Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Na-akpụgharị Echiche Gị?

Ònye Na-akpụgharị Echiche Gị?

‘Kwụsịnụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị.’​—ROM 12:2.

ABỤ: 88, 45

1, 2. (a) Gịnị ka Jizọs zara Pita mgbe Pita gwara ya ka o meere onwe ya ebere? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị mere Jizọs ji si otú ahụ zaghachi ya?

IHE Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya gbara ha gharịị. Ha nọ na-atụ anya na Jizọs ga-abịa weghachiri mba Izrel alaeze ya. Ma, Jizọs bịara gwa ha na n’oge na-adịghị anya, na ya ga-ata ahụhụ ma nwụọ. Pita onyeozi gwara ya, sị: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị; ihe a agaghị eme gị ma ọlị.” Ma, Jizọs baara Pita mba, sị ya: “Gaa m n’azụ, Setan! Ị bụụrụ m ihe ịsụ ngọngọ, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ.”—Mat. 16:21-23; Ọrụ 1:6.

2 Jizọs ji ihe ahụ ọ gwara Pita gosi na echiche Chineke dị nnọọ iche n’echiche ụwa a Ekwensu na-achị. (1 Jọn 5:19) Ihe a Pita kwuru bụ ihe e ji mara ụwa Setan a na-achọkarị ọdịmma onwe ha. Ma, Jizọs ma na ihe Nna ya na-eche dị iche. Ọ ma na Chineke chọrọ ka ọ dị njikere maka ahụhụ na ọnwụ ọ na-aga iche ihu. O ji ihe ahụ ọ zara Pita gosi na ya anabataghị echiche ụwa, kama na ọ bụ echiche Chineke ka ya nabatara.

3. Olee ihe mere o ji esi ike ịjụ echiche nke ụwa ma nabata echiche nke Jehova?

3 Oleekwanụ maka anyịnwa? Ànyị na-eche echiche ka Chineke, ka ànyị na-eche echiche ka ụwa a? O nwere ike ịbụ na anyị agbaala mbọ na-akpa àgwà dị Chineke mma. Ma, oleekwanụ banyere ihe anyị na-eche n’obi anyị? Ànyị na-agbalị ime ka otú anyị si eche echiche daba n’otú Jehova si eche echiche? Anyị ga-agbalịsi ike iji mee ya. Ma, ọ dị ezigbote mfe mmadụ ịmụta iche echiche ka ụwa. Ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na mmụọ nke ụwa a juru ebe niile. (Efe. 2:2) Ihe ọzọ bụ na mmụọ nke ụwa a na-agba ndị mmadụ ume ịchọ ọdịmma nke onwe ha. Ọ bụ ya mere o ji amasị ọtụtụ ndị. N’eziokwu, o siri ezigbo ike ịmụta iche echiche ka Chineke. Ma, ịmụta iche echiche ka ụwa a dị mfe.

4. (a) Gịnị ga-eme anyị ma anyị kwe ka ụwa kpụgharịa echiche anyị? (b) Olee otú isiokwu a ga-esi nyere anyị aka?

4 Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ụwa kpụgharịa echiche anyị ka ọ dị ka nke ha, anyị ga-abụ ndị na-achọkarị ọdịmma onwe anyị na ndị na-achọ ịna-eme ihe masịrị anyị. (Mak 7:21, 22) N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị mụta “echiche Chineke,” ọ bụghị “nke mmadụ.” Isiokwu a ga-enyere anyị aka ime ya. Anyị ga-eleba anya n’ihe mere iche echiche ka Chineke ji bụrụ ihe na-anaghị ekegide mmadụ, kama ọ na-aba ezigbo uru. Anyị ga-amụtakwa otú anyị ga-esi ghara ikwe ka ụwa a kpụgharịa echiche anyị. Isiokwu na-esonụ ga-eleba anya n’otú anyị ga-esi mata ihe bụ́ echiche Jehova n’okwu dị iche iche, nakwa otú anyị ga-esi na-eche echiche ka ya.

