ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 8
Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ikele Ndị Meere Anyị Ihe Ọma?
“Gosikwanụ na unu bụ ndị nwere ekele.”—KỌL. 3:15.
ABỤ 46 Anyị Na-ekele Gị, Jehova
IHE ISIOKWU A NA-EKWU *
1. Gịnị ka onye Sameria ahụ Jizọs gwọrọ mere iji gosi na obi dị ya ụtọ maka ihe Jizọs meere ya?
E NWERE ụmụ nwoke iri nọ n’ọnọdụ ọjọọ. Ha bụ ndị ekpenta, ha enweghịkwa olileanya na ha ga-agbake. Ma otu ụbọchị, ha nọ ebe dị anya hụ Jizọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu. Ha nụrụ na Jizọs na-agwọ ụdị ọrịa dị iche iche, obi sikwara ha ike na ọ ga-agwọ ha. N’ihi ya, ha tiri mkpu, sị: “Jizọs, Onye Ozizi, meere anyị ebere!” Jizọs gwọrọ ha niile. O doro anya na obi tọrọ ha niile ụtọ maka ihe o meere ha. Ma, ọ bụ naanị otu n’ime ha, bụ́ onye Sameria, bịara kelee Jizọs iji gosi na obi dị ya ụtọ. * Nwoke ahụ ji “oké olu” nye Chineke otuto.—Luk 17:12-19.
2-3. (a) Olee ihe nwere ike ime ka anyị ghara ikele ndị meere anyị ihe ọma? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?
2 Anyị kwesịkwara ịna-ekele ndị meere anyị ihe ọma otú ahụ onye Sameria ahụ mere. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ichefu ikele onye mere anyị ihe ọma ma ọ bụ ime ka ndị ọzọ mara na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọma ha meere anyị.
3 N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-egosi na anyị “nwere ekele.” Anyị ga-amụta ihe n’aka ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, bụ́ ndị kelere ndị meere ha ihe ọma nakwa ndị nke na-ekeleghị ndị meere ha ihe ọma. Anyị ga-atụlekwa ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi kelee ndị meere anyị ihe ọma iji gosi na obi dị anyị ụtọ.
GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ IKELE NDỊ MEERE ANYỊ IHE ỌMA?
4-5. Gịnị mere anyị ji kwesị ikele onye meere anyị ihe ọma?
4 Jehova mere ihe anyị kwesịkwara ime ma a bịa n’ikele ndị meere anyị ihe ọma. Otu ụzọ o si eme ya bụ ịgọzi ndị na-erubere ya isi. (2 Sam. 22:21; Ọma 13:6; Mat. 10:40, 41) Baịbụl gbakwara anyị ume ka anyị bụrụ “ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Efe. 5:1) N’ihi ya, ihe kacha mkpa mere anyị ji kwesị ikele ndị meere anyị ihe ọma bụ na anyị chọrọ iṅomi Jehova.
5 Ka anyị tụlee ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ikele ndị meere anyị ihe ọma. Ikele ndị meere anyị ihe ọma dị ka nri na-atọ ezigbo ụtọ. Ọ na-aka atọ anyị ụtọ ma anyị na ndị ọzọ soro rie ya. N’ihi ya, ndị mmadụ kelee anyị maka ihe anyị meere ha, obi na-atọ anyị ụtọ. Anyị keleekwa ndị ọzọ maka ihe ha meere anyị, obi na-atọ ha ụtọ. Onye anyị kelere maka ihe o meere anyị na-aghọta na mbọ ọ gbara inyere anyị aka ma ọ bụ inye anyị ihe dị anyị mkpa, baara anyị ezigbo uru. Ọ ga-emezi ka anyị na ya bụrụ ezigbo enyi.
6. Olee otú ikele ndị mmadụ maka ihe ọma ha meere anyị na mkpụrụ osisi apụl ọlaedo si yie?
6 Ikele ndị meere anyị ihe ọma bara ezigbo uru. Baịbụl kwuru, sị: “Dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo nke dị n’ime ihe e ji ọlaọcha tụọ, otú ahụ ka okwu e kwuru n’oge kwesịrị ya dị.” (Ilu 25:11) Chegodị otú mkpụrụ osisi apụl ọlaedo nke dị n’ime ihe e ji ọlaọcha tụọ ga-adị. Cheekwa otú a ga-esi eji ya akpọrọ ihe. Olee otú obi ga-adị gị ma e nye gị ụdị onyinye a? Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa ikele ndị meere anyị ihe ọma, ha ga-ejikwa ya kpọrọ ihe. Mkpụrụ osisi apụl ọlaedo nwere ike ịnọ ogologo oge. Otú ahụ ka ọ dịkwa ikele onye meere anyị ihe ọma. O nwere ike ịna-echeta ya ma jiri ya kpọrọ ihe ná ndụ ya niile.
