Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 18

Ka Anyị Na-agba Ibe Anyị Ume n’Ọmụmụ Ihe

Ka Anyị Na-agba Ibe Anyị Ume n’Ọmụmụ Ihe

“Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche . . . , na-agbarịta ibe anyị ume.”​—HIB. 10:24, 25.

ABỤ NKE 88 Mee Ka M Mara Ụzọ Gị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Gịnị mere anyị na-eji aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe?

 OLEE ihe mere anyị ji aga ọmụmụ ihe? Ihe kacha mkpa mere anyị ji aga ọmụmụ ihe bụ ka anyị too Jehova. (Ọma 26:12; 111:1) Ihe ọzọ mekwara anyị ji aga ọmụmụ ihe bụ ka anyị gbaa ibe anyi ume n’oge a ihe siri ike. (1 Tesa. 5:11) Ọ bụrụ na anyị ewelie aka ma zaa ajụjụ n’ọmụmụ ihe, anyị na-eme ụzọ ihe abụọ ndị a mere anyị ji aga ọmụmụ ihe.

2. Olee ohere ndị anyị nwere ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe anyị?

2 N’izu ọ bụla, anyị nwere ọtụtụ ohere ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe anyị. Dị ka ihe atụ, ná ngwụcha izu, anyị nwere ike ịza ajụjụ ma a mụwa Ụlọ Nche. N’etiti izukwa, anyị nwere ike ịza ajụjụ ma e mewe ihe omume Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke, Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ, na ihe omume ndị ọzọ ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

3. Olee ihe ụfọdụ nwere ike isiri anyị ike? Oleekwa otú Ndị Hibru 10:24, 25 si enyere anyị aka?

3 Anyị niile chọrọ ito Jehova, na-agbakwa ụmụnna anyị ume. Ma, e nwere ihe ndị nwere ike ime ka ọ na-esiri anyị ike ịza ajụjụ. Ụjọ nwere ike ịtụ anyị ịza ajụjụ, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na anyị chọrọ ịza ajụjụ ma a naghị akpọ anyị ka anyị zaa ajụjụ ugboro ole anyị chọrọ. Gịnị ga-enyere anyị aka n’ihe abụọ ndị a? Ihe Pọl onyeozi kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a. Mgbe Pọl na-ekwu gbasara uru ọmụmụ ihe na-abara anyị, ọ sịrị na ihe kwesịrị ịka anyị mkpa bụ ‘ịgbarịta ibe anyị ume.’ (Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.) Ọ bụrụ na anyị achọpụta na obere ihe anyị kwuru n’ọmụmụ ihe nwere ike ịgba ndị ọzọ ume, ọ na-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ ịza ajụjụ. Ọ bụrụkwanụ na a naghị akpọ anyị otú anyị chọrọ, obi ga-adị anyị ụtọ na ụmụnna ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ zara ajụjụ.​—1 Pita 3:8.

4. Olee ihe atọ anyị ga-ekwu banyere ha n’isiokwu a?

4 N’isiokwu a, anyị ga-ebu ụzọ eleba anya n’otú anyị nwere ike isi na-agba ibe anyị ume n’ọgbakọ dị obere, ebe ndị na-aza ajụjụ dị ole na ole. Anyị ga-atụlekwa otú anyị nwere ike isi na-agba ibe anyị ume n’ọgbakọ buru ibu, ebe ọtụtụ ndị na-eweli aka ka ha zaa ajụjụ. N’ikpeazụ, anyị ga-eleba anya n’ihe anyị nwere ike ime ka azịza anyị na-agba ndị ọzọ ume.