ECHICHE JEHOVA BARA URU

5. Olee ihe mere ụfọdụ ndị anaghị achọtụdị ka ndị ọzọ gwa ihe ha ga-eme?

5 Ụfọdụ ndị achọtụdịghị ka onye ọ bụla na-agwa ha ihe ha ga-eme. Ha na-asịkarị, “Ọ bụ mụnwa nwe onwe m.” Ọ ga-abụ na ha na-ekwu na ọ bụ hanwa na-ekpebiri onwe ha ihe, nakwa na ọ dịghị njọ ime otú ahụ. Ha achọghị ka mmadụ na-atụrụ ha ụka, ma ọ bụ manye ha ime ka ndị ọzọ. *

6. (a) Olee ihe Jehova hapụrụ anyị ka anyị nwere onwe anyị ime? (b) Mana, ọ̀ pụtara na anyị ga-emewezi ihe ọ bụla masịrị anyị?

6 Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na iche echiche ka Jehova apụtaghị na anyị agaghịzi enwe ike ikpebiri onwe anyị ihe ma ọ bụ ikwu uche anyị. Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 3:17, “ebe ọ bụla mmụọ Jehova dị, n’ebe ahụ ka nnwere onwe dị.” Anyị nweere onwe anyị ịbụ ụdị ndị anyị chọrọ ịbụ na ịhọrọ ihe ndị na-amasị anyị. N’eziokwu, Jehova kere anyị ka anyị dịrị otú ahụ. Ma, ọ pụtaghị na anyị ga-emewezi ihe ọ bụla masịrị anyị. (Gụọ 1 Pita 2:16.) A bịa n’okwu gbasara ikpebi ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, Jehova chọrọ ka anyị soro echiche nke ya na ihe Okwu ya kwuru. Ihe a ọ̀ na-ekegide anyị, ka ọ̀ na-abara anyị uru?

7, 8. Gịnị mere ile ihe anya otú Jehova si ele ya anaghị ekegide mmadụ? Mee ihe atụ.

7 Chegodị banyere ihe atụ a. Ndị nne na nna na-agba mbọ akụziri ụmụ ha ezigbo àgwà. Ha na-akụziri ha ịna-ekwu eziokwu, ịna-agba mbọ, na ịna-echebara ndị ọzọ echiche. Nke a apụtaghị na ha na-ekegide ụmụ ha. Kama, ha na-akụziri ha ihe ha ga-eji ebi ezigbo ndụ n’ọdịnihu. Ụmụaka ndị ahụ tolite biri nke ha, ha ga-ejizi aka ha na-ekpebiri onwe ha ihe ha ga-eme. Ọ bụrụ na ha ekpebie ịna-akpa ezigbo àgwà ndị ahụ ha mụtara n’aka nne na nna ha, ha ga-enwe ike ime ezigbo mkpebi ndị ha na-agaghị emecha kwaara mmakwaara. Ha agaghịkwa adaba n’ọtụtụ nsogbu ndị mmadụ na-eji aka ha akpatara onwe ha.

8 Jehova bụ ezigbo Nna. Ọ chọrọ ka ihe gaziere ụmụ ya. (Aịza. 48:17, 18) Ọ bụ ya mere o ji akụziri anyị ime omume ọma na ịna-akpaso ndị ọzọ àgwà ọma. Ọ chọrọ ka anyị na-eche echiche ka ya ma na-ele ihe anya otú o si ele ya. Ihe ndị a anaghị ekegide anyị, kama ha na-enyere anyị aka ịna-eche echiche nke ọma. (Ọma 92:5; Ilu 2:1-5; Aịza. 55:9) Iche echiche ka Chineke agaghị egbochi anyị iji aka anyị na-ekpebiri onwe anyị ihe ụfọdụ na-amasị anyị, kama ọ ga-eme ka anyị na-eme mkpebi ndị ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ. (Ọma 1:2, 3) N’eziokwu, iche echiche ka Jehova ga-abara anyị ezigbo uru.

ECHICHE JEHOVA KARỊRỊ ECHICHE ỤWA A

9, 10. Olee ihe ndị gosiri na echiche Jehova karịrị echiche ụwa a?

