Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 19

Olee Otú Anyị Ga-esi Kwetasie Ike na Ụwa Ọhụrụ Jehova Kwere Anyị ná Nkwa Ga-abịa?

Olee Otú Anyị Ga-esi Kwetasie Ike na Ụwa Ọhụrụ Jehova Kwere Anyị ná Nkwa Ga-abịa?

“Ọ bụrụ na [Jehova] kwuo ihe, ọ̀ bụ na ọ gaghị eme ya?”​—ỌNỤ ỌGỤ. 23:19.

ABỤ NKE 142 Ka Anyị Jidesie Olileanya Anyị Ike

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1-2. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme ka anyị na-eche ka ụwa ọhụrụ bịa?

 OBI dị anyị ụtọ na Jehova kwere anyị nkwa iji ụwa ọhụrụ ya dochie ụwa ochie a. (2 Pita 3:13) Ọ bụ eziokwu na anyị amaghị mgbe ụwa ọhụrụ ahụ ga-abịa, mana, ihe ndị na-eme eme na-egosi na ọ gaghịzi ete aka, ya abịa.​—Mat. 24:32-34, 36; Ọrụ 1:7.

2 Ma, n’agbanyeghị afọ ole anyị nọrọla n’ọgbakọ, anyị niile kwesịrị ịna-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike ná nkwa ahụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụgodị na okwukwe anyị siri ezigbo ike, o nwere ike ibido nyụwa ka ọkụ. Pọl onyeozi kpọdịrị enweghị okwukwe “mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị.” (Hib. 12:1) Ọ bụrụ na anyị achọghị ka okwukwe anyị nyụọ ka ọkụ, anyị kwesịrị ịna-eleba anya n’ihe ndị gosiri na ụwa ọhụrụ ga-abịa n’oge na-adịghị anya.​—Hib. 11:1.

3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

3 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ atọ anyị ga-esi eme ka okwukwe anyị nwere ná nkwa Chineke kwere na ụwa ọhụrụ ga-abịa sikwuo ike: (1) ịna-atụgharị uche n’ihe mgbapụta ahụ, (2) ịna-eche gbasara ike Jehova, na (3) ịna-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova. Anyị ga-elebakwa anya n’otú ihe Jehova gwara Habakọk si eme ka okwukwe anyị sie ike taa. Ka anyị burugodị ụzọ kwuo gbasara ihe ụfọdụ anyị nwere ike ime taa nke mere o ji dị mkpa ka okwukwe anyị sie ike na ụwa ọhụrụ ga-abịa.

IHE NDỊ MERE O JI DỊ MKPA KA ANYỊ NWEE OKWUKWE SIRI IKE

4. Olee ihe ndị anyị na-ekpebi mere o ji dị mkpa ka anyị nwee okwukwe siri ike?

4 Kwa ụbọchị, e nwere ihe ndị anyị na-ekpebi mere o ji dị mkpa ka anyị nwee okwukwe siri ike. Dị ka ihe atụ, anyị na-ekpebi ihe ndị gbasara ndị anyị na ha ga na-akpa, ihe anyị ji atụrụ ndụ, agụmakwụkwọ, alụmdi na nwunye, ụmụ, nakwa ọrụ. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ihe m kpebiri ime ọ̀ na-egosi na m kwetasiri ike na ụwa ochie a agaghị adịte aka, nakwa na n’oge na-adịghị anya, ụwa ọhụrụ Chineke ga-abịa nọchie ya? Ka ihe m na-ekpebi ọ̀ na-egosi na m na-ebi ndụ ka ndị kweere na mmadụ nwụọ, na nke ya agaala kpamkpam?’ (Mat. 6:19, 20; Luk 12:16-21) Ihe ga-eme ka anyị mee mkpebi kacha mma bụ ma ọ bụrụ na okwukwe anyị esie ezigbo ike na ụwa ọhụrụ dị nso.

5-6. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị nwee okwukwe siri ike ma nsogbu bịara anyị? Nye ihe atụ.

