Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 17

Jehova Ga-enyere Gị Aka ma Nsogbu Ndị Ị Na-atụghị Anya Ha Bịara Gị

Jehova Ga-enyere Gị Aka ma Nsogbu Ndị Ị Na-atụghị Anya Ha Bịara Gị

“Ọtụtụ nsogbu na-abịara onye ezi omume, ma Jehova na-anapụta ya na ha niile.”​—ỌMA 34:19.

ABỤ NKE 44 Ekpere Onye Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Gịnị ka obi siri anyị ike na ya?

 EBE anyị bụ ndị Jehova, anyị ma na ọ hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ chọrọ ka anyị na-ebi ndụ kacha mma. (Rom 8:35-39) Obi sikwara anyị ike na ihe ndị Baịbụl kwuru na-abara anyị uru mgbe niile ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ha. (Aịza. 48:17, 18) Ma, gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na nsogbu ndị anyị na-atụghị anya ha abịara anyị?

2. Olee nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị? Gịnị ka nsogbu ndị a nwere ike ime ka anyị na-eche?

2 Nsogbu na-abịara ndị niile na-efe Jehova. Dị ka ihe atụ, onye ezinụlọ anyị nwere ike ime ihe wutere anyị. Ezigbo ọrịa nwere ike ịbịa anyị, mee ka anyị ghara ime ihe ndị anyị chọrọ ime n’ozi Jehova. Ọdachi ndị na-emere onwe ha nwekwara ike ịkpatara anyị nsogbu, ma ọ bụkwanụ, e nwere ike imegide anyị maka ihe ndị anyị kweere. Ọ bụrụ na ụdị nsogbu a abịara anyị, anyị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Gịnị mere nsogbu a ji bịara m? È nweela ihe m mejọrọ? Ihe a ọ̀ pụtara na Jehova anaghị agọzi m?’ Ò nwetụla mgbe ọ dị gị otú ahụ? Ọ bụrụ na e nwetụla, adala mbà. E nwekwara mgbe ọ dị ọtụtụ ndị ji obi ha niile fee Jehova otú ahụ.​—Ọma 22:1, 2; Hab. 1:2, 3.

3. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’Abụ Ọma 34:19?

3 Gụọ Abụ Ọma 34:19. Cheta ihe abụọ dị mkpa e kwuru n’ebe a anyị gụrụ: (1) Nsogbu na-abịara ndị ezi omume. (2) Jehova na-anapụta anyị ná nsogbu ndị na-abịara anyị. Olee otú Jehova si anapụta anyị? Otu ụzọ o si enyere anyị aka bụ ime ka anyị na-ele ndụ anyị dị n’ụwa ochie a anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ bụ eziokwu na Jehova kwere nkwa na anyị ga-eji ọṅụ na-ejere ya ozi, o kweghị anyị nkwa na anyị agaghị enwe nsogbu ọ bụla ugbu a. (Aịza. 66:14) Ọ na-agwa anyị ka anyị lekwasị anya n’ọdịnihu mgbe anyị ga-enweta ụdị ndụ ọ chọrọ ka anyị nweta ruo mgbe ebighị ebi. (2 Kọr. 4:16-18) Ma, ka ọ dị ugbu a, ọ na-enyere anyị aka ịna-efe ya kwa ụbọchị.​—Ákwá 3:22-24.

4. Olee ihe ndị anyị ga-ekwu gbasara ha n’isiokwu a?

4 Ka anyị kwuo ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ụfọdụ ndị ji obi ha niile fee Jehova ma n’oge a na-ede Baịbụl ma n’oge anyị a. Anyị ga-achọpụta na nsogbu ndị anyị na-atụghị anya ha nwere ike ịbịara anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, o nweghị mgbe ọ na-agaghị akwado anyị. (Ọma 55:22) Ka anyị na-eleba anya n’akụkọ ha, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka m gaara eme ma ọ bụrụ m? Olee otú akụkọ ha si eme ka m tụkwasịkwuo Jehova obi? Olee ihe ndị m nwere ike ịmụta m ga na-eme ná ndụ m?’

