Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga, Ya Bụ n’Afọ 1918

Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga, Ya Bụ n’Afọ 1918

Ihe e dere ná mmalite Ụlọ Nche January 1, 1918 kwuru, sị: “Olee ihe ndị ga-eme n’afọ 1918?” A ka na-akwa mgbọ mgbe ahụ n’ike n’ike na Yurop n’Agha Ụwa nke Mbụ. Ma, ihe ndị na-eme ná mmalite afọ a yiri ka ihe ọ̀ ga-adịrị Ndị Mmụta Baịbụl nakwa ụwa niile mma.

NDỊ MMADỤ NA-EKWU OKWU UDO

N’abalị asatọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 1918, onyeisi ala mba Amerịka aha ya bụ Woodrow Wilson gwara Ụlọ Nzukọ Omeiwu nke Amerịka ihe iri na anọ o chere dị mkpa ga-eme ka e nwee “udo nke na-agaghị akwụsị akwụsị.” O kwuru ka mba dị iche iche kwurịta ihe ga-eme ka udo dịrị, belata ngwá agha a na-emepụta, hiwekwa “òtù mba niile” nke ga-abara “ma mba ndị buru ibu ma ndị nke na-ebughị ibu” uru. A ga-emecha jiri “Ihe Iri na Anọ” ahụ o kwuru hiwe Njikọ Mba Niile nakwa Nkwekọrịta nke Versailles, si otú a kwụsị Agha Ụwa nke Mbụ.

NDỊ MMỤTA BAỊBỤL EMERIE NDỊ NA-EMEGIDE HA

N’agbanyeghị oké ọgba aghara ndị e nwere n’afọ bu ya ụzọ, * o yiri ka Ndị Mmụta Baịbụl hà ga-adị n’udo. Ihe gosiri ya bụ ihe ndị mere ná nnọkọ Watch Tower Bible and Tract Society na-enwe kwa afọ.

Ná nnọkọ a e nwere n’abalị ise n’ọnwa Jenụwarị afọ 1918, ọtụtụ ndị a ma ama a chụpụrụ na Betel gbara mbọ ka ọ bụrụ ha na-ahazi ihe ndị a na-eme ná nzukọ Jehova. Nwanna Richard H. Barber, bụ́ ezigbo onye nlekọta sekit n’oge ahụ ji ekpere meghee nnọkọ ahụ. Mgbe ọ gụpụtachara ihe ndị a rụpụtara n’afọ gara aga, e mere ntụliaka a na-eme kwa afọ e ji họpụta ndị ga na-ahazi ọrụ ná nzukọ Jehova. Tupu emee ntụliaka ahụ, Nwanna Barber tụrụ aro ka ọ bụrụ Nwanna Joseph Rutherford na ụmụnna isii ndị ọzọ. Otu Ọkàiwu nke dụnyeere ndị na-emegide Ndị Mmụta Baịbụl úkwù atụọkwa aro ka ọ bụrụ mmadụ asaa ọzọ, ma ndị nke ahụ a chụpụrụ na Betel. Ma e meriri ha. Ọtụtụ ndị bịara nnọkọ a họpụtara Nwanna Rutherford na ụmụnna isii ndị ọzọ ji obi ha niile na-efe Jehova ka ha na-ahazi ọrụ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova.

Obi tọrọ ọtụtụ ụmụnna bịara nnọkọ a ụtọ. Ọ bụ ya mere ha ji kpọọ ya “nnọkọ ha gatụrụla nke Jehova kacha gọzie.” Ma obi ụtọ ha nwere adịteghị aka.

IHE NDỊ MMADỤ MERE N’IHI AKWỤKWỌ THE FINISHED MYSTERY

Kemgbe ọtụtụ ọnwa, Ndị Mmụta Baịbụl nọ na-ekesa akwụkwọ The Finished Mystery. Ndị na-agụ ya n’ihi na ha chọrọ ịmụta eziokwu nabatara eziokwu Baịbụl ha gụtara na ya.