9 Ihe ọzọ mekwara Ndị Kraịst ji na-achọ ịna-eche echiche ka Jehova bụ na echiche ya karịrị echiche ụwa a. Ụwa na-enye ndị mmadụ ndụmọdụ gbasara ịkpa àgwà ọma, inwe udo n’ezinụlọ, inweta ezigbo ọrụ na ihe ndị ọzọ. Ma, ọtụtụ n’ime ndụmọdụ ndị a ekwekọghị n’echiche Jehova. Dị ka ihe atụ, ụwa na-agba ndị mmadụ ume ịna-achọkarị ọdịmma nke onwe ha, na-emekwa ka ịkwa iko yie ihe na-enweghị ihe o mere. Ụwa na-akụzikwara ndị mmadụ na nkewa di na nwunye ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm n’enweghị ezigbo ihe kpatara ya adịghị njọ ma ọ bụrụhaala na ọ ga-eme ka ha na-enwekwu obi ụtọ. Ndụmọdụ ndị a adabaghị n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ma, ànyị ga-asị na ndụmọdụ ụwa a na-aba uru taa karịa ndụmọdụ Baịbụl?

10 Jizọs kwuru, sị: “A na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” (Mat. 11:19) Ụwa enweela ọtụtụ ọganihu n’ihe gbasara nkà na ụzụ. Ma, ha na-agba ọnyụpa ma a bịa n’iwepụrụ ndị mmadụ nsogbu ndị na-eme ha ụra aga n’anya, dị ka agha, ịkpa ókè agbụrụ na ime mpụ. Ụwa na-akụzi na ịkwa iko enweghị ihe o mere. Ma, ọtụtụ ndị kwetara na ịkwa iko etisaala ọtụtụ ezinụlọ, kpatara ọtụtụ ndị ọrịa na nsogbu ndị ọzọ. Oleekwanụ maka Ndị Kraịst na-ele ihe anya otú Chineke si ele ya? Ha na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ ha, ha anaghịkwa ebute ọrịa ndị na-esi n’omume rụrụ arụ. Ha na ụmụnna ha zuru ụwa ọnụ dịkwa n’udo. (Aịza. 2:4; Ọrụ 10:34, 35; 1 Kọr. 6:9-11) Ihe a niile ọ́ naghị egosi na echiche Jehova karịrị echiche ụwa a?

11. Olee onye echiche ya duziri Mozis, oleekwa uru ọ baara ya?

11 Ndị fere Jehova a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ghọtara nke ọma na echiche Jehova karịrị nke ụwa a. Dị ka ihe atụ, a kụziiri Mozis ihe “n’amamihe niile nke ndị Ijipt.” Ma, ọ rịọrọ Chineke arịrịọ ka o mee ka o “nweta obi amamihe.” (Ọrụ 7:22; Ọma 90:12) Ọ rịọkwara Jehova, sị: “Mee ka m mara ụzọ gị.” (Ọpụ. 33:13) Ebe Mozis kwere ka echiche Jehova duzie ya, Jehova ji ya rụọ ọtụtụ ọrụ iji mezuo nzube ya. O mekwara ka e kwuo okwu ọma banyere ya n’ime Akwụkwọ Nsọ na ọ bụ nwoke nwere okwukwe pụrụ iche.—Hib. 11:24-27.

12. Olee ihe Pọl gbakwasịrị ụkwụ na ya mee mkpebi ndị o mere?

12 Pọl onyeozi bụ nwoke maara ihe, ọ gụkwara akwụkwọ. Ọ dịkarịa ala, ọ na-asụ asụsụ abụọ. (Ọrụ 5:34; 21:37, 39; 22:2, 3) Ma, mgbe o ruru n’ikpebi ihe ọma na ihe ọjọọ, o kweghị ka echiche ụwa a duzie ya. Kama, o ji ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru mee mkpebi ya. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 17:2; 1 Ndị Kọrịnt 2:6, 7, 13.) Ihe a mere ka ozi ya gaa nke ọma, ya enweekwa olileanya inweta ụgwọ ọrụ ga-adịru ebighị ebi.—2 Tim. 4:8.

13. Ònye ka ọ dị n’aka ime ka echiche ya daba n’echiche nke Chineke?

13 O doro anya na echiche Chineke karịrị echiche nke ụwa a. Anyị soro echiche Chineke, anyị ga-enwe ezigbo obi ụtọ, ihe agaziekwara anyị. Ma, Jehova agaghị amanye anyị ka anyị soro echiche ya. “Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na ndị okenye anaghịkwa amanye anyị ka anyị mee otú ahụ. (Mat. 24:45; 2 Kọr. 1:24) Onye Kraịst nke ọ bụla ga-eji aka ya mee ka echiche ya daba n’echiche Chineke. Olee otú anyị nwere ike isi mee ya?

