Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 19

Otú Jehova Si Egosi na Ya Nwere Ịhụnanya ma Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi ma Mmadụ Mee Ihe Jọgburu Onwe Ya

Otú Jehova Si Egosi na Ya Nwere Ịhụnanya ma Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi ma Mmadụ Mee Ihe Jọgburu Onwe Ya

“Ị bụghị Chineke nke ajọ omume na-atọ ụtọ; onye ọjọọ agaghị ebinyere gị ma ọlị.”—ỌMA 5:4.

ABỤ 142 Ka Anyị Jidesie Olileanya Anyị Ike

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-3. (a) Olee otú Jehova si ele mmebi iwu anya, dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 5:4-6? (b) Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na imetọ ụmụaka megidere “iwu nke Kraịst”?

JEHOVA CHINEKE kpọrọ ụdị mmebi iwu niile asị. (Gụọ Abụ Ọma 5:4-6.) Ọ kpọrọ imetọ ụmụaka asị nke ukwuu n’ihi na ọ bụ mmehie jọgburu onwe ya. Ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị weere imetọ ụmụaka ka ihe arụ, anyị anaghịkwa agbachi nkiti ma nwanna mee ya.—Rom 12:9; Hib. 12:15, 16.

2 Imetọ ụmụaka n’ụdị ya ọ bụla, megidere “iwu nke Kraịst.” (Gal. 6:2) Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Dị ka anyị tụlere n’isiokwu bu nke a ụzọ, iwu nke Kraịst, ya bụ, ihe niile Jizọs si n’okwu ya nakwa n’ihe ndị o mere kụzie, dabeere n’ịhụnanya, ha na-emekwa ka a na-ekpe ikpe ziri ezi. Ebe ezigbo Ndị Kraịst na-edebe iwu a, ha na-emeso ụmụaka ihe n’ụzọ na-eme ka ahụ́ ruo ha ala, ha amarakwa na a hụrụ ha n’anya n’eziokwu. Ma, mmadụ imetọ ụmụaka na-egosi na onye ahụ na-eche naanị banyere onwe ya, bụrụkwa omume jọgburu onwe ya. Ọ na-eme ka ahụ́ ghara iru nwatakịrị ala, meekwa ka ọ na-eche na a hụghị ya n’anya.

3 Ọ dị mwute ikwu na a na-emetọ ụmụaka n’ebe niile n’ụwa. E nweekwala ụmụnna omume ọjọọ a kpara aka ọjọọ. Gịnị mere o ji dị otú a? Ọ bụ n’ihi na “ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie” na-adịkwu ọtụtụ, ụfọdụ n’ime ha nwekwara ike ịchọ ịbata n’ọgbakọ. (2 Tim. 3:13) Ihe ọzọ bụ na ụfọdụ ndị sịrị na ha bụ ụmụnna emetọọla ụmụaka iji mee ihe na-agụ anụ ahụ́ ha agụụ. Ka anyị tụlee ihe mere imetọ ụmụaka ji bụrụ mmehie jọgburu onwe ya. Anyị ga-atụlekwa ihe ndị okenye na-eme ma nwanna mee mmehie dị oké njọ, dị ka imetọ ụmụaka, nakwa otú ndị nne na nna ga-esi echebe ụmụ ha ka a ghara imetọ ha. *

Ọ BỤ MMEHIE JỌGBURU ONWE YA

4-5. Olee otú imetọ nwatakịrị si bụrụ ime ya ezigbo ihe ọjọọ?

4 E metọọ nwatakịrị, ọ na-akpa ya aka ọjọọ ruo ogologo oge. Ọ na-agbawa ndị e metọrọ, ndị ezinụlọ ha nakwa ndị ya na ha nọ n’ọgbakọ obi. Imetọ ụmụaka bụ mmehie jọgburu onwe ya.

5 Onye metọrọ nwatakịrị mere ya ezigbo ihe ọjọọ. Ọ bụ ịkpatara ndị ọzọ obi mgbawa na ahụhụ. Dị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a, onye metọrọ nwatakịrị mere ya oké ihe ọjọọ. Ọ bụ eziokwu na nwatakịrị ahụ tụkwasịrị ya obi, ọ kpachaara anya mee ka obi gbawaa nwa ahụ, mee ka ahụ́ ghara ịna-eru nwa ahụ ala, manye nwa ahụ ime ihe ọ na-ekwesịghị ime. E kwesịrị ichebe ụmụaka ka a ghara ịrụsa ha arụrụala a. E kwesịkwara ịkasi ndị e metọrọ obi ma nyere ha aka.—1 Tesa. 5:14.

