Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 14

“Mmadụ Niile Ga-eji Ya Mata na Unu Bụ Ndị Na-eso Ụzọ M”

“Mmadụ Niile Ga-eji Ya Mata na Unu Bụ Ndị Na-eso Ụzọ M”

Ọ bụrụ na unu hụrụ ibe unu n’anya, mmadụ niile ga-eji ya mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.”—JỌN 13:35.

ABỤ NKE 106 Ka Anyị Mụta Ịhụnanya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

Olee ihe ọtụtụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-eche ma ha hụ otú anyị si hụ ibe anyị n’anya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1)

1. Olee ihe na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ mgbe mbụ ha bịara ọmụmụ ihe anyị? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

 WEREGODỊ ya na ị hụrụ di na nwunye bịara ọmụmụ ihe mbụ ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova. Otú ụmụnna si nabata ha na otú ụmụnna si hụ ibe ha n’anya tọgburu ha atọgbu. Ka ha nọ n’ụzọ na-ala, nke nwaanyị sịrị di ya, ‘Ndị a dị nnọọ iche ná ndị ọzọ m hụtụrụla. Ihe ha masịrị m.’

2. Olee ihe mere ka ụfọdụ ndị kwụsị ife Jehova?

2 Otú Ndị Kraịst si hụ ibe ha n’anya pụrụ nnọọ iche. Ma, Ndịàmà Jehova ezughị okè. (1 Jọn 1:8) N’ihi ya, ka anyị na-amatakwu ụmụnna anyị na ha nọ n’ọgbakọ, anyị nwere ike ịna-ahụkwu ụfọdụ ihe ha na-emejọ. (Rom 3:23) Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị ekwela ka ihe ha hụrụ ndị ọzọ na-emejọ mee ka ha kwụsị ife Jehova.

3. Gịnị ka ndị mmadụ ga-eji mata ezigbo Ndị Kraịst? (Jọn 13:34, 35)

3 Legodị anya ọzọ n’amaokwu Baịbụl e si nweta isiokwu a. (Gụọ Jọn 13:34, 35.) Gịnị ka ndị mmadụ ga-eji mata ezigbo Ndị Kraịst? Ọ bụ na ha ga-ahụ ibe ha n’anya, ọ bụghị na ha ga-ezu okè. Ị̀ chọpụtara na Jizọs asịghị: ‘Unu ga-eji ya mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m’? Kama, ọ sịrị: “Mmadụ niile ga-eji ya mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.” Ihe a Jizọs kwuru pụtara na ọ bụghị naanị ndị na-eso ụzọ ya ga-achọpụta ndị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst n’ihi otú ha si hụ ibe ha n’anya n’eziokwu, kama ndị na-anọghị n’ọgbakọ ga-achọpụtakwa ya.

4. Olee ihe ụfọdụ ndị nwere ike ịchọ ịmata gbasara ezigbo Ndị Kraịst?

4 Ụfọdụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova nwere ike ịna-ajụ, sị: ‘Olee otú ịhụnanya si egosi ndị bụ́ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs? Olee otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ ndịozi ya n’anya? Oleekwa otú ọ ga-esi kwe ndị mmadụ omume ime ka Jizọs taa?’ Ndịàmà Jehova kwesịkwara ichebara ajụjụ ndị a echiche. Ime otú ahụ ga-enyere anyị niile aka ịna-ahụkwu ụmụnna anyị n’anya, karịchaa, ma ha mejọọ anyị.—Efe. 5:2.

GỊNỊ MERE ỊHỤNANYA JI BỤRỤ IHE PỤRỤ ICHE E JI AMATA EZIGBO NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS?

