Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 16

“Nwanne Gị Nwoke Ga-ebili”

“Nwanne Gị Nwoke Ga-ebili”

“Jizọs sịrị [Mata]: ‘Nwanne gị nwoke ga-ebili.’”​—JỌN 11:23.

ABỤ NKE 151 Ọ Ga-akpọ Òkù

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Olee otú otu nwatakịrị si gosi na o nwere olileanya ná mbilite n’ọnwụ?

 OTU nwatakịrị aha ya bụ Matthew nọ na-arịa ọrịa jọgburu onwe ya, nke mere ka a waa ya ahụ́ ọtụtụ ugboro. Mgbe ọ dị afọ asaa, ya na ndị ezinụlọ ha nọ na-ele Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova. Ná ngwụcha ihe omume ahụ, e gosiri otu vidio egwú nke na-egosi ebe a na-anabata ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ a kpọlitere n’ọnwụ. b Mgbe ha lechara ihe omume ahụ, Matthew jidere ndị mụrụ ya aka, ma sị ha: “Mama, papa, ùnu ahụla ya? Ọ bụrụgodị na mụ anwụọ, m ga-ebilite n’oge mbilite n’ọnwụ. Unu nwere ike ichere m mgbe ahụ. Ọ ga-emecha dị mma.” Chegodị otú obi dị papa ya na mama ya mgbe ha chọpụtara na nwa ha nwoke kwetasiri ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.

2-3. Gịnị mere o ji dị mma ka anyị na-atụgharị uche ná nkwa Chineke kwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ?

2 Anyị niile kwesịrị ịna-eme, anyị nọtụ, anyị atụgharịa uche ná nkwa Baịbụl kwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 5:28, 29) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị amaghị mgbe anyị ga-arịawa ọrịa nwere ike ịta isi anyị ma ọ bụkwanụ mgbe mmadụ nwere ike ịnwụnahụ anyị na mberede. (Ekli. 9:11; Jems 4:13, 14) Olileanya anyị nwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ga-enyere anyị aka idi ụdị nsogbu ahụ. (1 Tesa. 4:13) Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na Nna anyị nke eluigwe ma anyị nke ọma nakwa na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. (Luk 12:7) Chegodị otú Jehova Chineke maruru anyị, nke ga-eme ka o nwee ike ikeghachi anyị ka anyị nwee àgwà ndị anyị nweburu, na-echetakwa ihe ndị anyị na-echetabu. Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. O kwekwala nkwa na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi. Ọ bụrụgodị na anyị anwụọ, ọ ga-akpọlite anyị n’ọnwụ.

3 N’isiokwu a, anyị ga-ebu ụzọ leba anya n’ihe mere anyị ji kweta na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Anyị ga-elebakwa anya n’akụkọ Baịbụl kọrọ na-eme ka okwukwe anyị sie ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ọ bụ n’akụkọ ahụ ka e si nweta amaokwu Baịbụl isiokwu a gbakwasịrị ụkwụ, nke bụ́: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” (Jọn 11:23) N’ikpeazụ, anyị ga-amụtakwa ihe anyị ga-eme ka anyị kwetasie ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.

IHE MERE ANYỊ GA-EJI KWETA NA A GA-AKPỌLITE NDỊ NWỤRỤ ANWỤ

4. Ọ bụrụ na ị chọrọ ikweta nkwa e kwere gị, olee ihe obi ga-esi gị ike na ya? Nye ihe atụ.