6-7. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na onye metọrọ nwatakịrị mejọrọ ma ọgbakọ ma ndị ọchịchị?

6 Onye metọrọ nwatakịrị mejọrọ ọgbakọ. Mgbe onye nọ n’ọgbakọ metọrọ nwatakịrị, ọ na-emebi aha ọgbakọ. (Mat. 5:16; 1 Pita 2:12) Ọ bụkwa ihe jọgburu onwe ya ikwutọ ọtụtụ nde ụmụnna ji ofufe Chineke kpọrọ ihe ma na-alụsi “ọgụ ike maka okwukwe ahụ.” (Jud 3) Anyị anaghị ekwe ka ndị mere mmehie dị oké njọ ma na-emebi aha ọgbakọ nọgide n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ha jụrụ ichegharị.

7 Onye metọrọ nwatakịrị mebiri iwu ndị ọchịchị. Ndị Kraịst kwesịrị ‘ido onwe ha n’okpuru ndị ọchịchị.’ (Rom 13:1) Otú anyị si egosi na anyị na-edo onwe anyị n’okpuru ha bụ irubere iwu ha isi. Ọ bụrụ na onye nọ n’ọgbakọ adaa iwu ndị ọchịchị, dị ka imetọ nwatakịrị, ọ na-emehie ndị ọchịchị. (Tụlee Ọrụ Ndịozi 25:8.) E nyeghị ndị okenye ikike ịta ndị dara iwu ndị ọchịchị ahụhụ. Ma ha anaghị egbochi ndị ọchịchị ịta onye metọrọ nwatakịrị ahụhụ. (Rom 13:4) Onye metọrọ nwatakịrị ga-eji isi ya buru ihe o metere.—Gal. 6:7.

8. Olee otú Jehova si ewere mmadụ imehie mmadụ ibe ya?

8 Nke kacha njọ bụ na onye metọrọ nwatakịrị mehiere Chineke. (Ọma 51:4) Ọ bụrụ na mmadụ emehie mmadụ ibe ya, onye ahụ mehiekwara Jehova. Ka anyị tụlee ihe gosiri na nke ahụ bụ eziokwu n’Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel. Iwu ahụ kwuru na onye zuru mmadụ ibe ya ohi ma ọ bụ ghọgbuo ya mesoro “Jehova omume ekwesịghị ntụkwasị obi.” (Lev. 6:2-4) Otú ahụ ka ọ dịkwa onye nọ n’ọgbakọ metọrọ nwatakịrị ma mee ka obi ghara iru nwa ahụ ala. Onye ahụ mesoro Chineke omume ekwesịghị ntụkwasị obi. Onye mere ụdị ihe a mere ka a na-akọcha aha Jehova. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpọ omume a asị n’ihi na onye mere ya mere mmehie dị oké njọ n’anya Chineke.

9. Kemgbe ọtụtụ afọ, olee ihe ụfọdụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nzukọ Jehova kwuru banyere imetọ ụmụaka, n’ihi gịnịkwa?

9 Kemgbe ọtụtụ afọ, nzukọ Jehova ebipụtala ọtụtụ isiokwu ndị dabeere na Baịbụl banyere imetọ ụmụaka. Dị ka ihe atụ, isiokwu ndị gbara n’Ụlọ Nche na Teta! kwuru ihe ndị e metọrọ nwere ike ime n’ihi obi mgbawa ihe a kpataara ha, nakwa otú ndị ọzọ nwere ike isi nyere ha aka ma gbaa ha ume. Ha kwukwara otú ndị nne na nna ga-esi na-echebe ụmụ ha ka a ghara imetọ ha. E nwekwara ọtụtụ ihe dabeere na Baịbụl a gwara ndị okenye ha ga-eme ma nwanna metọọ nwatakịrị. Nzukọ a anọgidekwala na-eleba anya n’ihe ndị ahụ a gwara ndị okenye ka ha na-eme. Mgbe ụfọdụkwa, ha na-agbanwe ihe ụfọdụ na ha. Ihe mere ha ji eme ya bụ ka ha jide n’aka na ndị okenye na-eme ihe iwu nke Kraịst kwuru ma mee ihe gosiri na ha nwere ịhụnanya ma na-ekpe ikpe ziri ezi ma e nwee onye metọrọ nwatakịrị.

