Ị̀ Na-eme Ka Echiche Gị na Echiche Jehova Bụrụ Otu?
“Gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ.”—ROM 12:2.
1, 2. Ka anyị na-abịarukwu Jehova nso, olee ihe ndị ọzọ anyị ga-amụta? Mee ihe atụ.
KA E WERE ya na e nyere otu nwatakịrị onyinye. Ndị mụrụ ya asị ya kelee onye ahụ nyere ya onyinye. Nwa ahụ ekelee onye ahụ n’ihi na a gwara ya mee otú ahụ. Ma, ka ọ na-eto, ọ ga na-aghọta ihe mere ndị mụrụ ya ji na-akụziri ya ka ọ na-ekele ndị ọzọ maka ihe ọma ha meere ya. Ugbu a, ọ mụtala ịna-esi n’obi ya ekele ndị meere ya ihe ọma.
2 Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Mgbe anyị mụtara eziokwu Baịbụl ọhụrụ, anyị matara na ọ dị ezigbo mkpa ịna-edebe iwu ndị bụ́ isi Chineke nyere anyị. Ma ka oge na-aga, anyị mụtara ihe ndị ọzọ gbasara Chineke, dị ka, ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-anaghị amasị ya, nakwa otú o si ele ihe anya. Ọ bụrụ na anyị amụta ịna-eche echiche ka Chineke, na-emekwa ihe ndị na-amasị ya, ọ ga-egosi na anyị na-eme ka echiche anyị na echiche Jehova bụrụ otu.
3. Olee ihe mere o ji esi ike ime ka echiche anyị na echiche Chineke bụrụ otu?
3 Ọ bụ eziokwu na ịmụta ịna-eche echiche ka Jehova na-atọ anyị ụtọ, ma ọ dịghị mfe ime ya n’ihi na ezughị okè na-akpa anyị aka ọjọọ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike isitụrụ anyị ike ịghọta ihe bụ́ echiche Chineke banyere izere omume rụrụ arụ, ịhụ akụnụba n’anya, ikwusa ozi ọma, izere ọbara, na ihe
ndị ọzọ. Olee ihe ga-enyere anyị aka? Olee otú anyị ga-esi na-emekwu ka echiche anyị na echiche Chineke bụrụ otu? Oleekwa otú ọ ga-esi nyere anyị aka ime mkpebi ndị dị mma ugbu a na n’ọdịnihu?IME KA ECHICHE ANYỊ NA ECHICHE CHINEKE BỤRỤ OTU
4. Gịnị ka ‘ime ka uche anyị dị ọhụrụ’ pụtara?
4 Gụọ Ndị Rom 12:2. N’ebe a, Pọl onyeozi kọwara ọrụ dị n’ime ka echiche anyị na nke Chineke bụrụ otu. Isiokwu gara aga mere ka anyị ghọta na ihe ga-enyere anyị aka ‘ịkwụsị ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị,’ bụ izere ihe ọ bụla na-akwado echiche ụwa. Mana, Pọl kwukwara na ọ dị mkpa ka anyị ‘mee ka uche anyị dị ọhụrụ.’ Iji mee ya, anyị ga na-amụ Okwu Chineke ka ọ bamie anyị n’obi, na-atụgharị uche na ya, na-emekwa ka echiche anyị na nke Chineke bụrụ otu.
5. Kọwaa ihe dị iche n’ịgụ ihe elu elu na ịmụ ihe.
5 Ịmụ ihe abụghị ịgụ ihe elu elu na ịkatụ ihe n’ebe azịza dị na paragraf. Anyị mụwa ihe, anyị kwesịrị ịchọpụta ihe ihe anyị na-amụ na-akọrọ anyị gbasara Jehova, àgwà ya, na echiche ya. Anyị ga-achọpụtakwa ihe mere Chineke ji gwa anyị mee otu ihe ma sị anyị emela nke ọzọ. Anyị kwesịkwara iche banyere otú anyị ga-esi jiri ihe ndị anyị mụtara gbanwee ndụ anyị na otú anyị si eche echiche. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike anyị agaghị emecha ihe a niile mgbe ọ bụla anyị na-amụ ihe, ma ọ bụrụ na anyị ewepụta ihe dị ka ọkara oge anyị ji amụ ihe tụgharịa uche n’ihe anyị mụrụ, ọ ga-abara anyị ezigbo uru.—Ọma 119:97; 1 Tim. 4:15.
6. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche mgbe niile n’Okwu Chineke?
6 Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche mgbe niile n’Okwu Chineke, ihe dị ịtụnanya ga-eme. Anyị ‘ga-achọpụta n’onwe anyị,’ ya bụ, ọ ga-edo anyị anya na echiche Jehova zuru okè. Anyị ga-ebido ile ihe anya otú o si ele ya ma na-anabata echiche ya. Uche anyị ‘ga-adị ọhụrụ,’ anyị agbanweekwa otú anyị sibu eche echiche. Nwayọọ nwayọọ, anyị ga-eme ka echiche anyị na nke Jehova bụrụ otu.
ECHICHE ANYỊ NA-EMETỤTA IHE ANYỊ NA-EME
7, 8. (a) Olee otú Jehova si ele ịchụ akụnụba anya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Ọ bụrụ na anyị na-ele akụnụba anya otú Jehova si ele ya, olee ihe anyị ga-ewere ka ihe kacha mkpa?
7 N’eziokwu, ihe anyị na-eche n’echiche na-emetụta ihe ndị anyị na-eme. Ọ bụ ihe anyị na-eche ka anyị na-emekarị. (Mak 7:21-23; Jems 2:17) O nwere ihe atụ ụfọdụ ga-eme ka ihe a doo anya. Otu bụ ihe a kọrọ na Baịbụl banyere ọmụmụ Jizọs. O mere ka anyị mata otú Jehova si ele akụnụba anya. Chineke ji aka ya họta ndị ga-abụ nne na nna Nwa ya. Ọ họtara ndị na-abaghị ọgaranya. (Lev. 12:8; Luk 2:24) Mgbe Meri mụrụ Jizọs, ‘o nyiwere ya n’ime ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri, n’ihi na ọ dịghị ebe ha ga-anọ n’ụlọ ndị njem.’ (Luk 2:7) A sị na Jehova chọrọ, ọ gaara esi n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ mee ka e nweta ụlọ dị mma a ga-anọ mụọ Ọkpara ya. Mana, ihe ka ya mkpa abụghị akụnụba, kama ọ bụ ka a zụlite Ọkpara ya n’ezinụlọ ji ofufe ya kpọrọ ihe.
8 Ihe a Baịbụl kọrọ gbasara otú e si mụọ Jizọs mere ka anyị mata otú Jehova si ele akụnụba anya. Ụfọdụ ndị nne na nna na-achọ ka ụmụ ha rụwa ọrụ ga na-enye ha nnukwu ego, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ọ ga-eme ka ha lawa azụ n’ọgbakọ. Ma, o doro anya na ihe kacha Jehova mkpa bụ ofufe anyị na-efe ya. Ị̀ na-ele Ndị Hibru 13:5.
okwu a anya otú Jehova si ele ya? Gịnị ka omume gị na-egosi?—Gụọ9, 10. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-ele ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ anya otú Jehova si ele ya?
9 Ihe atụ nke abụọ bụ otú Chineke si ele ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ anya. Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke mere ka otu n’ime ndị a dị nta kwere ekwe sụọ ngọngọ, ọ ga-akara ya mma ma ọ bụrụ na e konye nkume igwe nri, dị ka nke ịnyịnya ibu na-akwagharị, n’olu ya wee tụba ya nnọọ n’ime oké osimiri.” (Mak 9:42) Otú Jizọs si kwuo ihe a gosiri na ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ abụghị obere okwu. Ebe ọ bụ na Jizọs na-eme ka Nna ya, obi siri anyị ike na Jehova achọtụghị ka onye ọ bụla n’ime anyị mee ka otu n’ime ndị ohu ya sụọ ngọngọ.—Jọn 14:9.
10 Otú a Jehova na Jizọs si ele ihe a anya ọ̀ bụ otú anyịnwa si ele ya? Ànyị emeela ka echiche anyị na nke Chineke bụrụ otu n’okwu a? Gịnị ka omume gị na-egosi? Dị ka ihe atụ, were ya na o nwere otu ụdị ejiji na-amasị gị. Ma, ụdị ejiji ahụ na-ewe ndị ụfọdụ iwe n’ọgbakọ unu ma ọ bụ na-eme ka echiche na-adịghị mma na-abata ha n’obi. Ị̀ ga-ekwe ka ịhụnanya i nwere n’ebe ụmụnna gị nọ mee ka ị hapụ ihe ahụ na-amasị gị?—1 Tim. 2:9, 10.
