Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Anyị Nwere Ike Inye Jehova?

Olee Ihe Anyị Nwere Ike Inye Jehova?

JIZỌS kwuru, sị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ihe a Jizọs kwuru bụ eziokwu, ọ gbasakwara adịm ná mma anyị na Jehova. N’ihi gịnị? Jehova enyela anyị ọtụtụ ihe ndị na-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ. Ma anyị nwedịrị ike inwekwu obi ụtọ ma anyị nye Jehova ihe. Oleekwanụ ihe anyị nwere ike inye Jehova? Ilu 3:9 kwuru, sị: “Jiri ihe gị ndị dị oké ọnụ ahịa sọpụrụ Jehova.” Ihe ndị ahụ dị “oké ọnụ ahịa” bụ oge anyị, nkà anyị na ihe ndị anyị nwere. Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe ndị ahụ na-akwado ofufe Chineke, anyị na-enye Jehova ihe. Ime otú ahụ ga-emekwa ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ.

A bịa n’ihe ndị anyị nwere, olee ihe ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ileghara ịna-enye Jehova ihe? Pọl onyeozi gwara ụmụnna nọ na Kọrịnt ka ha si n’ihe ha nwere “wepụta ihe” ha ga-enye n’onyinye. (1 Kọr. 16:2) Olee ihe i nwere ike ime ma ị chọọ ịmatakwu ụzọ ndị ị ga-esi enye onyinye n’Ịntanet n’obodo gị? Biko, gụọ igbe dị n’okpuru.

Ọ bụghị obodo niile ka mmadụ nwere ike isi n’Ịntanet nye onyinye. Ma e nwere ike ihụ ụzọ ndị ọzọ a ga-esi enye onyinye n’ebe e dere otú e si enye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ. Ná mba ụfọdụ, otu n’ime ihe ndị dị na peeji a zara ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị gbasara inye onyinye.