5 Anyị kwesịrị inwe okwukwe siri ezigbo ike iji die nsogbu ndị na-abịara anyị. E nwere ike ịna-akpagbu anyị ma ọ bụ anyị ana-arịa ọrịa na-ekweghị ala ala, ma ọ bụkwanụ anyị enwee nsogbu ndị ọzọ nwere ike ime ka anyị daa mbà. Na mbụ, o nwere ike ịdị anyị ka ànyị ga-edili nsogbu ahụ. Mana, ọ bụrụ na nsogbu ahụ anọtee aka, otú ahụ ọtụtụ nsogbu na-eme, anyị kwesịrị inwe okwukwe siri ike ka anyị nwee ike idi ya, jirikwa ọṅụ na-efe Jehova.​—Rom 12:12; 1 Pita 1:6, 7.

6 Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị, o nwere ike ịdị anyị ka ụwa ọhụrụ Jehova kwere anyị ná nkwa agaghị abịa. Ihe a ọ̀ pụtara na okwukwe anyị esighịzi ike? Mba. Dị ka ihe atụ, n’oge udu mmiri, o nwere ike ịdị anyị ka ọkọchị agaghị emecha bịa. Ma, ọkọchị na-emecha bịa. Ọ bụrụkwa na nsogbu bịaara anyị emee ka anyị daa mbà, o nwere ike ịdị anyị ka ụwa ọhụrụ agaghịzi abịa. Mana ọ bụrụ na okwukwe anyị esie ike, obi ga-esi anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa ya. (Ọma 94:3, 14, 15; Hib. 6:17-19) Obi sie anyị ike otú ahụ, anyị ga-enwe ike iwere ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa ná ndụ anyị.

7. Olee ihe anyị kwesịrị izere?

7 Ka anyị kwuo ebe ọzọ anyị kwesịrị inwe okwukwe siri ike. Ọ bụ n’ikwusa ozi ọma. Ọtụtụ ndị anyị na-ezi ozi ọma na-eche na “ozi ọma” anyị na-ekwusara ha gbasara ụwa ọhụrụ Chineke ga-abịanụ bụ akụkọ ifo. (Mat. 24:14; Ezik. 33:32) Anyị ekwesịghị ikwe ka otú a ha si eche echiche mee ka nkwa Jehova mewe anyị obi abụọ. Ihe ga-enyere anyị aka bụ ịna-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Ka anyị lee ụzọ atọ anyị ga-esi eme ya.

NA-ATỤGHARỊ UCHE N’IHE MGBAPỤTA AHỤ

8-9. Olee otú ịtụgharị uche n’ihe mgbapụta ahụ si eme ka okwukwe anyị sikwuo ike?

8 Otu ụzọ anyị ga-esi eme ka okwukwe anyị na-esi ike bụ ịtụgharị uche n’ihe mgbapụta ahụ. Ihe mgbapụta ahụ na-eme ka obi sie anyị ike na nkwa Chineke kwere ga-emezurịrị. Ọ bụrụ na anyị echee echiche nke ọma gbasara ihe mere Chineke ji nye ihe mgbapụta ahụ nakwa ihe o furu ya, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike na nkwa Chineke kwere inye anyị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ya ga-emezurịrị. Olee ihe mere anyị ji kwuo ya?

9 Olee ihe o furu Jehova iji nye anyị ihe mgbapụta ahụ? Jehova zitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, onye ya na ya kacha dịrị ná mma, ya esi n’eluigwe bịa a mụọ ya n’ụwa, ya abụrụ mmadụ zuru okè. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, e nweghị ụdị nsogbu ọ na-edighị. O mechara hụsie anya ma nwụọ ọnwụ ahụhụ. Ị̀ hụlanụ ihe o furu Jehova iji nye anyị ihe mgbapụta ahụ? Chineke anyị hụrụ anyị n’anya agaraghị ekwe ka Ọkpara ya bịa taa ahụhụ ma nwụọ ma ọ bụrụ na ihe ọma ndị anyị ga-enweta maka ya agaghị adịte aka. (Jọn 3:16; 1 Pita 1:18, 19) Ebe ọ bụ na o furu Jehova ihe dị otú a iji nye anyị ihe mgbapụta ahụ, obi siri anyị ike na ọ ga-ahụ na anyị dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ.