IHE NDỊ OKENYE NA-EME MA NWANNA MEE MMEHIE DỊ OKÉ NJỌ

10-12. (a) Gịnị ka ndị okenye kwesịrị icheta ma ha nụ na mmadụ mere mmehie dị oké njọ, oleekwa ihe bụ́ mkpa ha? (b) Dị ka Jems 5:14, 15 kwuru, gịnị ka ndị okenye na-agbalị ime?

10 Mgbe ndị okenye na-eleba anya ná mmehie dị oké njọ nwanna mere, ha na-eburu n’uche na iwu nke Kraịst chọrọ ka a na-emeso atụrụ Chineke ihe n’ụzọ gosiri na a hụrụ ha n’anya, nakwa ka ha na-eme ihe ziri ezi n’anya Chineke. N’ihi ya, e nwere ihe ụfọdụ ha kwesịrị ichebara echiche ma a gwa ha na nwanna mere mmehie dị oké njọ. Ihe kacha ndị okenye mkpa bụ ito Jehova nakwa ime ka a ghara ịna-akatọ aha ya. (Lev. 22:31, 32; Mat. 6:9) Ihe ọzọ ha na-emekwa bụ inyere ụmụnna nọ n’ọgbakọ aka ka ha na Jehova dịrị n’ezigbo mma na ịkasi ndị mmehie ahụ dị oké njọ nwanna mere kpara aka ọjọọ obi ma na-enyere ha aka.

11 Ihe ọzọ bụ na, ọ bụrụ na onye mere mmehie ahụ dị oké njọ nọ n’ọgbakọ, ndị okenye na-agbalị ka ha chọpụta ma ò chegharịala ná mmehie ya. Ọ bụrụ na o chegharịala, ha na-enyere ya aka ka ya na Chineke dịghachi ná mma. (Gụọ Jems 5:14, 15.) Onye Kraịst mere mmehie dị oké njọ iji mee ihe ọjọọ na-agụ ya yiri onye na-arịa ọrịa. Nke a pụtara na ya na Chineke adịghịzi n’ezigbo mma. * E nwere ike iji ndị okenye tụnyere ndị dọkịta. Mkpa ha bụ ime ka “ahụ́ dị onye ahụ nke ahụ́ na-adịghị ike mma.” Ha nwere ike iji Baịbụl nyere ya aka ka ya na Chineke dịghachi ná mma. Nke a ga-ekwe omume ma onye ahụ jiri obi ya niile chegharịa.—Ọrụ 3:19; 2 Kọr. 2:5-10.

12 O doro anya na ọrụ ndị okenye na-arụ adịghị mfe. Ihe gbasara atụrụ Chineke nyere ha ka ha na-elekọta na-emetụ ha n’obi nke ukwuu. (1 Pita 5:1-3) Ha chọrọ ka ahụ́ na-eru ụmụnna ala n’ọgbakọ. N’ihi ya, ha na-eme ihe ozugbo ma ha nụ na mmadụ mere mmehie dị oké njọ, ma mmadụ imetọ nwatakịrị. Olee ihe ndị okenye na-eme? Ka anyị tụlee ajụjụ ndị dị ná mmalite  paragraf nke 13,  15, na nke  17.

13-14. Ndị okenye nụ na nwanna metọrọ nwatakịrị, hà na-akọrọ ya ndị ọchịchị ma ọ bụrụ na iwu kwuru ka e mee otú ahụ? Kọwaa.