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-AGBA IBE ANYỊ UME N’OBERE ỌGBAKỌ

5. Olee otú anyị ga-esi na-agba ibe anyị ume ma ọ bụrụ na anyị nọ n’ọgbakọ dị obere?

5 N’ọgbakọ dị obere ma ọ bụ n’obere ìgwè na-abụbeghị ọgbakọ, a na-enwe mmadụ ole na ole na-eweli aka ka ha zaa ajụjụ. Mgbe ụfọdụ, onye na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ nwere ike icheretụ tupu mmadụ ewelie aka ka ọ zaa ajụjụ. Ihe a nwere ike ime ka ọmụmụ ihe na-egbutụ oge, nke na-eme ka ọmụmụ ihe ghara ịna-atọcha ụtọ. Gịnị ka ị ga-eme? Na-eweli aka gị ọtụtụ ugboro. Ọ bụrụ na ị na-eme ya, o nwere ike ime ka ndị ọzọ na-ewelikwu aka na-aza ajụjụ.

6-7. Olee ihe ị ga-eme ka ụjọ ghara ịna-atụ gị ịza ajụjụ?

6 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị ịza ajụjụ? Ọ na-adị ọtụtụ ndị otú ahụ. Ma, ọ bụrụ na ị chọrọ ịna-agbakwu ụmụnna gị ume, ọ ga-aka mma ka ị gbalịa chọpụta ihe ndị ị ga-eme ka ụjọ ghara ịna-atụ gị ịza ajụjụ. Olee otú i nwere ike isi eme ya?

7 Ịgụ ihe ụfọdụ e kwuru n’Ụlọ Nche n’oge gara aga nwere ike inyere gị aka. b Otu n’ime ha bụ ịkwadebe nke ọma. (Ilu 21:5) Ọ bụrụ na ihe a na-amụ edoo gị anya, ọ ga-eme ka ọ dịrị gị mfe iweli aka ịza ajụjụ. Ihe ọzọ bụ ịza ajụjụ dị nkenke. (Ilu 15:23; 17:27) Ọ bụrụ na ihe ị chọrọ ịza dị nkenke, ọ ga-eme ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị. Azịza dị nkenke ị zara ihe dị ka otu ahịrịokwu ma ọ bụ abụọ nwere ike ịdịrị ụmụnna gị mfe nghọta karịa ikwu ogologo okwu gbasara ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ na i si n’obi gị zaa ajụjụ dị nkenke, ọ ga-egosi na ị kwadoro nke ọma nakwa na ị ghọtara ihe a na-amụ.

8. Olee otú Jehova si ele mbọ anyị na-agba anya?

8 Ọ bụrụkwanụ na i meela ụfọdụ n’ime ihe ndị a e kwuru, mana ụjọ ka na-atụ gị ịza ajụjụ karịa otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ? Ka obi sie gị ike na obi ga-atọ Jehova ụtọ maka otú i si agba mbọ ịza ajụjụ otú i nwere ike. (Luk 21:1-4) Ime ike gị niile apụtaghị na ị ga-eme karịa ihe i nwere ike ime. (Fil. 4:5) Chọpụta ihe ị ga-emeli. Gbaa mbọ mee ya. Kpeekwa ekpere ka Jehova mee ka ụjọ kwụsị ịtụ gị. Na mbụ, ihe i nwere ike ịgba mbọ mee bụ ịza otu ajụjụ dị nkenke n’ọmụmụ ihe.

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-AGBA IBE ANYỊ UME NÁ NNUKWU ỌGBAKỌ

9. Olee ihe mere o nwere ike iji esi ike ịza ajụjụ n’ọgbakọ buru ibu?

9 Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ndị nkwusa n’ọgbakọ unu, nsogbu nke gị nwere ike ịdị iche. O nwere ike ịbụ na ọtụtụ ụmụnna na-eweli aka, ya emee ka a ghara ịna-akpọ gị mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, ọ na-atọ otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Danielle ụtọ ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. c O weere ya ka otú o si efe Jehova, otú o si agba ndị ọzọ ume, nakwa otú o si eme ka eziokwu Baịbụl bamie n’obi ya. Ma mgbe ọ gafere n’ọgbakọ buru ibu, a naghịzi akpọ ya otú e sibu akpọ ya. Mgbe ụfọdụ, a nadịghị akpọ ya otu ugboro, ọmụmụ ihe agbasaa. Ọ sịrị: “Ihe a were m ezigbo iwe. Ọ dị m ka è nwere ihe na-akwa m. O mee ugboro ugboro, m na-echewe ma hà na-akpachara anya ghara ịkpọ m.”

10. Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ohere buru ibu ịza ajụjụ?

10 Ọ̀ dịtụla gị otú ọ dị Danielle? Ọ bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịdị gị ka ị kwụsị ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, nọrọzie na-ege naanị ntị. Ma, akwụsịla ịgba mbọ ka ị zaa ajụjụ. Gịnị ka i nwere ike ime? Ihe nwere ike inyere gị aka ịza ajụjụ bụ ịkwadebe ọtụtụ ihe ị ga-aza n’ọmụmụ ihe nke ọ bụla. Ọ bụrụzie na a kpọghị gị ná mmalite ọmụmụ ihe, ị ka nwere ohere ịza ajụjụ ka ọmụmụ ihe na-aga n’ihu. Ọ bụrụ na ị mụwa Ụlọ Nche, chee gbasara otú paragraf nke ọ bụla si gbasa isiokwu ahụ. I mee otú ahụ, o nwere ike ime ka i nwee ihe ị ga-aza n’oge ọ bụla n’ọmụmụ ihe ahụ. Ihe ọzọ bụ na i nwere ike ịkwadebe ịza ajụjụ na paragraf ndị kwuru gbasara eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ ndị siri ike nkọwa. (1 Kọr. 2:10) Maka gịnị? Ọ bụ maka na o nwere ike ịbụ naanị mmadụ ole na ole ga-eweli aka ma a mụwa ebe ahụ. Ma, ọ bụrụkwanụ na i mee ihe ndị a, gị achọpụta na ị gaala ọmụmụ ihe ugboro ole na ole, ị zabeghị ajụjụ ọ bụla? I nwere ike ịgakwuru onye ga-eduzi ọmụmụ ihe ahụ tupu a malite ọmụmụ ihe, gwa ya ajụjụ nke ị ga-achọ ịza.

11. Gịnị ka Ndị Filipaị 2:4 na-agba anyị ume ka anyị mee?

11 Gụọ Ndị Filipaị 2:4. Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ gbaa Ndị Kraịst ume ka ha na-achọ ihe ga-abara ndị ọzọ uru. Olee otú anyị ga-esi eme ihe a o kwuru ma anyị gaa ọmụmụ ihe? Ọ bụ ịna-echeta na ndị ọzọ chọrọ ịza ajụjụ otú ahụ anyịnwa chọkwara.

Kwe ka ndị ọzọ na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe otú ahụ ị na-ekwe ka ndị ọzọ na-etinye ọnụ ná mkparịta ụka gị na ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. Olee otu ụzọ dị mma anyị ga-esi agba ndị ọzọ ume n’ọmụmụ ihe? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

12 Chegodị ya otú a. Mgbe gị na ndị enyi gị na-ekwu okwu, ị̀ ga-achọ ikwucha ihe niile, ndị enyi gị agaghị etinyetụ ọnụ? Mbanụ. Ị ga-achọ ka hanwa tinyekwa ọnụ. Otú ahụkwa ka ọ dị n’ọmụmụ ihe. Anyị chọrọ ka ọtụtụ ndị zaa ajụjụ. N’eziokwu, otu n’ime ụzọ ndị kacha mma anyị si agba ụmụnna anyị ume bụ inye ha ohere ka ha kwuo ihe ha kweere. (1 Kọr. 10:24) Ka anyị chọpụta otú anyị ga-esi eme ya.