4 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ikweta nkwa e kwere anyị, obi ga-ebu ụzọ sie anyị ike na onye kwere nkwa ahụ chọrọ imezu ya, nweekwa ike ọ ga-eji eme ya. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na oké ifufe mebisịrị ụlọ gị, otu enyi gị abịakwute gị, kwe gị nkwa, sị, ‘M ga-enyere gị aka rụghachi ụlọ gị a.’ Nkwa ahụ o kwere gị si ya n’obi. Obi sikwara gị ike na ọ chọrọ inyere gị aka. Ọ bụrụ na ọ bụ aka ochie n’ịrụ ụlọ, nweekwa ngwá ọrụ ọ ga-eji arụ ya, ị ma na ọ ga-emeli ihe ahụ o kwuru. N’ihi ya, ị ga-ekweta nkwa ahụ o kwere gị. Gịnịkwanụ ka i chere banyere nkwa Chineke kwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ? Ọ̀ chọrọ n’eziokwu imezu ya, nweekwa ike ọ ga-eji eme ya?

5-6. Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na Jehova chọrọ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ?

5 Jehova ọ̀ chọrọ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ? À na-ajụkwa ajụ? O si n’ike mmụọ nsọ mee ka ụfọdụ ndị so dee Baịbụl dee nkwa o kwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọdịnihu. (Aịza. 26:19; Hos. 13:14; Mkpu. 20:11-13) Ọ bụrụ na Jehova ekwe nkwa, ọ ga-emezurịrị ya. (Josh. 23:14) N’eziokwu, ọ na-agụsi Jehova agụụ ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Gịnị mere anyị ji kwuo ya?

6 Chegodị banyere ihe Job kwuru. Obi siri ya ike na ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ọ ga-agụsi Jehova agụụ ike ịkpọlite ya n’ọnwụ. (Job 14:14, 15) Otú ahụkwa ka Jehova chọsiri ike ịkpọlite ndị ohu ya niile nwụrụ anwụ. Ọ na-agụsi ya agụụ ike ime ka ha dị ndụ ọzọ, ahụ́ agbasie ha ike, obi adịkwa ha ụtọ. Oleekwanụ otú obi dị ya maka ọtụtụ ijeri ndị nwụrụ anwụ, ndị a na-enyeghị ohere ịmụta eziokwu gbasara Jehova? Chineke anyị hụrụ anyị n’anya chọkwara ịkpọlite hanwa. (Ọrụ 24:15) Ọ chọrọ ka e nye ha ohere ịghọ ndị enyi ya, ha adịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa. (Jọn 3:16) O doro anya na Jehova chọsiri ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ.

7-8. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na Jehova ga-akpọliteli ndị nwụrụ anwụ?

7 Jehova ò nwekwara ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ? Eheenụ. Ọ bụ “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” (Mkpu. 1:8) N’ihi ya, o nwere ikike imeri onye iro ọ bụla, ma ọnwụ. (1 Kọr. 15:26) Ịmata eziokwu a na-eme ka obi sie anyị ike, na-akasikwa anyị obi. Chegodị banyere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Emma Arnold. Ezigbo ọnwụnwa bịaara ya na ndị ezinụlọ ya mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ. Mgbe nwanna nwaanyị a chọrọ ịkasi nwa ya nwaanyị obi maka ndị nwụnahụrụ ha n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi, ọ sịrị ya: “Ọ bụrụ na ọnwụ ga-enwe ike ijide ndị o gburu ruo mgbe ebighị ebi, ọ̀ bụ na ọ gaghị apụta na ọ ka Chineke ike?” O doro anya na e nweghị ihe ka Jehova ike. Ọ bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile nyere anyị ndụ. N’ihi ya, ọ ga-emeli ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ.

8 Ihe ọzọ mere anyị ji mara na Chineke ga-akpọliteli ndị nwụrụ anwụ bụ na ihe ọ ga-echetali enweghị ọgwụgwụ. Ọ na-akpọ kpakpando nke ọ bụla aha ya. (Aịza. 40:26) Ihe ọzọ bụ na ọ na-echeta ndị nwụrụ anwụ. (Job 14:13; Luk 20:37, 38) Ọ ga-echetali obere ihe ọ bụla gbasara ndị ọ ga-akpọlite n’ọnwụ, ma àgwà ha ma otú ha dị ma ihe ndị ha hụrụla ná ndụ ma ihe ndị ha na-echeta.

