Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Zụta Eziokwu, Erekwala Ya”

“Zụta Eziokwu, Erekwala Ya”

“Zụta eziokwu, erekwala ya; zụtakwa amamihe na ịdọ aka ná ntị na nghọta.”—ILU 23:23.

ABỤ: 94, 96

1, 2. (a) Olee ihe anyị nwere nke kacha anyị mkpa? (b) Olee eziokwu anyị ji kpọrọ ihe, n’ihi gịnịkwa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

OLEE ihe i nwere nke kacha gị mkpa? Ị̀ ga-achọ iji ya gbanwere ihe na-adịchaghị gị mkpa? Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova nyefere ya onwe anyị, azịza ajụjụ ndị a ataghị akpụ. Otu ihe kacha anyị mkpa anyị nwere bụ adịm ná mma anyị na Jehova. Anyị agaghị achọ iji ya gbanwere ihe ọ bụla ọzọ. Ihe ọzọ kacha anyị mkpa bụ eziokwu dị na Baịbụl, n’ihi na ọ bụ ya mere ka anyị na Nna anyị nke eluigwe dịrị n’ezigbo mma.—Kọl. 1:9, 10.

2 Chegodị ihe niile Onye Ozizi Ukwu anyị na-akụziri anyị na Baịbụl. Ọ na-akụziri anyị mkpa aha ya dị nakwa àgwà ya ndị magburu onwe ha. Ọ na-agwa anyị na ya hụrụ anyị n’anya nke na o nyere anyị Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya. Jehova na-akụzikwara anyị banyere Alaeze Mesaya. O mere ka ndị e tere mmanụ nwee olileanya ịga eluigwe, meekwa ka “atụrụ ọzọ” nwee olileanya ibi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ Paradaịs. (Jọn 10:16) Ọ na-akụziri anyị otú anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ. Anyị ji eziokwu ndị a kpọrọ ihe n’ihi na ha na-eme ka anyị na-abịaru Onye Okike anyị nso, na-emekwa ka ndụ anyị nwee isi.

3. Jehova ọ̀ na-achọ ka anyị kwụọ ya ụgwọ iji mụta eziokwu?

3 Jehova bụ Chineke na-emesapụ aka. Ọ na-enyere ndị chọrọ ịmụta eziokwu aka ka ha mụta ya. O nyedịrị anyị Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ka o jiri ndụ ya chụọ àjà maka anyị. O doro anya na Chineke agaghị achọ ka anyị kwụọ ya ụgwọ iji mụta eziokwu. Mgbe otu nwoke aha ya bụ Saịmọn nyere Pita onyeozi ego ka o nye ya mmụọ nsọ, Pita baara ya ezigbo mba. Ọ sịrị ya: “Ka gị na ọlaọcha gị laa n’iyi, n’ihi na i chere na ị pụrụ iji ego nweta onyinye nke Chineke na-enye n’efu.” (Ọrụ 8:18-20) Ma, mgbe Baịbụl kwuru ka anyị “zụta eziokwu,” gịnị ka ọ pụtara?

GỊNỊ KA ‘ỊZỤTA’ EZIOKWU PỤTARA?

4. N’isiokwu a, olee ihe anyị ga-amụ banyere eziokwu?

4 Gụọ Ilu 23:23. Anyị ga-agba ezigbo mbọ tupu anyị amụta eziokwu dị n’Okwu Chineke. Anyị ga-adị njikere ịhapụ ihe ọ bụla a chọrọ ka anyị hapụ ka anyị nwee ike ịmụta ya. Onye amamihe dere Ilu kwuru na anyị “zụta eziokwu,” ya bụ, mụta “eziokwu,” anyị ga-akpachara anya ka anyị ghara ‘ire ya,’ ya bụ, ịhapụ ya. Ka anyị tụlee ihe ‘ịzụta’ eziokwu pụtara nakwa ihe ọ ga-efu anyị ịzụta ya. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị jiri eziokwu kpọrọkwuo ihe, meekwa ka anyị kpebisikwuo ike na anyị emekataghị ‘ree’ ya. Anyị ga-ahụkwa ihe mere ịzụta eziokwu ji baa uru karịa ihe ọ bụla anyị nwere ike ime iji zụta ya.

