Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 10

Gịnị Mere Ị Ga-eji Mee Baptizim?

Gịnị Mere Ị Ga-eji Mee Baptizim?

“Ka onye ọ bụla n’ime unu meekwa baptizim.”—ỌRỤ 2:38.

ABỤ NKE 34 Ekpebiela M Ime Ezi Omume

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1-2. Gịnị na-emekarị mgbe a na-eme ndị mmadụ baptizim? Gịnị ka i kwesịrị ichebara echiche?

 Ị̀ HỤTỤLA ndị a na-aga ime baptizim? Ị nụrụ ka ha ji obi ike zaa ajụjụ abụọ a jụrụ ha tupu e mee ha baptizim. Ị hụkwara ka obi na-atọ ndị enyi ha na ndị ezinụlọ ha ụtọ. Ka e mechara ha baptizim, ha esi ná mmiri na-apụta, ị hụrụ ka ihu bụ ha ọchị ọchị, ndị mmadụ ana-akụkwara ha aka. Kwa izu, ọtụtụ puku mmadụ na-enyefe Jehova onwe ha, e meekwa ha baptizim ha aghọọ Ndịàmà Jehova.

2 Gịnwa kwanụ? Ọ bụrụ na ị chọrọ ka e mee gị baptizim, ọ pụtara na ị dị iche n’ụwa ọjọọ a n’ihi na ị “na-achọ Jehova.” (Ọma 14:1, 2) A kwadebere isiokwu a maka gị, ma ị̀ bụ nwata ma ì meela okenye. Ma, anyịnwa merela baptizim kwesịrị ikpebisikwu ike na anyị ga na-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi ya, ka anyị lee atọ n’ime ọtụtụ ihe ndị mere anyị kwesịrị iji na-efe Jehova.

Ị HỤRỤ EZIOKWU NA EZI OMUME N’ANYA

Ekwensu ekwutọọla aha Jehova ọtụtụ puku afọ. Ọ ka na-emekwa otú ahụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3 na nke 4)

3. Gịnị mere ndị ohu Jehova ji hụ eziokwu na ezi omume n’anya? (Abụ Ọma 119:128, 163)

3 Jehova nyere ndị ya iwu ka ha ‘hụ eziokwu n’anya.’ (Zek. 8:19) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-achọ ezi omume. (Mat. 5:6) Ihe ọ pụtara bụ na mmadụ kwesịrị ịna-achọsi ike ka o mee ihe ziri ezi na ihe dị ọcha n’anya Chineke. Ị̀ hụrụ eziokwu na ezi omume n’anya? Anyị ma na ị hụrụ ha n’anya. Ị kpọrọ ụgha na ihe ọjọọ niile asị. (Gụọ Abụ Ọma 119:128, 163.) Onye ọ bụla na-agha ụgha na-eme ka onye na-achị ụwa a bụ́ Ekwensu. (Jọn 8:44; 12:31) Otu n’ime ihe ndị bụ́ mkpa Ekwensu bụ ịkatọ aha nsọ Jehova Chineke. Setan na-aghagide Chineke ụgha kemgbe ahụ e nupụrụ isi n’ogige Iden. Ọ na-agbalị ime ka ndị mmadụ na-eche na Jehova bụ Onye Ọchịchị na-eche naanị gbasara onwe ya, nke na-anaghị ekwu eziokwu, na-egbochikwa ihe ọma ịbịara ndị ọ na-achị. (Jen. 3:1, 4, 5) Ụgha a Ekwensu na-aghagide Jehova emeela ka ndị mmadụ na-eche na Jehova bụ onye ọjọọ. Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ egosi na ha ahụghị ‘eziokwu n’anya,’ Setan nwere ike ime ka ha na-eme ụdị ihe ọjọọ dị iche iche.—Rom 1:25-31.

