Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 22

Otú Ị Ga-esi Na-amụ Ihe nke Ọma

Otú Ị Ga-esi Na-amụ Ihe nke Ọma

“Chọpụta ihe ndị ka mkpa.”—FIL. 1:10.

ABỤ 35 “Na-achọpụta Ihe Ndị Ka Mkpa”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị mere o ji esiri ụfọdụ ndị ike ịmụ ihe?

TAA, mmadụ inweta ihe o ji egbo mkpa ya abụghị asụ anwụru. Ọtụtụ ụmụnna anyị na-arụ ọrụ ọtụtụ awa iji na-akpa afọ ezinụlọ ha. E nwekwara ndị ọ na-ewe ọtụtụ awa ije ọrụ na ịlọta ọrụ. Ụfọdụ na-arụ ọrụ ike keta o rie. Ka ọrụ na-emechi ná mgbede, ike agwụchaala ụmụnna ndị a. N’ihi ya, ọ na-esiri ha ezigbo ike ịmụ ihe.

2. Olee oge i ji amụ ihe?

2 Ma e tere ụgba ma e tere azụ̀, anyị kwesịrị iwepụta oge na-amụsi Okwu Chineke na akwụkwọ anyị ike. Nke a dị ezigbo mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova dịrị ná mma, anyị enwetakwa ndụ ebighị ebi. (1 Tim. 4:15) Ụfọdụ na-ebili n’isi ụtụtụ mụọ ihe mgbe ebe niile dara jii, isi akpakọọkwa ha ọnụ. Ndị ọzọ na-eji nkeji ole na ole n’abalị mgbe mkpọtụ na-adịghị mụọ Baịbụl nakwa akwụkwọ anyị ma chebara ihe ndị ha mụrụ echiche.

3-4. Olee mgbanwe ndị e mere n’ihe ndị anyị na-agụ, n’ihi gịnịkwa?

3 I nwere ike ikwu na anyị kwesịrị iwepụta oge na-amụ ihe. Ma olee ihe anyị kwesịrị ịmụ? I nwere ike ikwu, sị: ‘Ihe a ga-agụ agụ karịrị akarị. Ọ na-esikwara m ezigbo ike ịgụ ihe niile e wepụtara.’ Ụfọdụ ụmụnna anyị na-agba mbọ agụ ihe niile ma na-ekiri vidio niile nzukọ Jehova wepụtara, ebe ọ na-esiri ọtụtụ ike ime otú ahụ. Òtù Na-achị Isi ma banyere ya. Ọ bụ ya mere ha ji kpebie n’oge na-adịghị anya ibelata ihe ndị ha na-ewepụta, ma ndị nke e biri ebi ma ndị nke na-adị n’Ịntanet.

4 Dị ka ihe atụ, anyị anaghịzi ebipụta Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova ebe ọ bụ na ọtụtụ akụkọ ndị na-agba anyị ume na-agbazi na jw.org® nakwa n’ihe omume tiivi anyị a na-eme kwa ọnwa. A na-ebipụtazi Ụlọ Nche nke ọhaneze na Teta! ugboro atọ n’afọ. Ihe mere e ji mee mgbanwe ndị a abụghị ka anyị nwetakwuo oge anyị ga-eji eme ihe ndị na-agbasaghị ofufe Chineke. Ihe mere e ji mee ha bụ ka anyị nwetakwuo oge anyị ga-eji eme “ihe ndị ka mkpa.” (Fil. 1:10) Ka anyị tụlee otú i nwere ike isi ekpebi ihe ndị ka mkpa nakwa ihe ndị ị ga-eme ka ịmụ Baịbụl bakwuoro gị uru.

HAZIE IHE NDỊ Ị GA-AGỤ AHAZIE

5-6. Olee akwụkwọ ndị anyị kwesịrị imeda obi na-amụ?