5, 6. (a) Olee otú anyị ga-esi zụta eziokwu n’efu? Kọwaa. (b) Olee otú eziokwu si abara anyị uru?

5 Ihe e nyere anyị n’efu nwere ike ifu anyị ihe. Okwu Hibru e si sụgharịa “ịzụ” n’Ilu 23:23 nwere ike ịpụta “inweta.” Okwu abụọ a pụtara mmadụ ịgba mbọ ma ọ bụ inye ihe ka o nwee ike inweta ihe dị ya mkpa. Ka anyị mee ihe atụ otú e nwere ike isi zụta eziokwu. Ka e were ya na a mara ọkwa n’ahịa na a ga-enye anyị “Osikapa n’Efu.” Osikapa ahụ ọ̀ ga-efere efere bata na nke anyị? Mbanụ. Anyị ga-aga ahịa ka anyị nwee ike inweta ya. È nyere anyị ya n’efu? Ee. Ma anyị ga-agba mbọ ma wepụta oge gaa ahịa. Otú ahụ ka ọ dịkwa eziokwu. Anyị ekwesịghị ịzụ ya azụ. Ma anyị ga-agba mbọ tupu anyị amụta ya.

6 Gụọ Aịzaya 55:1-3. Ihe Jehova si n’ọnụ Aịzaya gwa anyị mere ka anyị ghọtakwuo ihe ịzụta eziokwu pụtara. N’amaokwu ndị a, Jehova ji okwu ya tụnyere mmiri, mmiri ara ehi, nakwa mmanya. Okwu Chineke nke eziokwu na-eme ka anyị nweta ume otú ahụ mmiri jụrụ ezigbo oyi na-eme. Mmiri ara ehi na-emekwa ka ahụ́ gbasie anyị ike ma nyere ụmụaka aka ịna-eto eto. Otú ahụ ka ọ dịkwa Okwu Chineke. Ọ na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike ma nyere anyị aka ime ka anyị na Chineke dịrịkwuo ná mma. Jehova jikwa Okwu ya tụnyere mmanya. N’ihi gịnị? Baịbụl kwuru na mmanya na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa ọṅụ. (Ọma 104:15) N’ihi ya, mgbe Jehova gwara anyị ka anyị “zụrụ mmanya,” ọ na-eme ka anyị mata na ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ọ gwara anyị, anyị ga na-enwe obi ụtọ. (Ọma 19:8) Ihe atụ a Chineke mere iji kọwaa uru anyị ga-erite ma anyị mụta eziokwu dị n’Okwu ya ma na-eme ya eme, dabara adaba. Anyị nwere ike iji mbọ anyị na-agba iji nweta ihe tụnyere ụgwọ anyị na-akwụ inweta ya. Ugbu a, ka anyị tụlee ihe ise anyị nwere ike ime iji zụta eziokwu.

OLEE IHE NDỊ Ị HAPỤRỤ IJI ZỤTA EZIOKWU?

7, 8. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị iwepụta oge mụta eziokwu? (b) Olee ihe otu onye na-eto eto na-aga akwụkwọ kwụsịrị, oleekwa uru ọ baara ya?

