Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 3

Olee Otú Ị Ga-esi Chebe Obi Gị?

Olee Otú Ị Ga-esi Chebe Obi Gị?

“Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị.”​ILU 4:23.

ABỤ 36 Anyị Na-echebe Obi Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-3. (a) Gịnị mere Jehova ji hụ Sọlọmọn n’anya, oleekwa otú o si gọzie ya? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

SỌLỌMỌN ghọrọ eze Izrel mgbe ọ bụ okorobịa. N’oge ọ malitere ịchị, Jehova gwara ya okwu ná nrọ, sị: “Rịọ ihe m ga-enye gị.” Sọlọmọn gwara ya, sị: “M ka bụkwa nwata. Amaghị m otú e si apụ apụ, amaghịkwa m otú e si abata abata. . . . Nye ohu gị obi na-erube isi iji kpee ndị gị ikpe.” (1 Eze 3:​5-10) Ihe a Sọlọmọn rịọrọ Jehova, ya bụ, ka o nye ya “obi na-erube isi,” gosiri na ọ dị umeala n’obi. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji hụ ya n’anya. (2 Sam. 12:24) Ihe a Sọlọmọn zara Jehova tọrọ Chineke anyị ụtọ nke na o nyere ya “obi nwere amamihe na nke na-aghọta ihe.”​—1 Eze 3:12.

2 Jehova gọziri Sọlọmọn mmaji kwuru mmaji n’oge niile ọ nọ na-efe ya. Ọ rụrụ ụlọ nsọ maka “aha Jehova bụ́ Chineke Izrel.” (1 Eze 8:20) Ọ ghọrọ onye a ma ama n’ihi amamihe Chineke nyere ya. E dere ihe ndị o ji ike mmụọ nsọ Chineke kwuo n’akwụkwọ atọ dị na Baịbụl. Otu n’ime ha bụ akwụkwọ Ilu.

3 Okwu ahụ bụ́ obi pụtara ihe dị ka otu narị ugboro n’akwụkwọ Ilu. Dị ka ihe atụ, Ilu 4:23 kwuru, sị: “Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị.” N’amaokwu a, gịnị ka okwu ahụ bụ́ “obi” pụtara? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu a. Anyị ga-atụlekwa azịza ajụjụ abụọ ọzọ. Ha bụ, olee otú Setan si agbalị imebi obi anyị? Oleekwanụ ihe anyị ga-eme iji chebe ya? Ka anyị nwee ike nọgide na-efe Chineke, anyị kwesịrị ịghọta azịza ajụjụ ndị a dị mkpa.

“OBI GỊ,” GỊNỊ KA Ọ PỤTARA?

4-5. (a) Olee otú Abụ Ọma 51:6 si enyere anyị aka ịghọta ihe okwu ahụ bụ́ “obi” pụtara? (b) Olee otú mkpa ọ dị ime ka ahụ́ gbasie anyị ike ga-esi enyere anyị aka ịghọta mkpa ọ dị ichebe obi anyị?

4 N’Ilu 4:​23, okwu ahụ bụ́ “obi” na-akọwa ihe dị “n’ime obi mmadụ.” (Gụọ Abụ Ọma 51:6.) Ihe “obi” pụtara bụ ihe anyị na-eche n’echiche, otú obi na-adị anyị, ihe anyị bu n’obi nakwa ihe na-agụ anyị agụụ. Ọ bụ ụdị onye anyị bụ n’ime, ọ bụghị naanị otú anyị dị n’elu ahụ́.

5 Ka anyị tụlee otú ahụ́ ịgbasi anyị ike si egosi na ụdị onye anyị bụ n’ime dị ezigbo mkpa. Nke mbụ, ka ahụ́ nwee ike ịgbasi anyị ike, anyị kwesịrị ịna-eri ezigbo nri, na-emegakwa ahụ́ mgbe niile. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma a bịa n’ihe gbasara ofufe Chineke. Ka anyị nwee ike ichebe obi anyị, anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl, na-egosikwa na anyị nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ mgbe niile. Otú anyị si egosi na anyị nwere okwukwe bụ ịna-eme ihe ndị anyị na-amụta, nakwa ịgwa ndị ọzọ ihe ndị anyị kweere. (Rom 10:​8-10; Jems 2:26) Nke abụọ, anyị lee onwe anyị anya n’elu ahụ́, anyị nwere ike iche na ahụ́ gbasiri anyị ike, n’agbanyeghị na o nwere ọrịa anyị nwere n’ime ahụ́. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe gbasara okwukwe anyị. Anyị nwere ike na-eche na okwukwe anyị siri ike n’ihi ihe ndị anyị na-eme n’ofufe Chineke, ma agụụ ihe ọjọọ nwere ike jiri nwayọọ nwayọọ na-agba mgbọrọgwụ n’obi anyị. (1 Kọr. 10:12; Jems 1:​14, 15) Anyị kwesịrị icheta na Setan ga-achọ ime ka anyị na-eche echiche otú o si eche. Olee otú o nwere ike isi eme ya? Oleekwanụ otú anyị nwere ike isi echebe onwe anyị?