5 Olee ihe ndị anyị kwesịrị ibu ụzọ na-amụ? O doro anya na anyị kwesịrị iwepụta oge na-amụ Okwu Chineke kwa ụbọchị. E belatala amaokwu Baịbụl ole anyị na-agụ n’ọgụgụ Baịbụl a na-agụ kwa izu ka anyị nwee ike inwetakwu oge anyị ga-eji na-echebara ihe ndị anyị gụrụ echiche ma na-eme nchọnchọ gbasara ha. Mkpa anyị ekwesịghị ịbụ ka anyị gụchaa amaokwu ndị ahụ, kama ọ bụ ikwe ka ihe anyị gụrụ na Baịbụl ruo anyị n’obi ma mee ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma.—Ọma 19:14.

6 Olee ihe ndị ọzọ anyị kwesịrị iji nwayọọ na-amụ? Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị kwesịrị ịkwadebe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ nakwa ihe ndị ọzọ anyị na-amụ n’ọmụmụ ihe etiti izu. Anyị kwesịkwara ịna-agụ Ụlọ Nche na Teta! ọ bụla.

7. Ànyị kwesịrị ịda mbà ma ọ bụrụ na anyị enweghị ike ịgụcha ihe niile anyị wepụtara n’Ịntanet ma ọ bụ kirie ihe niile anyị na-eme n’ihe omume tiivi anyị?

7 I nwere ike ikwu, sị: ‘Ọ dị mma ịmụ ihe ndị ahụ, ma gịnịkwanụ banyere ihe ndị na-agba na jw.org nakwa n’ihe omume tiivi anyị? Ihe a ga-amụ karịrị akarị.’ Ka anyị tụlee ihe atụ a: N’ebe a na-ere nri, a na-enwe nri dị iche iche. Ndị na-abịa ebe ahụ eri nri anaghị eri ihe niile e nwere. Ha na-eri ihe ole na ole ha chọrọ. Ọ bụrụkwa na i nweghị ike ịgụ ma ọ bụ ikiri ihe niile anyị nwere n’Ịntanet, adala mbà. Na-agụ ma ọ bụ na-ekiri ha otú i nwere ike. Ka anyị tụlee otú anyị nwere ike isi amụ ihe nakwa ihe ndị anyị nwere ike ime ka ịmụ ihe bakwuoro anyị uru.

ỊMỤ IHE ADỊGHỊ MFE

8. Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ma anyị mụwa Ụlọ Nche, oleekwa uru ọ ga-abara anyị?

8 Mgbe ị na-amụ ihe, ị na-elekwasị anya n’ihe ị na-amụ ka i nwee ike ịmụta ihe dị mkpa. Ịmụ ihe abụghị ịgụ ihe ọkụ ọkụ ka ị gụchaa ebe ndị a sị ka a gụọ ma katụ ihe n’azịza ha. Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-akwadebe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, buru ụzọ gụọ ihe isiokwu ahụ na-ekwu, nke dị ná mmalite isiokwu ahụ. Ị gụchaa ya, gị agụọ isiokwu ya, isiokwu nta ndị dị na ya na ajụjụ ntụleghachi ya ma chebara ha echiche. Mgbe ahụzị, gị ejiri nwayọọ gụọ isiokwu ahụ. Buru ahịrịokwu na-akọwa ihe paragraf na-ekwu n’obi. Ọ na-abụkarị ahịrịokwu mbụ nke paragraf ọ bụla. Ahịrịokwu ahụ ga-enyere gị aka ịmata ihe paragraf ahụ na-ekwu. Mgbe ị na-agụ isiokwu ahụ, chee banyere otú paragraf nke ọ bụla si gbasa isiokwu nta ị na-atụle na isiokwu ahụ. Depụta okwu ọ bụla na-edochaghị gị anya nakwa ihe ndị ị ga-achọ ịmụtakwu gbasara ha.

9. (a) Gịnị mere anyị ga-eji elekwasị anya karịchaa n’amaokwu Baịbụl mgbe anyị na-amụ Ụlọ Nche, oleekwa otú anyị nwere ike isi eme ya? (b) Dị ka e kwuru na Jọshụa 1:8, gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe anyị gụrụ amaokwu Baịbụl?

