Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Nwere Ike Ịmụ

Ihe I Nwere Ike Ịmụ

Ihe Ị Ga-eji “Ihe Ọhụrụ Ndị E Nwere” Eme

Ihe dị n’ebe a kpọrọ “Ihe Ọhụrụ Ndị E Nwere” na JW Library® nakwa na jw.org bụ vidio na isiokwu ọhụrụ ndị e wepụtara. Olee otú ị ga-esi eji ebe a amara nke ekwe na-akụ ugbu a?

JW Library

  • E wepụta isiokwu ndị ọhụrụ, a na-etinye ha ebe ha kwesịrị ịdị n’ebe a na-akpọ “Isiokwu Dị Iche Iche.” N’ihi ya, mgbe ọ bụla ị hụrụ isiokwu gbara n’ebe a kpọrọ “Ihe Ọhụrụ Ndị E Nwere,” i nwere ike isi na ya were isiokwu ndị ọhụrụ e tinyere. I nweziri ike ịgụ isiokwu ọhụrụ ahụ n’ebe elu elu ya. Ndị nke e wepụtaburu ga-adị n’okpuru ya.

  • O nwere ike ị gaghị agụchali akwụkwọ ndị buru ibu, dị ka magazin, otu mgbe. Ka i nwee ike ịmata nke ị na-agụchabeghị, i nwere ike itinye ya n’ebe a na-akpọ “Ihe Ndị Dị M Mkpa” ruo mgbe ị gụchara ya.

JW.ORG

E nwere ihe ndị na-anaghị agba na JW Library na-agba naanị na jw.org, dị ka ịma ọkwa na akụkọ. Na-echeta aga n’ebe a na-akpọ “Ihe Ọhụrụ Ndị E Nwere” ka ị hụ ihe ndị kacha ọhụrụ e tinyere.