Otu onye nlekọta sekit nọ na Kanada aha ya bụ E. F. Crist kwuru gbasara otu di na nwunye gụrụ akwụkwọ The Finished Mystery ma malite ịbịa ọmụmụ ihe naanị n’izu ise ha nwetara akwụkwọ a. O kwuru, sị: “Di na nwunye a ji ofufe Chineke kpọrọ ihe ma na-eme nke ọma.”

Otu nwoke nwetara akwụkwọ a nyere ya ndị enyi ya ozugbo ka ha gụọ. Ihe ọ gụtara na ya “metụrụ” ya n’ahụ́. O kwuru, sị: “Mgbe m na-aga n’otu okporo ámá dị na Niu Yọk a na-akpọ Third Avenue, otu ihe si n’elu dasa m n’ubu. Echere m na ọ bụ okwute, ma m lere ya anya hụzie na ọ bụ akwụkwọ ‘The Finished Mystery.’ M weere ya laa n’ụlọ m ma gụchaa ya. . . . M mechara chọpụta na ọ bụ onye na-ekwu okwu chukwu . . . ji iwe si na windo tụda ya . . . Ekwetasiri m ike na akwụkwọ a ọ tụdara mere ka ọtụtụ ndị mụta eziokwu karịa okwu chukwu ọ bụla o kwuru ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ o mere ná ndụ ya. . . . Iwe ahụ o were emeela ka anyị na-eto Chineke ugbu a.”

E nwere ndị ọzọ na-achọghị iji anya ahụ akwụkwọ ahụ otú ahụ onye okwu chukwu ahụ mere. Ndị ọchịchị Kanada machibidoro akwụkwọ ahụ iwu n’abalị iri na abụọ n’ọnwa Febụwarị afọ 1918, n’ihi na ha kwuru na ọ na-agba ọchịchị mgba okpuru, na-akatọkwa agha. Ọ dịghị anya, ndị ọchịchị Amerịka emeekwa otú ahụ. Ndị ọrụ gọọmenti chọrọ akwụkwọ ahụ ebe niile na Betel nakwa n’ọfịs ndị dị na Niu Yọk, Pensụlvenịa nakwa na Kalịfọnịa. Ha na-achọ ihe ha ga-eji emegide ndị na-ahaziri nzukọ Jehova ọrụ. N’abalị iri na anọ n’ọnwa Mach afọ 1918, Ngalaba Okwu Ikpe n’Amerịka machibidoro akwụkwọ The Finished Mystery iwu. Ha kwuru na ibipụta ya na ikesara ya ọhaneze na-eme ka ndị mmadụ gharazie ịga agha, bụ́kwanụ nke megidere otu iwu ha tiri nke machiri mmadụ ikwu ma ọ bụ ide ihe ọ bụla megidere agha.

ỊTỤ MKPỌRỌ

N’abalị asaa n’ọnwa Mee afọ 1918, Ngalaba Okwu Ikpe natara ikike ha ji nwụchie ụmụnna asatọ. Ha bụ Giovanni DeCecca, George Fisher, Alexander Macmillan, Robert Martin, Frederick Robison, Joseph Rutherford, William Van Amburgh, na Clayton Woodworth. E boro ha ebubo na ha “na-eme mpụ, kpachara anya na-enupụrụ ndị ọchịchị isi ma jụ ịbụ ndị amị Amerịka.” A malitere ikpe ha ikpe n’abalị atọ n’ọnwa Jun afọ 1918. Ma, e nwere ike ịma ha ikpe. N’ihi gịnị?