7 Oge. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịzụta eziokwu, anyị ga-ewepụta oge maka ya. Ọ na-ewe oge iji gee ntị n’ozi Alaeze Chineke, ịgụ Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, ịmụ Baịbụl n’onwe anyị, ịkwadebe ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe, nakwa ịga ọmụmụ ihe. Ka anyị nwee ike ime ihe ndị a, anyị ga-eji oge ndị ahụ anyị gaara eji eme ihe ndị na-adịchaghị anyị mkpa na-eme ha. (Gụọ Ndị Efesọs 5:15, 16.) Olee oge ọ na-ewe anyị ịmụta ihe ndị na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi? Oge o nwere ike iwe otu onye nwere ike ịdị iche n’oge ọ ga-ewe onye ọzọ. Anyị enweghị ike ịmụtacha amamihe Jehova, ụzọ ya, nakwa ihe ndị o kere eke. (Rom 11:33) Ụlọ Nche mbụ e bipụtara kwuru na eziokwu yiri “obere okooko osisi.” O kwukwara, sị: “Afọ ekwesịghị iju gị ma i nweta naanị otu. A sị na otu zuru, a garaghị enwe ndị ọzọ. Na-agba mbọ ka i nwetakwuo.” Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee ihe m mụtarala banyere Jehova?’ Anyị dịgodị ndụ ebighị ebi, anyị ka ga na-amụ banyere Jehova. Taa, ihe dị mkpa bụ ka anyị jiri oge anyị na-eme ihe bara uru ka anyị nwee ike ịmụta eziokwu otú anyị nwere ike. Ka anyị tụlee banyere otu onye agụụ eziokwu gụsiri ike.

8 Otu nwa agbọghọ onye Japan aha ya bụ Mariko, * gara Niu Yọk Siti dị n’Amerịka ịgụ akwụkwọ. N’oge ahụ, o kpewere otu okpukpe malitere n’afọ 1959 na Japan. Otu ụbọchị, otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ gara n’ụlọ ya zie ya ozi ọma. Mgbe Mariko malitere ịmụ Baịbụl, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ nke na ọ gwara nwanna nwaanyị a ka ha na-amụ ihe ugboro abụọ n’izu. Ọ malitere ịbịa ọmụmụ ihe ozugbo, n’agbanyeghị na ọ na-arụ ọrụ abalị ole na ole n’izu, ihe ndị ọ na-eme n’ụlọ akwụkwọ anaghịkwa enyecha ya ohere. Ọ kwụsịkwara iji oge buru ibu na-atụrụ ndụ ka o nwee ike inwekwu oge ọ ga-eji mụta eziokwu. Ihe ndị ahụ ọ kwụsịrị mere ka ya na Jehova na-adịkwu ná mma. E mekwara ya baptizim n’ihe na-erughị otu afọ ọ malitere ịmụ ihe. Mgbe ọnwa isii gachara, ya bụ, n’afọ 2006, ọ ghọrọ ọsụ ụzọ. Ọ ka na-asụkwa ụzọ.

9, 10. (a) Olee otú ịmụta eziokwu ga-esi mee ka anyị gbanwee otú anyị si ele akụnụba anya? (b) Olee ihe otu nwata nwaanyị hapụrụ, oleekwa otú obi dị ya banyere ya?

9 Ịchụ Akụnụba. Ka anyị nwee ike ịmụta eziokwu, anyị nwere ike ịhapụ ọrụ a na-akwụ anyị ezigbo ụgwọ ma ọ bụ ịgụ oké akwụkwọ. Mgbe Jizọs kpọrọ Pita na Andru, bụ́ ndị na-akụ azụ̀ ka ha bụrụ “ndị na-akụta mmadụ,” ha “hapụrụ ụgbụ ha.” (Mat. 4:18-20) Ma, ọtụtụ ndị na-amụta eziokwu taa agaghị ahapụ ọrụ ha. Ha ga-akpa afọ ezinụlọ ha otú Akwụkwọ Nsọ kwuru. (1 Tim. 5:8) Ndị na-amụta eziokwu kwesịrị ịna-agbanwe otú ha si ele akụnụba anya, gbanweekwa ihe ndị ha chere kacha mkpa ná ndụ ha. Jizọs mere ka ihe a doo anya mgbe o kwuru, sị: “Kwụsịnụ ịkpakọbara onwe unu akụ̀ n’ụwa . . . Kama nke ahụ, na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe.” (Mat. 6:19, 20) Ka anyị tụlee banyere otu nwata nwaanyị aha ya bụ Maria.