HA KELERE NDỊ MEERE HA IHE ỌMA
7. Dị ka Abụ Ọma 27:4 si kwuo, olee otú Devid na ndị ọzọ dere abụ ha ji too Jehova si gosi na obi dị ha ụtọ maka ihe ọma o meere ha?
7 Ọtụtụ ndị fere Chineke n’oge ochie gosiri na obi dị ha ụtọ maka ihe ọma Abụ Ọma 27:4.) O ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ihe ndị o mere gosikwara na o ji ya kpọrọ ihe. O nyere ọtụtụ ihe ndị o nwere n’onyinye iji rụọ ụlọ nsọ Chineke. Ụmụ Esaf dere abụ ha ji too Jehova iji gosi na obi dị ha ụtọ maka ihe Chineke meere ha. N’otu abụ ha dere, ha kelere Chineke ma too ya maka ‘ọrụ ya ndị dị ebube.’ (Ọma 75:1) O doro anya na Devid na ụmụ Esaf chọrọ igosi Jehova na obi dị ha ụtọ maka ihe ọma ndị o meere ha. Ì nwere ike iche ụzọ ndị i nwere ike isi ṅomie ha?
e meere ha. Otu n’ime ha bụ Devid. (Gụọ8-9. Olee otú Pọl onyeozi si gosi na obi dị ya ụtọ maka ihe ndị ụmụnna ya na-eme, oleekwa uru ọ ga-abụ na ọ baara ha?
8 Pọl onyeozi ji ụmụnna ya kpọrọ ihe. Ihe ndị o kwuru banyere ha gosiri na o ji ha kpọrọ ihe. O kelere Chineke mgbe niile maka ha n’ekpere ya. O mere ka ha mata na o ji ha kpọrọ ihe n’akwụkwọ ozi ndị o degaara ha. N’amaokwu iri na ise mbụ nke Ndị Rom isi iri na isii, ọ kpọrọ aha Ndị Kraịst ibe ya iri abụọ na asaa. Pọl kwuru na Priska na Akwịla “tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ” n’ihi ya. O kwukwara na Fibi bụ “onye na-agbachitere ọtụtụ ndị,” ma yanwa. Ọ jara ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị ahụ ọ hụrụ n’anya na-arụsi ọrụ ike mma.—Rom 16:1-15.
9 Pọl ma na ụmụnna ya ezughị okè. Ma, mgbe ọ na-emechi akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, o lekwasịrị anya n’ebe ha na-eme nke ọma. Chegodị otú obi nwere ike isi tọọ ụmụnna ndị ahụ ụtọ mgbe ha na-anụ ka a na-agụpụtara ọgbakọ ha ihe ndị ahụ Pọl kwuru gbasara ha. Ọ ga-abụ na ihe a mere ka ha na Pọl dịrịkwuo ná mma. Ị̀ na-ekelekarị ụmụnna gị na ha nọ n’ọgbakọ maka ihe ọma ndị ha na-eme na ihe ndị ha na-ekwu?
10. Olee ihe anyị na-amụta n’otú Jizọs si kelee ndị na-eso ụzọ ya maka ihe ndị ha meere ya?
10 N’ozi Jizọs zigaara ụfọdụ ọgbakọ dị n’Eshia Maịnọ, o gosiri na obi dị ya ụtọ maka ọrụ ha rụrụ. Dị ka ihe atụ, ihe o ji bido ozi o zigaara ọgbakọ dị na Tayataịra bụ: “Amaara m ihe ndị ị na-eme, na ịhụnanya na okwukwe na ije ozi na ntachi obi gị, amakwaara m na ihe ndị ị na-eme n’oge na-adịbeghị anya karịrị ndị i mere n’oge gara aga.” (Mkpu. 2:19) Ihe Jizọs jara ha mma maka ya abụghị naanị maka ọrụ ha rụsiri ike, kama ọ jakwara ha mma maka àgwà ọma ha, bụ́ ndị mere ka ha rụọ ọrụ ọma ndị ahụ. N’agbanyeghị na Jizọs ga-agwa ụfọdụ n’ime ha ebe ha ga-emezi ihe, ọ gbara ha ume mgbe ọ na-ebido ozi ahụ, gbaakwa ha ume mgbe ọ na-emechi. (Mkpu. 2:25-28) Chegodị ụdị ikike Jizọs nwere ebe ọ bụ ya bụ onyeisi nke ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ bụghị iwu na ọ ga-ekele anyị maka ihe ndị anyị na-emere ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-ekele anyị. Ndị okenye kwesịkwara iṅomi ya.