4. Olee otú Jehova sirila gosi na ya bụ “Chineke, onye eziokwu”? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

4 Jehova bụ “Chineke, onye eziokwu.” Ọ na-akụzikwara ndị hụrụ ya n’anya eziokwu. (Ọma 31:5) O si otú a na-enyere ha aka ka ha mara nke bụ́ eziokwu banyere ụgha ndị Setan na-agha. Jehova na-akụzikwara ndị ohu ya ka ha na-ekwu eziokwu, na-emekwa ezi omume. Ihe a ọ na-akụziri ha na-eme ka ha mata na ha bara uru, na-emekwa ka obi na-eru ha ala. (Ilu 13:5, 6) Jehova ò meerela gị ihe ndị a ka ị na-amụ Baịbụl? Ị mụtala na ọ bụ otú Jehova si eme ihe ga-akacha abara ma gịnwa ma mmadụ niile uru. (Ọma 77:13) N’ihi ya, i kpebisiri ike ịna-eme ihe Chineke kwuru na ọ dị mma. (Mat. 6:33) Ị chọrọ ime ka ndị mmadụ mata nke bụ́ eziokwu ma gosi na ihe Setan kwuru banyere Jehova Chineke anyị bụ okpookpo ụgha. Olee otú ị ga-esi eme ya?

5. Olee otú ị ga-esi egosi na ị na-akwado eziokwu na ezi omume?

5 Ị ga-adịli ndụ gị otú ga-eme ka o doo onye ọ bụla anya na i kwetaghị ụgha Setan nakwa na ị na-akwado eziokwu. I nwere ike igosi na ị chọrọ ka Jehova chịwa gị, gosikwa na ị dị njikere ime ihe dị ya mma. Olee otú ị ga-esi eme ya? Ọ bụ ikpe ekpere, kwe Jehova nkwa na ị ga na-efe ya ruo mgbe ebighị ebi, meekwa baptizim. Mmadụ ịhụ eziokwu na ihe ziri ezi n’anya bụ ihe dị ezigbo mkpa na-eme ka o kpebie ime baptizim.

Ị HỤRỤ JIZỌS KRAỊST N’ANYA

6. Olee ihe Abụ Ọma 45:4 kwuru gbasara Jizọs nke mere i ji hụ ya n’anya?

6 Gịnị mere i ji hụ Jizọs Kraịst n’anya? Ụfọdụ ihe mere anyị ji hụ Jizọs n’anya dị n’Abụ Ọma 45:4. (Gụọ ya.) Jizọs na-akụziri ndị mmadụ ikwu eziokwu, ịdị umeala n’obi, nakwa ime ezi omume. Ọ bụrụ na ị hụrụ eziokwu na ezi omume n’anya, o doro anya na ị ga-ahụkwa Jizọs Kraịst n’anya. Chee banyere otú Jizọs si jiri obi ike mee ka ndị mmadụ mata ihe bụ́ eziokwu na ihe ziri ezi. (Jọn 18:37) Ma, olee otú Jizọs si kụziere ndị mmadụ ịdị umeala n’obi?

7. Olee ihe na-amasị gị n’otú Jizọs si dị umeala n’obi?

7 Jizọs si n’ihe ndị o mere kụziere anyị ịdị umeala n’obi. Dị ka ihe atụ, o mere ka ndị mmadụ mata na ọ bụ Jehova ka e kwesịrị ịna-eto. O nweghị mgbe o kwere ka ha too ya. (Mak 10:17, 18; Jọn 5:19) Olee otú obi dị gị maka na Jizọs dị umeala n’obi? Ọ̀ bụ na ọ naghị eme ka ị hụ Ọkpara Chineke n’anya ma na-eme ka ya? O doro anya na ọ na-eme. Gịnị mere Jizọs ji dịrị umeala n’obi? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ Nna ya bụ́ onye dị umeala n’obi n’anya, na-emekwa ka ya. (Ọma 18:35; Hib. 1:3) Ebe ọ bụ na Jizọs na-eme nnọọ ka Nna ya, ọ̀ bụ na ihe ya anaghị amasị gị?

8. Gịnị mere obi ji dịrị anyị ụtọ na Jizọs bụ Eze anyị?

8 Anyị hụrụ Eze anyị bụ́ Jizọs n’anya n’ihi na ọ bụ Onye Ọchịchị kacha mma. Jehova ji aka ya zụọ Ọkpara ya nke ọma ma họpụta ya ka ọ chịwa. (Aịza. 50:4, 5) Cheekwa gbasara otú Jizọs si hụ anyị n’anya nke na ọ nwụrụ n’ihi anyị. (Jọn 13:1) I kwesịrị iji obi gị hụ Jizọs n’anya n’ihi na ọ bụ Eze gị. Ọ kpọrọ ndị hụrụ ya n’anya ndị enyi ya, kwuokwa na ihe ga-egosi na ha hụrụ ya n’anya bụ ma ha na-erubere ya isi. (Jọn 14:15; 15:14, 15) Ọ bụ ihe ọma pụrụ iche meere mmadụ ma ọ bụrụ enyi Ọkpara Chineke.