N’OGE A NA-EDE BAỊBỤL

Jehova gọziri Jekọb n’ime afọ iri abụọ ọ rụsiiri Leban bụ́ nwanne mama ya ọrụ ike. Leban ghọgburu ya n’afọ ndị ahụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

5. Olee nsogbu ndị bịaara Jekọb n’ihi Leban? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

5 N’oge a na-ede Baịbụl, ndị na-efe Jehova nwere ọtụtụ nsogbu ndị ha na-atụghị anya ha. Chegodị banyere Jekọb. Papa ya nyere ya iwu ka ọ gaa lụọ nwa Leban bụ́ onye ikwu ya na-efe Jehova. O mekwara ka obi sie ya ike na Jehova ga-agọzi ya mmaji kwuru mmaji. (Jen. 28:1-4) N’ihi ya, Jekọb mere ihe o kwesịrị ime. Ọ hapụrụ ala Kenan gaa n’ụlọ Leban. Leban nwere ụmụ nwaanyị abụọ. Aha ha bụ Lia na Rechel. Ma onye Jekọb hụrụ n’anya bụ nke nta, bụ́ Rechel. O kwetakwara ịrụrụ nna ya ọrụ afọ asaa tupu ya alụọ ya. (Jen. 29:18) Ma, ihe agaghị otú Jekọb si tụọ anya ya. Leban ghọgburu ya mee ka ọ lụọ nke ada, bụ́ Lia. Leban kwetara ka Jekọb lụọ Rechel mgbe otu izu gachara ma ọ bụrụ na ọ ga-arụkwuru ya ọrụ afọ asaa ọzọ. (Jen. 29:25-27) Leban rụsara Jekọb arụrụala mgbe ọ na-arụrụ ya ọrụ. Afọ niile Leban ji ghọgbuo Jekọb bụ afọ iri abụọ.​—Jen. 31:41, 42.

6. Olee nsogbu ndị ọzọ bịaara Jekọb?

6 Nsogbu ndị ọzọ bịakwaara Jekọb. O nwere ezinụlọ buru ibu. Ma ụmụ ya ejighị otu obi na-emekọ ihe mgbe niile. E nwedịrị mgbe ha rere nwanne ha nwoke bụ́ Josef ka ọ gaa gbawa ohu. Ụmụ Jekọb abụọ, bụ́ Simiọn na Livaị, mechuru ndị ezinụlọ ha ihu, meekwa ka a kọchaa aha Jehova. Ihe ọzọ bụ na nwunye Jekọb hụrụ n’anya bụ́ Rechel nwụrụ mgbe ọ na-amụ nwa nke abụọ ya. N’ihi oké ụnwụ, Jekọb kwagara Ijipt n’agadi ya.​—Jen. 34:30; 35:16-19; 37:28; 45:9-11, 28.

7. Olee otú Jehova si gosi Jekọb na ihe ya masịrị ya?

7 N’agbanyeghị nsogbu a niile, o nweghị mgbe Jekọb kwụsịrị ịtụkwasị Jehova na nkwa ya obi. Jehova gosikwara Jekọb na ihe ya masịrị ya. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị otú Leban si na-agbalị ịghọgbu ya, Jehova gọziri Jekọb mee ka o nwee akụnụba. Ọ ga-abụrịrị na Jekọb kelere Jehova mgbe ọ hụrụ nwa ya Josef o chere na ọ nwụọla kemgbe. Ihe nyeere Jekọb aka idi nsogbu ahụ niile bụ otú ya na Jehova si dịrị n’ezigbo mma. (Jen. 30:43; 32:9, 10; 46:28-30) Ọ bụrụ na anyị emee ka anyị na Jehova dị n’ezigbo mma, anyịnwa ga-enwekwa ike idi nsogbu ọ bụla bịaara anyị anyị na-atụghị anya ya.

8. Gịnị ka Eze Devid bu n’obi ime?

8 Eze Devid emelighị ihe niile o bu n’obi ime n’ozi Jehova. Dị ka ihe atụ, Devid chọsiri ike ịrụrụ Chineke ya ụlọ nsọ. Ọ gwara onye amụma bụ́ Netan na ya chọrọ ịrụrụ Chineke ụlọ, Netan azaa ya, sị: “Mee ihe ọ bụla dị gị n’obi ime, n’ihi na ezi Chineke nọnyeere gị.” (1 Ihe 17:1, 2) Chegodị otú ihe ahụ Netan kwuru si gbaa Devid ume. O nwere ike ịbụ na o bidoro ozugbo ahụ haziwe otú ọ ga-esi arụ nnukwu ọrụ ahụ.

