Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere nwoke a kpọrọ “Enyi m” ji sị na ‘ọ ga-aghọ ya ahịa’ ma ọ lụọ Rut? (Rut 4:1, 6)

N’oge a na-ede Baịbụl, ọ bụrụ na nwoke lụrụ nwaanyị anwụọ n’amụtaghị nwa, e nwere ọtụtụ ajụjụ o nwere ike ịkpata. Dị ka ihe atụ, gịnị ga-eme ala ya? Aha ezinụlọ ya ọ̀ ga-efu kpamkpam? Iwu Mosis nyere aka ịza ajụjụ ndị a.

Gịnị ga-eme ala nwoke nwụrụ n’amụtaghị nwa ma ọ bụkwanụ onye rere ala ya n’ihi na ọ dara ogbenye? Nwanne ya nwoke ma ọ bụ onye ikwu ya ọzọ nwere ike ịgbara ala ahụ. Ihe a ga-eme ka ọ ghara ịgara ezinụlọ ọzọ.—Lev. 25:23-28; Ọnụ Ọgụ. 27:8-11.

Olee ihe ga-eme ka aha ezinụlọ nwoke ahụ nwụrụ anwụ ghara ifu? Ọ bụ ma nwanne nwoke ahụ nwụrụ anwụ lụọ nwunye ya. Ọ bụ ihe a ka e mere n’oge Rut. Mmadụ ga-alụrụ nwunye nwanne ya nwoke nwụrụ anwụ ka ọ mụta nwa ga-aza aha nwanne ya nwoke ahụ ma keta ala ya. Ihe a mekwara ka e nwee ike ịna-elekọta ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ.—Diut. 25:5-7; Mat. 22:23-28.

Ka anyị leba anya n’akụkọ Naomi. Aha di ya bụ Elimelek. Mgbe di ya na ụmụ ya ndị nwoke abụọ nwụrụ, o nweghịzi nwoke ọzọ fọrọ n’ezinụlọ ahụ ga-elekọta Naomi. (Rut 1:1-5) Ozugbo ha laghachiri Juda, Naomi gwara nwunye nwa ya bụ́ Rut ka ọ gwa Boaz ka ọ gbara ala ha. Boaz bụ onye ikwu Elimelek. (Rut 2:1, 19, 20; 3:1-4) Ma Boaz ma na e nwere onye ọzọ bụ́ onye ikwu Elimelek karịa yanwa. Baịbụl kpọrọ nwoke ahụ “Enyi m.” Ọ bụ ya bụ onye mbụ o ruuru ikpebi ma ọ̀ ga-agbara ala Elimelek ma ọ̀ bụ na ọ gaghị agbara ya.—Rut 3:9, 12, 13.

Na mbụ, nwoke ahụ kwetara ịgbara ala Elimelek. (Rut 4:1-4) Ọ bụ eziokwu na ọ ga-efu ya ihe, ọ ma na Naomi agaghị enwe ike ịmụta nwa ga-eketa ala Elimelek. N’ihi ya, ala ahụ ga-abụ nke ya. O yikwara ka ọ̀ ga-abara ya uru.

Ma nwoke ahụ gbanwere obi ya mgbe ọ chọpụtara na ọ ga-ebu ụzọ lụọ Rut tupu ya enwee ike ịgbara ala Elimelek. Ọ sịrị: “Agaghị m agbarali ya. M gbara ya, ọ ga-aghọ m ahịa.” (Rut 4:5, 6) Gịnị mere o ji gbanwee obi ya?

Ọ bụrụ na nwoke ahụ ma ọ bụ onye ọzọ alụọ Rut, ya amụta nwa nwoke, nwa nwoke ahụ ga-eketa ala Elimelek. Olee otú o si bụrụ na ‘ọ ga-aghọ ya ahịa’? Baịbụl ekwughị. Mana e nwere ihe ụfọdụ nwere ike ịkpata ya.

  • Nke mbụ, ego o ji gbara ala ahụ nwere ike iyi ihe furu ọhịa n’ihi na ala Elimelek agaghị abụ ala ya. Ọ ga-abụ nke nwa Rut mụtara.

  • Nke abụọ, ọ bụ yanwa ga na-elekọta ma Naomi ma Rut, na-akpakwa afọ ha.

  • Nke atọ, ọ bụrụ na Rut amụtara ya ụmụ ndị ọzọ, ha na ụmụ ya ga-eke ala ya.

  • Nke anọ, ọ bụrụ na nwoke ahụ enweghị nwa nwoke ọ bụla, nwa mbụ Rut mụtaara ya ga-eketa ala Elimelek, ketakwa nke ya. N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ bụ nwa na-aza aha Elimelek ga-eketa ala ya, ọ bụghị nke na-aza aha yanwa. Nwoke ahụ achọghị ka ihe a mee ya ebe ọ na-enyere Naomi aka. O kpebiri ịhapụ ka Boaz bụ́ onye ọzọ nwere ikike ịgbara ala Elimelek gbarawa ala ahụ. Ma ihe mere Boaz ji kweta ịgbara ala ahụ bụ na ọ chọrọ ka “ala nwoke ahụ nwụrụ anwụ ghara ịgara ndị ọzọ” nakwa ka a “ghara ichefu aha ya.”—Rut 4:10.

Ọ ga-abụ na ihe ka nwoke ahụ mkpa bụ ime ka aha ya ghara ifu nakwa ka ala ya ghara ịgara onye ọzọ. Ọ na-achọ ihe ga-abara naanị ya uru. N’agbanyeghị na ọ gbalịrị ka aha ya ghara ifu, taa, anyị amadịghị ihe bụ́ aha ya. Ihe ọma bịaara Boaz kwakwara ya, ya bụ, iso ná ndị nna nna Jizọs Kraịst, bụ́ Mezaya. Ihe a bụ ihe kwara nwoke ahụ n’ihi na o ji maka ịchọ ọdịmma onwe ya ghara inyere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya aka.—Mat. 1:5; Luk 3:23, 32.