Ọkàikpe ukwu nke mba Amerịka kwuru na iwu ahụ a sị na ha dara bụ “ihe e ji na-emekpọ ndị na-agba ndị ọchịchị mgba okpuru ọnụ.” N’abalị iri na isii n’ọnwa Mee afọ 1918, Ụlọ Nzukọ Omeiwu jụrụ imegharị Iwu ahụ, bụ́ nke gaara echebe ndị dere “ihe bụ́ eziokwu n’ebughị ihe ọjọọ n’obi.” Akwụkwọ The Finished Mystery so n’ihe gbara ọkpụrụkpụ ha kwurịtara. Ihe Ụlọ Nzukọ Omeiwu nke Amerịka dere banyere akwụkwọ The Finished Mystery, sịrị: “Otu n’ime ihe kacha njọ e ji na-eduhie ndị mmadụ bụ akwụkwọ a na-akpọ ‘The Finished Mystery’ . . . Naanị ihe ọ na-eme bụ ime ka ndị agha na-akatọ agha anyị na-alụ . . . na-emekwa ka ndị mmadụ jụ ịba amị.”

N’abalị iri abụọ n’ọnwa Jun afọ 1918, òtù ikpe mara ụmụnna anyị asatọ ahụ ikpe n’ebubo niile ahụ e boro ha. N’echi ya, otu ọkàikpe gụpụtara ihe o ji maa ha ikpe. Ọ sịrị: “Ihe ndị a na-akụzi n’okpukpe ha, bụ́ ihe ndị ha na-akụziri ndị mmadụ n’ebe niile . . . ga-emebiri anyị ihe karịa ìgwè ndị agha Jamanị. E kwesịrị ịta ha ezigbo ahụhụ.” Mgbe izu abụọ gachara, a tụrụ ụmụnna asatọ ndị a mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ gọọmenti etiti dị n’Atlanta, Jọjịa. A tụrụ ha mkpọrọ malite n’afọ iri ruo afọ iri abụọ.

A NỌGIDERE NA-EKWUSA OZI ỌMA

N’oge ndị a niile, a nọkwa na-emekpọ Ndị Mmụta Baịbụl ọnụ. Ụlọ Ọrụ Etiti nke Na-eme Nchọpụta Maka Mpụ mere ezigbo nchọnchọ gbasara ọrụ ụmụnna ndị a na-arụ, deekwa ọtụtụ puku peeji akwụkwọ banyere ihe ha chọpụtara. Ihe ndị a ha dere gosiri na ụmụnna anyị kpebisiri ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma.

N’akwụkwọ ozi otu onye na-arụ ọrụ na post ọfis n’Ọlando dị na Flọrịda degaara Ụlọ Ọrụ Etiti nke Na-eme Nchọpụta Maka Mpụ, ọ sịrị: “[Ndị Mmụta Baịbụl] na-aga ozi ọma ụlọ n’ụlọ na Flọrịda niile, ha na-agakarị ya n’abalị. . . . O  yiri ka hà chọrọ ịnọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na ọ na-ewe ndị mmadụ iwe.”

Otu onyeisi ndị agha na-arụ na Ngalaba Ndị Agha degaara ụlọ ọrụ etiti ahụ akwụkwọ ma kọọrọ ha banyere ọrụ Nwanna Frederick W. Franz na-arụ. Nwanna a mechara soro n’Òtù Na-achị Isi. Onyeisi ahụ dere, sị: “F. W. Franz . . . ereela ọtụtụ puku akwụkwọ ‘Finished Mystery’.”

E mekpọkwara Nwanna Charles Fekel ọnụ. O mechakwara soro n’Òtù Na-achị Isi. Ndị ọchịchị nwụchiri ya maka ikesa akwụkwọ The Finished Mystery, na-elebakwa anya n’akwụkwọ ozi ndị ọ na-edegara ndị mmadụ na ndị ọ na-enweta. A tụrụ ya mkpọrọ otu ọnwa na Baltimọ dị na Meriland ma were ya ka “onye iro si Ọstrịa bịa biri n’Amerịka.” Ka o ji obi ike na-ezi ndị na-emekpọ ya ọnụ ozi ọma, o chetara ihe Pọl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 9:16. Ebe ahụ kwuru, sị: “Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na ezisaghị m ozi ọma!” *

