Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 1

“Elegharịla Anya n’Ụjọ, n’Ihi na Abụ M Chineke Gị.”

“Elegharịla Anya n’Ụjọ, n’Ihi na Abụ M Chineke Gị.”

“Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka.”​—AỊZA. 41:10.

ABỤ 7 Jehova Bụ Ike Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Olee uru Aịzaya 41:10 baara otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Yoshiko? (b) Ole ndị ka okwu ahụ Jehova mere ka e dee n’Aịzaya 41:10 baara uru?

A GWARA otu nwanna nwaanyị kwesịrị ntụkwasị obi aha ya bụ Yoshiko ihe na-emenye ụjọ. Dọkịta ya gwara ya na ọ ga-anwụ n’ime ọnwa ole na ole. Olee ihe o mere? Yoshiko chetara amaokwu Baịbụl na-amasịkarị ya, ya bụ, Aịzaya 41:10. (Gụọ ya.) O ji nwayọọ gwa dọkịta ya na ụjọ anaghị atụ ya, n’ihi na Jehova jidesiri ya ike. * Ihe e kwuru n’amaokwu Baịbụl ahụ, bụ́ nke na-akasi anyị obi, nyeere nwanna anyị nwaanyị aka ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam. Amaokwu Baịbụl ahụ ga-eme ka anyị ghara ịtụ ụjọ mgbe anyị na nsogbu ndị bịaara anyị na-alụ. Ka anyị nwee ike ịghọta otú ọ ga-esi nyere anyị aka, anyị ga-eburugodị ụzọ tụlee ihe mere Jehova ji gwa Aịzaya okwu ahụ.

2 Jehova bu ụzọ mee ka Aịzaya dee okwu ndị ahụ iji kasie ndị Juu obi, bụ́ ndị a ga-emecha dọrọ n’agha laa Babịlọn. Ma, Jehova mere ka e chebe okwu ndị ahụ ka ha baara ma ndị Juu a dọọrọ n’agha ma ndị ohu ya niile dịrịla ndụ kemgbe ahụ ruo ugbu a uru. (Aịza. 40:8; Rom 15:4) Taa, anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, nke tara akpụ,’ n’ihi ya, okwu ndị na-agba ume dị n’akwụkwọ Aịzaya dị anyị mkpa.​—2 Tim. 3:1.

3. (a) Olee nkwa ndị Jehova kwere anyị n’Aịzaya 41:​10, bụ́ isiokwu afọ 2019? (b) Olee ihe mere nkwa ndị ahụ ji dị anyị mkpa?

3 N’Isiokwu a, anyị ga-elekwasị anya ná nkwa atọ Jehova kwere anyị, bụ́ ndị ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. E dere ha n’Aịzaya 41:10. Ha bụ: (1) Jehova ga-anọnyere anyị, (2) ọ bụ Chineke anyị, na (3) ọ ga-enyere anyị aka. Nkwa * ndị a dị anyị mkpa n’ihi na nsogbu na-abịara anyị otú ahụ ọ bịaara Nwanna Nwaanyị Yoshiko. Anyị nwekwara nsogbu ndị anyị na ha na-alụ n’ihi otú imi na anya dị ụwa ugbu a. Ụfọdụ n’ime anyị na-edidị ọnụ ndị ọchịchị na-emekpọ ha. Ka anyị tụlee nkwa atọ ahụ otu otu.

“M NỌNYEERE GỊ”

4. (a) Olee nkwa mbụ anyị ga-atụle? (Gụọkwa ihe e dere n’ala ala peeji.) (b) Olee otú Jehova si gosi otú obi dị ya banyere anyị? (ch) Olee otú obi dị gị banyere ihe Jehova kwuru?

4 Jehova bu ụzọ jiri okwu ndị a kasie anyị obi. Ọ sịrị: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.” * Jehova na-egosi na ya nọnyeere anyị. Otú o si mee ya bụ ige anyị ntị nke ọma na ịhụ anyị n’anya. Lee ihe o kwuru iji gosi na ya hụrụ anyị n’anya. Ọ sịrị: “Ị dị oké ọnụ ahịa n’anya m, a gụọla gị n’onye kwesịrị nsọpụrụ, hụkwara gị n’anya.” (Aịza. 43:4) O nweghị ihe ọ bụla nọ n’eluigwe na n’ụwa a ga-eme ka Jehova kwụsị ịhụ anyị n’anya. Ọ gaghị akwụsị ịnọnyere anyị. (Aịza. 54:10) Otú o si hụ anyị n’anya n’ihi na anyị na ya bụ enyi, na-eme ka obi na-esi anyị ike. Ọ ga na-echebe anyị taa, otú ahụ o chebere Ebram ma ọ bụ Ebreham enyi ya. Jehova gwara ya, sị: “Atụla egwu, Ebram. Abụụrụ m gị ọta.”​—Jen. 15:1.