9. Gịnị ka Devid mere mgbe e ziri ya ozi ọ na-atụghị anya ya?

9 Ma ọ dịghị anya, onye amụma Jehova bụ́ Netan abịa zie Devid ozi ọ na-atụghị anya ya. “N’abalị ụbọchị ahụ,” Jehova gwara Netan na ọ bụghị Devid ga-arụrụ ya ụlọ nsọ, kama, ọ ga-abụ otu n’ime ụmụ ya. (1 Ihe 17:3, 4, 11, 12) Gịnị ka Devid mere mgbe Netan ziri ya ozi a? Ọ gbanwere ihe o bu n’obi ime. O lekwasịziri anya n’inweta ego na ngwá ọrụ nwa ya bụ́ Solomọn ga-eji rụọ ụlọ nsọ ahụ.​—1 Ihe 29:1-5.

10. Olee otú Jehova si gọzie Devid?

10 Ozugbo a gwachara Devid na ọ bụghị ya ga-arụrụ Jehova ụlọ nsọ, Jehova mere ka ya na ya gbaa ndụ. Jehova kwere Devid nkwa na otu n’ime ụmụ ya ga-achị ruo mgbe ebighị ebi. (2 Sam. 7:16) N’ụwa ọhụrụ, chegodị otú obi ga-esi bụrụ Devid sọ aṅụrị mgbe ọ ga-amata na ọ bụ Jizọs, bụ́ Eze si n’agbụrụ ya, na-achị n’ime otu puku afọ ahụ. Ihe a Baịbụl kọrọ na-enyere anyị aka ịghọta na ọ bụrụgodị na anyị agaghị emeli ihe niile anyị bu n’obi ime n’ozi Jehova, Chineke anyị nwere ike imere anyị ihe ọma ndị ọzọ anyị na-atụghị anya ha.

11. Olee otú Chineke si gọzie Ndị Kraịst oge mbụ n’agbanyeghị na Alaeze Chineke abịaghị mgbe ha tụrụ anya ya? (Ọrụ Ndịozi 6:7)

11 Ndị Kraịst oge mbụ nwekwara nsogbu ndị ha na-atụghị anya ha. Dị ka ihe atụ, ha chọsiri ike ka Alaeze Chineke bịa, ma ha amaghị mgbe ọ ga-abịa. (Ọrụ 1:6, 7) N’ihi ya, gịnị ka ha mere? Ha nọ na-ekwusasi ozi ọma ike. Ka ozi ọma ahụ na-agbasa, ha hụrụ ihe gosiri na Jehova na-agọzi mbọ ha na-agba.​—Gụọ Ọrụ Ndịozi 6:7.

12. Gịnị ka Ndị Kraịst oge mbụ mere mgbe e nwere ụnwụ nri?

12 E nwere mgbe oké ụnwụ dara “n’ụwa niile.” (Ọrụ 11:28) Ụnwụ nri ahụ metụtakwara Ndị Kraịst oge mbụ. Chegodị ụdị nsogbu ọ ga-abụrịrị na ụkọ nri ahụ kpataara ha. O doro anya na ndị isi ezinụlọ nọ na-eche otú ha ga-esi na-akpa afọ ezinụlọ ha. Gịnịkwanụ ka ndị na-eto eto nọ na-ahazi otú ha ga-esi wepụta oge jekwuoro Chineke ozi mere? Ọ̀ ga-abụ na ha nọ na-eche na ọ ga-akara ha mma icheretụ? Ndị Kraịst ndị ahụ gbanwere ihe ndị ha kwesịrị ịgbanwe n’agbanyeghị otú ihe si dịrị ha. Ha nọ na-ekwusa ozi ọma otú ọ bụla ha nwere ike. Ha jikwa obi ụtọ na-enye ụmụnna ha ndị nọ na Judia ihe ndị ha nwere.​—Ọrụ 11:29, 30.