OTÚ SETAN SI AGBALỊ IMEBI OBI ANYỊ

6. Gịnị ka Setan bu n’obi, oleekwa otú o si agbalị imezu ya?

6 Setan chọrọ ka anyị dị ka ya. Ọ bụ onye nnupụisi na-anaghị eji ihe Jehova kwuru kpọrọ ihe. Ihe mere o ji eme ya bụ na ọ na-eme ihe ga-abara naanị onwe ya uru. Ọ gaghị amanyeli anyị iche echiche ka ya ma na-eme ka ya. N’ihi ya, ọ na-agbalị iji ihe ndị ọzọ emezu ihe o bu n’obi. Dị ka ihe atụ, ndị juru n’ụwa a bụ ndị o mebirila obi ha. (1 Jọn 5:19) Ọ chọrọ ka anyị na ha na-akpa, n’agbanyeghị na anyị ma na mkpakọrịta ọjọọ “na-emebi” otú anyị si eche echiche nakwa otú anyị si akpa àgwà. (1 Kọr. 15:33) O ji ụdị ihe a nweta Eze Sọlọmọn. Ọ lụrụ ọtụtụ ụmụ nwaanyị na-efe arụsị. Ha mechara megharịa ya anya, ma “jiri nke nta nke nta mee ka obi ya chigharịa” n’ebe Jehova nọ.​—1 Eze 11:3.

Olee otú ị ga-esi echebe obi gị ka Setan ghara iji echiche ya mebie ya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7) *

7. Olee ihe ọzọ Setan ji eme ka ọtụtụ ndị na-eche echiche ka ya? Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya?

7 Setan na-eji fim na ihe ndị a na-egosi na tiivi eme ka ọtụtụ ndị na-eche echiche ka ya. Ọ ma na ihe akụkọ na-eme abụghị naanị ime ka anyị na-enwe obi ụtọ, kama ọ na-akụziri anyị otú anyị ga-esi eche echiche, otú obi kwesịrị isi na-adị anyị, nakwa otú anyị ga-esi na-akpa àgwà. Jizọs ji akụkọ kụziere ndị mmadụ ihe. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe atụ o mere gbasara onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi na otu nwa okorobịa hapụrụ ụlọ ma mefusie ihe o nwere. (Mat. 13:34; Luk 10:​29-37; 15:​11-32) Ma, ndị na-eche echiche ka Setan nwere ike iji akụkọ mebie echiche anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ilezi anya họrọ akụkọ ndị anyị na-ege. Fim na ihe ndị a na-egosi na Tiivi nwere ike ịna-eme anyị obi ụtọ ma na-akụziri anyị ihe n’emebighị echiche anyị. Ma anyị kwesịrị ịkpachara anya. Mgbe anyị na-ahọrọ ihe ndị anyị ji atụrụ ndụ, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Fim a ma ọ bụ ihe a a na-egosi na Tiivi, ọ̀ na-akụziri m na ọ dị mma ime ihe na-agụ anụ ahụ́ m agụụ?’ (Gal. 5:​19-21; Efe. 2:​1-3) Gịnị ka ị ga-eme ma ị chọpụta na ihe a na-egosi na tiivi na-akwado echiche Setan? Zere ya otú ahụ i nwere ike isi zere ọrịa na-efe efe.

8. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi nyere ụmụ ha aka ichebe obi ha?