HA EGOSIGHỊ NA OBI DỊ HA ỤTỌ MAKA IHE E MEERE HA
11. Olee otú Ndị Hibru 12:16 si gosi otú Isọ si were ihe ndị dị nsọ?
11 Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl egosighị na obi dị ha ụtọ maka ihe ọma e meere ha. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị na ndị mụrụ Isọ hụrụ Jehova n’anya ma na-akwanyere Jehova ùgwù, Isọ ejighị ihe ndị dị nsọ kpọrọ ihe. (Gụọ Ndị Hibru 12:16.) Olee otú o si mee ya? Isọ echeghị echiche resị nwanne ya Jekọb ihe ruuru ya ka ọkpara n’ihi naanị otu efere ofe. (Jen. 25:30-34) Ihe a o mere mechara gbawaa ya obi. Ma, ebe ọ bụ na o jighị ọkpara ọ bụ kpọrọ ihe, o kwesịghị iwewe iwe n’ihi na o nwetaghị ngọzi ọkpara kwesịrị inweta.
12-13. Olee otú ndị Izrel si gosi na obi adịghị ha ụtọ maka ihe ọma e meere ha? Olee nsogbu ọ kpataara ha?
12 E nwere ọtụtụ ihe mere obi kwesịrị iji dị ndị Izrel ụtọ. Jehova napụtara ha n’ohu ha na-agba n’Ijipt mgbe o tiri ndị Ijipt Ihe Otiti Iri. Chineke bibiri ndị agha Ijipt niile n’Oké Osimiri Uhie, si otú ahụ napụta ha n’aka ndị agha Ijipt. Ndị Izrel bụrụ abụ ha ji too Jehova iji gosi na obi dị ha ezigbo ụtọ maka ihe o meere ha. Ma, hà nọgidere na-egosi na obi dị ha ụtọ maka ihe a Jehova meere ha?
13 Mgbe nsogbu ọzọ bịaara ndị Izrel, ọ dịghị anya, ha echefuo ihe ọma niile Jehova meere ha. Ihe a ha mere gosiri na obi adịghị ha ụtọ maka ihe ndị ahụ. (Ọma 106:7) Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Baịbụl kwuru na ‘nzukọ ụmụ Izrel dum malitere ịtamu ntamu megide Mozis na Erọn.’ Ihe a ha mere bụ ịtamu ntamu megide Jehova. (Ọpụ. 16:2, 8) Obi adịghị Jehova mma maka na ndị Izrel egosighị na obi dị ha ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere ha. O mechara kwuo na ọgbọ ahụ niile ga-anwụ n’ala ịkpa, e wezụga Jọshụa na Keleb. (Ọnụ Ọgụ. 14:22-24; 26:65) Ka anyị tụlee otú anyị ga-esi ghara iṅomi ndị ahụ na-egosighị na obi dị ha ụtọ maka ihe e meere ha nakwa otú anyị ga-esi eṅomi ndị nke gosiri na obi dị ha ụtọ.
OTÚ ANYỊ GA-ESI EGOSI NA OBI DỊ ANYỊ ỤTỌ TAA
14-15. (a) Olee otú di na nwunye ga-esi gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya? (b) Olee otú ndị nne na nna ga-esi akụziri ụmụ ha ikele ndị meere ha ihe?
14 N’ezinụlọ. Obi na-atọ onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ụtọ ma onye nke ọ bụla na-ekele onye meere ya ihe ọma. Di na nwunye na-adịkwu ná mma ma ha na-ekele ibe ha maka ihe ha meere ibe ha. Ọ na-emekwa ka ọ na-adịkwuru ha mfe ịgbaghara ibe ha. Ihe di hụrụ nwunye ya n’anya na-eme abụghị naanị ịhụ ihe ọma nwunye ya na-eme nakwa okwu ọma ọ na-ekwu, kama ọ “na-ebili, na-ajakwa ya mma.” (Ilu 31:10, 28) Nwaanyị maara ihe na-agwakwa di ya ihe ndị ọ na-eme na-atọ ya ụtọ.