5. Kọwaa ihe Jizọs kwuru na Jọn 15:12, 13.

5 Jizọs kọwara na ndị na-eso ụzọ ya ga-ahụ ibe ha n’anya otú pụrụ iche. (Gụọ Jọn 15:12, 13.) Legodị ihe Jizọs nyere ha n’iwu. Ọ sịrị: ‘Hụnụ ibe unu n’anya otú m hụrụ unu n’anya.’ Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Jizọs kọwara na ihe ọ pụtara bụ na ha ga-ahụ ibe ha n’anya karịa onwe ha ma ọ bụkwanụ na ha ga-adị njikere ịnwụ maka ibe ha ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. b

6. Olee otú Okwu Chineke si gosi na ịhụnanya dị ezigbo mkpa?

6 Okwu Chineke kwuru na ịhụnanya dị ezigbo mkpa. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ amaokwu Baịbụl kacha amasị ọtụtụ ndị bụ: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) “Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.” (Mat. 22:39) “Onye hụrụ ndị ọzọ n’anya na-adị njikere mgbe niile ịgbaghara ha ma ha mejọọ ya.” (1 Pita 4:8) “Ịhụnanya anaghị akwụsị akwụsị.” (1 Kọr. 13:8) Amaokwu Baịbụl ndị a na ndị ọzọ mere ka o doo anya na anyị kwesịrị inwe àgwà a magburu onwe ya.

7. Gịnị mere na Ekwensu agaghị emeli ka ndị mmadụ hụ ibe ha n’anya ma dịrị n’otu?

7 Ọtụtụ ndị na-ajụ, sị: ‘Olee otú m ga-esi mata nke bụ́ ezigbo okpukpe? Okpukpe niile na-ekwu na ha na-akụzi eziokwu. Ma, ihe ha na-akụzi gbasara Chineke abụghị otu.’ Ekwensu emeela ka e nwee ọtụtụ okpukpe bụ́ adịgboroja, ya emee ka o siere ndị mmadụ ike ịmata nke bụ́ ezigbo okpukpe. Ma, Ekwensu agaghị emeli ka ndị si ebe niile n’ụwa dịrị n’otu ma hụ ibe ha n’anya. Ọ bụ naanị Jehova ga-emeli ya. Ihe mere anyị ji mata ihe a bụ na ọ bụ Jehova ka ịhụnanya si n’aka. Ọ bụ naanị ndị Jehova nyere mmụọ nsọ ya ga-ahụli ibe ha n’anya n’eziokwu. (1 Jọn 4:7) Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị na ọ bụ naanị ezigbo ndị na-eso ụzọ ya ga-eji obi ha niile hụ ibe ha n’anya.

8-9. Olee ihe ọtụtụ ndị mere mgbe ha chọpụtara otú Ndịàmà Jehova si hụ ibe ha n’anya?

8 Ihe Jizọs kwuru na-emezu. Ọtụtụ ndị achọpụtala ndị bụ́ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ihi otú ha si hụ ibe ha n’anya. Dị ka ihe atụ, otu nwanna aha ya bụ Ian chetara ihe mere ná mgbakọ mbụ ọ gara. E mere mgbakọ ahụ n’ámá egwuregwu dị nso n’ụlọ ya. Ian agabuola n’ámá egwuregwu ahụ ọnwa ole na ole tupu mgbe ahụ ịga lee egwuregwu a na-eme ebe ahụ. Ọ sịrị: “Otú ndị bịara mgbakọ ahụ si kpaa àgwà dị nnọọ iche n’otú ndị bịara mgbe ahụ m gara lee egwuregwu si kpaa àgwà. Ndịàmà Jehova kpara àgwà ọma, ha jikekwara nke ọma. Ụmụ ha kpakwara àgwà ọma.” Ọ sịkwara: “Nke kachanụ bụ na ha yiri ndị ihe ha nwere juru afọ, obi rukwara ha ala. Ọ bụ ụdị ihe a ka m chọrọ ná ndụ m. Anaghị m echeta okwu ọ bụla e kwuru ná mgbakọ ahụ. Ma, m ka na-echeta àgwà ọma Ndịàmà Jehova kpara.” c Ndịàmà Jehova na-akpa àgwà ọma maka na ha ji obi ha niile hụ ibe ha n’anya. Ebe ọ bụ na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya, anyị na-eji obiọma emeso ha ihe, na-akwanyekwara ha ùgwù.

9 Ụdị ihe a mekwara otu nwanna aha ya bụ John n’oge mbụ ọ gara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ọ sịrị: “Àgwà ọma ha na otú ha si hụ ibe ha n’anya masịrị m. Ha dịcha ka ndị nsọ. Otú ha si jiri obi ha niile hụ ibe ha n’anya mere ka m ghọta na okpukpe ha bụ ezigbo okpukpe.” d Ụdị akụkọ a na-egosi na Ndịàmà Jehova bụ ezigbo Ndị Kraịst.