Jehova ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị yiri mmiri na ọnwụnwa ndị yiri ire ọkụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 6) *

5-6. (a) Olee otú anyị si mara na Jehova chọrọ inyere anyị aka mgbe ọnwụnwa bịaara anyị? (b) Olee ihe anyị mụtara n’aka Nwanna Nwaanyị Yoshiko?

5 Anyị ma na Jehova nwere mmasị n’inyere anyị aka ná nsogbu ndị anyị na ha na-alụ n’ihi na o kwere ndị ya nkwa, sị: “Ọ bụrụ na ị gafee mmiri, m ga-anọnyere gị; ọ bụrụ na ị gafee osimiri, ọ gaghị eri gị. Ọ bụrụ na ị gafee ọkụ, ọ gaghị ahụ gị, ire ọkụ agaghị ere gị.” (Aịza. 43:2) Olee ihe okwu ndị a pụtara?

6 Jehova anaghị ekwe anyị nkwa na ya ga-ewepụ ihe ndị na-eme ka ndụ na-esiri anyị ike, ma ọ gaghị ekwe ka nsogbu ndị yiri “mmiri” rikpuo anyị ma ọ bụ kwe ka ọnwụnwa ndị yiri “ire ọkụ” dịgide. O mesiri anyị obi ike na ya ga-anọnyere anyị, ma na-enyere anyị aka imeri ọnwụnwa ndị ahụ. Olee ihe Jehova ga-eme? Ọ ga-eme ka anyị kwụsị ịtụ ụjọ, ka anyị nwee ike ịnọgide na-efe ya, ọ bụrụgodị na anyị anọrọ n’ọnụ ọnwụ. (Aịza. 41:13) Nwanna Nwaanyị Yoshiko, anyị kwuru banyere ya ná mmalite isiokwu a chọpụtara na nke a bụ eziokwu. Nwa ya nwaanyị kwuru, sị: “Obi tọrọ anyị ụtọ n’ihi otú Mama anyị si kata obi. Anyị chọpụtara n’eziokwu na Jehova mere ka obi ruo ya ala. Ruokwa ụbọchị ahụ ọ nwụrụ, ọ nọgidere na-akọrọ ma ndị nọọsụ ma ndị ọrịa banyere Jehova na nkwa ndị o kwere anyị.” Olee ihe anyị mụtara n’aka nwanna nwaanyị a? Ọ bụrụ na anyị atụkwasị nkwa a Chineke kwere anyị obi, ya bụ, “m ga-anọnyere gị,” obi ga-esikwa anyịnwa ezigbo ike ka anyị na-edi ọnwụnwa ndị bịaara anyị.

“ABỤ M CHINEKE GỊ”

7-8. (a) Olee nkwa nke abụọ anyị ga-atụle, oleekwa ihe ọ pụtara? (b) Gịnị mere Jehova ji gwa ndị Juu a dọọro n’agha, sị: “Elegharịla anya n’ụjọ.”? (ch) Olee okwu ndị dị n’Aịzaya 46:​3, 4, bụ́ ndị ọ ga-abụ na ha mere ka obi ruo ndị Chineke ala?

7 Lee nkwa nke abụọ Chineke mere ka Aịzaya dee. O kwuru, sị: “Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị.” Gịnị ka ụjọ e kwuru banyere ya ebe a pụtara? N’amaokwu a, okwu a sụgharịrị ‘ilegharị anya n’ụjọ’ pụtara “mmadụ ile anya n’azụ ugboro ugboro n’ihi na ụjọ na-atụ ya na e nwere ihe ma ọ bụ mmadụ nwere ike imerụ ya ahụ́,” ma ọ bụ “ilegharị anya otú ahụ mmadụ si elegharị anya ma ọ nọrọ n’ọnọdụ ọjọọ.”