15 Ndị nne na nna, olee otú unu ga-esi akụziri ụmụ unu ka ha na-ekele ndị meere ha ihe ọma? Cheta na ụmụ unu ga na-eme ihe otú unu si eme, na-ekwukwa okwu otú unu si ekwu. N’ihi ya, otú ụmụ unu ga-esi amụta ikele ndị meere ha ihe ọma bụ ma unu na-ekele ha ma ha meere unu ihe. Ihe ọzọ unu ga-eme bụ ịkụziri ha ka ha na-ekele ndị meere ha ihe ọma. Nyere ụmụ unu
aka ịghọta na ha kwesịrị isi n’obi ha na-ekele ndị meere ha ihe ọma nakwa na okwu ọma ha gwara ndị ọzọ ga-abara ndị ahụ uru. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ aha ya bụ Clary kwuru na mgbe mama ya dị afọ iri atọ na abụọ, a tụrụ papa ya mkpọrọ, nke mere ka ọ bụrụ naanị mama ya na-azụ ya na ụmụnne ya nwoke abụọ. O kwukwara, sị: “Mgbe m dị afọ iri atọ na abụọ, m bịara na-eche otú ihe si dịrị mama m mgbe ahụ ọ dị afọ iri atọ na abụọ. N’ihi ya, m gwara ya na obi dị m ụtọ maka otú o si gbaa mbọ zụọ mụ na ụmụnne m ndị nwoke. N’oge na-adịbeghị anya, ọ gwara m na okwu ndị ahụ m gwara ya ka baara ya uru, nakwa na ya anaghị echefu ha echefu n’ihi na ha na-eme ka obi na-atọ ya ụtọ.”16. Nye ihe atụ nke otú ikele ndị meere anyị ihe ọma nwere ike isi gbaa ha ume.
16 N’ọgbakọ. Anyị kelee ụmụnna meere anyị ihe ọma, ọ ga-agba ha ume. Dị ka ihe atụ, otu okenye dị afọ iri abụọ na asatọ aha ya bụ Jorge dara ezigbo ọrịa. O nwelighị ike ịga ọmụmụ ihe ruo otu ọnwa. Mgbe ọ gawara ọmụmụ ihe, ọ naghị enweli ike ime ihe omume. O kwuru, sị: “Ọ na-adị m ka e nweghi ihe m dị mma ya n’ihi ọrịa m na-arịa nakwa n’ihi na enweghịzi m ike ịrụ ọrụ ndị m na-arụ n’ọgbakọ. Mgbe a gbasara ọmụmụ ihe otu ụbọchị, otu nwanna gwara m, sị: ‘M chọrọ ikele gị maka ihe mụ na ezinụlọ m mụtara n’aka gị. Okwu ndị i kwuru n’afọ ole na ole gara aga baara anyị ezigbo uru. O meela ka okwukwe anyị sikwuo ezigbo ike.’ Ihe ahụ o kwuru metụrụ m n’obi nke na m bewere ákwá. Okwu ahụ ọ gwara m baara m ezigbo uru n’ihi na ọ bụ ihe m chọrọ ịnụ mgbe ahụ.”
17. Dị ka Ndị Kọlọsi 3:15 si kwuo, olee otú anyị ga-esi ekele Jehova maka ihe ọma ndị ọ na-emere anyị?
17 N’ebe Chineke anyị na-emesapụ aka nọ. Jehova akụzierela anyị ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, a na-akụziri anyị ọtụtụ ihe ndị na-abara anyị uru n’ọmụmụ ihe anyị, n’Ụlọ Nche na Teta!, nakwa n’ebe ndị anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. È nwetụla mgbe ị nụrụ okwu e kwuru n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ ná mgbakọ, gụọ otu isiokwu n’akwụkwọ anyị ma ọ bụ lee Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova ma kwuo, sị, ‘Ihe a bụ nnọọ ihe m chọrọ’? Olee otú anyị ga-esi na-ekele Jehova maka ihe ndị a? (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:15.) Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ ịna-ekele ya mgbe niile n’ekpere maka ihe ọma ndị ahụ o nyere anyị.—Jems 1:17.
