ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 13
Jiri Ihe Ndị E Kere Eke Na-akụziri Ụmụ Gị Gbasara Jehova
‘Ònye kere ihe ndị a?’—AỊZA. 40:26.
ABỤ NKE 11 Ihe Chineke Kere Na-eto Ya
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Olee ihe na-agụsi ndị nne na nna agụụ ike imere ụmụ ha?
NDỊ nne na nna, anyị ma na unu chọrọ inyere ụmụ unu aka ka ha mara Jehova, hụkwa ya n’anya. Ma, anyị anaghị ahụ Chineke anya. Olee otú unu nwere ike isi nyere ụmụ unu aka ịghọta na Jehova dị adị, ha abịaruokwa ya nso?—Jems 4:8.
2. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi kụziere ụmụ ha àgwà Jehova?
2 Otu ụzọ dị ezigbo mkpa nne na nna ga-esi nyere ụmụ ha aka ịbịaru Jehova nso bụ ịmụrụ ha Baịbụl. (2 Tim. 3:14-17) Ma, Baịbụl kwukwara ụzọ ọzọ ụmụaka nwere ike isi mụta gbasara Jehova. N’akwụkwọ Ilu, e kwuru gbasara otú otu nna si chetara nwa ya ka ọ ghara ichefu àgwà ndị Jehova nwere, nke ihe ndị o kere eke na-akụziri anyị. (Ilu 3:19-21) Anyị ga-atụle ụzọ ụfọdụ ndị nne na nna nwere ike isi jiri ihe ndị Chineke kere kụziere ụmụ ha gbasara Jehova.
OLEE OTÚ UNU GA-ESI JIRI IHE NDỊ CHINEKE KERE NA-AKỤZIRI ỤMỤ UNU IHE?
3. Olee aka ndị nne na nna kwesịrị inyere ụmụ ha?
3 Baịbụl kwuru na ‘e leruo otú e si kee ụwa anya, a na-ahụ àgwà Chineke ndị a na-anaghị ahụ anya. Ihe ndị o kere na-emekwa ka a ghọta ụdị onye ọ bụ.’ (Rom 1:20) Ndị nne na nna, ọ ga-abụ na unu na ụmụ unu ịga legharịa anya na-amasị unu. Jirinụ oge ahụ nyere ha aka ka ha hụ otú ‘ihe ndị Chineke kere’ si akụziri anyị gbasara àgwà magburu onwe ha Jehova nwere. Ka anyị hụ ihe ndị nne na nna nwere ike ịmụta n’otú Jizọs si kụzie ihe.
4. Olee otú Jizọs si jiri ihe ndị Chineke kere kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe? (Luk 12:24, 27-30)
4 Ka anyị lee otú Jizọs si jiri ihe ndị e kere eke kụzie ihe. N’otu oge, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha leruo ugoloọma na okooko lili anya. (Gụọ Luk 12:24, 27-30.) Jizọs gaara ekwu gbasara anụmanụ ọ bụla ma ọ bụ osisi ọ bụla dị ya mma, ma o kpebiri iji nnụnụ na okooko osisi ndị na-eso ụzọ ya ma nke ọma kụziere ha ihe. Ọ ga-abụ na ndị na-eso ụzọ ya na-ahụ ugoloọma ndị na-efegharị nakwa okooko osisi ndị dị n’ubi. Weregodị ya na ị na-ahụ Jizọs ka ọ na-atụ ihe ndị a aka mgbe ọ na-ekwu okwu. Gịnị ka o mere mgbe ọ kpọchara ihe ndị a aha? Ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ihe bara ezigbo uru gbasara otú Nna ha nke eluigwe si emesapụ aka ma dị obiọma, ya bụ, na Jehova ga-enye ndị ohu ya nri na uwe otú ahụ ọ na-emere ugoloọma na okooko osisi.
5. Olee ihe ụfọdụ Chineke kere ndị nne na nna nwere ike iji akụziri ụmụ ha gbasara Jehova?
5 Ndị nne na nna, unu kụziwere ụmụ unu ihe, olee otú unu ga-esi eme ka Jizọs? I nwere ike ịkọrọ nwa gị gbasara ihe Jehova kere na-amasị gị, dị ka anụmanụ ma ọ bụ osisi kacha amasị gị. Ị gwawa ya gbasara ya, kọwaara ya ihe ọ na-akụziri anyị gbasara Jehova. I nweziri ike ịjụ nwa gị anụmanụ ma ọ bụ osisi kacha amasị ya. Ọ bụrụ na i jiri ihe e kere eke na-amasị ya na-akụziri ya gbasara Jehova, o nwere ike ime ka o gee gị ntị nke ọma.
6. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe mama Christopher mere?
6 Ndị nne na nna hà kwesịrị iwepụta oge buru ibu mụọ gbasara otu osisi ma ọ bụ otu anụmanụ tupu ha ejiri ya kụziere ụmụ ha gbasara Jehova? Ọ dịchaghị mkpa. Mgbe Jizọs ji ugoloọma na okooko lili na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe, ọ bịaghị kọwawa otú ugoloọma si eri nri ma ọ bụ otú okooko lili si eto. Ọ bụrụgodị na nwa gị na-achọ ka a kọwakwuoro ya gbasara ihe ndị Jehova kere, mgbe ụfọdụ, ikwu obere okwu ma ọ bụ ịjụ ya obere ajụjụ nwere ike inyere ya aka ịghọta ihe ị chọrọ ịkụziri ya. Lee ihe otu nwanna aha ya bụ Christopher kwuru mere mgbe ọ ka bụ nwata. Ọ sịrị: “Mama m nwere ike ikwu obere okwu ka o jiri ya nyere anyị aka ikele Jehova maka ihe ndị o kere eke anyị na-ahụ gburugburu anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị erutewe n’ebe ugwu dị, o nwere ike ịsị anyị, ‘Legodị otú ugwu a si buo ibu ma maa mma. Ọ̀ bụ na Jehova adịghị ebube?’ Ma ọ bụkwanụ, anyị rute n’akụkụ osimiri, o nwere ike ịsị, ‘Legodị otú ebili mmiri si akpa ike. Ọ̀ bụ na ọ naghị egosi na Chineke dị ike?’ ” Christopher sịrị: “Ihe ndị a dị mfe mama m na-ekwu mere ka anyị na-echebara ihe ndị Chineke kere echiche nke ọma.”
7. Olee otú i nwere ike isi akụziri ụmụ gị ichebara ihe Jehova kere echiche?
7 Ka ụmụ gị na-etolite, i nwere ike ịkụziri ha otú ha ga-esi na-echebakwuru ihe Chineke kere echiche nakwa otú ha ga-esi jiri ya na-amụta àgwà Jehova. I nwere ike ikwu gbasara otu ihe Jehova kere ma jụọ nwa gị, sị, “Gịnị ka ihe a na-akụziri gị gbasara Jehova?” Ihe ọ ga-aza gị nwere ike iju gị anya.—Mat. 21:16.
OLEE MGBE I NWERE IKE IJI IHE CHINEKE KERE KỤZIERE ỤMỤ GỊ IHE?
8. Olee ohere ndị nne na nna bụ́ ndị Izrel nwere mgbe ha na-aga “n’okporo ụzọ”?
8 A gwara ndị nne na nna bụ́ ndị Izrel ka ha na-akụziri ụmụ ha iwu Jehova mgbe ha na-aga “n’okporo ụzọ.” (Diut. 11:19) E nwere ọtụtụ ụzọ n’ime obodo ndị dị n’Izrel. A na-ahụ ụdị anụmanụ, nnụnụ, na okooko osisi dị iche iche n’ebe ndị ahụ. Ka ezinụlọ dị iche iche bụ́ ndị Izrel si n’ụzọ ndị ahụ na-aga ebe ha na-aga, ndị nne na nna nwere ike ịgwa ụmụ ha gbasara ihe ndị Jehova kere. Ọ ga-abụkwa na unu bụ́ ndị nne na nna nwere ụdị ohere a unu ga-eji jiri ihe ndị Jehova kere kụziere ụmụ unu ihe. Ka anyị hụ otú ụfọdụ ndị nne na nna si mee ya.