9 Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche bụ otu ụzọ anyị si amụ Baịbụl. N’ihi ya, lekwasị anya n’amaokwu Baịbụl ndị dị n’Ụlọ Nche ị na-akwadebe, karịchaa ndị nke a ga-agụ n’ọmụmụ ihe. Chọpụta otú okwu ndị dị n’amaokwu ahụ si mee ka a ghọta ihe paragraf a na-atụle na-ekwu. Wepụtakwa oge chebara amaokwu Baịbụl ndị ị gụrụ echiche, cheekwa otú ị ga-esi eme ha eme.—Gụọ Jọshụa 1:8.

Nne na nna kwesịrị ịkụziri ụmụ ha otú e si amụ ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10) *

10. Dị ka Ndị Hibru 5:14 si kwuo, gịnị mere ndị nne na nna ga-eji ewepụta oge n’ofufe ezinụlọ kụziere ụmụ ha otú ha ga-esi amụ ihe ma na-eme nchọnchọ?

10 O doro anya na ndị nne na nna chọrọ ka Ofufe Ezinụlọ ha na-enwe kwa izu na-atọ ụmụ ha ụtọ. Ọ bụ eziokwu na ha kwesịrị ịhazi ihe ndị a ga-eme n’ofufe ezinụlọ ha, ha kwesịkwara icheta na ọ bụghị kwa izu ka ha kwesịrị inwe ihe ndị pụrụ iche ha ga-eme na ya. N’agbanyeghị na ezinụlọ nwere ike ile ihe omume tiivi anyị a na-eme kwa ọnwa n’Ofufe Ezinụlọ ha ma ọ bụkwanụ mgbe ụfọdu, ha emee ihe pụrụ iche, dị ka ịrụ ụgbọ Noa, ndị nne na nna kwesịkwara ịkụziri ụmụ ha otú e si amụ ihe. Ha kwesịrị ịmụta otú e si akwadebe ọmụmụ ihe ma ọ bụ otú ha ga-esi eme nchọnchọ n’ajụjụ a jụrụ ha n’ụlọ akwụkwọ. (Gụọ Ndị Hibru 5:14.) Ọ bụrụ na ha ewepụta oge na-amụ ihe n’ụlọ, ọ ga-adịrị ha mfe ige ntị nke ọma n’ọmụmụ ihe na ná mgbakọ, ma mgbe a na-eme ihe omume ndị na-enweghị vidio. Nke bụ́ eziokwu bụ na oge a ga-eji akụziri nwatakịrị nke ọ bụla ihe ga-adabere n’afọ ole ọ dị nakwa n’ụdị onye ọ bụ.

11. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkụziri ndị anyị na-amụrụ ihe otú ha ga-esi amụ ihe nke ọma n’onwe ha?

11 Anyị kwesịkwara ịkụziri ndị anyị na-amụrụ Baịbụl otú e si amụ ihe. Mgbe anyị na ha malitere ịmụ ihe, obi na-atọ anyị ụtọ ma ha kanye ihe n’azịza nke paragraf nke ọ bụla mgbe ha na-akwadebe ihe anyị na ha ga-amụ ma ọ bụ mgbe ha na-akwadebe ọmụmụ ihe. Ma, anyị kwesịrị ịkụziri ha otú e si eme nchọnchọ nakwa otú ha ga-esi na-amụ ihe nke ọma n’onwe ha. Nke a ga-eme ka ha mata otú ha ga-esi achọta ihe ndị ga-enyere ha aka n’akwụkwọ anyị ma nsogbu bịara ha, kama ịchọwa ụmụnna ozugbo ka ha gwa ha ihe ha ga-eme.