 13 Ndị okenye nụ na mmadụ metọrọ nwatakịrị, hà na-akọrọ ya ndị ọchịchị ma ọ bụrụ na iwu kwuru ka e mee otú ahụ? Ee, ha na-eme otú ahụ. Iwu mba ụfọdụ kwuru ka ndị mmadụ kọọrọ ndị ọchịchị ma e kwuo na mmadụ metọrọ nwatakịrị. Ndị okenye nọ ná mba ndị ahụ na-emekwa otú ahụ. (Rom 13:1) Iwu ndị ahụ emegideghị iwu Chineke. (Ọrụ 5:28, 29) N’ihi ya, a gwa ndị okenye na e nwere onye metọrọ nwatakịrị, ha na-akpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ ka ha gwa ha otú ha ga-esi akọrọ ya ndị ọchịchị.

14 Mgbe ndị okenye na-agwa ndị e metọrọ na nne na nna ha ma ọ bụ onye ọzọ ma banyere ya okwu, ha na-emeda obi gwa ha na ha nwere ike ịkọrọ ya ndị ọchịchị ma ha chọọ. Ọ bụrụkwanụ na onye ahụ a sịrị na o metọrọ nwatakịrị nọ n’ọgbakọ, ya abụrụkwa na ewu na ọkụkọ nọ n’obodo ahụ ma banyere ya? Onye Kraịst mere ka a mata banyere ya, ò kwesịrị ịna-eche na ya emeela ka a na-akọcha aha Jehova? Mbanụ. Ọ bụ onye ahụ metọrọ nwatakịrị mere ka a na-akọcha aha Chineke.

15-16. (a) Dị ka e kwuru na 1 Timoti 5:19, gịnị mere o ji dị mkpa ka e nwee ọ dịkarịa ala ndị akaebe abụọ tupu ndị okenye ehiwe kọmitii ikpe? (b) Gịnị ka ndị okenye na-eme ma ha mata na o nwere nwanna a sị na o metọrọ nwatakịrị?

 15 Gịnị mere e ji kwesị inwe ndị akaebe abụọ tupu ndị okenye ekpebie na mmadụ mere mmehie dị oké njọ? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ ihe Baịbụl kwuru e kwesịrị ime. Ọ bụrụ na e kwuru na nwanna mere mmehie dị oké njọ, ma o kwetaghị na ọ bụ ihe o mere, a ga-enwe ọ dịkarịa ala, ndị akaebe abụọ tupu ndị okenye ehiwe kọmitii ikpe. (Diut. 19:15; Mat. 18:16; gụọ 1 Timoti 5:19.) Ma, nke a ọ̀ pụtara na a ga-enwe ndị akaebe abụọ tupu a gwa ndị ọchịchị na mmadụ metọrọ nwatakịrị? Mba. Ọ dịghị mkpa na a ga-enwe ndị akaebe abụọ tupu ndị okenye ma ọ bụ ndị ọzọ agwa ndị ọchịchị na mmadụ mere mpụ.

16 Ọ bụrụ na a gwa ndị okenye na onye nọ n’ọgbakọ metọrọ nwatakịrị, ha na-agbalị mee ihe iwu obodo ha kwuru gbasara ịkọrọ ya ndị ọchịchị. Mgbe ahụzi, ha na-esi imi n’ala ka ha mata otú ihe niile si mee. Ha mechaa, ha eleba anya n’ihe Baịbụl kwuru iji mara ma a ga-ehiwere ya kọmitii ikpe. Ọ bụrụ na onye ahụ agọọ, ha ga-enye ohere ka ndị ọzọ maara banyere ya kwuo ihe ha ma gbasara ya. Ọ bụrụ na e nwee ndị akaebe abụọ, ma ọ dịkarịa ala, ya bụ, onye kwuru na nwanna ahụ metọrọ nwatakịrị na onye ọzọ ma banyere ya ma ọ bụ ma banyere nwatakịrị ọzọ nwanna ahụ metọrọla, a ga-ehiwere ya kọmitii ikpe. * Ọ bụrụ na e nweghị onye akaebe ọzọ, ọ pụtaghị na ihe o kwuru bụ ụgha. Ọ bụrụgodị na e nweghị ndị akaebe abụọ nwere ike igosi na nwanna mere mmehie dị oké njọ, ndị okenye na-aghọta na o nwere ike ịbụ na nwanna ahụ mere mmehie dị oké njọ nke kparala ndị ọzọ aka ọjọọ. Ndị okenye ga-anọgide na-akwado ndị ihe ahụ kparala aka ọjọọ ma na-akasi ha obi. Ndị okenye ga na-elebara nwanna ahụ anya ka ọ ghara ịkpatara ndị nọ n’ọgbakọ nsogbu ọzọ.—Ọrụ 20:28.

