ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Ọktoba 2018

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite Disemba 3 ruo 30, 2018.

Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga, Ya Bụ n’Afọ 1918

A ka na-akwa mgbọ mgbe ahụ n’ike n’ike na Yurop n’Agha Ụwa nke Mbụ. Ma, ihe ndị na-eme ná mmalite afọ a yiri ka ihe ọ̀ ga-adịrị Ndị Mmụta Baịbụl na ụwa niile mma.

Na-ekwu Eziokwu

Gịnị mere ndị mmadụ ji agha ụgha, oleekwa aka ọ na-akpa ha? Olee otú anyị ga-esi na-agwa ibe anyị eziokwu?

Na-akụzi Eziokwu

N’oge a fọrọnụ anyị ga-eji ezi ozi ọma, anyị ga-elekwasị anya n’ịmalite ọmụmụ Baịbụl na ịkụzi eziokwu. Olee otú Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe ga-esi enyere anyị aka?

AKỤKỌ NDỤ

Jehova Gọziri Mkpebi M Mere nke Ukwuu

Mgbe Charles Molohan na-eto eto, o jere ozi na Betel, si otú ahụ jekwuoro Jehova ozi. Jehova agọziela ya nke ukwuu kemgbe ahụ.

Tụkwasị Kraịst Bụ́ Onye Ndú Anyị Na-arụsi Ọrụ Ike Obi

Ka nzukọ Jehova na-aga n’ihu n’ihu, gịnị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị otú Jizọs si na-edu anyị obi?

Ka Obi Na-eru Gị Ala n’Agbanyeghị Otú Ihe Nwere Ike Isi Gbanwee ná Ndụ Gị

Ihe gbanwee ná ndụ anyị na mberede, o nwere ike ime ka anyị na-echegbu onwe anyị. Olee otú “udo nke Chineke” ga-esi enyere anyị aka ma ihe gbanwee?

Ị̀ Maara?

Stivin bụ onye na-eso ụzọ Kraịst mbụ e gburu maka okwukwe ya. Gịnị mere ụjọ atụghị ya mgbe a na-akpagbu ya?