10 Maria malitere ịkụ gọlf mgbe ọ ka dị obere. Mgbe ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndri, ọ nọgidere na-akụ gọlf ma na-eme nke ọma, mechaakwa nweta ohere ịgụ akwụkwọ n’efu na mahadum. Ịkụ gọlf riri ya isi, ọ chọkwara iji ya mere aka ọrụ ma na-enweta nnukwu ego na ya. Maria mechara malite ịmụ Baịbụl, eziokwu ọ na-amụ na-atọkwa ya ụtọ. Obi dị ya ụtọ maka ihe ndị ọ gbanwere ná ndụ ya n’ihi eziokwu ọ na-amụ. O kwuru, sị: “Ka m na-agbanwe otú m si ebi ndụ ka ọ daba otú Baịbụl kwuru, ka m na-enwekwu obi ụtọ.” Marịa ghọtara na ọ ga-esiri ya ike ịna-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke, na-achụkwa ego. (Mat. 6:24) Ọ hapụrụ gọlf ọ chọrọ iji mere aka ọrụ, hapụkwa ịchọ inwe ego na ịbụ onye a ma ama. Ma, ọ bụ ọsụ ụzọ ugbu a n’ihi na ọ mụtala eziokwu. O kwuru na ya na-enwe “ezigbo obi ụtọ ma na-eji ndụ ya eme ihe bara uru.”

11. Ọ bụrụ na anyị amụta eziokwu, olee ihe ụfọdụ ndị enyi nakwa ndị ikwu anyị nwere ike ime?

11 Mmekọrịta anyị na ndị ọzọ. Ọ bụrụ na anyị amalite ime ihe anyị na-amụta na Baịbụl, otú anyị na ndị enyi nakwa ndị ikwu anyị si emekọrịta ihe nwere ike ịgbanwe. Maka gịnị? Jizọs kpere ekpere banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Jiri eziokwu doo ha nsọ; okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Ihe “doo ha nsọ” nwekwara ike ịpụta bụ “doo ha iche.” Mgbe anyị nabatara eziokwu, e doola anyị iche n’ụwa n’ihi na anyị anaghịzi akpa àgwà otú ụwa si akpa. Ndị mmadụ na-ele anyị anya ka ndị dị iche n’ihi na àgwà anyị agbanweela. Anyị na-akpazi àgwà otú Baịbụl kwuru. Ọ bụ eziokwu na anyị achọghị ịkpata nkewa, ụfọdụ ndị ezinụlọ anyị nakwa ndị enyi anyị nwere ike ịna-agbara anyị ọsọ ma ọ bụdị na-emegide anyị n’ihi ihe anyị kweere. Ihe ndị a anaghị eju anyị anya. Jizọs kwuru, sị: “N’ezie, ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinụlọ ya.” (Mat. 10:36) O kwekwara anyị nkwa na uru ndị anyị ga-erite n’ihi ịmụta eziokwu karịrị ihe ọ bụla anyị hapụrụ.—Gụọ Mak 10:28-30.