9. Gịnị mere i ji kweta nkwa ahụ Jehova kwere na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ?

9 O doro anya na anyị kwesịrị ikweta nkwa Jehova kwere na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ihi na anyị ma na ọ chọrọ ime ya, nweekwa ikike ime ya. Chegodị ihe ọzọ mere anyị ji kweta na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ: Jehova emeela ya n’oge gara aga. N’oge a na-ede Baịbụl, o nyere Jizọs na ụfọdụ ụmụ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kọrọ gbasara otu n’ime ndị ahụ Jizọs kpọlitere n’ọnwụ, ya bụ, nke a kọrọ na Jọn isi 11.

MGBE EZIGBO ENYI JIZỌS NWỤRỤ

10. Gịnị mere mgbe Jizọs nọ n’ofe Jọdan na-ekwusa ozi ọma? Gịnịkwa ka o mere? (Jọn 11:1-3)

10 Gụọ Jọn 11:1-3. Chegodị ihe mere na Betani ná ngwụcha afọ 32 Oge Ndị Kraịst. Jizọs nwere ezigbo ndị enyi n’obodo Betani, ya bụ, Lazarọs na ụmụnne ya ndị nwaanyị abụọ, bụ́ Meri na Mata. (Luk 10:38-42) Ma, ọrịa bịara Lazarọs, ụmụnne ya achịrị obi n’aka. Ha zigaara Jizọs ozi n’ofe Jọdan ọ nọ mgbe ahụ. Isi Betani ruo ebe ahụ na-ewe onye ji ụkwụ ihe dị ka ụbọchị abụọ. (Jọn 10:40) Ma, ọ dị mwute na Lazarọs nwụrụ n’ihe dị ka n’oge ahụ ozi ahụ ruru Jizọs ntị. Ọ bụ eziokwu na Jizọs ma na enyi ya anwụọla, ọ nọkwuru ebe ahụ ụbọchị abụọ, gawazie Betani. N’ihi ya, mgbe Jizọs rutere Betani, ụbọchị anọ agaala kemgbe Lazarọs nwụrụ. Jizọs bu n’obi ime ihe ga-abara ndị enyi ya uru ma tookwa Chineke.​—Jọn 11:4, 6, 11, 17.

11. Gịnị ka anyị na-amụta gbasara ịbụ enyi n’akụkọ Lazarọs?

11 E nwere ezigbo ihe akụkọ a na-akụziri anyị gbasara ịbụ enyi. Chegodị echiche. Mgbe Meri na Mata zigaara Jizọs ozi, ha agwaghị ya ka ọ bịa Betani. Naanị ihe ha gwara ya bụ na ezigbo enyi ya na-arịa ọrịa. (Jọn 11:3) Mgbe Lazarọs nwụrụ, Jizọs gaara anọ ebe ahụ ọ nọ kpọlite ya n’ọnwụ. Ma, kama ime otú ahụ, o kpebiri ịga Betani ka ọ gaa nọnyere ndị enyi ya, bụ́ Meri na Mata. Ì nwere enyi na-agbatara gị ọsọ enyemaka n’agbanyeghị na ị rịọghị ya? Ọ bụrụ na i nwere, obi siri gị ike na ọ ga-enyeliri gị aka “n’oge nsogbu.” (Ilu 17:17) Dị ka Jizọs, ka anyị gosi ndị ọzọ na anyị bụ ụdị enyi ahụ. Ka anyị laghachizie n’akụkọ Lazarọs ma hụ ihe ọzọ merenụ.