18. Olee ụzọ ndị anyị ga-esi na-ekele Jehova maka Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị?
18 Ụzọ ọzọ anyị ga-esi na-ekele Jehova bụ ịna-edebe ebe anyị na-anọ efe ya ọcha. Anyị na-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ọcha mgbe niile, na-emezikwa ihe ndị mebiri emebi na ya. Ndị na-ahụ maka ígwè okwu na vidio na-akpachapụ anya ka ha ghara imebi ya. Anyị na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị nke ọma, ọ ga-anọ ogologo oge, a ga na-emezikwa ihe ole na ole na ya. Ihe a ga-eme ka anyị nwetakwuo ego anyị ga-eji na-arụkwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ụwa niile, na-arụzigharịkwa ha.
19. Olee ihe ị mụtara n’akụkọ otu onye nlekọta sekit na nwunye ya a kọrọ akụkọ ha ebe a?
19 N’ebe ndị na-arụsi ọrụ ike maka anyị nọ. Ọ bụrụ na anyị ekelee mmadụ maka ihe o mere, o nwere ike ime ka ọ gbanwee otú o si ele nsogbu ya na ya na-alụ anya. Ka anyị tụlee gbasara otu onye nlekọta sekit na nwunye ya. Mgbe ha gachara ozi ọma otu ụbọchị ezigbo oyi na-atụ lọta, ike gwụchara ha. Ụdị oyi tụrụ ụbọchị ahụ mere ka nwunye ya yiri uwe oyi ya hie ụra. N’ụtụtụ, ọ gwara di ya na ya chọrọ ka ha kwụsị ozi ha. N’oge na-adịghị anya n’ụtụtụ ahụ, ha nwetara akwụkwọ ozi alaka ụlọ ọrụ detaara nwunye ya. Ha ji akwụkwọ ozi ahụ jaa ya mma maka ozi ọ na-eje nakwa otú o si na-enwe ndidi. Ha gwara ya na ha ma na ọ naghị adị mfe ịna-akwa ngwongwo kwa izu. Di ya kwuru, sị: “Akwụkwọ ozi ahụ metụrụ ya nnọọ n’obi nke na ọ naghị ekwute okwu ka anyị hapụ ozi anyị. Ọ gbaala m ume ọtụtụ ugboro m chọrọ ịkwụsị.” Onye nlekọta ahụ na nwunye ya nọrọ n’ozi ha ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri anọ.
20. Olee ihe anyị kwesịrị ịgba mbọ na-eme kwa ụbọchị, n’ihi gịnịkwa?
20 Ka anyị si n’ihe anyị na-eme nakwa n’ihe anyị na-ekwu na-ekele ndị meere anyị ihe. Ihe anyị si n’obi anyị kwuo ma ọ bụ mee nwere ike inyere mmadụ aka idi nsogbu o nwere n’ụwa a ọtụtụ ndi na-anaghị ekele ndị meere ha ihe. Anyị si n’obi anyị na-ekele ndị meere anyị ihe, ọ ga-eme ka anyị na ha bụrụ ezigbo enyi nke nwere ike ịdịru ebighị ebi. Nke kacha mkpa bụ na ọ na-egosi na anyị na-eṅomi Nna anyị Jehova, bụ́ onye na-emesapụ aka ma na-ekele ndị meere ya ihe.
ABỤ 20 I Nyere Anyị Ọkpara Ị Hụrụ n’Anya
^ para. 5 Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jehova, Jizọs, nakwa onye Sameria ahụ bụ́ onye ekpenta banyere ikele ndị meere anyị ihe ọma? Anyị ga-atụle gbasara ha nakwa ndị ọzọ n’isiokwu a. Anyị ga-atụlekwa ihe mere o ji dị ezigbo mkpa ikele ndị meere anyị ihe ọma nakwa otú anyị nwere ike isi eme ya.
^ para. 1 NKỌWAKWU: Ikele mmadụ maka ihe o meere anyị pụtara iji onye ahụ na ihe o meere anyị kpọrọ ihe. O nwekwara ike ịpụta inwe obi ụtọ maka ihe e meere anyị.
^ para. 55 NKỌWA FOTO: Ebe a na-agụrụ ọgbakọ dị na Rom akwụkwọ ozi Pọl detaara ha, obi ana-atọ Akwịla, Prisila, Fibi na ndị ọzọ ụtọ mgbe a kpọrọ aha ha.
^ para. 57 NKỌWA FOTO: Ebe otu nne na-enyere nwa ya aka igosi na obi dị ya ụtọ maka ihe otu nwanna nwaanyị merela agadi mere.