Ndị nne na nna, unu nwere ọrụ pụrụ iche ichebe ụmụ unu na mgba Setan na-agba imebi obi ha. O doro anya na unu na-agbasi mbọ ike ime ka ụmụ unu ghara ịrịa ọrịa. Unu na-edebe ụlọ unu ọcha, na-etufu ihe ọ bụla nwere ike ime ka unu na ụmụ unu na-arịa ọrịa. Unu kwesịkwara inyere ụmụ unu aka ka ha ghara ịna-ele fim, ihe ndị a na-egosi na Tiivi, igwu egwuregwu kọmputa, na ịga n’Ịntanet, ndị nwere ike ime ka ha na-eche echiche ka Setan. Jehova enyela unu ọrụ inyere ụmụ unu aka ịbụ enyi ya. (Ilu 1:8; Efe. 6:​1, 4) N’ihi ya, atụla ụjọ iji ihe Baịbụl kwuru gwa ụmụ unu ihe ndị ha ga-eme, na ihe ndị ha na-agaghị eme. Gwa ha ihe ndị ha nwere ike ile na ndị ha na-agaghị ele, nyekwara ha aka ka ha ghọta ihe mere i ji kwuo otú ahụ. (Mat. 5:37) Ka ụmụ unu na-etolite, kụziere ha ka ha jiri aka ha chọpụta ihe Jehova kwuru na ọ bụ ihe dị mma na ihe na-adịghị mma. (Hib. 5:14) Chetakwa na ụmụ unu ga-amụta ọtụtụ ihe n’ihe unu na-ekwu, ma ha ga-aka amụtakwu ihe n’ihe ndị unu na-eme.​—Diut. 6:​6, 7; Rom 2:21.

9. Olee otu echiche Setan na-eme ka ndị mmadụ na-enwe, gịnịkwa mere o ji jọgbuo onwe ya?

9 Otú ọzọ Setan si agbalị imebi obi anyị bụ ime ka anyị tụkwasị amamihe mmadụ obi kama iche echiche otú Chineke si eche echiche. (Kọl. 2:8) Ka anyị tụlee otu echiche Setan na-eme ka ndị mmadụ na-enwe. Ọ na-eme ka ndị mmadụ na-eche na ịba ọgaranya kwesịrị ịbụ ihe kacha mkpa ná ndụ. Ndị na-eche ụdị echiche a nwere ike ịba ọgaranya, ha nwekwara ike ha agaghị aba. Nke ọ bụla ọ bụ, ha nọ ná nsogbu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha nwere ike itinye isi n’ịchụ ego nke na ha anaghị achọ ịma ihe banyere ahụ́ ike ha, mmekọrịta ha na ndị ezinụlọ ha, na adịm ná mma ha na Jehova naanị ka ha nweta ego. (1 Tim. 6:10) Obi kwesịrị ịtọ anyị ụtọ na Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye maara ihe, na-enyere anyị aka ile ego anya otú kwesịrị ekwesị.​—Ekli. 7:12; Luk 12:15.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI ECHEBE OBI ANYỊ?

Ka ihe ọjọọ ghara ịbata n’obi anyị, anyị ga-amụrụ anya ma mee ihe otú ahụ ndị nche na ndị nche ọnụ ụzọ ámá oge ochie si eme (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11) *

10-11. (a) Olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji chebe onwe anyị? (b) Olee ihe ndị nche oge ochie na-eme, oleekwa otú akọnuche anyị nwere ike isi arụ ọrụ ka ha?

10 Ka anyị nwee ike ichebe obi anyị, anyị kwesịrị ịmata ihe ndị ga-eduba anyị ná nsogbu ma mee ihe ngwa ngwa ichebe onwe anyị. Okwu a sụgharịrị “chebe” n’Ilu 4:23 na-echetara anyị ọrụ onye nche na-arụ. N’oge Eze Sọlọmọn, ndị nche na-akwụrụ ná mgbidi obodo iji na-eche obodo ahụ nche. Ma ha hụ ka nsogbu na-abịa, ha emee ka ndị nọ n’ime obodo mara. Anyị buru ihe atụ a n’obi, ọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe anyị ga-eme ka Setan ghara imebi echiche anyị.

11 N’oge ochie, ndị nche na ndị nche ọnụ ụzọ ámá na-arụkọ ọrụ. (2 Sam. 18:​24-26) Ha na-enye aka eme ka e chebe obodo. Otú ha si eme ya bụ ịhụ na ha mechiri ọnụ ụzọ ámá mgbe ọ bụla ndị iro na-eru nso. (Nehe. 7:​1-3) Akọnuche anyị e ji Baịbụl zụọ * nwere ike ịbụrụ anyị onye nche. Ọ na-adọ anyị aka ná ntị mgbe Setan na-agbalị imebi obi anyị, ya bụ, mgbe ọ na-agba mbọ ka o mebie otú anyị si eche echiche, otú obi na-adị anyị, ihe anyị bu n’obi ime ma ọ bụ ihe na-agụ anyị agụụ. Mgbe ọ bụla akọnuche anyị na-adọ anyị aka ná ntị banyere ihe nwere ike ime ka anyị banye ná nsogbu, anyị kwesịrị ige ya ntị ma mee ihe niile anyị nwere ike ime iji zere ihe ahụ.

12-13. Olee ihe e nwere ike ịnwa anyị ọnwụnwa ka anyị mee, oleekwa ihe anyị kwesịrị ime?