12. Olee ihe otu onye Juu hapụrụ n’ihi eziokwu?

12 Kemgbe a mụrụ otu onye Juu na-eji ego achụ nta ego aha ya bụ Aaron, a kụziiri ya na e kwesịghị ịkpọ aha Chineke. Ma, agụụ eziokwu nọ na-agụsi ya ike. Obi tọrọ ya ụtọ mgbe otu Onyeàmà Jehova gosiri ya na ọ bụrụ na o tinye ụdaume ná mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ bụ́ aha Chineke, na o nwere ike ịkpọ ya “Jehova.” N’ihi otú a obi dị ya, ọ gara n’ụlọ nzukọ ha ka ọ gaa kọọrọ ndị rabaị. Ihe ha mere abụghị ihe Aaron tụrụ anya ya. Kama iso ya ṅụrịa ọṅụ n’ihi aha Chineke ọ mụtara, ha bụrụ ya ọnụ mmiri ma mee ya ka onye mba ọzọ. Ndị ezinụlọ ya jụkwara ya. N’agbanyeghị ihe ndị a, ọ nọgidere na-amụ eziokwu, fegidekwa Chineke ruo mgbe ọ nwụrụ. Ka anyị nwee ike ịnọgide n’eziokwu otú ahụ Aaron mere, anyị dị njikere ịnabata mgbanwe ọ bụla nwere ike ịbịa n’otú anyị na ndị enyi anyị nakwa ndị ikwu anyị si emekọrịta ihe.

13, 14. Ka anyị nwee ike ịmụta eziokwu, olee mgbanwe ndị anyị kwesịrị ime ma n’àgwà anyị ma n’otú anyị si eche echiche? Nye ihe atụ.

13 Echiche na àgwà ndị na-adịghị mma. Ka anyị nwee ike ịnabata eziokwu ma na-akpa àgwà otú Baịbụl kwuru, anyị ga-adị njikere ịgbanwe otú anyị si eche echiche na otú anyị si akpa àgwà. Pita kwuru banyere mgbanwe ndị a anyị kwesịrị ime, sị: “Dị ka ụmụ na-erube isi, kwụsịnụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka ọchịchọ unu nwere n’oge gara aga si dị, mgbe unu na-amaghị ihe . . . bụrụkwanụ ndị dị nsọ n’omume unu niile.” (1 Pita 1:14, 15) Omume rụrụ arụ juru n’obodo Kọrịnt. Ka ndị bi na ya nwee ike ịzụta eziokwu, ọ pụtara na ha ga-agbanwe ụdị ndụ ha na-ebi. (1 Kọr. 6:9-11) Otú ahụ ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị taa. Ha ahapụla àgwà ọjọọ ndị ha na-akpa ka ha nwee ike ịzụta eziokwu. Pita gwakwara Ndị Kraịst n’oge ya, sị: “Oge gafere agafe ezuworo unu ịrụzu ihe ndị mba ọzọ na-achọ, mgbe unu jere ije n’omume rụrụ arụ, n’agụụ ihe ọjọọ, n’ịṅụ oké mmanya, n’oriri oké mkpọtụ, n’ịma aka n’ịṅụ mmanya, na n’ikpere arụsị jọgburu onwe ya.”—1 Pita 4:3.

14 Kemgbe ọtụtụ afọ, Devynn na Jasmine nwunye ya bụ ndị aṅụrụma. Ọ bụ eziokwu na Devynn bụ aka ochie n’idepụta otú ego si abata n’ụlọ ọrụ nakwa otú e si emefu ya, oké mmanya ọ na-aṅụ na-eme ka a na-achụ ya n’ọrụ mgbe ọ bụla. A makwanụ nwunye ya ama ka onye iwe ọkụ na onye na-alụkarị ọgụ. Otu ụbọchị ọ ṅụrụ tọọ tọọ na-aga n’ụzọ, ya na Ndịàmà Jehova bụ́ ndị ozi ala ọzọ hụrụ. Ha gwara ya ka ha na-abịa n’ụlọ ya amụrụ ya Baịbụl. Ma, mgbe ha bịara n’izu ọzọ, ma Jasmine ma Devynn aṅụrọọla anya. O juru ha anya na ndị ozi ala ọzọ a bịara na nke ha. Ma, mgbe ọzọ ndị ozi ala ọzọ ahụ bịara, Jasmine na Devynn aṅụghịzi mmanya. Malite n’ụbọchị mbụ a malitere ịmụrụ ha ihe, ha mụchiwara Baịbụl anya ma na-eme ihe ndị ha na-amụta. N’ime ọnwa atọ ha malitere ịmụ ihe, ha kwụsịrị ịṅụ oké mmanya ma lụọ otú iwu kwuru. Ọtụtụ ndị obodo ha bịara mara na ha agbanweela, ya emee ka ọtụtụ n’ime ha malite ịmụ Baịbụl.