EKWELA KA ỤWA A KPỤGHARỊA ECHICHE GỊ

14, 15. (a) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-eche echiche ka Jehova, olee ụdị ihe anyị kwesịrị ịna-eche n’obi anyị mgbe niile? (b) N’ihi ihe e kwuru ná Ndị Rom 12:2, gịnị mere anyị kwesịrị iji jụ echiche ụwa a? Mee ihe atụ.

14 Ndị Rom 12:2 kwuru, sị: “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị, kama gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.” Amaokwu a na-ekwu na n’agbanyeghị ụdị ihe na-eduzi echiche anyị tupu anyị amụta eziokwu, anyị ka nwere ike ịgbanwe echiche anyị ma mee ka o kwekọọ n’echiche Chineke. Ọ bụ eziokwu na ebumpụta ụwa na ihe ndị merela anyị ná ndụ so na-eme ka anyị na-eche echiche otú anyị si eche, ma anyị ka nwere ike ịgbanwe otú anyị si eche echiche. Ihe ga-akacha ekpebi ma ọ̀ ga-agbanwe bụ ụdị ihe anyị na-ekwe ka ọ bata anyị n’obi na ụdị ihe anyị na-eche n’obi anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-eche ihe ndị kwekọrọ n’echiche Chineke, anyị ga-achọpụta na echiche Chineke ziri ezi. Mgbe ahụ, ọ ga na-agụ anyị agụụ iche echiche ka Chineke.

15 Mana, marakwa na iji nwee ike ịna-eche echiche ka Chineke, anyị kwesịrị ‘ịkwụsị ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị.’ Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga-akwụsị ile, ịgụ, na igere ihe ọ bụla na-adabaghị n’echiche Chineke. Iji mee ka ihe a dokwuo anya, ka anyị jiri nri mee ihe atụ. Onye chọrọ inwe ezigbo ahụ́ ike nwere ike ikpebi ịna-eri nri ndị na-edozi ahụ́. Ma, ọ gaghị enwe ezigbo ahụ́ ike ma ọ bụrụ na ọ na-eri nri mebiri emebi mgbe niile. Otú ahụ ka ọ dịkwa onye nabatara echiche Jehova, ma ya ejiri echiche ụwa a na-emerụ obi ya. Ọ gaghị abara ya uru ọ bụla.

16. Olee ihe anyị kwesịrị ịgbalịsi ike zere?

16 Mmadụ ò nwere ike izetachali echiche niile nke ụwa a? Mba. Ebe anyị ka nọ n’ụwa, anyị agaghị ezetali echiche ya niile. (1 Kọr. 5:9, 10) Anyị nọrọ n’ozi ọma, anyị na-anụ ihe ndị kweere n’ozizi ụgha na-ekwu. Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị ezetachali echiche ụgha ndị a, ma anyị ekwesịghị ịnabata ha ma ọ bụ na-atụgharị ha n’obi anyị. Dị ka Jizọs mere, anyị kwesịrị ịjụ echiche ọ bụla si n’aka Ekwensu. Ma, anyị nwekwara ike ịgbalị zere ihe ọ bụla ga-eme ka anyị hụ ma ọ bụkwanụ nụ ihe ndị si n’echiche ụwa a.—Gụọ Ilu 4:23.

17. Olee ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi gbaara echiche ụwa a ọsọ?

17 Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ụdị ndị anyị na-emeta enyi. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị na ọ bụrụ na anyị na ndị na-anaghị efe Jehova ana-akpachi anya, anyị ga-amụta iche echiche ka ha. (Ilu 13:20; 1 Kọr. 15:12, 32, 33) Anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ụdị ihe anyị na-eji atụrụ ndụ. Ọ bụrụ na anyị ajụ ntụrụndụ ndị na-akwado ozizi evolushọn, ime mpụ ma ọ bụ mmekọahụ rụrụ arụ, ọ ga-eme ka echiche ndị ahụ “na-emegide ihe ọmụma Chineke” ghara imerụ obi anyị.—2 Kọr. 10:5.