12 Ka anyị tụlee otu ihe atụ nke gosiri otú anyị nwere ike isi echebe onwe anyị ka anyị ghara ịna-eche echiche ka Setan. Jehova akụzierela anyị na e kwesịghị “ịkpọtụdị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu aha n’etiti [anyị].” (Efe. 5:3) Ma olee ihe anyị ga-eme ma ndị ọgbọ anyị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị malite ikwu gbasara ịkwa iko? Anyị manụ na anyị kwesịrị ‘ịjụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa.’ (Taị. 2:12) Akọnuche anyị nwere ike ịdọ anyị aka ná ntị banyere ya. (Rom 2:15) Ma ànyị ga-egenụ ya ntị? E nwere ike ịnwa anyị ka anyị na-ege ndị ọgbọ anyị ntị ma ọ bụ na-ele foto ndị ha nwere ike igosi anyị. Ma anyị kwesịrị izere nsogbu ahụ. Otú anyị ga-esi zere ya bụ ịgbanwe ihe anyị na ha na-ekwu ma ọ bụ anyị esi ebe ahụ pụọ.

13 Anyị kwesịrị ịkata obi ka anyị nwee ike imeri nsogbu ndị ọgbọ anyị na-enye anyị iche ihe ọjọọ ma ọ bụ ime ihe ọjọọ ka ha. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova na-ahụ mbọ anyị na-agba, ọ ga-enyekwa anyị ike na amamihe anyị ga-eji gbaara echiche Setan ọsọ. (2 Ihe 16:9; Aịza. 40:29; Jems 1:5) Ma, olee ihe ọzọ anyị ga-eme ka anyị na-echebe obi anyị?

MỤRỤ ANYA

14-15. (a) Olee ihe anyị kwesịrị imeghere obi anyị, oleekwa otú anyị nwere ike isi eme ya? (b) Olee otú Ilu 4:​20-22 ga-esi nyere anyị aka mee ka ịgụ Baịbụl baara anyị uru? (Gụọkwa igbe isiokwu ya bụ “ Otú Anyị Ga-esi Na-echebara Ihe Anyị Gụrụ Echiche.”)

14 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ichebe obi anyị, ihe anyị ga-eme abụghị naanị igbochi ihe ọjọọ ịbata na ya, kama, anyị ga-emeghe ya ka ihe ọma na-abata anyị n’obi. Cheekwa banyere obodo ahụ a gbara mgbidi gburugburu anyị ji mee ihe atụ. Onye nche ọnụ ụzọ ámá na-emechi ụzọ ka ndị iro ghara ịbata wakpoo obodo ahụ, ma n’oge ndị ọzọ, ọ na-emeghe ụzọ ka e nwee ike ibubata nri na ihe ndị ọzọ dị mkpa. Ma, ọ bụrụ na o nweghị mgbe ọ na-emeghe ụzọ ahụ, agụụ ga-anyụ ndị bi n’obodo ahụ ịkpakwụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Anyị kwesịrị imeghe obi anyị mgbe niile ka anyị nwee ike ịna-eche echiche ka Chineke.

15 Baịbụl kwuru otú Jehova si eche echiche. N’ihi ya, mgbe ọ bụla anyị gụrụ Baịbụl, anyị na-ekwe ka otú Jehova si eche echiche metụta otú anyị si eche echiche, otú obi na-adị anyị, nakwa otú anyị si akpa àgwà. Olee ihe anyị ga-eme ka ịgụ Baịbụl baara anyị uru? Ekpere dị ezigbo mkpa. Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “Tupu mụ agụọ Baịbụl, m na-ekpe ekpere, na-arịọ Jehova ka o mee ka ‘m hụ nke ọma ihe dị ebube ndị’ dị n’Okwu ya.” (Ọma 119:18) Anyị kwesịkwara ichebara ihe ndị anyị gụrụ echiche. Anyị kpee ekpere, gụọ Baịbụl ma chebara ihe ndị anyị gụrụ echiche, Okwu Chineke ga-abanye “n’ime obi” anyị, meekwa ka anyị na-eche echiche ka Jehova.​—Gụọ Ilu 4:​20-22; Ọma 119:97.