13. Olee otú Chineke si gọzie Ndị Kraịst n’oge e nwere ụnwụ nri?

13 Olee otú Chineke si gọzie Ndị Kraịst n’oge ụnwụ nri ahụ? Ndị nwetara ihe enyemaka hụrụ otú Jehova si gọzie ha. (Mat. 6:31-33) Ọ ga-abụrịrị na o mere ka ha na ụmụnna ha ndị gbataara ha ọsọ enyemaka dịkwuo ná mma. Ndị nyekwaranụ onyinye ndị ahụ ma ọ bụ ndị si n’ụzọ ndị ọzọ kwado ụmụnna ha nwere obi ụtọ n’ihi na ha nyere ụmụnna ha ihe. (Ọrụ 20:35) Jehova gọziri ha niile maka otú ha si mee mgbanwe n’ihi otú ihe si gbanwee.

14. Gịnị mere Banabas na Pọl onyeozi, oleekwa uru ọ bara? (Ọrụ Ndịozi 14:21, 22)

14 Ọtụtụ mgbe, a kpagburu Ndị Kraịst oge mbụ. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ mgbe ha na-atụghị anya ya. Chegodị ihe mere Banabas na Pọl onyeozi mgbe ha nọ na-ekwusa ozi ọma na Listra. Ná mmalite, ndị obodo ahụ nabatara ha ma gee ha ntị. Ma, ndị mmegide mechara “mee ka ìgwè mmadụ ahụ megidewe Pọl.” Ụfọdụ n’ime ndị ahụ tụdịrị Pọl okwute, hapụ ya chee na ọ nwụọla. (Ọrụ 14:19) Ma, Pọl na Banabas gara ebe ọzọ kwusawa ozi ọma. Olee uru ọ bara? Ha mere “ka ọtụtụ ndị bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.” Okwu ha na omume ha gbakwara ụmụnna ha ume. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 14:21, 22.) Ọtụtụ ndị ritere uru n’ihi na Pọl na Banabas adaghị mbà mgbe e bidoro megidewe ha na mberede. Ọ bụrụ na anyị adaghị mbà n’ọrụ Jehova nyere anyị ka anyị rụọ, Jehova ga-agọzi anyị.

N’OGE ANYỊ A

15. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Nwanna A. H. Macmillan mere?

15 Tupu afọ 1914, e nwere ihe ụfọdụ ndị ohu Jehova tụrụ anya ga-emenụ. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere Nwanna A. H. Macmillan. Dịkwa ka ọtụtụ ụmụnna n’oge ahụ, Nwanna Macmillan chere na ya ga-aga eluigwe n’oge na-adịghị anya. N’otu okwu o kwuru n’ọnwa Septemba afọ 1914, ọ sịrị: “Nke a nwere ike ịbụ okwu ihu ọha ikpeazụ m ga-ekwu.” Ma, o mechaghị bụrụ okwu ikpeazụ o kwuru. Nwanna Macmillan mechara dee, sị: “O nwere ike ịbụ na ọ dị ọtụtụ n’ime anyị ọkụ n’ahụ́ iche na anyị ga-aga eluigwe ozugbo.” O kwukwara, sị: “Ihe anyị kwesịrị ime bụ ịna-agbasi mbọ ike n’ozi Onyenwe anyị.” Nwanna Macmillan nọ na-arụsi ọrụ Onyenwe anyị ike. O ji obi ya niile na-ekwusa ozi ọma. E nwere ọtụtụ ụmụnna ọ gbara ume n’ihi na a tụrụ ha mkpọrọ maka na ha ekweghị aga agha. O jikwa obi ya niile na-agachi ọmụmụ ihe anya ma mgbe o mere agadi. Olee uru Nwanna Macmillan ritere n’otú o si jiri oge ya na-eme ihe bara uru n’oge ahụ ọ na-eche ka ọ gaa eluigwe? Obere oge tupu ya anwụọ n’afọ 1966, o dere, sị: “Okwukwe m siri ike ugbu a dịkwa ka o siri ná mmalite.” Ihe a Nwanna Macmillan mere bụ ihe anyị niile kwesịrị ịmụta, nke ka nke, ma ọ bụrụ na anyị echeela ọgwụgwụ ụwa ochie a karịa otú anyị tụrụ anya ya.​—Hib. 13:7.