8 Gịnị mere Jehova ji gwa ndị Juu a ga-emecha dọrọ n’agha gaa Babịlọn ka ha ghara ‘ilegharị anya n’ụjọ’? Ọ bụ n’ihi na ọ ma na ụjọ ga-ejide ndị Babịlọn. Olee ihe ga-eme ka egwu jide ha? Ihe kpatara ya bụ na mgbe ọ ga-afọ obere ka ndị Juu a dọọrọ n’agha nọzuo afọ iri asaa na Babịlọn, ndị agha Midia na Peshia bụ́ azụ eru ala ga-alụso ndị Babịlọn ọgụ. Jehova ga-eji ndị agha a napụta ndị ya n’aka ndị Babịlọn dọọrọ ha n’agha. (Aịza. 41:​2-4) Mgbe ndị Babịlọn na mba ndị ọzọ dịrị ndụ n’oge ahụ matara na ndị iro ha na-abịa, ha gbara mbọ kata obi ma gwa ibe ha, sị: “Dị ike.” Ha mekwara ọtụtụ arụsị, ma na-atụ anya na arụsị ndị ahụ ga-echebe ha. (Aịza. 41:​5-7) Ma, Jehova mere ka obi ruo ndị Juu a dọọrọ n’agha ala. Ọ gwara ha, sị: “Ma gị onwe gị, Izrel, [unu adịghị ka ndị agbata obi unu] bụ ohu m. . . Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị.” (Aịza. 41:​8-10) Ị̀ hụrụ na Jehova kwuru, sị: Abụ m Chineke gị”? Jehova ji okwu ndị a na-eme ka obi sie ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi ike na ya ahapụbeghị ha, na ya ka bụ Chineke ha, nakwa na ha ka bụ ndị ya. Ọ gwara ha, sị: ‘M ga na-eku unu, meekwara unu ụzọ mgbapụ.’ O doro anya na okwu ndị a Jehova ji kasie ndị Juu a dọọrọ n’agha obi mere ka okwukwe ha sikwuo ike.​—Gụọ Aịzaya 46:​3, 4.

9-10. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ? Kọwaa.

9 Taa, ụjọ na-atụ ndị mmadụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ, n’ihi otú ihe si na-akakwu njọ. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ndị ahụ na-emetụtakwa anyị. Ma, anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ. Jehova gwara anyị, sị: “Abụ m Chineke gị.” Gịnị mere ihe a Jehova kwuru ji kwesị ime ka anyị ghara ịtụ ụjọ?

10 Tụlee ihe atụ a. Ndị njem abụọ aha ha bụ Jim na Ben nọ n’ụgbọelu oké ifufe nọ na-enye nsogbu. Ka ifufe ahụ na-ebugharị ụgbọelu ahụ, onye na-akwọ ụgbọelu ahụ ekwuo, sị: “Kechisienụ belt unu ike. Oké ifufe ga na-enye ụgbọelu anyị nsogbu ruo oge ụfọdụ.” Ihe a o kwuru mere ka obi wụnye Jim n’afọ. Ma ọkwọ ụgbọelu ahụ kwukwara, sị: “Ọ bụ m na-ekwu. O nweghị ihe ga-emenụ, n’ihi ya, unu atụla ụjọ.” Mgbe o kwuru ihe a, Jim efufee isi ya ma kwuo, sị: “Ọ̀ makwa ihe ọ na-ekwu?” Ma, ọ chọpụtara na o nweghị ụjọ na-atụ Ben. Jim ajụọ ya, sị: “Gịnị mere obi ji sie gị ike?” Ben amụmụọ ọnụ ọchị ma gwa ya, sị: “Ọ bụ n’ihi na m ma ọkwọ ụgbọelu a nke ọma. Ọ bụ papa m.” Ben agwazie ya, sị: “Ka m kọọrọ gị banyere papa m. O doro m anya na ị mata onye ọ bụ na otú o si akwọ ụgbọelu nke ọma, obi ga-esikwa gị ike.”

11. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ gbasara ndị njem abụọ ahụ nọ n’ụgbọelu?

11 Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ a? Ihe mere anyị anaghị atụ ụjọ bụ n’ihi na anyị ma Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova nke ọma, otú ahụ Ben si mara nna ya. Anyị ma na ọ ga-enyere anyị aka idi nsogbu anyị n’oge ikpeazụ a, ma ndị nke tadịrị akpụ. (Aịza. 35:4) Anyị tụkwasịrị Jehova obi anyị niile, n’ihi ya, anyị anaghị atụ ụjọ n’agbanyeghị na ezigbo ụjọ ji ndị ụwa. (Aịza. 30:15) Anyị na-eme ka Ben mgbe anyị na-akọrọ ndị agbata obi anyị ihe mere anyị ji tụkwasị Chineke obi. Ọ ga-eme ka obi siekwa hanwa ike na n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara ha, Jehova ga-enyere ha aka.

‘M GA-EME KA Ị DỊ IKE, M GA-ENYEKWARA GỊ AKA’

12. (a) Olee nkwa nke atọ anyị ga-atụle? (b) Olee ihe “ogwe aka” Jehova e kwuru banyere ya na-echetara anyị?