16. Olee otú Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova sirila baara ọtụtụ ụmụnna anyị uru?

16 Ụzọ ọzọ anyị ga-esi eme ka anyị na-eche echiche ka Chineke bụ ịna-ele Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova. Otu di na nwunye kwuru, sị: “Ihe ndị a na-eme n’Ihe Omume Tiivi anyị kwa ọnwa bụ nnọọ otú Jehova si za ekpere anyị. Ha emeela ka okwukwe anyị sikwuo ike, gbaakwa anyị ume mgbe obi na-ajọ anyị njọ ma ọ bụ mgbe anyị nọ naanị anyị. Anyị na-egekarị egwú ndị a na-agụ n’Ihe Omume Tiivi anyị n’ụlọ anyị. Anyị na-akpọnye ha ma anyị na-ehicha ụlọ, siwe nri, ma ọ bụ na-aṅụ tii.” Ihe omume ndị ahụ na-enyere anyị aka ichebe obi anyị. Ha na-akụziri anyị ịna-eche echiche ka Jehova nakwa ịghara ịna-eche echiche ka Setan.

17-18. (a) Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Eze 8:​61, gịnị ga-eme ma anyị mee ihe Jehova na-akụziri anyị? (b) Olee ihe anyị ga-amụta n’aka Eze Hezekaya? (ch) Olee ihe ndị anyị ga ekpe n’ekpere otú ahụ Devid kpere n’Abụ Ọma 139:​23, 24?

17 Mgbe ọ bụla anyị hụrụ uru ime ihe ziri ezi bara, okwukwe anyị na-esikwu ike. (Jems 1:​2, 3) Obi na-atọ anyị ụtọ n’ihi na anyị emeela Jehova obi ụtọ ịkpọ anyị ụmụ ya. Anyị na-achọkwukwa ime ihe dị ya mma. (Ilu 27:11) Ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị bụ ohere anyị ga-eji gosi na anyị ejighị obi abụọ na-efe Nna anyị hụrụ anyị n’anya. (Ọma 119:113) Kama, anyị ga-egosi na anyị ji obi anyị niile hụ Jehova n’anya, nakwa na anyị kpebisiri ike irubere iwu ya isi nakwa ime uche ya.​—Gụọ 1 Ndị Eze 8:61.

18 Ànyị ga-emejọ ihe? À na-ajụkwa ajụ? Ihe kpatara ya bụ na anyị ezughị okè. Anyị mejọọ ihe, ka anyị cheta Eze Hezekaya. O mejọrọ ihe. Ma o chegharịrị, mewe ihe dị Jehova mma, jirikwa “obi zuru ezu” na-efe Jehova. (Aịza. 38:​3-6; 2 Ihe 29:​1, 2; 32:​25, 26) N’ihi ya, ka anyị jụ mbọ niile Setan na-agba iji echiche ya mebie obi anyị. Ka anyị na-arịọ Jehova ka o mee ka anyị nwee “obi na-erube isi.” (1 Eze 3:9; gụọ Abụ Ọma 139:​23, 24.) Anyị ga na-ekwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ ma anyị chebe obi anyị karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche.

ABỤ 54 “Lekwa Ụzọ”

^ par. 5 Ànyị ga-anọgide na-efe Jehova, ka ànyị ga-ekwe ka Setan mee ka anyị kwụsị ife Chineke? Azịza ajụjụ a adabereghị n’otú ọnwụnwa anyị siruru n’ike, kama, ọ bụ n’otú anyị si chebe obi anyị. Gịnị ka okwu a bụ́ “obi” pụtara? Olee otú Setan si agbalị imebi obi anyị? Oleekwanụ otú anyị ga-esi chebe ya? Isiokwu a ga-aza ajụjụ ndị a dị mkpa.

^ par. 11 NKỌWAKWU: Jehova nyere anyị ikike inyocha otú anyị si eche echiche, otú obi na-adị anyị nakwa àgwà anyị ka anyị nwee ike ịma ma ànyị na-eme nke ọma ma ọ bụ na anyị anaghị eme. Baịbụl kpọrọ ikike ahụ Jehova nyere anyị akọnuche. (Rom 2:15; 9:1) Akọnuche e ji Baịbụl zụọ na-eji iwu Jehova dị na Baịbụl amata ma ihe ndị anyị na-eche, ihe ndị anyị na-eme ma ọ bụ ihe ndị anyị na-ekwu, hà dị mma ma ọ bụ dị njọ.

^ par. 56 NKỌWA FOTO: Ebe e gosiri ndị na-eme omume rụrụ arụ mgbe otu nwanna e merela baptizim nọ na-ele tiivi. Ọ ga-ekpebi ihe ọ ga-eme.

^ par. 58 NKỌWA FOTO: Ebe onye nche n’oge ochie hụrụ ndị chọrọ ịwakpo obodo ha. Ya akpọọ ndị nche ọnụ ụzọ ámá nọ n’ala ala, ha emee ihe ozugbo mechisie ọnụ ụzọ ámá obodo ha ma si n’ime kpọchie ha.