9. Olee otú baptizim ndị na-eso ụzọ Jizọs si yie nke Jizọs?

9 Otu n’ime iwu ndị Jizọs nyere bụ na a ga-eme ndị na-eso ụzọ ya baptizim. (Mat. 28:19, 20) Yanwa mekwara baptizim. E nwere ụzọ ndị baptizim e mere Jizọs si dị iche na nke e mere ndị na-eso ụzọ ya. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Otú Baptizim E Mere Jizọs Si Dị Iche na Nke E Mere Ndị Na-eso Ụzọ Ya.”) E nwekwara ụzọ ndị ha si yie. Jizọs mere baptizim iji gosi na ya dị njikere ime uche Nna ya. (Hib. 10:7) E mee ndị na-eso ụzọ Jizọs baptizim, ọ na-egosikwa ndị mmadụ na ha enyefeela Chineke onwe ha. Ugbu a, ihe kacha ha mkpa ná ndụ bụ ime uche Jehova, ọ bụghị uche ha. Ha si otú a na-eme ka Nna ha ukwu.

10. Gịnị mere ịhụ Jizọs n’anya ga-eji mee ka i mee baptizim?

10 I kwetara na Jizọs bụ Ọkpara Jehova mụrụ naanị ya. Obi dịkwa gị ụtọ na ọ bụ Eze Jehova họpụtara ka ọ chịwa anyị. Ị ma na Jizọs dị umeala n’obi nakwa na ọ na-eme nnọọ ka Nna ya. Ị mụtala na o nyere ndị agụụ ji nri, kasie ndị dara mbà obi, gwọọkwa ndị na-arịa ọrịa. (Mat. 14:14-21) Ị hụkwala otú o si na-eduzi ọgbakọ ya taa. (Mat. 23:10) Ị makwa na ebe ọ bụ ya ga-achị anyị n’Alaeze Chineke, ọ ga-emere anyị ihe ndị ka ndị nke ahụ o mere. Olee otú ị ga-esi egosi na ị hụrụ Jizọs n’anya? Ọ bụ ịna-eme ka ya. (Jọn 14:21) Otu i nwere ike isi eme ya bụ ibugodị ụzọ nyefee Jehova onwe gị ma mee baptizim.

Ị HỤRỤ JEHOVA CHINEKE N’ANYA

11. Olee ihe ị ga-asị na ọ bụ ihe kacha mkpa mere ị ga-eji mee baptizim? Ọ bụ maka gịnị?

11 Olee ihe kacha mkpa mere ị ga-eji mee baptizim? Jizọs mere ka anyị mata iwu kacha n’iwu Chineke niile mgbe ọ sịrị: “Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mak 12:30) Ihe a Jizọs kwuru ò gosiri otú i si hụ Chineke n’anya?

Ọ bụ Jehova nyere gị ihe ọma niile i nwere nakwa nke ị ka ga-enwe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)

12. Gịnị mere i ji hụ Jehova n’anya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

12 E nwere ọtụtụ ihe mere i kwesịrị iji hụ Jehova n’anya. Dị ka ihe atụ, ị ghọtala na ọ bụ ya “na-enye ndụ,” nakwa na “onyinye ọ bụla dị mma, nke zukwara okè,” si n’aka ya. (Ọma 36:9; Jems 1:17) Ihe ọma niile i nwere si n’aka Chineke anyị hụrụ anyị n’anya, onye na-emesapụkwa aka.

