Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Nwere Ike Ịmụ

Ihe I Nwere Ike Ịmụ

Otú e si kọwaa amaokwu Baịbụl ndị dị n’Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ ọ̀ na-abara gị uru?

Nkọwa ndị ahụ nwere ike inyere gị aka ịghọtakwu Okwu Chineke. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ otú ihe dị mgbe a na-ede amaokwu Baịbụl ị na-agụ, ihe mere e ji dee ya, onye e bu n’obi dee ya, ma ọ bụ ihe okwu ụfọdụ ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu ụfọdụ pụtara.

Ma Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET ma JW Library® ga-eme ka i nwee ike isi n’amaokwu Baịbụl mepee akwụkwọ ndị a kpọrọ aha n’Akwụkwọ Nchọnchọ. Ị ga-ahụ akwụkwọ ndị ahụ ma i mepee amaokwu Baịbụl nke ọ bụla, pịa ihe na-acha pọpụl dị n’ebe aka nri ala ala ya, pịzie “Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ” dị n’amaokwu ahụ.

Ị gụwa akwụkwọ ndị ahụ, leruo mgbe e bipụtara ha anya. Ndị kacha ọhụrụ na-apụta n’elu elu. Ị gbadawa, ị ga-ahụ ndị merela ochie, ndị o nwere ike ịbụ na a gbanweela otú anyị sibu ghọta ihe e kwuru na ha.

  • Akwụkwọ ndị a kpọrọ aha n’Akwụkwọ Nchọnchọ dị adị n’Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET.

  • Ị chọọ ịna-ahụ akwụkwọ ndị ahụ ma i mepee amaokwu Baịbụl na JW Library, tinye Akwụkwọ Nchọnchọ na ya, na-etinyekwa nke ọhụrụ mgbe ọ bụla ọ pụtara. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịpị “Library,” pịa Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ, pịzie Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ nke kacha ọhụrụ.