15. Olee ihe kacha taa akpụ mmadụ nwere ike ime ka o nwee ike ịmụta eziokwu, n’ihi gịnịkwa?

15 Omenala ndị na-adịghị Chineke mma. Mmadụ ịhapụ omenala ndị na-adịghị Chineke mma ka o nwee ike ịmụta eziokwu bụ otu n’ime ihe kacha taa akpụ. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịdịrị ụfọdụ ndị mfe ikweta ihe Baịbụl kwuru mere ha ji hapụ omenala ndị ahụ, ma ọ na-esiri ndị ọzọ ike ime otú ahụ n’ihi nsogbu ndị ezinụlọ ha, ndị ọrụ ibe ha na ezigbo ndị enyi ha na-enye ha. Ma o nwere ike ịna-ewe ndị a ezigbo iwe, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ihe mere e ji eme omenala ahụ bụ ka a kwanyere ndị ikwu nwụrụ anwụ ùgwù. (Diut. 14:1) Otú ndị ọzọ si kata obi kwụsị ime omenala ndị ahụ ga-enyere anyị aka ime mgbanwe ndị a chọrọ ka anyị mee. Ka anyị tụlee otú ụfọdụ ndị bi n’Efesọs n’oge ndịozi si kata obi mee ya.

16. Olee ihe ụfọdụ ndị Efesọs mere iji zụta eziokwu?

16 A ma ndị Efesọs ama ka ndị na-eme anwansi. Olee ihe ụfọdụ n’ime ha na-emebu omume a mere mgbe ha ghọrọ Ndị Kraịst? Baịbụl kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị na-eme anwansi chịkọtara akwụkwọ ha ma kpọọ ha ọkụ n’ihu mmadụ niile. Ha wee gbakọọ ọnụ ahịa ha wee hụ na o ruru puku mkpụrụ ego ọlaọcha iri ise. Okwu Jehova wee si otú a na-agbasa ma na-enwe mmeri nke ukwuu.” (Ọrụ 19:19, 20) Ha kpọrọ akwụkwọ ndị ahụ ọkụ n’agbanyeghị ọnụ ego ha, Jehova gọzikwara ha nke ukwuu maka ya.

17. (a) Olee ihe ndị anyị hapụrụ ka anyị nwee ike ịmụta eziokwu? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

17 Olee ihe ndị ị hapụrụ ka i nwee ike ịmụta eziokwu? Anyị niile ji oge anyị na-amụ eziokwu. Ụfọdụ hapụrụ ohere ha nwere ịba ọgaranya ma gbanwee otú ha na ndị ọzọ si emekọrịta ihe iji mụta eziokwu. Ọtụtụ n’ime anyị agbanweela otú anyị si eche echiche na otú anyị si akpa àgwà. Anyị anaghịzi eme omenala ndị ahụ na-adịghị Jehova mma. N’agbanyeghị ihe ọ bụla anyị hapụrụ, anyị kwetasiri ike na eziokwu Baịbụl anyị mụtara bara ezigbo uru karịa ihe ọ bụla anyị hapụrụ. O mere ka anyị na Chineke dịrị n’ezigbo mma, bụ́ ihe kacha anyị mkpa anyị nwere. Ọ bụrụ na anyị echebara uru eziokwu anyị mụtara baara anyị, ọ na-esiri anyị ike ịghọta ihe mere mmadụ ga-eji ahapụ ya. Olee otú mmadụ nwere ike isi hapụ eziokwu, oleekwa ihe anyị ga-eme ka ụdị ihe a ghara ime anyị? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

^ para. 8 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.