9. Olee ihe ị mụtara n’aka Punitha na Katya?
9 E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Punitha. O bi n’obodo mepere emepe n’India. Ọ sịrị: “Anyị gawa ileta ndị ezinụlọ anyị bi n’ime obodo, anyị na-ewere oge ahụ ka ohere anyị ga-eji nyere ụmụ anyị aka ịmata gbasara ihe ndị dị ịtụnanya Jehova kere. Ama m na ụmụ anyị na-aghọta gbasara ihe ndị Jehova kere nke ọma ma ha nọrọ n’ime obodo karịa n’obodo mepere emepe.” Ndị nne na nna, o nwere ike ụmụ unu agaghị echefu oge unu na ha ji nọrọ n’ebe mara mma. Otu nwanna nwaanyị bi na Moldova aha ya bụ Katya sịrị: “Ihe mere n’oge m na-eto eto m kacha echeta bụ oge mụ na ndị mụrụ m gara n’ime obodo. Obi dị m ụtọ na ha bidoro mgbe m dị ezigbo obere na-akụziri m ileru ihe ndị Jehova kere anya, na isi otú ahụ mata na Jehova dị adị.”
10. Gịnị ka ndị nne na nna nwere ike ime ma ọ bụrụ na ọ na-esiri ha ike ịga n’ime obodo? (Kọwaa ihe dị n’igbe bụ́ “ Ihe Ga-enyere Ndị Nne na Nna Aka.”)
10 Ọ bụrụkwanụ na i nweghị ike ịga n’ime obodo gaa lee ihe ndị Chineke kere? Otu nwanna bi n’India aha ya bụ Amol sịrị: “N’ebe m bi, ndị mụrụ ụmụ na-arụ ọrụ ọtụtụ awa. Ịga n’ime obodo na-efukwa ezigbo ego. Ma, ha na ụmụ ha nwere ike ịhụ ihe ndị Jehova kere ma kwuo gbasara àgwà Jehova ma ha gaa n’ebe a na-aga ezu ike ma ọ bụ nọrọ na varanda dị n’ụlọ elu na-elepụ anya.” I leruo anya nke ọma, i nwere ike ịchọpụta na e nwekwara ọtụtụ ihe Jehova kere dị nso n’ụlọ unu i nwere ike igosi ụmụ gị. (Ọma 104:24) I nwere ike ịhụ ụmụ nnụnụ, ụmụ ahụhụ, osisi, na ihe ndị ọzọ. Otu nwanna nwaanyị si Jamanị aha ya bụ Karina sịrị: “Mama m ejighị okooko osisi egwu egwu. N’ihi ya, mgbe m dị obere, ọ na-egosi m ọmarịcha okooko osisi mgbe ọ bụla anyị na-aga n’ụzọ.” Ndị nne na nna, unu nwere ike iji ọtụtụ vidio na akwụkwọ ndị nzukọ Jehova na-ewepụta, ndị na-ekwu gbasara ihe ndị Jehova kere, kụziere ụmụ unu ihe. N’agbanyeghị otú ihe si dịrị gị, i nwere ike inyere ụmụ gị aka ileru ihe ndị Jehova kere anya. Ka anyị tụlee ụfọdụ àgwà Jehova i nwere ike ịkụziri ụmụ gị.
‘A NA-AHỤ ÀGWÀ JEHOVA NDỊ A NA-ANAGHỊ AHỤ ANYA’
11. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi nyere ụmụ ha aka ịmata na Jehova hụrụ anyị n’anya?
11 Iji nyere ụmụ gị aka ịghọta na Jehova hụrụ anyị n’anya, i nwere ike igosi ha otú ọtụtụ ụmụ anụmanụ na-esi elekọta ụmụ ha. (Mat. 23:37) I nwekwara ike ịgwa ha gbasara ọtụtụ ihe magburu onwe ha Jehova kere n’ụdị ha dị iche iche. Karina anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ọ na-abụ anyị na-aga n’okporo ụzọ, mama m agwa m ka m kwụsịtụ leruo okooko osisi nke ọ bụla anya chọpụta otú o si dị iche n’ibe ya, nakwa otú o si egosi na Jehova hụrụ anyị n’anya. Ọtụtụ afọ agaala kemgbe ihe a mere, ma m ka na-eleru okooko osisi anya nke ọma. M na-eleru ụcha ha anya, na-achọpụtakwa otú ha si dị iche ná ndị ọzọ. Ha na-echetara m na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu.”
12. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi nyere ụmụ ha aka ịghọta na Chineke nwere amamihe? (Abụ Ọma 139:14) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
12 Nyere ụmụ gị aka ịghọta na Chineke nwere amamihe. O doro anya na Jehova ka anyị niile mara ihe. (Rom 11:33) Dị ka ihe atụ, i nwere ike igosi nwa gị otú mmiri si alaghachi na mbara igwe ghọọ urukpuru, ikuku ana-ebugharịkwa ya si n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ. (Job 38:36, 37) I nwekwara ike ịkọwara ya otú dị ebube Chineke si kee ahụ́ anyị. (Gụọ Abụ Ọma 139:14.) Ka anyị lee otú otu nna aha ya bụ Vladimir si mee ya. Ọ sịrị: “E nwere otu ụbọchị nwa anyị nwoke si n’ígwè ya daa, merụọ ahụ́. Mgbe ụbọchị ole na ole gara, ọnyá ahụ lara. Mụ na nwunye m kọwaara ya na Jehova kere ahụ́ anyị otú ọ ga na-emezi onwe ya. Anyị gwakwara ya na ihe ụmụ mmadụ mepụtara anaghị eme otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ụgbọala akpọkaa, ọ naghị emezi onwe ya. Ihe a nyeere nwa anyị aka ịghọta na Jehova nwere amamihe.”
13. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi nyere ụmụ ha aka ịghọta na Chineke dị ike? (Aịzaya 40:26)
13 Jehova na-agwa anyị ka anyị lee anya n’eluigwe ma chee gbasara ike ya dị ebube o ji dowe kpakpando n’ebe ha kwesịrị ịdị. (Gụọ Aịzaya 40:26.) I nwere ike ịgba ụmụ gị ume ka ha lelie anya elu ma chebara ihe ha hụrụ echiche. Lee ihe otu nwanna nwaanyị bi na Taịwan aha ya bụ Tingting kwuru gbasara ihe mere mgbe ọ ka bụ nwata. Ọ sịrị: “E nwere mgbe mama m kpọ m mee mkpapụ. Ebe ọ bụ na ebe ahụ anyị nọ abụghị n’obodo mepere emepe, anyị nwere ike ịhụ kpakpando ndị dị n’eluigwe nke ọma. N’oge ahụ, ụmụaka ibe m na-enye m nsogbu ka m mee ihe na-adịghị mma. M nọkwa na-eche ma m̀ ka ga-erubeliri Jehova isi. Mama m gwara m ka m chee gbasara otú Jehova si jiri ike ya kee kpakpando niile, gwakwa m ka m cheta na Jehova ga-enyeliri m aka imeri nsogbu ọ bụla bịaara m. Mgbe m leruchara ihe ndị Jehova kere eke anya n’ebe ahụ anyị gara, o mere ka m matakwuo Jehova nke ọma, meekwa ka m kpebisikwuo ike ịna-efe ya.”
14. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi jiri ihe ndị Jehova kere nyere ụmụ ha aka ịmata na Jehova bụ Chineke obi ụtọ?
14 Ihe ndị Jehova kere na-egosi na ọ bụ onye obi ụtọ nakwa na ọ chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ. Ndị sayensị achọpụtala na ọtụtụ ụmụ anụmanụ, ma azụ̀ ma nnụnụ, na-egwuri egwu. (Job 40:20) Ụmụ gị hà achịtụla ọchị mgbe ha na-ele ka ụmụ anụmanụ na-egwuri egwu? O nwere ike ịbụ na ha ahụtụla ka ụmụ nkịta na-egwuri egwu. N’oge ọzọ ụmụ gị chịrị ọchị mgbe ha na-ele ihe ụmụ anụmanụ na-eme, i nwere ike ichetara ha na Jehova anyị na-efe bụ Chineke obi ụtọ.—1 Tim. 1:11.