BURU IHE N’OBI NA-AMỤ IHE

12. Olee ihe ndị anyị nwere ike ibu n’obi amụ ihe?

12 Ọ bụrụ na ịmụ ihe anaghị amasị gị, i nwere ike ịna-eche na o nweghị ihe ga-eme ka ịmụ ihe tọwa gị ụtọ. Ma, o nwere ike ịtọwa gị ụtọ. Olee otú ị ga-esi eme ya? O bụ ịmalite ịmụ ihe obere obere. Ka oge na-aga, i nweziri ike iji nwayọọ nwayọọ na-ewepụtakwu oge na-amụ ihe. Chebara ihe mere i ji na-amụ ihe echiche. Ma, ihe kacha mkpa mere anyị ji amụ ihe bụ ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma. Ihe ọzọ mere anyị ji amụ ihe nwere ike ịbụ ka anyị zaa ajụjụ mmadụ jụrụ anyị ma ọ bụkwanụ ka anyị mata ihe anyị ga-eme maka nsogbu bịaara anyị.

13. (a) Kọwaa ihe nwa akwụkwọ nwere ike ime ka o nwee ike ịgbachitere ihe o kweere n’ụlọ akwụkwọ. (b) Olee otú i nwere ike isi mee ihe e kwuru ná Ndị Kọlọsi 4:6?

13 Dị ka ihe atụ, ị̀ bụ nwa akwụkwọ? Ụmụ akwụkwọ ibe gị niile nwere ike ịna-eme ememme ụbọchị ọmụmụ ha. I nwere ike ịchọ isi na Baịbụl gwa ha ihe mere na ị naghị eso ha eme ya, ma gị echee na ị gaghị emeli ya. I nwere ike ịmụkwu banyere ya. E nwere ihe abụọ i nwere ike ibu n’obi amụ gbasara ya: (1) ka i mee ka obi sikwuo gị ike na ime ememme ụbọchị ọmụmụ anaghị amasị Jehova na (2) ka i mee ka obi kaa gị ịgbachitere ihe i kweere. (Mat. 14:6-11; 1 Pita 3:15) I nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Olee ihe ụmụ akwụkwọ ibe m kwuru mere ha ji eme ememme ụbọchị ọmụmụ ha?’ Ị matachaa ihe mere ha ji eme ya, gị ejirizie akwụkwọ anyị mee ezigbo nchọnchọ. Ịgwa ụmụ akwụkwọ ibe gị ihe i kweere nwere ike ọ gaghị esichara gị ike otú i chere. Ọtụtụ n’ime ha na-eme ememme ụbọchị ọmụmụ ha n’ihi na ha chere na mmadụ niile na-eme ya. Ọ bụrụ na ị chọpụta otu ihe ma ọ bụ abụọ i nwere ike ịgwa ha banyere ya, i nwere ike ịgwa onye ji obi ya niile chọọ ịmata nke bụ́ eziokwu ihe ga-eru ya n’obi.—Gụọ Ndị Kọlọsi 4:6.

NWEKWUO MMASỊ N’ỊMỤ IHE

14-16. (a) Olee otú i nwere ike isi matakwuo gbasara akwụkwọ Baịbụl ị na-amachaghị? (b) Olee otú amaokwu Baịbụl ndị e depụtara na paragraf nke iri na isii nwere ike isi nyere gị aka ịghọtakwu akwụkwọ Emọs? (Gụọkwa igbe isiokwu ya bụ “Otú Ị Ga-esi Aghọtakwu Ihe Ị Gụrụ na Baịbụl.”)

14 Ka e were ya na anyị ga-agụ ma kwurịta gbasara otu akwụkwọ Baịbụl nke otu n’ime ndị amụma ndị mmadụ na-akpọ obere ndị amụma dere n’ọmụmụ ihe. O nwere ike ịbụ na ị machaghị gbasara ya. Ihe mbụ i nwere ike ime bụ inwe mmasị n’ihe onye ahụ dere. Olee otú ị ga-esi eme ya?

15 Nke mbụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka m ma gbasara onye dere akwụkwọ Baịbụl a? Ònye ka ọ bụ, ebee ka o biri, oleekwa ọrụ ọ rụrụ?’ Anyị matakwuo gbasara ya, anyị ga-amatakwukwa ihe mere o ji jiri okwu ụfọdụ na ihe atụ ụfọdụ dee ihe o dere. Ka ị na-agụ akwụkwọ Baịbụl ahụ, chọpụta okwu ụfọdụ ga-enyere gị aka ịmatakwu ụdị onye onye dere ya bụ.