NA-ECHE GBASARA IKE JEHOVA

10. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 3:20, olee ihe Jehova ga-emeli?

10 Ụzọ nke abụọ anyị nwere ike isi mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike bụ ịna-eche gbasara ike Jehova. O nwere ikike imezu ihe ọ bụla o kwere anyị ná nkwa. Ọtụtụ ndị taa chere na nkwa ahụ Jehova kwere ime ka ụmụ mmadụ dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ agaghị eme eme. Ma, e nweela ọtụtụ ugboro Jehova kwere nkwa ụmụ mmadụ na-agaghị emeli n’ihi na ọ bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile. (Job 42:2; Mak 10:27) N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya ma Chineke kwe anyị nkwa tụrụ anyị n’anya.​—Gụọ Ndị Efesọs 3:20.

11. Kwuo otu n’ime nkwa ndị yiri ihe na-agaghị eme eme Jehova kwere. (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Ụfọdụ Nkwa Ndị Yiri Ihe Na-agaghị Ekwe Omume Mezurunụ.”)

11 Chegodị gbasara ihe ụfọdụ yiri ihe na-agaghị ekwe omume Chineke kwere ndị mmadụ ná nkwa n’oge gara aga. Ọ gwara Ebreham na Sera na ha ga-amụ nwa n’oge ha mere agadi. (Jen. 17:15-17) Ọ gwakwara Ebreham na ọ ga-enye ụmụ ya ala Kenan. N’oge niile ụmụ Izrel, bụ́ ụmụ Ebreham, nọ na-agba ohu n’Ijipt, ọ ga-abụrịrị na o yiri ka nkwa ahụ Chineke kwere ha agaghị eme. Ma, o mechara mee. Mgbe e mechara, Jehova gwara Elizabet na ọ ga-amụ nwa n’agbanyeghị na o meela agadi. Ọ gwakwara Meri, bụ́ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, na ọ ga-amụ Ọkpara Chineke, onye Chineke kwere ná nkwa na ọ ga-abịa. Ihe a ga-emezu nkwa Chineke kwere ọtụtụ puku afọ gara aga n’ogige Iden.​—Jen. 3:15.

12. Gịnị ka Joshụa 23:14 na Aịzaya 55:10, 11 na-eme ka obi sie anyị ike gbasara ike Jehova?

12 Otú anyị ga-esi eme ka okwukwe anyị sie ike na Jehova nwere ikike iweta ụwa ọhụrụ bụ iche banyere nkwa ndị o kwere na otú o si mezuo ha. (Gụọ Joshụa 23:14; Aịzaya 55:10, 11.) Ọ ga-eme ka anyị nwee ike inyere ndị ọzọ aka ịghọta na ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa abụghị ịmụ anya arọ nrọ. Jehova ji ọnụ ya kwuo gbasara eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, sị: “E kwesịrị ịtụkwasị okwu ndị a obi, ha bụkwa eziokwu.”​—Mkpu. 21:1, 5.

NA-EME IHE NDỊ GBASARA OFUFE JEHOVA

ỌMỤMỤ IHE ỌGBAKỌ

Olee otú ime ihe a ga-esi mee ka okwukwe gị sikwuo ike? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. Olee otú ọmụmụ ihe ọgbakọ si eme ka okwukwe anyị sikwuo ike? Kọwaa.

13 Ụzọ nke atọ anyị nwere ike isi mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike bụ ịna-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova. Dị ka ihe atụ, chegodị otú ọmụmụ ihe ọgbakọ si abara anyị uru. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Anna ejeela ụdị ozi oge niile dị iche iche ruo ọtụtụ afọ. Ọ sịrị: “Ọmụmụ ihe na-eme ka okwukwe m bụrụ a kwaa a kwụrụ. Ọ bụrụgodị na onye na-ekwu okwu amachaghị akụzi ihe nke ọma ma ọ bụkwanụ na ihe ọ na-ekwu abụghị ihe ọhụrụ, m na-anụkarị ihe ga-enyere m aka ịghọtakwu eziokwu Baịbụl. Ọ na-emekwa ka okwukwe m sie ike.” b O doro anya na obi na-adịkwa anyị niile ụtọ ma anyị na-ege ihe ndị bịara ọmụmụ ihe na-aza nke na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike.​—Rom 1:11, 12; 10:17.