KA GỊ NA EZINỤLỌ GỊ NA-ELEKỌ IHE NDỊ JEHOVA KERE ỌNỤ
15. Gịnị nwere ike inyere ndị nne na nna aka ịchọpụta ihe ụmụ ha na-eche? (Ilu 20:5) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
15 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri ndị nne na nna ike ime ka ụmụ ha kwuo gbasara nsogbu ndị ha na-enwe. Ọ bụrụ na ọ dị ụmụ gị otú ahụ, i nwere ike ịgbalị chọpụta ihe ha na-eche. (Gụọ Ilu 20:5.) Ọ na-adịrị ụfọdụ ndị nne na nna mfe ịmata ihe dị ụmụ ha n’obi ma ha na ha nọrọ na-ele ihe ndị Chineke kere eke. N’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na a naghị enwecha ihe ndị na-eme ka uche ha na ụmụ ha ghara ịdị n’ihe ha na-ekwu. Otu nwanna bi na Taịwan aha ya bụ Masahiko kwuru ihe ọzọ kpatara ya. Ọ sịrị: “Anyị na ụmụ anyị pụọ apụọ ịga rịa ugwu ma ọ bụ gaa n’akụkụ osimiri, ahụ́ na-aka eru ha ala. Ọ na-aka adịrị anyị mfe n’oge ahụ ịchọpụta ihe ha na-eche.” Katya anyị kwuru okwu ya ná mmalite sịrị: “Anyị gbasaa ụlọ akwụkwọ, mama m na-akpọrọ m gaa n’otu ogige mara mma. Ahụ́ na-eru m ala n’ebe ahụ. N’ihi ya, ọ na-adịrị m mfe ịgwa ya ihe ndị mere n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ihe na-echegbu m.”
16. Olee otú ezinụlọ nwere ike isi jiri oge ha na-eleru ihe ndị Jehova kere anya mee onwe ha obi ụtọ?
16 Ezinụlọ nwekwara ike iji oge ha ji eleru ihe ndị Jehova kere anya gwurie egwu, ahụ́ eruokwa onye ọ bụla ala, si otú ahụ mee ka ha na ibe ha dịkwuo ná mma. Baịbụl kwuru na e nwere “oge ịchị ọchị” na “oge ịwụli elu.” (Ekli. 3:1, 4, na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Jehova kere ebe ndị mara mma n’ụwa anyị nwere ike ịnọ mee ihe ndị na-atọ anyị ụtọ. Ọ na-amasị ọtụtụ ezinụlọ ịnọkọta ọnụ n’ebe ha nwere ike ịhụ ihe ndị Chineke kere, n’ime obodo, n’ugwu, ma ọ bụ n’akụkụ osimiri. Ọ na-atọ ụfọdụ ụmụaka ụtọ igwu egwu na ịgbagharị n’ebe a na-aga ezu ike, ileru ụmụ anụmanụ anya, ma ọ bụ igwu mmiri n’osimiri ma ọ bụkwanụ n’iyi. Oge ndị a bụ oge magburu onwe ha anyị nwere ike iji tụrụ ndụ ma anyị pụọ apụọ n’ihi na e nwere ọtụtụ ohere anyị nwere iji were ihe ndị Chineke kere mee onwe anyị obi ụtọ.
17. Gịnị mere ndị nne na nna ji kwesị inyere ụmụ ha aka ka ha na-eleru ihe ndị Jehova kere anya?
17 N’ụwa ọhụrụ, ndị nne na nna na ụmụ ha ga-enwe ụdị ọṅụ ha na-enwetụbeghị ka ha na-ekiri ihe ndị Jehova kere. N’oge ahụ, e nweghị ihe ọ bụla ga-eme ka anyị tụọ ụmụ anụmanụ ụjọ, hanwa agaghịkwa atụ anyị ụjọ. (Aịza. 11:6-9) Anyị ga-enwe oge buru ibu anyị ga-eji na-eleru ihe ndị Jehova kere anya. (Ọma 22:26) Ndị nne na nna, unu echela ruo oge ahụ tupu unu amalite inyere ụmụ unu aka ka ileru ihe ndị Chineke kere eke anya na-amasị ha. Ka i ji ihe ndị Jehova kere na-akụziri ụmụ gị ihe, ha ga-abịa ghọta na ihe Eze Devid kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Jehova, . . . e nweghị onye rụtụrụla ọrụ ndị ị rụrụ.”—Ọma 86:8.
ABỤ NKE 134 Ụmụ Bụ Onyinye Si n’Aka Chineke
a Ọtụtụ ụmụnna anyị na-echeta oge tọrọ ha ụtọ ha na nne na nna ha bụ́ Ndị Kraịst ji na-eleru ihe Chineke kere eke anya. Ha ka na-echeta otú ndị mụrụ ha si jiri oge ahụ kụziere ha gbasara àgwà ndị Jehova nwere. Ọ bụrụ na i nwere ụmụ, olee otú i nwere ike isi jiri ihe ndị e kere eke kụziere ha gbasara Jehova? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu a.