13. Gịnị mere ihe mgbapụta ahụ ji bụrụ onyinye magburu onwe ya?

13 Ihe mgbapụta ahụ bụ onyinye magburu onwe ya Jehova nyere anyị. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Chegodị banyere otú Jehova na Ọkpara ya si dị ná mma. Jizọs sịrị: “Nna m hụrụ m n’anya,” nakwa “m hụrụ Nna m n’anya.” (Jọn 10:17; 14:31) Ọtụtụ ijeri afọ Jehova na Ọkpara ya nọkọrọ mere ka ha dịkwuo ná mma. (Ilu 8:22, 23, 30) Chezienụ otú ọ ga-abụrịrị na o si wute Chineke mgbe o kwere ka Ọkpara ya taa ahụhụ ma nwụọ. Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, ma gịnwa. Ọ bụ ya mere o ji jiri Ọkpara ya chụọ àjà ka gị na ndị ọzọ nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16; Gal. 2:20) Ọ bụ ya bụ ihe kachanụ mere anyị ji kwesị ịhụ Chineke n’anya.

14. Gịnị bụ ihe kacha mma ị ga-ekpebi iji ndụ gị eme?

14 Ị hụkwuola Jehova n’anya maka na ị mụtakwuola gbasara ya. O doro anya na ị chọrọ ka gị na ya na-adịkwu ná mma ugbu a, ruokwa mgbe ebighị ebi. Ị ga-emelikwa ya. O ji obiọma na-agba gị ume ka i mee ka obi ya ṅụrịa. (Ilu 23:15, 16) Otú ị ga-esi eme ya abụghị naanị n’okwu ọnụ, kamakwa n’omume. Otú i si ebi ndụ gị ga-egosi na i ji obi gị niile hụ Jehova n’anya. (1 Jọn 5:3) Ọ bụ ya bụ ihe kacha mma ị ga-ekpebi iji ndụ gị eme.

15. Olee otú ị ga-esi egosi na ị hụrụ Jehova n’anya?

15 Olee otú ị ga-esi gosi na ị hụrụ Jehova n’anya? Ihe mbụ ị ga-eme bụ ikpe ekpere pụrụ iche nyefee Onye naanị ya bụ ezi Chineke onwe gị. (Ọma 40:8) Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ime ka ọhaneze mara na i nyefeela Chineke onwe gị. Otú ị ga-esi eme ya bụ ime baptizim. Dị ka anyị kwuru ná mmalite isiokwu a, oge ahụ bụ oge obi ụtọ nke dị ezigbo mkpa ná ndụ gị. Ọ pụtara na ị malitela ibi ndụ ọhụrụ, ndụ ị ga na-adịrị Jehova, ọ bụghị onwe gị. (Rom 14:8; 1 Pita 4:1, 2) O nwere ike ịdị gị ka ihe na-adịghị mfe. N’eziokwu, ọ dịghị mfe. Ma, ọ ga-eme ka ị malite ibi ndụ kacha mma. Olee otú ọ ga-esi eme ya?

16. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 41:12, olee otú Jehova ga-esi gọzie ndị ji ndụ ha niile na-efe ya?

16 Ọ bụ Jehova kacha emesapụ aka. N’agbanyeghị ihe ọ bụla i nyere ya, o nweghị mgbe ọ na-agaghị enye gị ya mmaji kwuru mmaji. (Mak 10:29, 30) Ọ ga-enye gị ndụ kacha mma, nke ga-akacha eme obi ụtọ, nakwa nke ga-akacha aba uru, ma n’ụwa ochie a na-agba egwú ụla ya. Ma nke ahụ ka bụ naanị mmalite. Ụdị ndụ ị ga-amalite ibi mgbe i mechara baptizim ekwesịghị inwe ọgwụgwụ. Ị ga-enwe ike ịna-efe Nna gị nke eluigwe ị hụrụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi. Ị ga na-ahụkwu ya n’anya, yanwa ana-ahụkwu gị n’anya. Ị ga-adịkwa ndụ ruo ogologo oge niile yanwa dị ndụ, ya bụ, ruo mgbe niile ebighị ebi.—Gụọ Abụ Ọma 41:12.