16 Ihe ọzọ ga-enyere gị aka bụ ịmata mgbe e dere akwụkwọ Baịbụl ahụ. “Ndepụta nke Akwụkwọ Ndị Dị na Baịbụl” nke dị ná ngwụcha Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ ga-enyere gị aka ịmata mgbe e dere akwụkwọ Baịbụl nke ọ bụla. Ihe ọzọ ga-enyere gị aka bụ akwụkwọ nta bụ́ Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Baịbụl, peeji nke 14 ruo nke 17. Ọ bụrụ na akwụkwọ Baịbụl ị na-amụ nwere amụma ndị e buru na ya, ọ ga-adị mma ka ị chọpụta otú ihe dị n’oge e dere ya. Olee àgwà ọjọọ ma ọ bụ ihe ndị oge ahụ na-eme a gwara onye amụma ahụ ka ọ gaa gwa ha ka ha kwụsị? Ole ndị ka ya na ha dịkọrọ ndụ? Ị chọọ ịmatakwu gbasara ihe na-eme n’oge ahụ, o nwere ike ịdị mkpa ka ị gụọ ebe ndị ọzọ na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ka i nwee ike ịmata ihe mere n’oge Emọs onye amụma, ọ ga-abara gị uru ma ị gụọ amaokwu ụfọdụ ná Ndị Eze nke Abụọ na Ihe E Mere nke Abụọ nke dị na ntụaka etiti peeji nke Emọs 1:1. I nwekwara ike ịgụ akwụkwọ Hosia, bụ́ onye o nwere ike ịbụ na ya na Emọs dịkọrọ ndụ. Ebe ndị a ị ga-agụ ga-enyere gị aka ịmatakwu otú ihe si kwụrụ n’oge Emọs dịrị ndụ.—2 Eze 14:25-28; 2 Ihe 26:1-15; Hos. 1:1-11; Emọs 1:1.

ELEGHARALA IHE NDỊ YIRI KA HÀ ADỊCHAGHỊ MKPA ANYA

17-18. Jiri ihe atụ dị na paragraf ndị a ma ọ bụ nke gị gosi otú ihe anyị chere na ọ dịchaghị mkpa nwere ike isi mee ka ịmụ Baịbụl na-atọkwu anyị ụtọ.

17 Anyị gụwa Baịbụl, anyị kwesịrị ịchọsi ike ịmụtakwu ihe na ya. Ka e were ya na ị na-agụ amụma e buru na Zekaraya isi iri na abụọ, nke kwuru gbasara ọnwụ Mesaya. (Zek. 12:10) Ị gụrụ ya ruo amaokwu iri na abụọ, ị ga-ahụ na o kwuru na “ezinụlọ Netan” ga-akwa ákwá arịrị ma Mesaya nwụọ. Kama ịgụrụ gawa n’echebaraghị ihe ahụ e kwuru echiche, i nwere ike ịkwụsịtụ ma jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị jikọrọ ezinụlọ Netan na Mesaya? È nwere otú m ga-esi matakwuo gbasara ya?’ I nwere ike ime nchọnchọ ka ị matakwuo gbasara ya. Ntụaka etiti peeji dị n’amaokwu ahụ ga-eduga gị na 2 Samuel 5:14, ebe kwuru na Netan bụ otu n’ime ụmụ Eze Devid. Amaokwu Baịbụl ọzọ dị na ntụaka ahụ bụ Luk 3:31. O kwuru na Jizọs si n’ezinụlọ Netan, bụ́ nna nna Meri. (Gụọ Ụlọ Nche, Ọgọst 2017, peeji nke 32, paragraf nke 4) Ihe a ị mụtara meziri ka i nwekwuo mmasị n’ihe ị na-amụ. Ị ma na Baịbụl buru amụma na Jizọs ga-esi n’ezinụlọ Devid. (Mat. 22:42) Ma, ụmụ nwoke Devid karịrị iri abụọ. Ị̀ hụlanụ ihe mere Zekaraya ji kwuo na ezinụlọ Netan nwere ihe mere ha ga-eji ruo uju ma Jizọs nwụọ?