12. Olee nkwa Jizọs kwere Mata? Gịnịkwa mere na ọ bụghị nkwa elu ọnụ? (Jọn 11:23-26)

12 Gụọ Jọn 11:23-26. Mata nụrụ na Jizọs erutewela Betani. Ọ gbapụrụ gaa zute ya ma sị ya: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” (Jọn 11:21) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jizọs nwere ike ịgwọ Lazarọs. Ma, o bu n’obi ime ihe ga-aka tụọ ndị mmadụ n’anya. O kwere Mata nkwa, sị: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” Ọ gwakwara Mata ihe ọzọ ga-eme ka o kwetasie ike na ọ ga-emezu nkwa ahụ. Ọ sịrị ya: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ.” N’eziokwu, Chineke nyere Jizọs ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Tupu mgbe ahụ, Jizọs kpọlitere otu nwa agbọghọ obere oge ọ nwụchara. Ọ kpọlitekwara otu nwa okorobịa. Ọ dị ka ọ̀ bụ n’otu ụbọchị ahụ ọ nwụrụ. (Luk 7:11-15; 8:49-55) Ma, ọ̀ ga-enwe ike ịkpọlite onye nwụrụ kemgbe ụbọchị anọ, onye ọ ga-abụrịrị na ahụ́ ya erewela?

“LAZARỌS, PỤTA!”

Jizọs nweere ndị enyi ya na-eru uju ezigbo ọmịiko (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 14)

13. Dị ka e kwuru na Jọn 11:32-35, gịnị ka Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ka Meri na ndị ọzọ na-ebe ákwá? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

13 Gụọ Jọn 11:32-35. Weregodị ya na ị na-ahụ ihe mezirinụ. Meri bụ́kwa nwanne Lazarọs gara izute Jizọs. O kwughachiri otu ihe ahụ nwanne ya nwaanyị kwuru. Ọ sịrị: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” Ya na ndị ọzọ ha na ya so nọ na-eru uju. Mgbe Jizọs hụrụ ka ha na-ebe ákwá, obi gbawara ya. Otú o si nweere ndị enyi ya ọmịiko mere ka anya mmiri gbaa ya. Ọ ghọtara otú obi si agbawa mmadụ ma e nwee onye nwụnahụrụ ya. N’eziokwu, ọ chọsiri ike iwepụ ihe ahụ kpataara ha anya mmiri.

14. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta banyere Jehova n’ihe Jizọs mere mgbe Meri na-ebe ákwá?

14 Ihe Jizọs mere mgbe Meri na-ebe ákwá na-akụziri anyị na Jehova bụ Chineke nwere ọmịiko. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Dị ka anyị mụtara n’isiokwu bu nke a ụzọ, Jizọs na-eche nnọọ echiche ka Nna ya, obi na-adịkwa ya otú ọ na-adị Nna ya. (Jọn 12:45) Jizọs bere ákwá n’ihi na o nweere ndị enyi ya na-eru uju ezigbo ọmịiko. Anyị si n’ihe a o mere mata na Jehova na-enwere anyị ezigbo ọmịiko ma ọ hụ ka anyị na-ebe ákwá. (Ọma 56:8) Ọ̀ bụ na ụdị ihe a anaghị eme ka ị chọọ ịbịarukwu Chineke anyị dị obi ebere nso?

Jizọs gosiri na o nwere ikike ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16)

15. Dị ka e kwuru na Jọn 11:41-44, gịnị mere n’ili Lazarọs? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

15 Gụọ Jọn 11:41-44. Jizọs rutere n’ili Lazarọs, kwuo ka a kwapụ nkume e ji mechie ya. Mata ekweghị. Ọ sịrị na ọ ga-abụrịrị na Lazarọs esiwela ísì. Jizọs zara ya, sị: “Ọ̀ kwa m gwara gị na ọ bụrụ na i kwere, ị ga-ahụ ebube Chineke?” (Jọn 11:39, 40) Jizọs leliri anya n’eluigwe ma kpee ekpere n’ihu mmadụ niile. Ọ chọrọ ka otuto niile gaara Jehova maka ihe ọzọ na-aga ime. Jizọs kpọziri Lazarọs òkù, sị: “Lazarọs, pụta!” Lazarọs esi n’ili ahụ pụta. Ihe ahụ Jizọs mere bụ ihe ụfọdụ ndị nwere ike iche na ọ gaghị ekwe omume.​—Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Mere Irute n’Ebe E Liri Lazarọs Ji Wee Jizọs Abalị Anọ?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche January 1, 2008.