OZI ỌMA

Olee otú ime ihe a ga-esi mee ka okwukwe gị sikwuo ike? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Olee otú ịga ozi ọma si eme ka okwukwe anyị sikwuo ike?

14 Otú ọzọ anyị si eme ka okwukwe anyị sikwuo ike bụ ịna-ekwusa ozi ọma. (Hib. 10:23) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Barbara efeela Jehova ihe karịrị afọ iri asaa. Ọ sịrị: “Achọpụtala m na ikwusa ozi ọma na-eme ka okwukwe m sikwuo ike mgbe niile. Ka m na-agwa ndị ọzọ gbasara nkwa ndị magburu onwe ha Jehova kwere, otú ahụ ka okwukwe m na-esikwu ike.”

ỊMỤ IHE N’ONWE ANYỊ

Olee otú ime ihe a ga-esi mee ka okwukwe gị sikwuo ike? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Olee otú ịmụ ihe n’onwe anyị si eme ka okwukwe anyị sikwuo ike? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

15 Chegodị banyere ihe ọzọ na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ọ bụ ịmụ ihe n’onwe anyị. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Susan kwuru na ọ na-abara ya uru ikpebi mgbe ọ ga-amụ ihe. Ọ sịrị: “N’ụbọchị Sọnde, m na-akwadebe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke izu na-abịa abịa. N’ụbọchị Mọnde na Tuzdee, m na-akwadebe ọmụmụ ihe etiti izu. M na-ejizi ụbọchị ndị fọrọ afọ mụọ ihe ndị m kpebiri ịmụ n’onwe m.” Otú Nwanna Nwaanyị Susan si eme ka okwukwe ya na-esikwu ike bụ ịna-amụ ihe mgbe niile. Nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Irene ejeela ozi ruo ọtụtụ afọ n’isi ụlọ ọrụ anyị. O kwuru na ihe na-eme ka okwukwe ya sikwuo ike bụ ịmụ gbasara amụma Baịbụl. Ọ sịrị: “Ọ na-atụ m n’anya na amụma ndị Jehova buru na-emezu n’enweghị otu mkpụrụ ihe fọrọ na ya.” c

“Ọ GA-EMEZURỊRỊ”

16. Gịnị mere ihe Jehova gwara Habakọk ji abara anyị uru taa? (Ndị Hibru 10:36, 37)

16 Ụfọdụ ndị ohu Jehova nọ kemgbe ọtụtụ afọ na-eche ka e bibie ụwa ochie a. N’anya mmadụ, o nwere ike iyi ka Chineke ọ̀ na-egbu oge imezu nkwa o kwere. Jehova ma na o nwere ike ịdị ndị ohu ya otú ahụ. Ọ bụ ya mere o ji mee ka obi sie onye amụma bụ́ Habakọk ike. Ọ sịrị ya: “Ọhụụ a ga-emezu n’oge a kara aka. Oge ọ ga-emezu jikwa ọsọ na-eru. Ọ gaghịkwa agha ụgha. Ọ bụrụgodị na o gbuo oge, na-atụ anya ya. N’ihi na ọ ga-emezurịrị. Ọ gaghị anọ ọdụ.” (Hab. 2:3) Chineke ò kwuru ihe a ka ọ baara naanị Habakọk uru? Ka ihe ahụ ọ gwara ya ọ̀ ga-abakwara anyị uru taa? Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo otú ihe ahụ Chineke gwara Habakọk si gbasa Ndị Kraịst na-atụ anya ụwa ọhụrụ Chineke. (Gụọ Ndị Hibru 10:36, 37.) N’eziokwu, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ bụrụgodị na o yie ka nnapụta Chineke kwere anyị ná nkwa ọ̀ na-egbu oge, “ọ ga-emezurịrị. Ọ gaghị anọ ọdụ.”