12 Chegodị banyere nkwa nke atọ Aịzaya kwuru banyere ya. O kwuru, sị: “M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka.” Aịzaya bu ụzọ kwuo otú Jehova ga-esi eme ka ndị ya dị ike. Ọ sịrị: “Jehova ga-abịa dị ka onye dị ike. Ogwe aka ya ka ọ ga-eji na-achị.” (Aịza. 40:10) Baịbụl na-ejikarị okwu bụ́ “ogwe aka” akọwa ike. N’ihi ya, mgbe Baịbụl kwuru na Jehova ga-eji ‘ogwe aka ya na-achị,’ ihe ọ pụtara bụ na Jehova bụ Eze dị ike. O ji ike ya na-enweghị atụ nyere ndị ya aka n’oge gara aga, ọ ka na-ejikwa ya na-echebe ma na-eme ka ndị tụkwasịrị ya obi dị ike taa.​—Diut. 1:​30, 31; Aịza. 43:10.

E nweghị ngwá agha ga-emerili ogwe aka dị ike nke Jehova, nke o ji na-echebe anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 ruo na nke 16) *

13. (a) Olee mgbe Jehova kacha emezu nkwa o kwere anyị, ya bụ, ime ka anyị dị ike? (b) Olee nkwa Chineke kwere anyị, nke mere anyị ji dị ike, obi esiekwa anyị ike?

13 Mgbe Jehova kacha emezu nkwa a, ya bụ, “M ga-eme ka ị dị ike,” bụ mgbe ndị iro anyị na-emegide anyị. N’ebe ụfọdụ n’ụwa taa, ndị iro anyị na-agbasi mbọ ike ka ha kwụsị anyị ikwusa ozi ọma ma ọ bụ machibido anyị iwu. N’agbanyeghị ya, ụjọ anaghị atụ anyị n’ihi ihe ndị ahụ ha na-eme anyị. Jehova gwara anyị ihe mere ka anyị dị ike, obi esiekwa anyị ike. O kwuru, sị: “Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma.” (Aịza. 54:17) E nwere ihe atọ dị mkpa ihe a Jehova kwuru na-echetara anyị.

14. Gịnị mere o jughi anyị anya na ndị iro Chineke na-alụso anyị ọgụ?

14 Nke mbụ bụ na, ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị na-atụ anya na ndị mmadụ ga-akpọ anyị asị. (Mat. 10:22) Jizọs kwuru na a ga-akpagbu ndị na-eso ụzọ ya mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ n’oge ikpeazụ a. (Mat. 24:9; Jọn 15:20) Ihe nke abụọ bụ na Aịzaya gwara anyị na ọ bụghị naanị asị ka ndị iro anyị ga-akpọ anyị. Ha ga-eji ngwá agha dị iche iche alụso anyị ọgụ. Ihe ndị ahụ bụ ime ka ụgha ha na-agha yie eziokwu, ikwu ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere anyị, nakwa imekpọ anyị ọnụ. (Mat. 5:11) Jehova agaghị eme ka ndị iro anyị kwụsị iji ngwá agha ndị a alụso anyị ọgụ. (Efe. 6:12; Mkpu. 12:17) Ma anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ. Maka gịnị?

15-16. (a) Olee ihe nke atọ anyị kwesịrị icheta, oleekwa otú Aịzaya 25:​4, 5 si kwado ya? (b) Olee ihe Aịzaya 41:​11, 12 kwuru ga-emecha mee ndị na-alụso anyị ọgụ?

15 Chegodị ihe nke atọ anyị kwesịrị icheta. Jehova kwuru na “ngwá ọgụ ọ bụla” e ji alụso anyị ọgụ agaghị aga nke ọma.” Otú ahụ mgbidi si echebe anyị ma e nwee oké mmiri ozuzo, ka Jehova si echebe anyị n’aka “ndị aka ike.” (Gụọ Aịzaya 25:​4, 5.) O nweghị nsogbu ndị iro anyị na-enye anyị ga-adịgide.​—Aịza. 65:17.

16 Ụzọ ọzọ Jehova sirila mee ka anyị dị ike bụ na ọ gwara anyị hoo haa ihe ga-eme ‘ndị niile na-eweso anyị iwe.’ (Gụọ Aịzaya 41:​11, 12.) N’agbanyeghị otú ndị iro anyị nwere ike isi na-alụso anyị ọgụ ma ọ bụ otú ọgụ ha na-alụso anyị nwere ike isi na-akpụ ọkụ n’ọnụ, ihe ga-emecha mee, ga-eme. Ndị iro Chineke niile “ga-adị ka ihe efu, ha ga-alakwa n’iyi.”