16. Olee otú ihe Baịbụl kọrọ na Jọn isi 11 si eme ka okwukwe anyị sikwuo ike na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ?

16 Ihe Baịbụl kọrọ na Jọn isi 11 na-eme ka okwukwe anyị sie ike na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Olee otú o si eme ya? Cheta na Jizọs kwere Mata nkwa, sị: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” (Jọn 11:23) Dịkwa ka Jehova, Jizọs chọrọ imezu nkwa ahụ, nweekwa ikike ime ya. Anya mmiri gbara ya na-eme ka anyị mata na ọ na-agụsi ya agụụ ike iwepụ ọnwụ na iru uju ọ na-akpata. Mgbe Lazarọs si n’ili pụta, Jizọs gosiri na ya nwere ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Cheekwa banyere ihe Jizọs chetaara Mata. Ọ sịrị ya: “Ọ̀ kwa m gwara gị na ọ bụrụ na i kwere, ị ga-ahụ ebube Chineke?” (Jọn 11:40) Anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ji kwere na Chineke ga-emezu nkwa o kwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ma, gịnị ka anyị ga-eme ka anyị kwetasie ike na nkwa a ga-emezu?

OTÚ ANYỊ GA-ESI MEE KA OBI SIKWUO ANYỊ IKE NA CHINEKE GA-AKPỌLITE NDỊ NWỤRỤ ANWỤ

17. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị na-agụ banyere ndị Baịbụl kọrọ akụkọ ha a kpọlitere n’ọnwụ?

17 Gụọ akụkọ gbasara ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’oge gara aga ma chebara ya echiche. Baịbụl kọọrọ anyị gbasara mmadụ asatọ a kpọlitere n’ọnwụ n’ụwa. c Ọ ga-adị mma ka i wepụta oge mụọ gbasara nke ọ bụla n’ime ha nke ọma. Ka ị na-eme otú ahụ, cheta na ha bụ ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka dịrị ndụ n’eziokwu. Gbalịa ka ị mụta ihe ndị i kwesịrị ịmụta n’akụkọ ndị ahụ. Cheekwa otú akụkọ nke ọ bụla si gosi na Chineke chọrọ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, nweekwa ikike ime ya. Ihe kachanụ ị ga-eme bụ iche gbasara mbilite n’ọnwụ kacha mkpa, ya bụ, nke Jizọs Kraịst. Cheta na ọtụtụ narị ndị ji anya ha hụ Jizọs mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ gbara akaebe na a kpọlitere ya n’ọnwụ. Ihe ndị ha kọrọ na-emekwa ka okwukwe anyị sie ezigbo ike.​—1 Kọr. 15:3-6, 20-22.

18. Olee otú ị ga-esi jiri abụ ndị na-ekwu gbasara olileanya mbilite n’ọnwụ na-agba onwe gị ume? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

18 Jiri ‘abụ e ji efe Chineke’ ndị na-ekwu banyere olileanya mbilite n’ọnwụ na-agba onwe gị ume. d (Efe. 5:19) Abụ ndị a na-eme ka anyị ghọta n’eziokwu na mbilite n’ọnwụ ga-eme eme. Ha na-emekwa ka okwukwe anyị nwere n’olileanya mbilite n’ọnwụ sikwuo ike. Na-ege abụ ndị ahụ. Jirikwanụ oge ofufe ezinụlọ unu na-amụ abụ ndị ahụ ma na-ekwurịta ihe ndị e kwuru na ha. Buru abụ ndị ahụ n’isi, na-echebakwara ihe ndị e kwuru na ha echiche ka ha mee ka okwukwe gị sikwuo ike. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, mgbe ọnwụnwa siri ezigbo ike bịaara gị ma ọ bụ mgbe mmadụ nwụnahụrụ gị, mmụọ Jehova ga-enyere gị aka icheta abụ ndị ahụ, ya akasie gị obi ma meekwa ka okwukwe gị sie ike.