17. Olee ihe i nwere ike inye Jehova ọ na-enweghị?

17 I nyefee Jehova onwe gị ma mee baptizim, ị ga-enwe ike inye Nna gị nke eluigwe ihe pụrụ ezigbo iche. Ọ bụ ya nyere gị ihe ọma niile i nwere. Ma, gịnwa nwere ike inye Onye nwe eluigwe na ụwa ihe ọ na-enweghị, ya bụ, ozi i ji obi gị niile na-ejere ya. (Job 1:8; 41:11; Ilu 27:11) O nweghị ihe ka mma ị ga-eji ndụ gị eme. O doro anya na ịhụnanya ị hụrụ Jehova bụ ihe kacha mma mere ị ga-eji mee baptizim.

GỊNỊ NA-EGBOCHI M IME BAPTIZIM?

18. Olee ajụjụ ndị i nwere ike ịjụ onwe gị?

18 Olee ihe ị ga-aza ma mmadụ jụọ gị, sị: Ị̀ ga-eme baptizim? Ọ bụ naanị gị ga-aza ajụjụ ahụ. Ihe ga-enyere gị aka ịza ya bụ ịjụ onwe gị, sị: ‘Gịnị na-egbochi m ime baptizim?’ (Ọrụ 8:36) Cheta ihe atọ ahụ anyị kwuru mere i ji kwesị ime baptizim. Nke mbụ bụ na ị hụrụ eziokwu na ezi omume n’anya. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ chọrọ ịhụ mgbe onye ọ bụla ga na-ekwu eziokwu, na-emekwa ihe dị mma?’ Nke abụọ, ị hụrụ Jizọs Kraịst n’anya. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ chọrọ ka Ọkpara Chineke bụrụ Eze m, chọọkwa ịna-eme ka ya?’ Nke atọ, bụ́kwanụ nke kacha ha niile, ị hụrụ Jehova n’anya. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ chọrọ ịna-efe Chineke, si otú ahụ na-eme ka obi ya ṅụrịa?’ Ọ bụrụ na ihe ị zara n’ajụjụ ndị a bụ ee, gịnịzi na-egbochi gị ime baptizim?—Ọrụ 16:33.

19. Gịnị mere na i kwesịghị igbu oge ime baptizm? Mee ihe atụ. (Jọn 4:34)

19 Ọ bụrụ na ọ ka na-eme gị obi abụọ ime baptizim, chee gbasara ihe atụ Jizọs mere. (Gụọ Jọn 4:34.) Ị̀ chọpụtara na Jizọs ji ime uche Nna ya tụnyere nri? Nri na-abara anyị uru. Jizọs ma na ihe niile Jehova gwara anyị mee na-abara anyị uru. Jehova achọghị ka anyị mee ihe ọ bụla ga-akpatara anyị nsogbu. Jehova ọ̀ chọrọ ka i mee baptizim? Ee. (Ọrụ 2:38) N’ihi ya, obi sie gị ike na ime ihe a ọ chọrọ ka i mee, ya bụ, ime baptizim, ga-abara gị uru. Ọ bụrụ na ị gaghị egbu oge iri nri kacha mma ị hụtụrụla, gịnị mere ị ga-eji egbu oge ime baptizim?

20. Olee ajụjụ anyị ga-aza n’isiokwu na-eso nke a?

20 Gịnị na-egbochi gị ime baptizim? Ọtụtụ ndị nwere ike ịsị: “Ejikerebeghị m.” Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ ikpebi inyefe Jehova onwe ya ma mee baptizim bụ ihe kacha mkpa o nwere ike ikpebi. N’ihi ya, tupu gị emee baptizim, i kwesịrị ichebara ya echiche nke ọma, gbaakwa ezigbo mbọ. Ọ ga-ewekwa gị oge. Ma, ọ bụrụ na ọ na-agụsi gị agụụ ike ime baptizim, gịnị ka i nwere ike ime ugbu a iji jikere? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-eso nke a.

ABỤ NKE 28 Ịbụ Enyi Jehova

a Onye ọ bụla a na-amụrụ Baịbụl kwesịrị ịgba mbọ ka e mee ya baptizim. Gịnị ga-eme ka onye a na-amụrụ Baịbụl chọọ ka e mee ya baptizim? Ọ bụ ịhụnanya. Gịnị ka ọ ga-ahụ n’anya? Ònyekwa ka o kwesịrị ịhụ n’anya? Anyị ga-amata azịza ya n’isiokwu a. Anyị ga-atụlekwa otú ihe ga-adịrị anyị ma e mee anyị baptizim.