Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 11

Otú Ị Ga-esi Jikere Ime Baptizim

Otú Ị Ga-esi Jikere Ime Baptizim

Gịnị ga-egbochi ime m baptizim?”—ỌRỤ 8:36.

ABỤ NKE 50 Ekpere M Ji Nyefee Chineke Onwe M

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

N’ụwa niile, ma ụmụaka ma ndị agadi na-agba mbọ ka ha ruo eruo ime baptizim, a na-emekwa ha baptizim (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1 na nke 2)

1-2. Ọ bụrụ na i kwesịrị ịgbakwu mbọ ka i ruo eruo ka e mee gị baptizim, gịnị mere na ike ekwesịghị ịgwụ gị? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

 Ọ BỤRỤ na ị chọrọ ime baptizim, ọ pụtara na i kpebiela ime ihe magburu onwe ya. Ị̀ dịla njikere ime baptizim ugbu a? Ọ bụrụ na obi siri gị ike na ị dịla njikere, ya abụrụkwa na ndị okenye kwetara, egbula oge ime baptizim n’oge ọzọ a ga-eme ndị mmadụ baptizim. I mee otú ahụ, ị ga-enwe ike iji ndụ gị rụọ ọtụtụ ọrụ bara uru n’ozi Jehova.

2 Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na a gwala gị na e nwere ihe ndị ị ga-eme ka i ruo eruo ka e mee gị baptizim, ma ọ bụkwanụ na gịnwa ji aka gị chọpụta na i kwesịrị ịgbakwu mbọ ka i nwee ike ruo eruo? Ọ bụrụ otú ahụ, ike agwụla gị. Ị ga-enwe ike imekwu nke ọma iji ruo eruo ka e mee gị baptizim, ma ị̀ ka na-eto eto, ma ị̀ bụ agadi.

“GỊNỊ GA-EGBOCHI IME M BAPTIZIM?”

3. Gịnị ka nwoke onye Etiopia bụ́ nnukwu mmadụ jụrụ Filip? Oleekwa ajụjụ anyị kwesịrị ịza? (Ọrụ Ndịozi 8:36, 38)

3 Gụọ Ọrụ Ndịozi 8:36, 38. Otu nwoke onye Etiopia bụ́ nnukwu mmadụ jụrụ Filip onye na-ekwusa ozi ọma, sị: “Gịnị ga-egbochi ime m baptizim?” Nwoke ahụ chọrọ ka e mee ya baptizim. Ma, ò ruola eruo n’eziokwu ka e mee ya baptizim?

Nwoke Etiopia ahụ kpebisiri ike ịmụ gbasara Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)

4. Olee otú nwoke Etiopia ahụ si gosi na o kpebisiri ike ịna-amụtakwu ihe?

4 Nwoke Etiopia ahụ “gara Jeruselem ife Chineke.” (Ọrụ 8:27) N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na o bidoro ikpe okpukpe ndị Juu. O doro anya na o sila n’Akwụkwọ Nsọ Hibru mụta ihe ụfọdụ gbasara Jehova. Ma, ọ chọrọ ịmụtakwu ihe ndị ọzọ. Gịnị ka nwoke ahụ nọ na-eme mgbe Filip hụrụ ya n’ụzọ? Ọ nọ na-agụ akwụkwọ mpịakọta Aịzaya onye amụma. (Ọrụ 8:28) Ihe ahụ ọ na-agụ bụ eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dị n’Akwụkwọ Nsọ. Ihe bụ́ mkpa nwoke Etiopia ahụ abụghị naanị ịmụta ihe ụfọdụ na-esighị ike dị n’Akwụkwọ Nsọ, kama ọ chọrọ ịmụtakwu ihe ndị ọzọ.

5. Gịnị ka nwoke Etiopia ahụ mere gbasara ihe ọ mụtara?

5 Nwoke ahụ bụ nnukwu mmadụ n’ọchịchị Eze Nwaanyị Kandesi nke Etiopia. Ọ bụ ya “na-elekọta akụ̀ niile eze nwaanyị a nwere.” (Ọrụ 8:27) N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na ọtụtụ ọrụ ọ na-arụ mere ka ọ ghara ịna-enwe efe. Ma, o wepụtara oge ịga fee Jehova. Ihe ọ chọrọ abụghị naanị ịmụta eziokwu. O mere ihe ọ mụtara. Ọ bụ ya mere o ji si Etiopia gaa ife Jehova n’ụlọ nsọ ya dị na Jeruselem. Ọ ga-abụrịrị na ịga ụdị ije ahụ were ya nnukwu oge na ego. Ma ọ chọsiri ike ife Jehova n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ya.