10. Olee oge anyị ga-eji gosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

10 Dị ka anyị kwuru ná mmalite, e nweghị nwanna zuru okè. Mgbe ụfọdụ, ha nwere ike ime ma ọ bụ kwuo ihe wutere anyị. e (Jems 3:2) Ụdị oge ahụ bụ ohere ọma anyị ga-eji kwuo ma ọ bụ mee ihe ga-egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya. Ka anyị lee ihe anyị ga-amụta n’ihe Jizọs mere mgbe ụdị ihe ahụ mere.—Jọn 13:15.

OLEE OTÚ JIZỌS SI GOSI NA Ọ HỤRỤ NDỊOZI YA N’ANYA?

Jizọs gosiri na ọ hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya ma mgbe ha mere ihe na-adịghị mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 ruo na nke 13)

11. Olee àgwà ọjọọ Jems na Jọn kpara? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

11 Jizọs atụghị anya na ndị na-eso ụzọ ya ga-ezu okè. Kama, o ji obiọma nyere ha aka ka ha gbanwee àgwà ndị ga-eme ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma. N’otu oge, ndịozi ya abụọ bụ́ Jems na Jọn gwara mama ha ka ọ bịa rịọ Jizọs ka o nye ha ọkwá pụrụ iche n’Alaeze. (Mat. 20:20, 21) Ihe a Jems na Jọn mere gosiri na ha dị mpako nakwa na ha chọrọ ịka ndị ọzọ.—Ilu 16:18.

12. Ọ̀ bụ naanị Jems na Jọn kpara àgwà na-adịghị mma? Kọwaa.

12 Ọ bụghị naanị Jems na Jọn kpara àgwà ọjọọ n’oge ahụ. Lee ihe Baịbụl kwuru ndịozi ndị ọzọ mere. Ọ sịrị: “Mgbe mmadụ iri ndị nke ọzọ nụrụ ihe a, ha wesoro ụmụnne abụọ ahụ iwe.” (Mat. 20:24) Anyị nwere ike iji uche anyị hụ ka ndịozi ndị ọzọ na Jems na Jọn na-agwa ibe ha okwu na-adịghị mma. O nwere ike ịbụ na ha kwuru ihe ndị dị ka: ‘Oleedị ndị unu chere unu bụ mere unu ga-eji rịọ ka e nye unu ọkwá pụrụ iche n’Alaeze? Ọ bụghị naanị unu so Jizọs rụsie ọrụ ike. Ọ bụrụ na e kwesịrị inye unu ọkwá pụrụ iche, e kwesịkwara inye anyịnwa.’ N’agbanyeghị ihe ha kwuru, ha kwere ka ihe a merenụ mee ka ha ghara ịhụ ibe ha n’anya n’oge ahụ.

13. Gịnị ka Jizọs mere mgbe ndị na-eso ụzọ ya mejọrọ ihe? (Matiu 20:25-28)

13 Gịnị ka Jizọs mere? O weghị iwe. Ọ sịghị na ọ na-aga ịchọta ndịozi ndị ọzọ ka ha mma, ndị dị umeala n’obi karịa ha, nakwa ndị ga-ahụ ibe ha n’anya mgbe niile. Kama, Jizọs nweere ha ndidi n’ihi na ọ ma na ha chọrọ ime ihe dị mma. (Gụọ Matiu 20:25-28.) Ọ kwụsịghị igosi ha na ọ hụrụ ha n’anya n’agbanyeghị na nke ahụ abụghị nke mbụ ma ọ bụkwanụ nke ikpeazụ ndịozi ya ahụ nọ na-arụ ụka onye ka ukwuu n’ime ha.—Mak 9:34; Luk 22:24.