17-18. Kọwaa ọrụ kọmitii ikpe na-arụ n’ọgbakọ.

 17 Gịnị bụ ọrụ kọmitii ikpe? Okwu bụ́ “ikpe” apụtaghị na ndị okenye na-ekpe onye ahụ metọrọ nwatakịrị ikpe iji mara ma ndị ọchịchị hà kwesịrị ịta ya ahụhụ maka ịda iwu. Ndị okenye anaghị arụ ọrụ ndị ọchịchị kwesịrị ịrụ. Ha na-ahapụrụ ndị ọchịchị okwu gbasara ime mpụ. (Rom 13:2-4; Taị. 3:1) Ihe ndị okenye na-eme bụ ikpebi ma nwanna ahụ ọ̀ ka kwesịrị ịnọ n’ọgbakọ.

18 Ihe ndị okenye so na kọmitii ikpe na-eleba anya bụ ihe gbasara adịm ná mma onye ahụ mere ihe ọjọọ na Chineke nakwa nke ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. Ha na-eji ihe Baịbụl kwuru ekpebi ma onye ahụ metọrọ nwatakịrị ò chegharịala ma ọ bụ na o chegharịbeghị. Ọ bụrụ na o chegharịghị, ha na-agwa ya na a ga-achụ ya n’ọgbakọ ma gwa ọgbakọ na onye ahụ abụkwaghị Onyeàmà Jehova. (1 Kọr. 5:11-13) O chegharịa, ọ ka nwere ike ịnọ n’ọgbakọ. Ma, ndị okenye ga-agwa ya na o nwere ike ọ gaghị enwe ihe ùgwù n’ọgbakọ ruo ọtụtụ afọ ma ọ bụdị ná ndụ ya niile. Ebe ọ bụ na ndị okenye achọghị ka ihe ọ bụla mee ụmụaka nọ n’ọgbakọ, ha nwere ike ịgwa ndị nne na nna na nzuzo ka ha na-elebara ụmụ ha anya ma ha na onye ahụ nọrọ. Mgbe ndị okenye na-agwa ndị nne na nna gbasara onye ahụ metọrọ ụmụaka, ha anaghị agwa ha aha ụmụaka onye ahụ metọrọla.

OTÚ Ị GA-ESI ECHEBE ỤMỤ GỊ

Ebe nne na nna ji akwụkwọ nzukọ Jehova bipụtara na-akụziri ụmụ ha ihe ha kwesịrị ịma banyere mmekọahụ ka a ghara imetọ ha. (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19 ruo na nke 22)

19-22. Gịnị ka ndị nne na nna nwere ike ime iji chebe ụmụ ha? (Lee ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

19 Ònye ka ọ dị n’aka ichebe ụmụaka? Ọ bụ nne na nna. * Ụmụ gị bụ onyinye Chineke nyere gị, ya bụ, “ihe nketa si n’aka Jehova.” (Ọma 127:3) Jehova nyere gị ọrụ ichebe ụmụ gị. Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike ichebe ụmụ gị ka a ghara imetọ ha?

20 Nke mbụ, chọpụta ihe ụfọdụ gbasara imetọ ụmụaka. Mụọ gbasara ụdị ndị na-emetọ ụmụaka na ihe ndị ha na-eme iji ghọgbuo ha. Mara ndị nwere ike imetọ ụmụaka na ihe ndị nwere ike ime ka e metọọ ha. (Ilu 22:3; 24:3) Cheta na ọtụtụ mgbe, onye na-emetọ nwatakịrị bụ onye nwa ahụ maara ma tụkwasị obi.

21 Nke abụọ, gị na ụmụ gị na-ekwurịta okwu nke ọma. (Diut. 6:6, 7) Ọ pụtara na ị ga na-ege ha ntị nke ọma. (Jems 1:19) Cheta na ụmụaka e metọrọ anaghị achọ ịkọrọ ya onye ọzọ. Ụjọ nwere ike na-atụ ha na e nweghị onye ga-ekweta ihe ha kwuru ma ọ bụkwanụ, onye ahụ nwere ike gwa ha na ọ ga-emesi ha ike ma ha gwa ya onye ọzọ. Ọ bụrụ na ị chọpụta na e nwere ihe mere ụmụ gị, meda obi jụọ ha ajụjụ ma gee ha ntị nke ọma mgbe ha na-aza gị ajụjụ ị jụrụ ha.