6-7. Olee otú nwoke Etiopia ahụ si na-ahụkwu Jehova n’anya?

6 Onye Etiopia ahụ si n’aka Filip mụta eziokwu ụfọdụ ndị ọ na-amabughị, dị ka onye bụ́ Mezaya. (Ọrụ 8:34, 35) Ọ ga-abụrịrị na nwoke Etiopia ahụ nwere ezigbo obi ụtọ mgbe ọ mụtara ihe Jizọs meere ya. Gịnị ka ọ ga-eji ihe ahụ ọ mụtara mee? Ọ chọọ, ọ gaara anọ bụrụ onye na-ekpe okpukpe ndị Juu a na-akwanyere ùgwù. Kama ime otú ahụ, ọ hụkwuru Jehova na Ọkpara ya n’anya, ya emee ka o kpebie ihe dị ezigbo mkpa ná ndụ ya, nke bụ́ ka e mee ya baptizim, ya abụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. Mgbe Filip chọpụtara na nwoke ahụ ruru eru ka e mee ya baptizim, o mere ya baptizim.

7 I mee ihe nwoke Etiopia ahụ mere, ị ga-eru eru ka e mee gị baptizim. Ị ga-enwekwa ike iji obi gị niile jụọ, sị: “Gịnị ga-egbochi ime m baptizim?” Ka anyị chọpụta otú ị ga-esi eme ihe ndị o mere. Ọ kwụsịghị ịna-amụtakwu ihe. O mere ihe ndị ọ mụtara. Ọ gbakwuru mbọ ịna-ahụkwu Chineke n’anya.

AKWỤSỊLA ỊMỤ GBASARA JEHOVA

8. Gịnị ka Jọn 17:3 gwara gị ka i mee?

8 Gụọ Jọn 17:3. Ihe a Jizọs kwuru ò nyeere gị aka ikpebi ịmụwa Baịbụl? O nyeere ọtụtụ n’ime anyị aka. Ma, ihe a o kwuru ọ̀ na-agwakwa anyị ka anyị ghara ịkwụsị ịna-amụ ihe? Ee. Anyị agaghị akwụsị ịmata “onye naanị ya bụ ezi Chineke.” (Ekli. 3:11) Ruo mgbe ebighị ebi, anyị ka ga na-amụta gbasara Chineke. Ọ bụrụ na anyị ana-amụkwu gbasara Jehova, anyị na ya ga na-adịkwu ná mma.—Ọma 73:28.

9. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị mụtachaa eziokwu ndị na-esighị ike dị n’Okwu Chineke?

9 O doro anya na anyị bido ịmụ gbasara Jehova, ihe mbụ anyị ga-amụta bụ ihe ndị na-esighị ike Baịbụl na-akụzi. N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Hibru, ọ kpọrọ ihe ndị ahụ “ihe ndị na-ataghị akpụ.” Ihe a o kwuru apụtaghị na “ihe ndị mbụ a kụziiri anyị” abaghị uru. Ọ sịrị na ha yiri mmiri ara e ji azụ nwa ọhụrụ. (Hib. 5:12; 6:1) Ma, ọ gwakwara Ndị Kraịst niile na ọ bụghị naanị ihe ndị ahụ na-esighị ike Baịbụl na-akụzi ka ha kwesịrị ịmụta. Kama, ha kwesịrị ịgba mbọ mụtakwuo ihe ndị siri ike Baịbụl na-akụzi. Ịmụta gbasara eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na Baịbụl ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike? Ị̀ dị njikere ịna-emekwu nke ọma ma na-amụtakwu gbasara Jehova na nzube ya?

10. Olee ihe mere o nwere ike iji esiri ụfọdụ ndị ike ịmụ ihe?

10 Ọ na-esiri ọtụtụ n’ime anyị ike ịmụ ihe. Ọ̀ bụ otú ọ na-adị gị? Ị̀ mụtara ịgụ ihe nke ọma na ịmụ ihe nke ọma n’ụlọ akwụkwọ? Ịmụ ihe ọ̀ na-atọ gị ụtọ, na-abakwara gị uru? Ka ì chere na ịmụ ihe anaghị agara gị aka? Ọ bụrụ otú ọ dị gị, ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. Ma, Jehova nwere ike inyere gị aka. O zuru okè, bụrụkwa Onye Nkụzi kachanụ e nwere.