E wezụga iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, Ndị Mmụta Baịbụl nọkwa na-ekesara ndị mmadụ akwụkwọ ka ha bịanye aka ka a tọhapụ ụmụnna anyị a tụrụ mkpọrọ n’Atlanta. Nwanna Nwaanyị Anna K. Gardner kwuru, sị: “Anyị anọghị nkịtị. Mgbe ahụ a tụrụ ụmụnna ndị ahụ mkpọrọ, ihe ọzọ anyị mere bụ ide akwụkwọ ma na-enye ya ndị mmadụ ka ha bịanye aka. Anyị gara n’ụlọ n’ụlọ. Ọtụtụ puku mmadụ bịanyekwaara anyị aka. Anyị gwara ndị mmadụ na ụmụnna ndị ahụ bụ ezigbo Ndị Kraịst, nakwa na mkpọrọ a tụrụ ha ezighị ezi.”

MGBAKỌ NDỊ E NWERE

N’oge niile a a na-emegide ụmụnna anyị, e nwere mgbakọ ugboro ugboro e ji mee ka okwukwe ụmụnna anyị sikwuo ike. Ụlọ Nche kwuru, sị: “Ihe karịrị mgbakọ iri anọ . . . ka e nwere n’afọ ahụ . . . E nwetara ọtụtụ akụkọ ọma gbasara mgbakọ ndị ahụ. N’oge mbụ, a na-enwe mgbakọ naanị ọnwa abụọ ma ọ bụ ọnwa atọ n’afọ, ma ugbu a, a na-enwe ya kwa ọnwa.”

Ndị chọrọ iji obi ha niile fee Jehova ka na-ege ozi ọma. N’otu mgbakọ e nwere na Klivland dị n’Ohayo, ihe dị ka otu puku mmadụ na narị abụọ bịara ya, e mekwara mmadụ iri anọ na abụọ baptizim. Otu n’ime ha bụ otu nwata nwoke “ihe banyere Chineke na inyefe ya onwe ya na-amasị, bụ́ nke ga-emenye ọtụtụ ndị torola eto ihere.”

OLEE IHE ỌZỌ MERENỤ?

Ka ọ fọrọ obere ka afọ 1918 gwụchaa, Ndị Mmụta Baịbụl amaghị ihe ga-emecha mee ha. E rere ụfọdụ ụlọ anyị dị na Bruklin ma buga isi ụlọ ọrụ anyị na Pitsbọg dị na Pensụlvenịa. N’agbanyeghị na ndị na-ahaziri nzukọ Jehova ọrụ nọ n’ụlọ mkpọrọ, e yikwara nnọkọ ndị so na Watch Tower Bible and Tract Society na-enwe kwa afọ n’abalị anọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 1919. Olee ihe ga-emenụ?

Ụmụnna anyị nọgidere na-arụ ọrụ ha. Obi siri ha ezigbo ike na o nweghị ihe ga-eme ha. Ọ bụ ya mere ha ji họrọ isiokwu afọ 1919 ka ọ bụrụ: “Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma.” (Aịza. 54:17) Ha kwadebekwara maka ihe ha na-atụghị anya ya ga-emenụ. Ihe a ga-eme ka okwukwe ha sie ike ma mee ka obi sie ha ike maka nnukwu ọrụ ha ga-arụ.

^ para. 6 Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga, Ya Bụ n’Afọ 1917.” Ọ gbara n’Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke afọ 2017, peeji nke 172 ruo 176.

^ para. 22 Gụọ akụkọ ndụ Nwanna Charles Fekel n’isiokwu bụ́ “Joys Through Perseverance in Good Work” (Ọṅụ M Na-enwe n’Ihi Itachi Obi n’Ọrụ Ọma). Ọ gbara n’Ụlọ Nche March 1, 1969, nke Bekee.