19. Gịnị ka anyị nwere ike iji uche anyị na-ahụ gbasara mbilite n’ọnwụ? (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ  “Gịnị Ka Ị Ga-ajụ Ha?”)

19 Jiri uche gị hụ ka ị nọ n’ụwa ọhụrụ. Jehova nyere anyị ike iji uche anyị na-ahụ ụwa ọhụrụ. Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “Ewepụtala m oge chekata banyere ụwa ọhụrụ nke na ọ dịzi m ka m̀ na-anụ ísì okooko osisi ndị dị na Paradaịs.” Were ya na ị na-ahụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị nwere okwukwe Baịbụl kọrọ akụkọ ha. Olee onye ị na-atụsi anya ike ịhụ? Olee ajụjụ ndị ị ga-ajụ ya? Werekwa ya na ị hụrụ ndị nwụnahụrụ gị a kpọlitere n’ọnwụ. Chegodị otú ọ ga-adị gị mgbe gị na ha ga-ahụ, ihe mbụ ị ga-agwa ha, otú ị ga-esi jiri obi ụtọ makụọ ha, nakwa otú obi ga-adị gị ịhụ ha.

20. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

20 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova kwere nkwa ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ka obi sie anyị ike na nkwa a ga-emezu n’ihi na Jehova chọrọ imezu ya, nweekwa ikike ime ya. Ka anyị kpebisie ike ịna-eme ka okwukwe anyị nwere n’ọmarịcha olileanya a na-esikwu ike. Anyị mee otú ahụ, anyị ga na-abịarukwu Chineke anyị nso. E nwere ike ikwu na ọ na-ekwe onye ọ bụla n’ime anyị nkwa, sị: ‘Ndị nwụnahụrụ gị ga-ebili.’

ABỤ NKE 147 Jehova Kwere Anyị Nkwa Ndụ Ebighị Ebi

a Ọ bụrụ na mmadụ nwụnahụrụ gị, o doro anya na nkwa Chineke kwere na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ na-akasi gị ezigbo obi. Ma, olee otú ị ga-esi akọwara ndị ọzọ ihe mere i ji kwere na nkwa ahụ ga-emezu? Olee otú ị ga-esi mee ka obi sikwuo gị ike na a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ n’eziokwu? Ihe mere e ji wepụta isiokwu a bụ ka o nyere anyị niile aka ka okwukwe anyị sikwuo ike n’olileanya mbilite n’ọnwụ.

b Isiokwu vidio egwú ahụ bụ N’Egbughi Oge Ọ Bụla. Ọ gbara n’ihe omume nke ọnwa Nọvemba afọ 2016.

c Gụọ igbe bụ́ “Mmadụ Asatọ Baịbụl Kwuru na A Kpọlitere n’Ọnwụ.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Ọgọst 1, 2015, peeji nke 4.

d Ụfọdụ n’ime abụ ndị kwuru banyere mbilite n’ọnwụ n’akwụkwọ abụ bụ́ “Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ” bụ “Hụ Onwe Gị n’Ụwa Ọhụrụ” (Abụ nke 139), “Lekwasị Anya n’Ụgwọ Ọrụ” (Abụ nke 144), na “Ọ Ga-akpọ Òkù” (Abụ nke 151). Leekwa vidio egwú ndị dị na jw.org isiokwu ha bụ “N’Egbughị Oge Ọ bụla,” “Alaeze Chineke Na-abịa,” na “Ka Anyị Banye na Paradaịs.”