Mgbe nwanna nwaanyị nke ọzọ ahụ hụrụ ka ọ na-ebe ákwá, ọ gakwuuru ya ozugbo, jide ya aka, ya na ya abụtọpụzie abụ ahụ. Nwanna nwaanyị ahụ nwa ya nwụrụ mechara kwuo, sị: “Ịhụnanya ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị hụrụ m riri m ọnụ.” Obi dị ya ezigbo ụtọ na ọ gara ọmụmụ ihe n’ụbọchị ahụ. Ọ sịrị: “Ọ bụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka anyị si enweta enyemaka.” Ka obi sie anyị ike na Jehova na-ahụ ihe ọ bụla anyị mere, ọ bụrụgodị obere ihe, iji gosi na anyị na-enwere ndị mmadụ nwụnahụrụ ọmịiko, ya bụ, ndị “obi gbawara.” O jikwa mbọ anyị na-agba kpọrọ ihe.​—Ọma 34:18.

IHE Ị GA-AMỤ NKE GA-AGBA GỊ EZIGBO UME

17. Gịnị ka anyị mụtarala n’isiokwu a?

17 Ọ ga-agba anyị ezigbo ume ma ọ bụrụ na anyị ewepụta oge mụọ ihe Matiu, Mak, Luk, na Jọn kọrọ gbasara ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ. Ọrụ ebube ndị ahụ na-akụziri anyị na Jehova na Jizọs hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, na Jizọs nwere ikike ịkwụsị nsogbu niile ndị mmadụ na-enwe, nakwa na obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ọma Chineke kwere nkwa ọ ga-eji Alaeze ya meere anyị ga-emezu. Ka anyị na-echebara ihe ndị a Baịbụl kọrọ echiche, anyị nwere ike ịtụgharị uche n’otú anyị ga-esi na-amụtakwu àgwà ndị Jizọs nwere. Mgbe ị na-amụ ihe n’onwe gị ma ọ bụ mgbe unu na-enwe Ofufe Ezinụlọ unu, ọ ga-adị mma ka unu wepụta oge mụọ banyere ọrụ ebube ndị ọzọ Jizọs rụrụ. Chee gbasara ihe ndị i nwere ike ịmụta na ha. Kọọkwara ndị ọzọ ihe ndị ahụ ị mụtara. Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, mkparịta ụka gị na ndị ọzọ ga na-agba ume.​—Rom 1:11, 12.

18. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a?

18 Ná ngwụcha oge Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, ọ kpọlitere onye nke atọ bụ́kwanụ onye nke ikpeazụ ọ kpọlitere e kwuru okwu ya na Baịbụl. Ma, onye nke a ọ kpọlitere dị iche. Ọ bụ ezigbo enyi ya. E nwekwara ihe ndị pụrụ iche merenụ n’oge ahụ. Olee ihe ụfọdụ anyị nwere ike ịmụta n’ihe Ozi Ọma Jọn kọrọ gbasara ọrụ ebube ahụ? Olee otú anyị ga-esi mee ka okwukwe anyị sikwuo ike n’olileanya mbilite n’ọnwụ? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-eso nke a.

ABỤ NKE 20 I Nyere Anyị Ọkpara Ị Hụrụ n’Anya

a Ịgụ gbasara ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ na-atọgbu anyị atọgbu. Dị ka ihe atụ, o mere ka oké ifufe kwụsị, gwọọ ndị na-arịa ọrịa, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. Ihe mere e ji dee ọrụ ebube ndị a ọ rụrụ abụghị iji mee anyị obi ụtọ, kama ọ bụ iji kụziere anyị ihe. Ka anyị na-eleba anya n’ọrụ ebube ndị a Jizọs rụrụ, anyị ga-amụta ihe gbasara Jehova na Jizọs ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Anyị ga-achọpụtakwa àgwà ndị magburu onwe ha anyị kwesịrị ịmụta.

b Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru, sị: “N’Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu, ndị mmadụ weere na ile ọbịa nke ọma bụ ihe ha kwesịrị ime. Onye kpọrọ ndị mmadụ oriri kwesịrị ịhụ na o wetara ihe karịrị ihe ga-eju ndị ahụ ọ kpọrọ oriri afọ. Onye bụ́ ezigbo mmadụ kpọọ ndị mmadụ oriri, karịchaa oriri agbamakwụkwọ, o kwesịrị iwetara ndị niile ọ kpọrọ nri na mmanya ga-eju eju bara abara.”

c Akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn kọọrọ anyị banyere ihe karịrị ọrụ ebube iri atọ Jizọs rụrụ. E nwekwara ọtụtụ ọrụ ebube ndị ọzọ ọ rụrụ. Ma, Baịbụl akpọghị nke ọ bụla n’ime ha aha iche iche. E nwere otu oge ‘obodo niile’ bịakwutere ya, “o wee gwọọ ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa.”​—Mak 1:32-34.

d Ị chọọ ịhụ ebe a tụrụ aro ihe i nwere ike ikwu ma ọ bụ mee iji kasie ndị mmadụ nwụnahụrụ obi, gụọ isiokwu bụ́ “Kasie Ndị Na-eru Uju Obi Otú Jizọs Mere.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Nọvemba 1, 2010.

e NKỌWA FOTO: Ebe Jizọs kwụ n’azụ, nwoke na nwaanyị na-agba akwụkwọ na ndị ha kpọrọ oriri ana-aṅụ ọmarịcha mmanya ahụ Jizọs nyere ha.