14. Olee otú ndị mmadụ si akpa àgwà n’ebe ndị na-eso ụzọ Jizọs toro?

14 O doro anya na Jizọs chetara na otú ndị mmadụ si akpa àgwà n’ebe ndịozi ya toro kpara ha aka ọjọọ. (Jọn 2:24, 25) N’ebe ha toro, ndị isi okpukpe ejighị mmadụ ịbụ onye a ma ama na mmadụ ịnọ n’ọkwá ukwu egwu egwu. (Mat. 23:6; gụọ isiokwu bụ́ “Ụlọ Nzukọ Ndị Juu—Ebe Jizọs na Ndị Na-eso Ụzọ Ya Kwusara Ozi Ọma.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Eprel 1, 2010, peeji nke 16 ruo 18) Ndị isi okpukpe ndị Juu chere na ha ka ndị ọzọ mma. f (Luk 18:9-12) Jizọs ghọtara na ndịozi ya si n’àgwà ndị mmadụ na-akpa mụta otú ha si were onwe ha na ndị ọzọ. (Ilu 19:11) Ọ tụwaghị anya ka ndị na-eso ụzọ ya ghara imejọ ihe ọ bụla. O nwekwaara ha ndidi mgbe ha mejọrọ ihe. Ọ ma na ha chọrọ ime ihe dị mma. N’ihi ya, o nweere ha ndidi ma nyere ha aka ka ha ghara ịdị mpako na ịna-achọ ịka ndị ọzọ, kama ka ha na-ahụ ndị ọzọ n’anya.

OLEE OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI NA-EME KA JIZỌS?

15. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ mere mgbe Jems na Jọn mejọrọ ihe?

15 Anyị mụtara ọtụtụ ihe n’ihe mere mgbe Jems na Jọn mejọrọ ihe. Ihe ahụ ha rịọrọ Jizọs, ya bụ, ka e nye ha ọkwá pụrụ iche n’Alaeze Chineke, adịghị mma. Ma, ndịozi ndị ọzọ mejọkwara ihe n’ihi na ha kwere ka ihe ahụ merenụ mee ka ha ghara ịdị n’otu. N’agbanyeghị ya, Jizọs meere ndịozi ya iri na abụọ niile obiọma, hụkwa ha n’anya. Gịnị ka anyị na-amụta? Ihe dị mkpa abụghị naanị ihe ndị ọzọ mere anyị, kama, ihe anyị mere mgbe ndị ọzọ mejọrọ ihe dịkwa mkpa. Olee ihe ga-enyere anyị aka? Ọ bụrụ na nwanna mere ihe were anyị iwe, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee ihe mere ihe a ji ewute m otú a? Ọ̀ na-egosi na m nwere àgwà na-adịghị mma m kwesịrị ịgba mbọ ka m gbanwee? Ka ọ̀ ga-abụ na ihe adịrịghị onye ahụ mejọrọ m mfe? Ọ bụrụgodị na m chere na m kwesịrị iwe iwe maka ihe ahụ merenụ, m̀ nwere ike igosi na m hụrụ nwanna m n’anya, leghara ihe ahụ o mere m anya?’ Ọ bụrụ na anyị ana-egosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya, anyị na-egosi na anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst.

16. Olee ihe ọzọ anyị nwere ike ịmụta n’aka Jizọs?

16 Ihe Jizọs mere na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ịgba mbọ na-aghọta ụmụnna anyị. (Ilu 20:5) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jizọs nwere ike ịmata ihe dị ndị mmadụ n’obi. Anyịnwa enweghị ike ịmata ihe dị mmadụ n’obi. Ma, anyị nwere ike inwere ụmụnna anyị ndidi ma ọ bụrụ na ha emee ihe wutere anyị. (Efe. 4:1, 2; 1 Pita 3:8) Ọ ga-adịrị anyị mfe inwere ụmụnna anyị ndidi ma ha mejọọ anyị ma ọ bụrụ na anyị amata ha nke ọma. Legodị otu ihe atụ.

17. Olee uru otu onye nlekọta sekit ritere mgbe ọ matakwuru nwanna ya nke ọma?

17 Otu onye nlekọta sekit chetara otu nwanna nọ n’otu ọgbakọ o letara n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Afrịka. Na mbụ, o chere na nwanna ahụ bụ onye ọjọọ. Olee ihe onye nlekọta sekit a mere? Ọ sịrị: “Kama izewe nwanna a eze, ekpebiri m ịmatakwu ya nke ọma.” Mgbe ya na nwanna ahụ nọrịchara, ọ chọpụtara na otú e si zụlite nwanna ahụ mere ka ọ na-emeso ndị ọzọ otú o si emeso ha. Onye nlekọta sekit ahụ sịrị: “Ozugbo m ghọtara otú nwanna a si gbaa ezigbo mbọ ịgbanwe nakwa mgbanwe ndị o merela, ihe ya bịara na-amasị m. Anyị ghọrọ ezigbo ndị enyi.” N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị agbalịa na-aghọta ụmụnna anyị, ọ ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe ịhụ ha n’anya.

18. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị ma ọ bụrụ na nwanna emee ihe wutere anyị? (Ilu 26:20)

18 Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike iche na anyị kwesịrị ịga ka anyị na nwanna mejọrọ anyị kwurịta okwu. Ma anyị kwesịrị ibu ụzọ jụọ onwe anyị ajụjụ ndị dị ka, ‘M̀ ma ihe niile merenụ?’ (Ilu 18:13) ‘Ọ̀ ga-abụ na nwanna a ebughị n’obi imejọ m?’ (Ekli. 7:20) ‘M̀ metụla ụdị ihe a o mere?’ (Ekli. 7:21, 22) ‘Ọ bụrụ na mụ agaa ka mụ na ya kwurịta ya, ọ̀ ga-eme ka ihe kakwuo njọ?’ (Gụọ Ilu 26:20.) Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge chebara ajụjụ ndị a echiche, anyị nwere ike ịchọpụta na ịhụnanya ga-eme ka anyị leghara ihe ahụ merenụ anya.

19. Olee ihe i kpebisiri ike ime?

19 Anyị bụ́ Ndịàmà Jehova na-egosi na anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst n’ihi na anyị hụrụ ibe anyị n’anya. Onye ọ bụla n’ime anyị ga-egosi na ọ bụ ezigbo onye na-eso ụzọ Jizọs ma ọ na-ahụ ụmụnna ya n’anya n’agbanyeghị na ha ezughị okè. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ya, ndị ọzọ nwere ike ịghọta na anyị na-ekpe ezigbo okpukpe ma soro anyị na-efe ezi Chineke anyị bụ́ Jehova. Ka anyị kpebisie ike na anyị agaghị akwụsị igosi ụmụnna anyị ịhụnanya e ji amata ezigbo Ndị Kraịst.

ABỤ NKE 17 “Achọrọ M”

a Ihe na-eme ka ọtụtụ ndị chọọ ịmụ gbasara Jehova na Okwu ya bụ́ Baịbụl bụ ma ha hụ otú anyị si hụ ibe anyị n’anya. Ma, anyị ezughị okè. N’ihi ya, mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri anyị ike igosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya. Ka anyị leba anya n’ihe mere ịhụnanya ji dị ezigbo mkpa na otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jizọs ma ụmụnna anyị mejọọ ihe.

b Gụọ akwụkwọ bụ́ ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M,’ isi nke 17, paragraf nke 10 na nke 11.

c Gụọ isiokwu bụ́ “Ndụ M Enweela Isi Ugbu A.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Nọvemba 1, 2012, peeji nke 13 na nke 14.

d Gụọ isiokwu bụ́ “Echere M na M Na-ekpori Ndụ.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Mee 1, 2012, peeji nke 18 na nke 19.

e Ihe a na-ekwu gbasara ya n’isiokwu a abụghị mmehie dị oké njọ ndị okenye kwesịrị ilebara anya, dị ka ndị nke ahụ e kwuru gbasara ha ná 1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.

f E kwuru na otu onye rabaị mechara kwuo, sị: “N’ụwa a, e nwere ma é nweghị ihe ọzọ mmadụ iri atọ bụ́ ndị ezi omume ka Ebreham. Ọ bụrụ na ha dị iri atọ, mụ na nwa m nwoke so na ha. Ọ bụrụ na ha dị iri, mụ na nwa m nwoke so na ha. Ọ bụrụ na ha dị ise, mụ na nwa m nwoke so na ha. Ọ bụrụ na ha dị abụọ, ọ bụ mụ na nwa m nwoke. Ọ bụrụkwanụ na ọ bụ naanị otu onye, ọ bụ mụnwa.”