11, 12. Olee otú ijide onwe anyị na ile ajọ omume anya otú Chineke si ele ya ga-esi nyere anyị aka izere ihe ọjọọ?
11 Ihe atụ nke atọ bụ na Jehova kpọrọ ajọ omume asị. (Aịza. 61:8) Jehova ma na ime ihe ọjọọ nwere ike ịgụ anyị agụụ mgbe ụfọdụ n’ihi ezughị okè. Ma, ọ na-agba anyị ume ka anyị kpọọ ajọ omume asị otú ahụ yanwa kpọrọ ya. (Gụọ Abụ Ọma 97:10.) Ọ bụrụ na anyị echee banyere ihe mere Jehova ji kpọọ ihe ọjọọ asị, ọ ga-eme ka anyị kpọọ ihe ọjọọ asị ma kpebisie ike izere ya.
12 Ọ bụrụ na anyị akpọọ ajọ omume asị otú ahụ Jehova kpọrọ ya, ọ ga-enyekwuru anyị aka ịmata omume ndị ọzọ na-adịghị mma, n’agbanyeghị na Baịbụl akpọghị omume ndị ahụ aha. Dị ka ihe atụ, e nwere ụdị ịgba egwú na-ewuzi ewu n’ụwa taa. Ndị na-agba ya na-afọ obere ka ọ bụrụ na ha gba ọtọ. Ụfọdụ na-ekwu na ụdị omume a adịghị njọ n’ihi na ọ bụghị ịkwa iko. * Ma, è nwere ike ikwu na Chineke nabatara ụdị omume a ebe ọ bụ na Chineke kpọrọ ụdị ajọ omume niile asị? Ka anyị gbalịsie ike na-ejide onwe anyị, si otú ahụ na-agbara ihe ọjọọ ọsọ ma kpọọ ihe niile Jehova kpọrọ asị asị.—Rom 12:9.
ICHEBARA MKPEBI Ị GA-EME N’ỌDỊNIHU ECHICHE
13. Gịnị mere anyị kwesịrị iji chọpụta ihe bụ́ echiche Jehova n’ihe dị iche iche ugbu a ka anyị nwee ike ime mkpebi dị mma n’ọdịnihu?
13 Mgbe anyị na-amụ ihe, anyị kwesịrị iche gbasara ihe bụ́ echiche Jehova n’ihe dị iche iche. Ọ ga-enyere anyị aka ime mkpebi dị mma n’ọdịnihu. Ọ bụrụzie na ọnọdụ chọrọ ka anyị mee mkpebi ozugbo adapụta, anyị ga-adị njikere ime mkpebi dị mma. (Ilu 22:3) Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ si na Baịbụl.
14. Gịnị ka ọjụjụ Josef jụrụ ime ihe nwunye Pọtịfa chọrọ na-akụziri anyị?
14 Josef jụrụ ọnwụnwa ahụ nwunye Pọtịfa nwara ya ka ya na ya kwaa iko. Ọjụjụ ahụ ọ jụrụ ya ozugbo gosiri na o cheela banyere ihe bụ́ echiche Jehova Jenesis 39:8, 9.) Josef sịrị nwunye Pọtịfa: “Olee otú m ga-esi mee oké ihe ọjọọ a wee mehie Chineke?” Ihe ahụ ọ gwara ya gosiri na o mere ka echiche ya na Jehova bụrụ otu. Oleekwanụ maka anyịnwa? Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye gị na ya na-arụkọ ọrụ emewa omume gosiri na ọ chọrọ ka gị na ya mewe enyi? Ma ọ bụkwanụ gịnị ka ị ga-eme ma mmadụ zitere gị ozi iberiibe ma ọ bụ foto na-ekwesịghị ekwesị n’ekwentị gị? * Ọ ga-adịrị anyị mfe ime ihe kwesịrị ekwesị n’okwu ndị a ma ọ bụrụ na anyị eburula ụzọ chọpụta ihe bụ́ echiche Jehova ma kpebie ihe anyị ga-eme.
n’ihe gbasara di ma ọ bụ nwunye ịgba n’èzí. (Gụọ15. Olee otú anyị ga-esi nọsie ike na-efe Jehova dị ka ndị Hibru atọ ahụ?
15 Ugbu a, ka anyị leba anya n’akụkọ ndị Hibru atọ ahụ a na-akpọ Shadrak, Mishak, na Abednego. Ọjụjụ ha jụrụ ife ihe oyiyi ọlaedo ahụ Eze Nebukadneza kpụrụ na otú ha si gwa ya hoo haa na ha agaghị eme ya gosiri na ha eburula ụzọ chee banyere otú ha ga-esi nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ. (Ọpụ. 20:4, 5; Dan. 3:4-6, 12, 16-18) Ka e were ya na onye were gị n’ọrụ sị gị soro tụọ ego a ga-eji eme ememme ndị okpukpe ụgha. Gịnị ka ị ga-eme? Kama ichere ka ụdị ihe ahụ mee tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme, ọ ka mma ka i chebara ha echiche ugbu a iji mata otú Jehova si ele ụdị ihe ndị ahụ anya. Ọ bụrụzie na ụdị ihe ndị ahụ ebilite, ọ ga-adịrị gị mfe ime mkpebi dị mma dị ka ndị Hibru atọ ahụ.
16. Olee otú ịmata ihe bụ́ echiche Jehova ga-esi nyere anyị aka ịkwadebe nke ọma a dịghị ama ama e buga anyị ụlọ ọgwụ?
16 Ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ kpebie na o nweghị ihe ga-eme ka anyị mebie iwu Jehova, ọ ga-enyekwara anyị aka ma ọ bụrụ na e bugara anyị ụlọ ọgwụ. Ọ bụ eziokwu na anyị kpebisiri ike na anyị agaghị ekwe ka a mịnye anyị ọbara ma ọ bụ ihe anọ bụ́ isi dị n’ọbara, ma, e nwere ihe ndị ọzọ metụtara ọbara anyị ga-eji ihe anyị mụtara na Baịbụl kpebie ihe anyị ga-eme. (Ọrụ 15:28, 29) O doro anya na oge kacha mma iji mee ụdị mkpebi a abụghị mgbe anyị nọ n’ụlọ ọgwụ, ahụ́ ana-enye anyị nsogbu, ya adịkwa mkpa ka anyị mee mkpebi ngwa ngwa. Ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị iwepụta oge mee nchọnchọ, dejupụta fọm iwu kwadoro anyị ji kwuo otú anyị chọrọ ka e si gwọọ anyị ọrịa, ma gwa dọkịta anyị banyere ya. *
17-19. Gịnị mere o ji dị mma ịmata ihe bụ́ echiche Jehova n’ihe dị iche iche ugbu a? Mee ihe atụ.
17 N’ikpeazụ, chee banyere ihe Jizọs zara Pita ozugbo Pita gwara ya, sị: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị.” Ọ ga-abụ na Jizọs eburula ụzọ chebara ihe bụ́ uche Chineke echiche, chebakwara amụma ndị e buru banyere ndụ ya na ọnwụ ya echiche. Ihe ndị a o chebaara echiche nyeere ya aka ịnọgide na-erubere Chineke isi ma jiri ndụ ya chụọ àjà.—Gụọ Matiu 16:21-23.
18 Taa, uche Chineke maka ndị ya bụ ka ha na ya bụrụ enyi, nakwa ka ha jiri ike ha niile jeere ya ozi. (Mat. 6:33; 28:19, 20; Jems 4:8) Ụfọdụ ndị anyị na ha dị ná mma nwere ike ịgwa anyị ihe ga-eme ka anyị ghara ime ihe ndị a Chineke chọrọ otú ahụ Pita gwara Jizọs. Dị ka ihe atụ, onye were gị n’ọrụ nwere ike ịchọ ibuli gị n’ọkwá, nke ga-eme ka ụgwọ ọnwa gị gbagota. Mana, ihe a nwere ike ime ka ị lawa azụ n’ọgbakọ. Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na ị bụ nwa akwụkwọ, were ya na e nyere gị ohere ịga gụkwuo akwụkwọ n’ebe ọzọ. Mana, ọ ga-eme ka i si n’ụlọ unu kwaga ebe ahụ. Ọ̀ bụ mgbe ahụ ka ị ga-amalite kpewe ekpere, mewe nchọnchọ, gwawa ndị ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị okenye, tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme? Ọ́ gaghị aka mma ka ị mata ihe bụ́ echiche Jehova n’ihe ndị a ugbu a ma mee ka echiche gị na ya bụrụ otu? Ọ bụrụzie na ụdị ihe ahụ adapụta, ọ gaghị abụrụ gị ọnwụnwa. I kpebie ihe ndị ị ga-eme n’ozi Jehova, uche gị adịrịkwa na ha mgbe niile, ọ ga-adịrị gị mfe ime ihe ndị ahụ i kpebiri.
19 I nwekwara ike iche banyere ihe ndị nwere ike ịdapụta na mberede. O doro anya na anyị agaghị enwe ike ijikere maka ọnọdụ niile nwere ike ịdapụta. Ma, ọ bụrụ na anyị atụgharịa uche n’echiche Jehova n’oge anyị na-amụ ihe, ọ ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe icheta ihe anyị mụrụ ma jiri ya mee mkpebi dị mma n’ọnọdụ ọ bụla dapụtaranụ. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ị na-amụ ihe, gbalịa mata ihe bụ́ echiche Jehova n’ihe dị iche iche, mee ka echiche gị na Jehova bụrụ otu, cheekwa banyere otú iche echiche ka Jehova ga-esi nyere gị aka ime mkpebi dị mma ugbu a na n’ọdịnihu.
INWE ECHICHE JEHOVA GA-EME KA ỌDỊNIHU GỊ DỊ MMA
20, 21. (a) Gịnị mere na ọ bụghị n’ihe niile ka anyị ga-enwere onwe anyị n’ụwa ọhụrụ? (b) Olee ihe ga-eme ka anyị na-aṅụrị ọṅụ ugbu a?
20 Anyị na-atụsi anya ụwa ọhụrụ ike. Ọtụtụ n’ime anyị na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’ụwa a. N’Alaeze Chineke, ụmụ mmadụ ga-enwere onwe ha n’ahụhụ niile ha na-ata n’ụwa ọjọọ a. N’oge ahụ, onye ọ bụla ka ga-enwere onwe ya ịhọrọ ime ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị ọ chọrọ.
21 Ma, ọ pụtaghị na anyị ga-emewezi ihe otú ọ bụla masịrị anyị. Ya ruo n’ihe gbasara ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, ọ bụ iwu Jehova na echiche ya ga na-eduzi ndị ya. Ihe a ga-eme ka obi ụtọ na udo ju ebe niile. (Ọma 37:11) Ma ka ọ dịgodị, anyị ga na-aṅụrị ọṅụ ugbu a n’ihi na anyị na-eme ka echiche anyị na nke Jehova bụrụ otu.
^ para. 12 Ihe a bụ ụdị ịgba egwú onye fọrọ obere ka ọ bụrụ na ọ gba ọtọ na-anọkwasị n’apata ụkwụ onye ọzọ na-echigharị onwe ya. Ọ bụrụ na nwanna emee ụdị ihe a, e nwere ike ile ya anya ka ịkwa iko, jiri maka ya hiwere ya òtù ikpe. Onye Kraịst mere ụdị ihe a kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere ya aka.—Jems 5:14, 15.
^ para. 14 Iji ekwentị ezigara mmadụ ozi iberiibe, foto, ma ọ bụ vidio ndị gba ọtọ nwere ike ime ka e hiwere mmadụ òtù ikpe dabere n’otú o si mee. O nweedịla mgbe ndị ọchịchị kpere ụmụaka ndị mere ụdị ihe a ikpe. Ị chọọ ịgụkwu banyere ihe a, gaa na Teta! Jenụwarị-Febụwarị 2014, peeji nke 4-5, gụọ isiokwu bụ́ “Otú Ị Ga-esi Gwa Nwa Gị Banyere Ozi Iberiibe.”
^ para. 16 E nwere ihe ndị Baịbụl kwuru a kọwara n’akwukwọ anyị ga-enyere anyị aka n’okwu a. Dị ka ihe atụ, lee akwụkwọ bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” peeji nke 215-217.