11. Olee otú Jehova si gosi na ya bụ ‘Onye Ozizi anyị kachanụ’?

11 Jehova kpọrọ onwe ya ‘Onye Ozizi anyị kachanụ.’ (Aịza. 30:20, 21) Jehova bụ Onye Nkụzi na-enwe ndidi. Ọ dị obiọma, na-aghọtakwa anyị. Ọ na-achọpụta ebe ndị ọ na-akụziri ihe na-eme nke ọma. (Ọma 130:3) Ọ naghịkwa atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. Cheta na ọ bụ ya kere ụbụrụ gị, nke bụ́kwanụ onyinye pụrụ iche. (Ọma 139:14) Ọ na-agụ anyị agụụ ịmụta ihe. Onye kere anyị chọkwara ka anyị na-amụ ihe ruo mgbe ebighị ebi, nakwa ka ọ na-atọ anyị ụtọ. N’ihi ya, ọ dị mma ka eziokwu ndị dị na Baịbụl ‘na-agụ anyị agụụ’ ugbu a. (1 Pita 2:2) Kpebie ihe ndị ị ga-emeli n’ihe gbasara ịmụ ihe. Wepụtakwa oge ị ga-eji na-agụ Baịbụl ma na-amụ ihe. Gbaakwa mbọ ka i jiri oge ahụ na-amụ ihe. (Josh. 1:8) Jehova ga-enyere gị aka ka ịgụ ihe na ịmụ gbasara ya na-atọkwu gị ụtọ.

12. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịmụ gbasara ndụ Jizọs na ozi ya?

12 Wepụta oge mgbe niile na-eche gbasara ndụ Jizọs biri n’ụwa na ozi o jere. Ihe ga-eme ka anyị na-efe Jehova karịchaa n’oge a ihe siri ezigbo ike bụ ma anyị na-esosi nzọụkwụ Jizọs ike. (1 Pita 2:21) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya hoo haa na nsogbu ga-abịara ha. (Luk 14:27, 28) Ma, obi siri ya ike na ezigbo ndị na-eso ụzọ ya ga na-erubere Chineke isi otú ahụ yanwa mere. (Jọn 16:33) Mụọ gbasara otú Jizọs si bie ndụ, kpebiekwa ime ka ya ná ndụ gị.

13. Olee ihe i kwesịrị ịna-arịọ Jehova, maka gịnịkwa?

13 Ọ bụghị naanị ịmụta ihe ka a chọrọ. Ihe mere anyị kwesịrị iji na-amụta ihe bụ ka anyị matakwuo Jehova, hụ ya n’anya ma nwee okwukwe na ya. (1 Kọr. 8:1-3) Ka ị na-amụtakwu banyere Jehova, na-arịọ ya ka o nyere gị aka inwekwu okwukwe. (Luk 17:5) Ọ na-amasị Jehova ịza ụdị ekpere ndị ahụ. Ọ bụrụ na ihe anyị mụtara gbasara Jehova emee ka anyị nwee okwukwe, ọ ga-enyere anyị aka ịna-emekwu nke ọma.—Jems 2:26.

NA-EME IHE Ị NA-AMỤTA

Tupu Iju Mmiri, Noa na ndị ezinụlọ ya mere ihe ndị ha mụtara (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Olee otú Pita onyeozi si gosi na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-eme ihe anyị na-amụta? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

14 Pita onyeozi kwuru na ọ dị ezigbo mkpa ka ndị na-eso ụzọ Kraịst na-eme ihe ha na-amụta. O kwuru gbasara Noa. Jehova gwara Noa na ọ ga-eji Iju Mmiri bibie ndị ajọ omume n’oge ya. Ihe Noa ga-eme iji chebe onwe ya na ezinụlọ ya abụghị naanị ịmata na Iju Mmiri na-abịa. Cheta na oge Pita kwuru okwu ya bụ tupu Iju Mmiri ahụ, ya bụ, “mgbe a nọ na-arụ ụgbọ” ahụ. (1 Pita 3:20) Noa na ezinụlọ ya mere ihe Chineke gwara ha. Ha rụrụ nnukwu ụgbọ. (Hib. 11:7) Pita ji ihe Noa mere tụnyere ime baptizim. O dere, sị: “Baptizim, nke ya na ihe a yiri, na-azọpụtakwa unu ugbu a.” (1 Pita 3:21) Anyị nwekwara ike iji mbọ ndị ị na-agba ugbu a iji ruo eruo ime baptizim tụnyere ọrụ Noa na ndị ezinụlọ ya rụrụ ọtụtụ afọ iji rụọ ụgbọ ahụ. Olee ihe ndị gịnwa kwesịrị ime iji ruo eruo ime baptizim?