13. Olee otú anyị ga-esi nye ndị ọzọ ohere ịza ajụjụ?

13 Otu ihe anyị ga-eme bụ ịza ajụjụ dị nkenke. Ọ ga-enye ndị ọzọ ohere ịza ajụjụ. Ndị okenye na ndị nkwusa ndị ọzọ ma nke a na-akọ n’ọgbakọ kwesịrị ibute ụzọ n’ihe a. Ị zawagodị ajụjụ dị nkenke, ekwula banyere ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ na i kwuo ihe niile dị na paragraf a na-amụ, ọ ga-eme ka a ghara inwe oké ihe ndị ọzọ ga-ekwu. Dị ka ihe atụ, na paragraf a, e kwuru gbasara ụzọ ihe abụọ. Nke mbụ bụ ịza ajụjụ dị nkenke, nke ọzọ abụrụ ịghara ikwu gbasara ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ na ị bụ onye mbụ a kpọrọ ka ị zaa ajụjụ na paragraf a, ọ̀ bụ na ọ gaghị aka mma ka i kwuo naanị otu n’ime ụzọ ihe abụọ a?

Olee mgbe anyị nwere ike ikpebi ka anyị ghara iweli aka n’ọmụmụ ihe? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14) f

14. Olee ihe ga-enyere anyị aka ikpebi ugboro ole anyị ga-eweli aka? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

14 Jiri amamihe na-ekpebi ugboro ole ị ga-eweli aka. Ọ bụrụ na ị na-eweli aka ọtụtụ ugboro, o nwere ike ime ka onye na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ kpọọ gị ọtụtụ ugboro ebe ọ bụkwanụ na ndị ọzọ azabeghị. Ihe a nwere ike ime ka ike gwụ ndị ọzọ iweli aka.​—Ekli. 3:7.

15. (a) Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na a kpọghị anyị ka anyị zaa ajụjụ? (b) Olee otú ndị na-eduzi ọmụmụ ihe ga-esi na-echebara mmadụ niile echiche? (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Ọ Bụrụ Gị Na-eduzi Ọmụmụ Ihe.”)

15 Ọ bụrụ na ọtụtụ ndị na-eweli aka ma a mụwa ihe, o nwere ike a gaghị akpọ anyị ka anyị zaa ajụjụ ugboro ole anyị chọrọ. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdaba na onye na-eduzi ihe ahụ agaghị akpọ anyị chaa chaa. Ihe a nwere ike ịgbawa anyị obi. Ma, anyị kwesịrị ịgbalị ka iwe ghara iwe anyị ma ọ bụrụ na a kpọghị anyị ka anyị zaa ajụjụ.​—Ekli. 7:9.

16. Olee otú anyị nwere ike isi agba ndị zara ajụjụ ume?

16 Ọ bụrụ na ị gara ọmụmụ ihe, ya abụrụ na a kpọghị gị ka ị zaa ajụjụ ugboro ole ị gaara achọ ịza, ọ ga-aka mma ka ị na-ege ntị mgbe ndị ọzọ na-aza ajụjụ. A gbasaa, jaa ha mma maka azịza ha zara. Mma a ị jara ụmụnna gị nwere ike ịgba ha ume otú ahụ ihe ị gaara aza gaara esi agba ha ume. (Ilu 10:21) Ịja ụmụnna anyị mma bụ ụzọ ọzọ anyị si agba ha ume.

ỤZỌ NDỊ ỌZỌ ANYỊ SI AGBA IBE ANYỊ UME

17. (a) Olee otú ndị nne na nna ga-esi enyere ụmụ ha aka ịkwadebe azịza ndị dabara adaba? (b) Dị ka e gosiri na vidio ahụ, olee ihe anọ mmadụ ga-eme ma ọ kwadebewe ihe ọ ga-aza? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