16. Olee nsogbu Nwanna Herbert Jennings na nwunye ya na-atụghị anya ya bịaara ha? (Jems 4:14)

16 E nwere ọtụtụ ndị na-efe Jehova nsogbu bịaara ha bụ nsogbu ha na-atụghị anya ya. Dị ka ihe atụ, n’akụkọ ndụ Nwanna Herbert Jennings, b ọ kọrọ otú ya na nwunye ya si jee ozi ala ọzọ tọrọ ha ụtọ na Gana. Ma, ka oge na-aga, a chọpụtara na e nwere ihe na-emetụ ya n’isi. Nwanna Jennings ji ihe e kwuru na Jems 4:14 kọwaa ihe mere. Ọ kpọrọ ya “ ‘echi’ nke anyị na-atụghị anya ya.” (Gụọ ya.) O kwuru na ha mere ihe ha kwesịrị ime. Ha hapụrụ Gana na ọtụtụ ndị enyi ha ma laghachi Kanada ka o nwee ike ịga ụlọ ọgwụ. Jehova nyeere Nwanna Jennings na nwunye ya aka iji obi ha niile na-ejere ya ozi n’agbanyeghị nsogbu ahụ bịaara ha.

17. Olee otú ihe Nwanna Jennings mere si baara ụmụnna ya uru?

17 Ihe Nwanna Jennings kọrọ n’akụkọ ndụ ya n’ezoghị ọnụ baara ọtụtụ ndị ọzọ uru. Otu nwanna nwaanyị kwuru na kemgbe ọ gụwara Ụlọ Nche na Teta! na o nwetụbeghị nke metụrụ ya n’ahụ́ otú isiokwu ahụ si metụ ya. O kwukwara na ịgụ otú Nwanna Jennings si hapụ ozi ya iji lekọta onwe ya nyeere ya aka ile ọnọdụ ya anya otú kwesịrị ekwesị. Otu nwanna nwoke kwukwara ihe yiri ya. Ọ sịrị na mgbe ya bụchara okenye ruo afọ iri, na ya kwụsịrị ịbụ okenye n’ihi isi mgbaka. O kwukwara na ọ bịara dịzie ya ka o nweghị ihe ya dị mma ya. N’ihi ya, o siziiri ya ike ịgụ isiokwu ndị bụ́ akụkọ ndụ. Ma otú Nwanna Jennings si nọsie ike n’ozi Jehova gbara ya ezigbo ume. Ihe a na-echetara anyị na ọ bụrụ na anyị edie nsogbu ndị anyị na-atụghị anya ha, anyị nwere ike ịgba ndị ọzọ ume. Ọ bụrụgodị na ihe ndị anyị na-atụghị anya ha emee, anyị ka nwekwara ike igosi ụdị okwukwe na ntachi obi ndị ọzọ nwere ike ịmụta.​—1 Pita 5:9.

Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, nsogbu ndị anyị na-atụghị anya ha nwere ike ime ka anyị na ya na-adịkwu ná mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18. Dị ka e gosiri na foto e ji kọwaa paragraf a, gịnị ka ị mụtara n’ihe otu nwaanyị di ya nwụrụ na Naịjirịa mere?

18 Ọdachi ndị dị ka ọrịa koronavaịrọs akpaala ọtụtụ ndị na-efe Jehova aka ọjọọ. Dị ka ihe atụ, na Naịjirịa, otu nwanna nwaanyị di ya nwụrụ na nwa ya nwaanyị ahụghị tụrụ rachaa. Otu ụtụtụ, nwa ya nwaanyị jụrụ ya ihe ha ga-eri ma ha sichaa iko osikapa ikpeazụ ha nwere. Nwanna nwaanyị ahụ gwara nwa ya nwaanyị na ha enweghị ego ọ bụla ma ọ bụ nri ọ bụla fọrọnụ, mana, ha ga-eme ihe nwaanyị Zarefat di ya nwụrụ mere, ya bụ, isi nri ikpeazụ ha nwere ma tụkwasị Jehova obi ha niile. (1 Eze 17:8-16) Tupudị ha amalite iche gbasara nri ehihie ha ga-eri n’ụbọchị ahụ, ha natara otu ngwugwu ụmụnna ziteere ha. Ihe dị ná ngwugwu ahụ bụ nri ga-ezuru ha ruo ihe karịrị izu abụọ. Nwanna nwaanyị ahụ kwuru na ya amaghị na Jehova nọ na-ege ntị nke ọma n’ihe ya nọ na-agwa nwa ya. N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, nsogbu ndị anyị na-atụghị anya ha nwere ike ime ka anyị bịarukwuo Jehova nso.​—1 Pita 5:6, 7.