22 Nke atọ, na-akụziri ụmụ gị ihe. Gwa ha ihe ha kwesịrị ịma gbasara mmekọahụ. Ihe ị ga-agwa ha kwesịrị ịdabere n’afọ ndụ ha na ihe ha ga-aghọtali. Gwa ha ihe ha ga-eme na ihe ha ga-ekwu ma mmadụ chọọ imetụ ha aka n’ebe na-ekwesịghị ekwesị. Jiri ihe ndị nzukọ Jehova kụzirila anyị chebe ụmụ gị ka a ghara imetọ ha.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Kụziere Onwe Gị na Ụmụ Gị Ihe.”

23. Olee otú anyị si ele imetọ ụmụaka anya, oleekwa ajụjụ anyị ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

23 Ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị na-ele imetọ ụmụaka anya ka mmehie dị oké njọ na ihe arụ. Anyị na-edebe iwu nke Kraịst, n’ihi ya, anyị anaghị ekpuchi ndị metọrọ ụmụaka ka ha ghara iji isi ha buru ihe ha metara. Ka ọ dị ugbu a, olee ihe anyị nwere ike ime iji nyere ndị e metọrọ aka? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

ABỤ 103 Ndị Ọzụzụ Atụrụ Bụ Onyinye Jehova Nyere Anyị

^ par. 5 N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú e nwere ike isi echebe ụmụaka ka a ghara imetọ ha. Anyị ga-atụlekwa ihe ndị okenye na-eme iji chebe ọgbakọ nakwa otú ndị nne na nna nwere ike isi chebe ụmụ ha.

^ par. 3 NKỌWAKWU: Imetọ ụmụaka bụ ihe ọ bụla nwoke ma ọ bụ nwaanyị torola eto mere nwatakịrị iji mejuo agụụ mmekọahụ na-agụ ya. O nwere ike ịbụ idina nwatakịrị, mmadụ na nwatakiri isi n’ọnụ ma ọ bụ n’otule nwee mmekọahụ, ịpịgharị nwatakịrị aka n’ihe o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ịpị nwatakịrị aka n’ara, ịdịda ya aka n’ikè ma ọ bụkwanụ mmekọahụ rụrụ arụ ndị ọzọ. Anyị kwesịrị icheta na e metọọ nwatakịrị, ọ na-agbawa ya obi, ọ bụkwa mmegbu ka e megburu ya. Ihe ọzọkwa bụ na ihe ahụ e mere ya esighị ya n’aka. Ọtụtụ ụmụaka a na-emetọ bụ ụmụ nwaanyị, a na-emetọkwa ọtụtụ ụmụ nwoke. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị na-emetọ ụmụaka bụ ụmụ nwoke, ụfọdụ ụmụ nwaanyị na-emetọkwa ụmụaka.

^ par. 11 Ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie dị oké njọ n’ihi na ya na Chineke adịchaghị ná mma, ọ pụtaghị na a ga-agbachi ya nkịtị. Ọ ga-eji isi ya buru nsogbu niile mkpebi o mere na ihe ndị o mere kpataara ya. Ọ ga-azakwa Chineke ajụjụ banyere ihe o mere.—Rom 14:12.

^ par. 16 Ndị okenye ekwesịghị ịkpọ nwatakịrị ka ọ nọrọ ya mgbe ha na onye ahụ e kwuru na o metọrọ ya na-ekwurịta okwu. Nne ma ọ bụ nna ma ọ bụkwanụ onye ọzọ nwatakịrị ahụ tụkwasịrị obi nwere ike ịgwa ndị okenye ihe nwatakịrị ahụ kwuru merenụ. Ime otú ahụ ga-eme ka obi ghara ịgbawakwu nwatakịrị ahụ.

^ par. 19 Ihe e kwuru gbasara ndị nne na nna ebe a gbasakwara ndị ọzọ na-azụ ụmụaka na-abụghị nke ha.