Ànyị na-enyere ụmụ anyị aka ịjụ ntụrụndụ ndị na-emerụ obi mmadụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18 na nke 19)

18, 19. (a) Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya maka echiche ụwa ndị e ji ụzọ aghụghọ na-agbasa? (b) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, n’ihi gịnịkwa?

18 Anyị kwesịrị ịgbalị zere echiche ụwa ndị yiri ka hà dị mma ma e lee ha anya elu elu. Dị ka ihe atụ, otú e si kọọ otu akụkọ gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na redio, tiivi ma ọ bụkwanụ n’akwụkwọ akụkọ nwere ike ime ka mmadụ chọwa ịkwado ihe ahụ a kọrọ. Ụfọdụ akụkọ gbasara ihe na-amasị ndị mmadụ nwekwara ike ịgba ndị mmadụ ume ka ha chụwa ihe nke ụwa a. Ụfọdụ fim na akwụkwọ na-eme ka ndị mmadụ chewe na ibu ụzọ achọ ọdịmma onwe ha na nke ezinụlọ ha bụ ihe kwesịrị ekwesị. Ụdị echiche ndị a na-eleghara eziokwu Baịbụl anya. Baịbụl kwuru na ihe ga-agaziri anyị na ezinụlọ anyị ma anyị jiri obi anyị niile hụ Jehova n’anya. (Mat. 22:36-39) E nwere akụkọ ụfọdụ a na-akọrọ ụmụaka e weere na ha adịghị njọ. Ma, ụmụaka nwere ike isi na ha mụta ime omume rụrụ arụ.

19 Ihe a apụtaghị na ọ dị njọ mmadụ iji ihe ndị dị mma na-atụrụ ndụ. Ma, anyị kwesịrị ịgbalị jụọ onwe anyị ajụjụ ndị a: ‘Ànyị na-achọpụtali ma ò nwere otú ihe ahụ anyị ji na-atụrụ ndụ si na-akụzi echiche ụwa a? Ànyị na-agbalịsi ike ka anyị na ụmụ anyị ghara ile ihe omume tiivi na ịgụ akwụkwọ ndị e ji akụzi echiche ụwa a? Ọ bụrụ na ụmụ anyị anụ ma ọ bụ hụ ihe ndị e ji akụzi echiche ụwa, ànyị na-enyere ha aka ịmata ihe bụ́ echiche Jehova?’ Ọ bụrụ na anyị achọpụta ihe dị iche n’echiche ụwa a na echiche Chineke, ọ ga-enyere anyị aka ‘ịkwụsị ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị.’

ÒNYE NA-AKPỤGHARỊ GỊ UGBU A?

20. Olee ihe ga-egosi ma ọ̀ bụ echiche Chineke na-edu anyị ka ọ̀ bụ nke ụwa?

20 Cheta na e nwere echiche abụọ na-akpụgharị ndị mmadụ n’ụwa taa, echiche Jehova na echiche ụwa a Setan na-achị. Olee nke na-akpụgharị gị? Ọ bụ nke ahụ ị na-ege ntị. Ọ bụrụ na ọ bụ echiche ụwa a ka anyị na-agbaso, ọ bụ ya ga na-akpụgharị echiche anyị. Ọ ga-eme ka anyị na-eche echiche ma na-akpa àgwà ka ndị anụ ahụ́ na-achị. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị kpachara anya maka ụdị ihe anyị na-atụgharị n’uche.

21. Olee ihe dị mkpa anyị ga-amụ n’isiokwu na-esonụ?

21 Dị ka anyị kwuru ná mmalite, iji nwee ike ịna-eche echiche ka Jehova, anyị ga-agba mbọ mee ihe karịrị naanị izere ihe ndị nwere ike imerụ obi anyị. Anyị kwesịrị ịna-amụchi Okwu Chineke anya, meekwa ka ọ bamie anyị n’ime obi. Isiokwu na-esonụ ga-elebakwu anya n’otú anyị nwere ike isi mee otú ahụ.

^ para. 5 Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị kacha bụrụ eze onye agwala m agaghị egbochili onwe ha iṅomi ndị ọzọ. Ma hà na-eche banyere otú ndụ si malite, ma hà na-ahọrọ ụdị efe ha ga-eyi, ihe doro anya bụ na ha ga-eṅomịrịrị ihe ndị ọzọ na-eme. Ma, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịhọrọ onye ọ ga-eṅomi.