15. Olee ihe ga-egosi na i ji obi gị niile chegharịa?

15 Otu n’ime ihe ndị mbụ anyị ga-eme bụ iji obi anyị niile chegharịa ná mmehie anyị. (Ọrụ 2:37, 38) Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile chegharịa, ọ ga-eme ka anyị gbanwee àgwà anyị. Ị̀ kwụsịla ịkpa àgwà ndị na-adịghị Jehova mma, dị ka ime omume rụrụ arụ, ịṅụ sịga na ịkpọ anwụrụ, ma ọ bụkwanụ ikwu okwu rụrụ arụ ma ọ bụ ịkparị mmadụ? (1 Kọr. 6:9, 10; 2 Kọr. 7:1; Efe. 4:29) Ọ bụrụ na i mebeghị otú ahụ, na-agba mbọ ka i nwee ike ime ya. Gwa onye na-amụrụ gị Baịbụl ma ọ bụkwanụ okenye ọgbakọ ka o nyere gị aka. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto ya na nne na nna ya ka bi, na-agwa ha ka ha nyere gị aka ịkwụsị àgwà ndị na-adịghị mma ị na-akpa na-egbochi gị ime baptizim.

16. Olee ihe ndị anyị ga na-eme iji na-efe Jehova mgbe niile?

16 Ọ dịkwa mkpa ka ị na-emechi ihe ndị gbasara ofufe Chineke anya. Ihe ndị so na ha bụ ịga ọmụmụ ihe na iso na-eme ihe ndị a na-eme na ya. (Hib. 10:24, 25) Ọ bụrụ na i ruo iso ụmụnna aga ozi ọma, gbalịa na-agachi ya anya. Ikwusa ozi ọma ga na-atọkwu gị ụtọ ma ị na-ewepụtakwu oge na-aga ya. (2 Tim. 4:5) Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto ya na nne na nna ya ka bi, jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ̀ bụ ndị mụrụ m na-echetara m ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma, ka ọ̀ bụ m na-eji aka m ejikere?’ Ọ bụrụ na a naghị echetara gị ya echetara, o gosiri na i nwere okwukwe, na ị hụrụ Jehova n’anya, nakwa na obi dị gị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere gị. Ihe ndị a bụ onyinye ị na-enye Chineke, ya bụ, otú i si “na-efe Chineke.” (Hib. 13:15; 2 Pita 3:11) Obi na-atọgbu Jehova atọgbu ma anyị si n’obi anyị nye ya ihe, n’abụghị ná mmanye. (I nwere ike ịtụle 2 Ndị Kọrịnt 9:7.) Ihe mere anyị na-eji eme ihe ndị ahụ bụ n’ihi na obi na-atọ anyị ụtọ inye Jehova ihe kacha mma anyị nwere.

NA-AHỤKWU JEHOVA N’ANYA

17-18. Olee àgwà dị mkpa ga-enyere gị aka iru eru ime baptizim? Maka gịnị? (Ilu 3:3-6)

17 Ka ị na-emekwu nke ọma ka i ruo eruo ime baptizim, nsogbu ga-abịara gị. Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-akwa gị emo maka ihe ọhụrụ i kweere. Ha nwedịrị ike imegide gị ma ọ bụkwanụ na-akpagbu gị. (2 Tim. 3:12) Ka ị na-agba mbọ ịkwụsị àgwà na-adịghị mma ị na-akpa, i nwere ike imeghachi ya mgbe ụfọdụ. Iwe nwekwara ike ịna-ewe gị n’ihi na i chere na ọ ga-adị anya tupu gị eruo eruo ime baptizim. Gịnị ga-enyere gị aka idi ihe ndị a? Ọ bụ ịhụ Jehova n’anya, nke bụ́kwanụ àgwà magburu onwe ya.

18 Ịhụ Jehova n’anya bụ àgwà magburu onwe ya i nwere ike inwe. (Gụọ Ilu 3:3-6.) Ịhụ Jehova n’anya nke ukwuu nwere ike inyere gị aka imeri nsogbu ndị ga-abịara gị. Baịbụl na-ekwukarị gbasara ịhụnanya pụrụ iche Jehova nwere n’ebe ndị ohu ya nọ. Ihe a pụtara na Jehova agaghị ahapụ ndị ohu ya ma ọ bụkwanụ kwụsị ịhụ ha n’anya. (Ọma 100:5) Jehova kere gị n’oyiyi ya. (Jen. 1:26) Olee otú ị ga-esi gosi ụdị ịhụnanya ahụ?