17 Olee otú ọzọ anyị nwere ike isi agba ibe anyị ume n’ọmụmụ ihe? Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere ụmụ gị aka ịkwadebe azịza ha ga-aza nke ga-adaba n’afọ ole ha dị. (Mat. 21:16) Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịna-amụ ihe ndị dị ezigbo mkpa n’ọmụmụ ihe, dị ka nsogbu di na nwunye ma ọ bụkwanụ otú anyị ga-esi zere omume rụrụ arụ. Ma, e nwekwara ike inwe otu paragraf ma ọ bụ abụọ ụmụaka nwere ike ịza ajụjụ na ha. I kwesịkwara inyere ụmụ gị aka ka ha ghọta ihe mere na ọ bụghị mgbe ọ bụla ha weliri aka ka e nwere ike ịkpọ ha ka ha zaa ajụjụ. Ịkọwara ha ihe a ga-eme ka iwe ghara iwe ha ma a kpọọ ndị ọzọ ka ha zaa ajụjụ kama ịkpọ hanwa.​—1 Tim. 6:18. d

18. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-ekwukarị gbasara onwe anyị ma anyị zawa ajụjụ? (Ilu 27:2)

18 Anyị niile ga-enweli ike ịkwadebe ezigbo azịza ga-eme ka e too Jehova ma gbaa ụmụnna anyị ume. (Ilu 25:11) Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịkọ ihe ụfọdụ gbasara onwe anyị, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị ghara ịna-ekwukarị gbasara onwe anyị. (Gụọ Ilu 27:2; 2 Kọr. 10:18) Kama ime otú ahụ, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka ihe kacha anyị mkpa bụrụ ikwu gbasara Jehova, Okwu ya, na ndị ya. (Mkpu. 4:11) Ma, ọ bụrụ na ajụjụ a jụrụ na paragraf bụ ka anyị kwuo ihe ụfọdụ gbasara onwe anyị, anyị kwesịrị ime otú ahụ. Anyị ga-ahụ ụdị ajụjụ ahụ na paragraf na-eso nke a.

19. (a) Olee uru ọ ga-aba ma ọ bụrụ na anyị ana-echebara ndị niile bịara ọmụmụ ihe echiche? (Ndị Rom 1:11, 12) (b) Olee ihe kacha amasị gị n’ihe gbasara ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe?

19 Ọ bụ eziokwu na o nweghị ebe e depụtara iwu gbasara otú anyị ga-esi na-aza ajụjụ, anyị niile kwesịrị ịgbalịsi ike na-aza ajụjụ ga na-agba ndị ọzọ ume. O nwere ike ịpụta na anyị ga-agbakwu mbọ na-aza ajụjụ ugboro ugboro n’ọmụmụ ihe. O nwekwara ike ịpụta na anyị agaghị ewe iwe ma á kpọghị anyị ugboro ole anyị chọrọ. Obi ga na-adịkwa anyị ụtọ ma a kpọọ ndị ọzọ ka ha zaa ajụjụ. Ọ bụrụ na ihe kacha anyị mkpa n’ọmụmụ ihe abụrụ ihe ga-abara ụmụnna anyị uru, obi ga-adị anyị ụtọ ma ụmụnna anyị gbaa anyị ume, anyịnwa agbaakwa ha ume.​—Gụọ Ndị Rom 1:11, 12.

ABỤ NKE 93 Gọzie Nzukọ Anyị

a Anyị na-agba ibe anyị ume ma anyị zaa ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ma, ụjọ na-atụ ụfọdụ ndị ịza ajụjụ. Ọ na-atọkwanụ ndị ọzọ ụtọ ịza ajụjụ nke na ọ na-adị ha ka a na-akpọ ha ọtụtụ ugboro. N’agbanyeghị otú o si dịrị anyị, olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-echebara ibe anyị echiche ka e nwee ike gbaa anyị niile ume? Olee otú anyị ga-esi na-aza ajụjụ ga-eme ka ụmụnna anyị na-ahụ ibe ha n’anya ma na-arụ ezigbo ọrụ? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.

b Ị chọọ ịhụ aro ndị ọzọ a tụrụ, gụọ Ụlọ Nche Jenụwarị 2019, peeji nke 8 ruo na nke 13, nakwa nke September 1, 2003, peeji nke 19 ruo na nke 22.

c Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

f NKỌWA FOTO: N’ọgbakọ buru ibu, nwanna zarala ajụjụ nyere ndị ọzọ ohere ka ha nwee ike ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe.