Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ole ndị bụ Ndị Ome Mma ahụ Jizọs kwuru banyere ha n’abalị bọtara ụbọchị ahụ ọ nwụrụ, oleekwa ihe mere e ji akpọ ha aha a?

N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ gwara ndịozi ya ka ha ghara ịchọ ọkwá ukwu n’etiti onwe ha. Ọ gwara ha, sị: “Ndị eze nke ndị mba ọzọ na-eme ka à ga-asị na ọ bụ ha nwe ha, a na-akpọkwa ndị na-achị ha Ndị Ome Mma. Ma unu onwe unu agaghị adị otú ahụ.”—Luk 22:25, 26.

Ole ndị bụ Ndị Ome Mma ahụ Jizọs kwuru banyere ha? Ihe ndị e dere na nkume, mkpụrụ ego, nakwa ihe ndị e dere n’akwụkwọ na-egosi na ndị Grik na ndị Rom na-ejikarị utu aha bụ́ Euergetes ma ọ bụ Ndị Ome Mma akwanyere ndị ukwu ma ọ bụ ndị ọchịchị ùgwù. Ihe mere ha ji eme ya bụ n’ihi ụfọdụ ọrụ ndị dị mkpa ha rụụrụ ọhaneze.

A na-akpọ ọtụtụ ndị eze Ndị Ome Mma. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị eze Ijipt aha ha bụ Tọlemi Nke Atọ nakwa Tọlemi Nke Asatọ. Ndị ọzọ bụ ndị ọchịchị Rom aha ha bụ Julius Caesar na Ọgọstọs nakwa Eze Judia aha ya bụ Herọd Onye Ukwu. O nwere ike ịbụ na ihe mere e ji akpọ Herọd aha a bụ n’ihi ọka wit ọ tụbataara ndị obodo ya n’oge e nwere ụkọ nri nakwa uwe o nyere ndị ogbenye.

Onye Jamanị bụ́ ọkà mmụta Baịbụl aha ya bụ Adolf Deissmann kwuru na a na-akpọ ndị mmadụ Ndị Ome Mma n’ọtụtụ ebe n’oge ochie. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ achọwa ebe e dere [utu aha a] n’ihe ndị dị ka nkume ndị e nwere n’oge ochie, ọ gaghị egbu oge onye ahụ achọta ya na nkume karịrị otu narị.”

Oleezi ihe mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ma unu onwe unu agaghị adị otú ahụ”? Jizọs ọ̀ gwara ha ka ha ghara inyere ndị mmadụ aka, ya bụ, ka ihe gbasara ọdịmma ndị mmadụ ghara imetụ ha n’ahụ́? Mbanụ. Ọ ga-abụ na ihe bụ́ mkpa Jizọs bụ ihe ndị mmadụ bu n’obi na-emesapụ aka.

N’oge Jizọs, ihe mere ndị ọgaranya ji akwado egwuregwu ndị a na-eme n’ámá egwuregwu, arụ nnukwu ogige, ụlọ arụsị, na-akwadokwa ọrụ ndị ọzọ yiri ya bụ ka a kpọọ ha aha ọma. Ha na-emekwa ya ka ndị mmadụ na-eto ha, ka ha bụrụ ndị a ma ama, nakwa ka ndị mmadụ tụnyere ha vootu. Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na e nwere ndị bu ihe ọma n’obi na-emesapụ aka, ma ihe mere ọtụtụ ndị ji eme ya bụ ka a tụnyere ha vootu.” Ọ bụ ụdị àgwà a ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha zere.

Mgbe afọ ole na ole gachara, Pọl onyeozi kwusiri ike na anyị kwesịrị ibu ihe ọma n’obi na-emesapụ aka. Ọ gwara ụmụnna nọ na Kọrịnt, sị: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.”—2 Kọr. 9:7.