OTÚ ANYỊ SI ATỤKWASỊKWU JEHOVA OBI

Ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị banyere Jehova ga-eme ka anyị tụkwasịkwuo ya obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17 na nke 18) *

17-18. (a) Olee otú ịgụ Baịbụl ga-esi mee ka anyị tụkwasịkwuo Chineke obi? Nye ihe atụ. (b) Olee otú ichebara isiokwu nke afọ 2019 echiche ga-esi nyere anyị aka?

17 Otú anyị si atụkwasịkwu Jehova obi bụ ịmata ya nke ọma. Ma naanị otú anyị nwere ike isi mata Chineke nke ọma bụ iji nwayọọ na-agụ Baịbụl ma na-echebara ihe ndị anyị gụrụ echiche. Baịbụl kọọrọ anyị otú Jehova si chebe ndị ya n’oge ndị gara aga. Akụkọ ahụ na-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-elekọta anyị ugbu a.

18 Tụlee ezigbo ihe atụ Aịzaya mere o ji kọwaa otú Jehova si echebe anyị. Ọ kpọrọ Jehova onye ọzụzụ atụrụ, kpọkwanụ ndị ohu ya ụmụ atụrụ ya. Aịzaya kwuru banyere Jehova, sị: “Ọ ga-eji ogwe aka ya chịkọta ụmụ atụrụ ya; ọ ga-ekuru ha n’obi ya.” (Aịza. 40:11) Mgbe anyị gụrụ na Jehova ji ogwe aka ya dị ike kuru anyị, ọ̀ bụ na ọ naghị adị anyị ka Jehova na-echebe anyị, obi eruokwa anyị ala? Iji mee ka obi na-eru anyị ala n’agbanyeghị nsogbu ndị anyị na ha na-alụ, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche ahọrọla Aịzaya 41:10 ka ọ bụrụ isiokwu afọ 2019. Isiokwu ahụ bụ: “Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị.” Na-echebara okwu ndị a echiche, n’ihi na ha na-eme ka obi sie anyị ike. Ha ga-emekwa ka ị dị ike ka i nwee ike imeri nsogbu ndị ị ga-enwe n’ọdịnihu.

ABỤ 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

^ par. 5 Isiokwu afọ 2019 gwara anyị ihe atọ mere na anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ ma mgbe ihe ọjọọ mere n’ụwa ma ọ bụ mee anyị. A ga-atụle ihe atọ ndị ahụ n’isiokwu a. Ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-atụcha ụjọ, meekwa ka anyị na-atụkwasịkwu Jehova obi. Na-echebara isiokwu afọ a echiche. Buru ya n’isi ma ọ bụrụ na i nwere ike. Ọ ga-eme ka okwukwe gị sikwuo ike maka nsogbu ndị ga-abịara gị n’ọdịnihu.

^ par. 3 NKỌWAKWU: Nkwa Jehova na-ekwe anyị bụ okwu ndị bụ́ eziokwu gosiri na ihe ga-emerịrị. Nkwa ndị ahụ nwere ike ime ka anyị ghara ịna-echegbucha onwe anyị banyere nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị.

^ par. 4 E kwuru banyere okwu a bụ́ “Atụla egwu” ugboro atọ n’Aịzaya 41:​10, 13, na 14. Amaokwu ndị a kwukwara “n’ihi na m nọnyeere gị,” “n’ihi na abụ m Chineke gị,” na “m ga-enyere gị aka.” Gịnị mere Jehova ji mee ka Aịzaya dee okwu ndị a? Ọ bụ iji mesie otu ihe dị mkpa ike, ya bụ, na ihe ga-eme ka anyị kwụsị ịtụ ụjọ bụ ịtụkwasị Jehova obi.

^ par. 52 NKỌWA FOTO: Ihe a bụ otu ezinụlọ. Onye nke ọ bụla n’ime ha nwere nsogbu ya na ya na-alụ. Nsogbu ndị ahụ bụ ndị ha nwere n’ebe ọrụ, n’ozi ọma, n’ụlọ akwụkwọ, tinyekwara ọrịa.

^ par. 54 NKỌWA FOTO: Ebe ụmụnna anyị nọ n’ụlọ otu nwanna na-enwe ọmụmụ ihe, ndị uwe ojii abịa wakpoo ha. Ma ụjọ atụghị ụmụnna anyị.

^ par. 56 NKỌWA FOTO: Ebe otu ezinụlọ na-enwe Ofufe Ezinụlọ. Ọ na-eme ka anyị nwee ike idi nsogbu anyị.