19. Olee mmegide Nwanna Aleksey Yershov diri?

19 N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ ụmụnna anyị ediela mmegide ndị o nwere ike ịbụ na ha atụghị anya ha. Chegodị banyere Nwanna Aleksey Yershov. O bi na Rọshịa. Ndị Jehova n’obodo ahụ nweere onwe ha mgbe Nwanna Yershov mere baptizim n’afọ 1994. Ma mgbe ọtụtụ afọ gachara, ihe gbanwere na Rọshịa. N’afọ 2020, ndị uwe ojii bara n’ụlọ Nwanna Yershov n’ike, kwaghasịchaa ebe niile, na-achọ ma è nwere ihe ha ga-ahụ. Ha jichikwara ọtụtụ ihe o nwere. Mgbe ọnwa ole na ole gachara, ndị ọchịchị kpọpụrụ nwanna a n’ụlọikpe kwuo na o mere mpụ. Nke kadị njọ bụ na ebe ha gbakwasịrị ụkwụ na-ebo ya ebubo ndị ahụ bụ vidio onye mere ka ọ̀ chọrọ ịmụ Baịbụl kemgbe ihe karịrị otu afọ sere. Leenụ otú onye ọ tụkwasịrị obi si tinye ya ná nsogbu.

20. Olee otú Nwanna Yershov sirila mee ka ya na Jehova na-adịkwu ná mma?

20 È nweela uru ọ bụla mmegide e megidere Nwanna Yershov bara? Ee. Ya na Jehova adịkwuola ná mma. Ọ sịrị: “Mụ na nwunye m na-ekpekọ ekpere ugboro ugboro. Aghọtara m na agaraghị m edili nsogbu a ma a sị na Jehova enyereghị m aka.” O kwukwara, sị: “Ịmụ ihe n’onwe m enyekwarala m aka ka ike ụwa ghara ịgwụ m. M na-atụgharị uche n’ihe ndị ji obi ha niile fee Jehova n’oge gara aga mere. E nwere ọtụtụ ihe a kọrọ na Baịbụl na-egosi na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị nọrọ jii ma tụkwasị Jehova obi.”

21. Gịnị ka anyị mụtara n’isiokwu a?

21 Gịnị ka anyị mụtara n’isiokwu a? Nsogbu ndị anyị na-atụghị anya ha nwere ike ịbịara anyị n’ụwa ochie a. N’agbanyeghị ya, Jehova na-enyere ndị ohu ya aka mgbe niile ma ọ bụrụ na ha atụkwasị ya obi. Dị ka e kwuru n’amaokwu Baịbụl e si nweta isiokwu a, “ọtụtụ nsogbu na-abịara onye ezi omume, ma Jehova na-anapụta ya na ha niile.” (Ọma 34:19) Ka anyị lekwasị anya mgbe niile n’ike Jehova ji na-akwado anyị, ọ bụghị ná nsogbu ndị na-abịara anyị. Anyị mee otú ahụ, dị ka Pọl onyeozi, anyị ga-ekwuli, sị: “N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.”​—Fil. 4:13.

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

a N’agbanyeghị na nsogbu ndị anyị na-atụghị anya ha nwere ike ịbịara anyị n’ụwa ochie a, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga na-akwado ndị ji obi ha niile na-efe ya. Olee otú Jehova si nyere ndị na-efe ya aka n’oge gara aga? Olee otú o si enyere anyị aka taa? Ịmụ banyere ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nakwa ndị nke oge a na-eme ka obi sie anyị ike na ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, ọ ga-akwado anyị.