18 Ka anyị tụlee ihe atụ ọzọ. Luk isi mbụ kwuru na mmụọ ozi aha ya bụ Gebriel gakwuuru Meri ma kwuo gbasara nwa ọ ga-amụ, sị: “Onye a ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kasị Elu; Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze Devid bụ́ nna ya, ọ ga-achịkwa ụlọ Jekọb dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi.” (Luk 1:32, 33) Anyị nwere ike ịna-eche naanị gbasara ihe mbụ Gebriel kwuru, nke bụ́ na a ga-akpọ Jizọs “Ọkpara nke Onye Kasị Elu.” Ma Gebriel kwukwara na Jizọs ‘ga-achị dị ka Eze.’ N’ihi ya, anyị nwere ike ịna-eche ihe Meri na-eche banyere okwu ndị ahụ Gebriel gwara ya. Ihe ọ na-eche ọ̀ bụ na Jizọs ga-anọchi Eze Herọd ma ọ bụ otu n’ime ndị ga-anọchi ya? Ọ bụrụ na Jizọs abụrụ eze, Meri ga-abụ nne eze, ezinụlọ ya ga-ebikwa n’obí eze. Ma e nweghị ebe Baịbụl kwuru na Meri jụtụrụ Gebriel ụdị ihe ahụ. E nweghịkwanụ ebe anyị gụrụ na Baịbụl na Meri kwuru ka e nye ya ọkwá n’Alaeze Chineke otú ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs abụọ mere. (Mat. 20:20-23) Ihe ndị ahụ na-eme ka obi sikwuo anyị ike na Meri bụ ezigbo nwaanyị dị umeala n’obi.

19-20. Dị ka Jems 1:22-25 na 4:8 si kwuo, olee ihe ndị anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị na-amụ ihe?

19 Anyị kwesịrị ịna-echeta na ihe kacha mkpa mere anyị ji amụ Okwu Chineke na akwụkwọ anyị bụ ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma. Anyị chọkwara ịghọtakwu “ụdị mmadụ” anyị bụ nakwa ụdị mgbanwe kwesịrị ime iji na-eme ihe dị Chineke mma. (Gụọ Jems 1:22-25; 4:8.) Mgbe ọ bụla anyị chọrọ ịmụ ihe, anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ ya. Anyị kwesịkwara ịrịọ ya ka o mee ka anyị ghọta ihe anyị na-amụ nke ọma, nakwa ka o nyere anyị aka ịghọta ihe ndị anyị kwesịrị ịgbanwe ná ndụ anyị.

20 Ka anyị niile gbaa mbọ na-eme ka onye ọbụ abụ kwuru banyere ya, sị: “Iwu Jehova na-atọ ya ụtọ, ọ na-agụkwa iwu ya n’olu dị ala ehihie na abalị. . . . Ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.”—Ọma 1:2, 3.

ABỤ 88 Mee Ka M Mara Ụzọ Gị

^ par. 5 Jehova na-enye anyị ọtụtụ ihe anyị na-ekiri, na-agụ ma na-amụ. Isiokwu a ga-enyere gị aka ikpebi ihe ị ga-amụ. Ọ ga-enyekwara gị aka ịma ihe ị ga-eme ka ị na-amụtakwu ihe n’ọmụmụ ihe gị.

^ par. 61 NKỌWA FOTO: Ebe nne na nna na-akụziri ụmụ ha otú e si akwadebe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche.

^ par. 63 NKỌWA FOTO: Ebe nwanna na-eme nchọnchọ banyere Emọs, bụ́ onye so dee Baịbụl. Foto ndị dị n’azụ ya na-egosi ihe nwanna ahụ na-ahụ ka ọ na-echebara ihe ndị ọ na-agụ na Baịbụl echiche.