Ị̀ Maara?
Olee mgbe a malitere inwe ụlọ nzukọ?
IHE okwu Grik a sụgharịrị “ụlọ nzụkọ” pụtara bụ “nzukọ” ma ọ bụ “izukọta ọnụ.” Aha a dabara adaba n’ihi na ụlọ nzukọ bụ ebe a na-anọ enye ndị mmadụ ndụmọdụ nakwa ebe a na-anọ efe Chineke kemgbe n’obodo ndị Juu oge ochie. E nweghị ebe a kpọrọ ụlọ nzukọ aha kpọmkwem n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ma ihe Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst kwuru mere ka o doo anya na ụlọ nzukọ adịrịla tupu oge ndịozi.
Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwuru na a malitere inwe ụlọ nzukọ mgbe a dọọrọ ndị Juu n’agha laa Babịlọn. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Judaica kwuru, si: “Ebe ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha laa Babịlọn enweghị Ụlọ Nsọ n’obodo ahụ, ha na-ezukọta si n’oge ruo n’oge ka ha gụọ Akwụkwọ Nsọ iji nweta nkasi obi n’ihi ọnọdụ ọjọọ ha nọ na ya. Ọ ga-abụ n’Ụbọchị Izu Ike ka ha na-ezukọkarị.” Mgbe ha nweere onwe ha, o yiri ka ndị Juu hà nọgidekwara na-ezukọ maka ikpe ekpere nakwa ịgụ Okwu Chineke. Ha rụkwara ụlọ nzukọ n’ebe ọ bụla ha bi.
Ka ọ na-erula n’oge ndịozi, ụlọ nzukọ bụzi ebe ndị Juu na-anọ eme ihe ndị gbasara okpukpe ha na ihe ndị ọzọ ha na-eme n’obodo ha ndị dị n’akụkụ Osimiri Mediterenian, nakwa ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu. Otu Prọfesọ aha ya bụ Lee Levine nke The Hebrew University of Jerusalem kwuru, si: “Ụlọ nzukọ ghọrọ ebe a na-anọ amụ ihe, eri nri n’ụbọchị izu ike nakwa n’oge ememme, ekpe ikpe, edowe ego ndị obodo, enwe nnọkọ ndị gbasara ọchịchị na ihe ndị ọzọ a na-eme n’obodo.” O kwukwara, si: “Ihe kacha mkpa ha na-anọ na ya eme bụ ihe ndị gbasara ofufe.” Ị̀ hụlanụ ihe mere Jizọs ji agakarị n’ụlọ nzukọ? (Mak 1:21; 6:2; Luk 4:16) Ọ na-anọ ebe ahụ ezi ndị mmadụ ihe, enye ndụmọdụ ma na-agba ha ume. Mgbe e hiwechara ọgbakọ Ndị Kraịst, Pọl onyeozi zikwara ndị mmadụ ozi ọma ọtụtụ ugboro n’ụlọ nzukọ. Ndị nwere mmasị ife Chineke na-aga n’ụlọ nzukọ. N’ihi ya, Pọl banyewe n’obodo izi ozi oma, ọ na-ebukarị ụzọ aga n’ụlọ nzukọ ka o zie ndị nọ ebe ahụ ozi ọma.—Ọrụ 17:1, 2; 18:4.