ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Nọvemba 2018

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite Disemba 31, 2018 ruo Febụwarị 3, 2019.

“Zụta Eziokwu, Erekwala Ya”

Gịnị ka ịzụta eziokwu pụtara? Ozugbo anyị mụtara ya, gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịhapụ ya?

“M Ga-eje Ije n’Eziokwu Gị”

Olee otú anyị nwere ike isi kpebisie ike iji eziokwu dị oké ọnụ ahịa Jehova kụziiri anyị kpọrọ ihe?

Tụkwasị Jehova Obi Ka I Wee Dị Ndụ

Akwụkwọ Habakọk nwere ike inyere anyị aka inwe obi iru ala n’agbanyeghị nsogbu anyị niile.

Ònye Na-akpụgharị Echiche Gị?

Olee otú ị ga-esi kwe ka echiche Chineke kpụgharịa echiche gị, ọ bụghị nke mmadụ?

Ị̀ Na-eme Ka Echiche Gị na Echiche Jehova Bụrụ Otu?

Olee ihe anyị ga-eme ka ụwa a ghara ịkpụgharị echiche anyị?

Obiọma Bụ Àgwà A Na-egosi ma n’Okwu ma n’Omume

Obiọma so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. Olee otú anyị ga-esi mụta ọmarịcha àgwà a?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ole ndị bụ Ndị Ome Mma ahụ Jizọs kwuru banyere ha n’abalị bọtara ụbọchị ahụ ọ nwụrụ, oleekwa ihe mere e ji akpọ ha aha a?

Olee Ihe Anyị Nwere Ike Inye Jehova?

Olee ihe dị “oké ọnụ ahịa” e kwuru banyere ya n’Ilu 3:​9, oleekwa otú anyị nwere ike isi jiri ha na-akwado ofufe Chineke?