I nwere ike ịna-agwa Jehova na obi dị gị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere gị kwa ụbọchị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19) b

19. Olee otú ị ga-esi egosikwu na obi dị gị ụtọ maka ihe niile Jehova meere gị? (Ndị Galeshia 2:20)

19 Obi kwesịrị ịdị gị ụtọ maka ihe ọma ndị Jehova na-emere gị. (1 Tesa. 5:18) Kwa ụbọchị, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú Jehova si gosi na ọ hụrụ m n’anya?’ Gbaakwa mbọ kelee Jehova n’ekpere. Kpọọ ihe ndị o meere gị aha, keleekwa ya maka ha. Were ya na Jehova na-emere gịnwa ihe ọma n’ihi na ọ hụrụ gị n’anya otú ahụ Pọl onyeozi ghọtara na Jehova hụrụ ya n’anya. (Gụọ Ndị Galeshia 2:20.) Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ chọrọ igosi Jehova na m hụrụ ya n’anya otú o si hụ m n’anya?’ Ịhụ Jehova n’anya nwere ike inyere gị aka imeri ọnwụnwa na nsogbu ndị na-abịara gị. Ọ ga-eme ka anyị na-emechi ihe ndị gbasara ofufe Chineke anya, na-egosi ụbọchị niile na anyị hụrụ Nna anyị nke eluigwe n’anya.

20. Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike inyefe Jehova onwe gị? Olee otú ọ dịruru ná mkpa?

20 Ka oge na-aga, otú i si hụ Jehova n’anya ga-eme ka i kpee ekpere pụrụ iche nyefee ya onwe gị. Cheta na i nyefee Jehova onwe gị, i nwere olileanya magburu onwe ya. Ị ga-enwe ike ịbụ nke ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụrụ na i nyefee Jehova onwe gị, ị na-ekwe ya nkwa na ị ga na-efe ya ma mgbe ihe dị mma ma mgbe ihe dị njọ. Ọ bụ ihe a na-eme naanị otu ugboro ná ndụ. N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị enyefee Jehova onwe anyị, anyị kpebiri ime ihe dị ezigbo mkpa. Chegodị echiche. E nwere ọtụtụ ihe ị ga-ekpebi ná ndụ gị. Ụfọdụ n’ime ha ga-abụ mkpebi dị ezigbo mma. Ma, e nweghị nke ọ bụla a ga-eji tụnyere inyefe Jehova onwe gị. (Ọma 50:14) Setan ga-agbalị ime ka ị ghara ịhụ Jehova n’anya otú ị hụburu ya. Ihe ọ ga-ebu n’obi bụ na ị ga-emecha kwụsị ife Chineke. Ekwekwala ka o merie. (Job 27:5) Otú i si jiri obi gị niile hụ Jehova n’anya ga-enyere gị aka imezu nkwa i kwere ya iji ndụ gị na-efe ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-emekwa ka ị bịarukwuo Nna gị nke eluigwe nso.

21. Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na baptizim abụghị ihe ikpeazụ ị ga-eme, kama na ọ bụ mmalite?

21 I nyefechaa Jehova onwe gị, gaa gwa ndị okenye ọgbakọ unu na ị chọrọ ime baptizim. Na-echeta mgbe niile na baptizim abụghị ihe ikpeazụ ị ga-eme, kama ọ bụ mmalite. Ọ pụtara na ị malitela iji ndụ gị niile na-efe Jehova. N’ihi ya, gbalịa na-ahụkwu Nna gị nke eluigwe n’anya ugbu a. Kpebie ihe ndị ị ga-eme ka i nwee ike ịna-ahụkwu Jehova n’anya kwa ụbọchị. Ihe a ga-enyere gị aka ime baptizim. Ụbọchị ị ga-eme baptizim ga-abụ ụbọchị pụrụ ezigbo iche. Ma, ọ ka bụ mmalite. Ekpere anyị bụ ka ị na-ahụkwu Jehova na Ọkpara ya n’anya ruo mgbe ebighị ebi.

ABỤ NKE 135 Jehova Ji Obiọma Na-arịọ: “Mara Ihe, Nwa M”

a N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị chọpụtara ihe mere anyị ji kwesị ime baptizim. Ma, e nwekwara ihe ndị anyị kwesịrị ime ka anyị ruo eruo ime baptizim. Anyị ga-eleba anya n’ihe otu nwoke onye Etiopia bụ́ nnukwu mmadụ mere. Ọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe onye a na-amụrụ Baịbụl kwesịrị ime iji ruo eruo ka e mee ya baptizim.

b NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-ekpe ekpere na-ekele Jehova maka ihe ndị o meere ya.