17. Olee otú otu nwanna nwaanyị si mee ihe ahụ Jehova gwara Habakọk?

17 Ọtụtụ ndị ohu Jehova emeela ihe a Jehova kwuru, nke bụ́ ‘ịna-atụ anya’ ụwa ọhụrụ. Ụfọdụ emeedịla otú ahụ ruo ọtụtụ afọ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Louise bidoro ife Jehova n’afọ 1939. O kwuru, sị: “N’oge ahụ, m chere na Amagedọn ga-abịa tupu mụ agachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ma, ọ bịaghị. Kemgbe ọtụtụ afọ, ihe baara m ezigbo uru bụ ịgụ ihe m kpọrọ ‘akụkọ gbasara ndị cheere,’ ya bụ, ihe Baịbụl kọrọ gbasara Noa, Ebreham, Josef, na ndị ọzọ cheere ruo ọtụtụ afọ tupu Jehova emezuo nkwa o kwere ha. Ịnọ na-atụsi anya ike enyerela mụ na ndị ọzọ aka ilekwasị anya n’ụwa ọhụrụ Chineke nke dị ezigbo nso ugbu a.” Ọtụtụ ndị ọzọ ferela Jehova ruo ọtụtụ afọ kwetara ihe o kwuru.

18. Olee otú iche gbasara ihe ndị Chineke kere eke si eme ka okwukwe anyị sie ike na ụwa ọhụrụ Chineke ga-abịa?

18 N’eziokwu, ụwa ọhụrụ abịabeghị. Ma, chegodị gbasara ihe ndị anyị na-ahụ ugbu a, ma kpakpando ma osisi ma anụmanụ ma ụmụ mmadụ ibe anyị. O nweghị onye ọ ga-emewe obi abụọ na ihe ndị a dị adị n’eziokwu n’agbanyeghị na e nwere mgbe ha na-adịghị. Naanị ihe mere ka ha dịrị bụ na Jehova kere ha. (Jen. 1:1, 26, 27) Chineke anyị kwere nkwa iweta ụwa ọhụrụ. Ọ ga-emezu nkwa ahụ. N’ụwa ọhụrụ ya, ahụ́ ga-agbasi ndị mmadụ ezigbo ike ruo mgbe ebighị ebi. Obi kwesịrị isi anyị ike na ụwa ọhụrụ Chineke ga-abịa n’oge Chineke kpebiri na ọ ga-abịa.​—Aịza. 65:17; Mkpu. 21:3, 4.

19. Olee otú i nwere ike isi mee ka okwukwe gị na-esikwu ike?

19 Ka ọ dị ugbu a, jiri ohere ọ bụla i nwere na-eme ka okwukwe gị sikwuo ike. Ka obi na-adị gị ụtọ mgbe niile maka ihe mgbapụta ahụ. Na-echebara ike Jehova echiche. Na-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke. Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ị ga-eso ná “ndị okwukwe ha na ndidi ha mere ka e kwe ha nkwa.”​—Hib. 6:11, 12; Rom 5:5.

ABỤ NKE 139 Hụ Onwe Gị n’Ụwa Ọhụrụ

a Ọtụtụ ndị taa ekwetaghị na ụwa ọhụrụ Baịbụl kwere ná nkwa ga-abịa. Ha chere na ọ bụ nrọ efu ma ọ bụ ihe na-agaghị eme eme. Ma, obi siri anyị ike na nkwa niile Jehova kwere anyị ga-emezurịrị. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị kwesịrị ime ka okwukwe anyị na-esikwu ike ka ọ ghara ịnyụ ka ọkụ. Olee otú anyị ga-esi na-eme ya? A ga-akọwa ya n’isiokwu a.

b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

c I nwere ike ịhụ ọtụtụ isiokwu ndị kwuru gbasara amụma Baịbụl ma ị gaa n’Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ, n’isiokwu bụ́ “Baịbụl,” n’okpuru isiokwu bụ́ “Amụma.” Dị ka ihe atụ, gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Jehova Buru n’Amụma Na-emezu.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche January 1, 2008.